Sunday readings in Igbo language for Ordinary season, Yaer C

07. ỤKA NKE ASAA N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

ỤKA NKE ASAA N’OGE NA-ADANYEGHỊ N’EMUME

UKWE MBATA

Onyenwanyị atụkwasara m obi n’ebere nke ihụnanya gi. A gam ekwere Dinwenụ onye na-emere m ihe ọma ukwe (Abụ 12:6)

EKPERE MMEGHE

Chukwu pụrụ ime ihe niile, mee ka site na itule uche n’ihe nke mmụọ mgbe ọbụla, k’anyị na-emepụta n’omume na okwu ọnụ ihe ndi na-asọ gi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 26:2.7-9,12-13,22-23                                                        

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel

Chineke ewereal gi nye n’aka m, mana agaghị m egbu gi.

Sọl kpọọrọ puku mmadụ atọ, bụ ụmụ okorobai a họrọ ahọ n’ala Izerl garuo n’ikpa nke Zif. Ọ bụ Devid ka ha na-achọ n’ọzara nke Zif.

Devid na Abishai jiri abalị gagharịa n’atiti ndị agha Sọl, wee hụ Sọl ka o dina na-ehi ụra, ebe a gbara ogige gburugburu. A rụnyere ube Sọl n’ala n’akụkụ isi ya. Abna na ndị agha dinara Sọl gburugburu. Abishaị gbaara ya Devid n’izu sị: “Taa Oseburụwa ewereal onye iro gị nyefee n’aka gị. Ya bụ, ka m were ube nke ya kpọgide ya n’ala. Nanị otu mma ube! Agaghị m ama ya ugboro abụw!” Devid azaa Abishaị sị: “E merụkwala ya ahụ. Kedụ onye ga-ewelite aka ya megide onye Chineke tere ude, aghara inye ya ọpịpịa maka ya? Devid ewere ube ahụ, burukwa ite mmịrị dị n’akụkụ isi Sọl, ha were ube rịe ọsọ. O nweghị onye hụrụ ha, nke ọ na-enwe onye mara ihe merenụ; Ọ dịghịkwanụ onye tetara n’ọra, n’ihi na ha dum nọ n’oke ụra nke siri n’aka Osrburụwa dakwasị ha. Devid wee gafere na mpaghara nke ọzọ, were gụzoro n’elu ugwu n’ebe dị anya. Nunkwu mbara ala kewara ha. Devid ewee kpọọ sị: “Nke a bụ ube eze. Otu onye n’ime ndị agha unu gafeta bịa were ya. Dinwenụ na-akwụghachi onye ọ bụla ụgwọ otu ezi omume na ihube isi ya si dị. Taa ka Dinwenụ weere gị nye n’aka m, mana agaghị m ewelite aka megide gị bụ onye Chineke tere ude.”

Okwu nke Oseburụwa.

Read more: : 07. ỤKA NKE ASAAI N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

05. ỤKA NKE ISE N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

UKWE MBATA

Bianụ k’anyị sekpuoro Chukwu.  Ngwanụ k’anyị kpọọ isi ala n’ihu Osebụrụwa Onye kere anyị, n’ihi na Ọ bụ Osebrụwa Chukwu anyị. (Abụ 94:6-7)

EKPERE MMEGHE

Were obiọma gi na-enweghi atụ chekwaba ezi-na-ụlọ gi, O Osebrụwa,  ebe ọ bụ na nchekwube ya niile di n’amara gi si n’eluigwe, biko, mee ka o na-enwe nchedo gi oge niile.  Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ, na-achi n’ịdịkọ n’otu nke Mụọnsọ,otu Chukwu site n’ụwatụwa nile. Amen.

IHE GG NKE MB (AZAYA: 6:1-8)

Ihe gg e wetara n’Akwkw Onye Amma Azaya

An m ebe a, ziga m.

N’afọ nke eze Uziya nwụrụ, ahụrụ m Chineke ka Ọ nọkwasara n’elu ocheeze nke dị elụ, ebube ya jupụtakwara ụlọnsọ ahụ. Ndị Mmụọọma guzoro n’elu ya; Mmụọọma ọbụla nwere nku isii; abụọ n’ime nku isii ndị a ka ha ji kpuchie ihu ha, werekwa abụọ ọzọ kpuchie ụkwụ ha, ebe abụọ ọzọ ka ha ji efe efe. Ha na-eti, “Nsọ, Nsọ Nsọ ka Chineke nke igwe ndịagha dị; Ebube ya jupụtara n’elu ụwa niile. Ụda olu ha mere ntọala niile nke ụlọ nsọ ahụ maa jijiji; anwụrụọkụ jupụtakwara n’ụlọnsọ ahụ. M wee sị, “Efuola m; leenụ ụdị ọnọdụ ọjọọ m nọ n’ime ya! Maka na abụ m onye egbugbereọnụ ya rụrụ arụ ma nọrọkwa n’etiti ndị egbugbereọnụ ha rụkwara arụ. Anya m ahụla eze, Chineke nke igwe ndịagha.”

Mgbe ahụ, otu n’ime ndị Mmụọọma ahụ fekwutere m, o jikwa n’aka ya otu icheku ọkụ nke o ji ihe gụta n’ebe nchụaja. O wee metụ m icheku ọkụ ahụ n’ọnụ sị: ‘Lee, nke a emetụla egbugbereọnụ gị; ya bụ na e kpochapụla ikpe ọmụma gị niile; a gbagharala gị njọ gị niile.” M wee nụ olu nke Chineke ka ọ na asị, “Ọ bụ onye ka m ga-eziga; onye ga-ejere anyị ya bụ ozi?” Ozigbo m zaa sị, “Anọ m ebe a, ziga m.” 

Okwu nke Oseburwa

Read more: : 05. ỤKA NKE ISE N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

04. ỤKA NKE ANỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

UKWE MBATA

Dinwenụ Chineke anyi, zọpụta anyị; si n’ala mba kpọkọta anyị ọnụ, ka anyị kenee aha gi di nso, wee ṅụria oṅu n’ito gi.(Abụ 105:47)

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ Chineke anyị, biko nyere anyị aka ka anyị were obi anyị nile na-asọpụrụ gi; ma weere ezi obi na-ahụ mmadụ ibe anyị n’anya.  Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

IHE GG NKE MB (JEREMAYA: 1:4-5.17-19)

Ihe gg e wetara nAkwkw Onye Amma Jeremaya.

Ahptala m g ka onye amma nke mba niile.

N’ụbọchị nke Josiah, okwu nke Chineke bịakwutere m na-asị: “Tupu a tụrụ ime gị, amarala m gị, tupu a mụọ gị, edoola m gị nsọ; ahọpụtakwala m gị ka onye amụma nke mba niile.” Ngwa kee ajị gị n’ume; bilie gwa ha ihe niile m gwara gị kwuo. Atụla ha ụjọ ka m gharakwa itinye ụjọ n’ime gị n’ihu ha. Ma lee, emeela m gị n’ụbọchị taa ka ị bụrụ obodo ukwu bụ akwaa akwụrụ, ide igwe na mgbidi ọlaọkụ imegide ala dum, megidekwa ndịeze niile nke Juda, megidekwa ndịịsi ya niile, ndị nchụaja ya dum, nakwa mmadụ niile nke ala ahụ. Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha apụghị imeri gị; anọnyeere m gị, iji zọpụta gị, Chineke kwuru nke a.”

Okwu nke Oseburwa

Read more: : 04. ỤKA NKE ANỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

03. ỤKA NKE ATỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

UKWE MBATA

Kweerenu Osebrụwa ukwe ọhụrụ, Kweerenụ Osebrụwa ukwe, mba niile. Ebube na ugwu bụ  nke ya, ike na nsọpụrụ  juputara n’ụlọ ya di asọ. (Abụ 96:1.6)

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile di ebeebe, biko, mee k’anyị na-eme ihe niile n’ụzọ ga-asọ gi, wee si n’aha Nwa gi I hụrụ n’anya nweta ụba na iheọma nke ezi-ọrụ. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

IHE GUGU NKE MBU

Ihe gugu nkea si n’ Akwkw nke Nehemaya.

Ezra, onye ukọchukwu, butere Iwu n’ebe ndi nwoke na ndi nwanyi na umuaka ndi nwere ike ighọta ihe nke ọma nọ. Nkea bụ n’ụbọchi mbụ nke ọnwa Isaa. N’ọgbakọ ahụ e debere n’ụzọ-Mmiri, n’ihu mmadụ  niile, ka ndi nwoke, ka ndi nwanyi na umuaka ndi nwere ike ighọta ihe nke ọma, ka Ezra nọ wee gụpụtara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Iwu ahu, bido n’ụzọ-ụtụtụ wee ruo n’ọkara ụbọchi. Ndi mmadụ  nọ n’ebe ahụ, gere nti nke ọma ka a na-agụpụtara ha ihe e dere na ya bụ Akwụkwọ Iwu.

Ezra, onye ode-akwụkwọ, wee rigoro n’ebe ndi mmadụ  ga-ahụya nke ọma, wee meghepu ya bụ Akwụkwọ: mgbe o meghere ya, ndi mmadụ  wee kwụrụsịa ọtọ. Ezra wee kpee ekpere, gozie Osebruwa Chukwu, ndi mmadụ  wee chinie aka ha elu wee zaa si: “Amen! Amen!” Ha niile wee daa, mado ihu ha n’ala, wee sekpuoro Osebruwa. Ezra wee bido ịgụpụta Iwu nke Chukwu, wee na-akọwara ha nke ọma ihe nke ọbụla n’ime ha pụtara ka ha wee ghọta ya n’ụzọ kwesiri-ekwesi.

 Mgbe ihe niile ndịa na-aga, Nehemaya, onye isi-ụkọchukwu, na Ezra, onye bụ ụkọchukwu bụrụkwa onye ode-akwụkwọ, na ndi nile si n’agbụrụ Livai, ndi so ha wee na-agbaziri na- achịkọta ndi mmadụ  gwara ha si: “Ụbọchị tata bụ nnukwu ụbọchị puru iche, bụrụkwa ụbọchị di asọ maka Osebruwa Chukwu. Unu erukwana uru n’ụzọ ọbụla, unu akwana-akwa”. A gwara ha nkea n’ihi na ha na-akwa-akwa ka ha na-egeta Iwu Chukwu a na-agụpụtara ha.

Nehemaya n’onwe ya mesiri gwa ha si: ‘Jeenu rie ihe, rijuonu afọ unu, ṅụọnụ mmanya di ụtọ, nyebinyenu ndi na-enweghi ihe oriri, ka ha rie, n’ihi na tata bụ ụbọchi di asọ maka Osebruwa. Unu ekwena ihe ọbụla wute unu. Aṅuri Osebruwa bụ ike unu nwere.”

Okwu nke Osebruwa.

Read more: : 03. ỤKA NKE ATỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

UKWE MBATA

Ụwa niile ga akpọ isi ala n’iru gi, O Chukwu, ha ga ekweere gi ukwe otito, ma weerekwa abụ ọma too aha gi, onye kacha elu!

EKEPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile di ebebe, onye na-achị enuigwe na ụwa; mee ebere nụrụ arịrịọ ndi nke gi, ka inye anyị udo n’oge nke anyị.   Site na Dinwenu anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achị, na ịdịkọ n’otu nke Mụọ Nsọ...

IHE GG NKE MB (Is. 62:1-5)

Ihe gg nkea si n’ Akwkw Onye Amma Aizaya.

Agaghị m agbachị nkiti n’ihe banyere Zayọn; ike agaghị agwụ m maka ihe ọbula banyere Jerusalem, wee ganye na o zuo-oke n’ezi-omume, nzọpụta ya ewee chawapụta dịka ọkụ.  Mba niile ga-ahụ ezi-omume gi, ndi eze niile ga-ahụkwa ebube gi.  A ga-akpọ gi aha ọhụrụ, aha nke Osebruwa n’onwe ya ga-ekwu.  I ga abụ okpu-eze ọma n’aka Osebruwa, wee di ka okpu-eze nke nwa-eze n’aka Chukwu.  I gaghị abụkwa “onye a gbaketere-azụ”, nke ala gi ga-abụ ala “a gbahapụrụ-agbahapụ”, kama ihe a ga-akpọ gi bụ: “Ihe na-asọ m”, a ga akpọ ala gi: “Ala e ji wee gbaa-akwụkwọ”, n’ihi na ihe gi na-asọ Osebruwa nke ukwuu. Ala gi ga-enwekwa agbam-akwụkwọ nke ya.  Dịka nwa-ịkorobịa na-anụ nwa-agbọghọ nke na-amaghị nwoke, etu ahụ ka onye mebere gi ga-esi jiri gi gbaa-akwụkwọ.  Etu nwoke nụrụ nwanyị ọhụrụ si enwe anụrị na nwunye ya, bụ ka Chukwu ga-esi nwee anụrị n’ebe I nọ.

Okwu nke Osebruwa.

Read more: : 02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE NKITI NKE ỤKA (C)

MMIRICHUKWU JESU KRISTI (C )

UKWE MBATA

Mgbe e mechara Dinwenụ mmirichukwu, eluigwe meghere, Mmụọ Nsọ wee dakwasara Ya n’ụdị nduru. Mgbe ahụ olu Nna dara ka egbe igwe sị: ‘Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya na-amasị M.

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile dị ebeebe, Onye, mgbe emechara Kristi mmiri Chukwu na orimiri Jodan na ka Mmụọ Nsọ dakwasara Ya kwụpụtara na ọ bụ Nwa Gị ịhụrụ n’anya, mee ka ụmụ Gị site na mgbaputa, ndị amụnworo site na mmịrị na Mụọ Nsọ, bụrụ ndi ihe ha gana-amasị Gị oge niile. Site na Kristi Dịnwenu anyị.

IHE GG NKE MB (AZAYA 40:1-5.9-11)

Ihe gg e wetara n’Akwkw Onye amma Azaya

Dozienu z Oseburuwa

1Oseburuwa kwuru si: kasie ndị nke m obi, kasienu ha obi.

2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya na ụbọchi ịgba ohu ya agwụla, na a gbagharala mmehie ya niile, na Chineke ga-enye mgbaghara ga-adị mmaji abụọ karịa mmehie niile o mere.

3Otu olu na-eti mkpu na-asị, “Dozierenu Dinwenu ụzọ ya, mekwanu ka ụzọ niile dị n’ime ọzara di larịị maka Chineke anyị.

4Kpojuonu ndagwurugwu niile, kposakwaanu ugwu niile, menu ka ebe niile gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ, meekwanu ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.

5Mgbe ahụ ebube nke Chineke ga-achawapụta, mmadụ niile ga-ahụ ya n’ihina Oseburuwa ekwuola ya.”

9Rịgoro n’elu ugwu, gị bụ onye ozi nke Zayọn, welie olu gị elu tisie mkpu ike, O onye ozi nke Jerusalem, tisie mkpu ike atụla egwu, gwa obodo niile nke Juda sị: “Leenu Chineke unu!”

10Lee, Oseburuwa Chineke anyị ji ike abịa, ọ ga-eji aka ya na-achị. Ọ ga-enye onye ọbụla ihe ruru ya. Dika onye ncheatụrụ,

11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya nri. Ọ ga-eji aka ya na-edu ụmụatụrụ ya. Ọ ga-ebu ha n’ubu ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.”     

Okwu nke Oseburwa.

Read more: : 01. MMIRICHUKWU JESU KRISTI (C )