Sunday readings in Igbo language for Lent, Yaer C

08. FRIDAY ỌMA

Then the Priest goes to the chair, faces the people and says the following prayer, (non dicitur oremus).

Cheta ebere Gị Dinwenụ were nchedo Gị dị ọkpụ chekwaba anyị bụ ụmụ-odibo Gị, ndị Kristi Nwa Gị si n'Ọbara Ya wee dobe ihe omimi nke Paska. Onye di ndụ na-achị, ebebe ebebe. Amen.

Ma ọbụ

Chineke Nna anyị, I sitere n'ọnwụ Kristi Nwa Gi bụ Onyenweanyị merie ọnwụ, nke bụ oke mmadụ niile ketara site na njọ Adam. Site n'omumụ a mụrụ anyị n'ụwa, ma Ọ ọsọghị anyị, anyị n'oyiyi mmadụ nke eluigwe ahụ bụ Jesu Kristi. Onye Gi na Ya dị ndụ na-achị ebeebe ebeebe. R. Amen

Ihe gg nke Mb:

Ihe gg ewetara n'akwkw Aizaya Onye Amma (52:13,53:1-12)

A mapr Ya ah maka nj any

Lee nwodibo m ga-enwe ọganiihu, a ga-eto ya, bulie ya elu, ọga-anọ n'ebe dị nnukwu elu, Kedụ onye kweerela ihe anyị nụrụ? Kedụkwa onye hụrụ n'ime ya aka nke Osebụrụwa? Ọ na-etolite n'ihu ya dịka obere osisi, ma dịkwa ka mgbọrọgwụ osisi si n'ala kpọronkụ. O nweghị oyịyị mọbụ ihe e jiri mara ya nke na ọ ga-amasị anyị ile anya, ọ bughịkwanụ mma ka ọ mara nke na anyị ga-achọ ya. Ọ bụ onye ndị mmadụ leliri eleli na onye nọ n'uru; na onye ahụhụ maarala ahụ; dịka onye ndị mmadụ na-ezo ihu ha n'ebe ọ nọ, eleliri ya eleli, akpọghikwa ya mmadụ ọbụla. N'ezie o diela ihe ufụ anyị, bịakwa buru iru ụjụ anyị ma anyị were ya ka onye a kụdara akụda, onye Chukwu megburu na onye nọ n'ahụhụ. Ma e merụrụ ya ahụ n'ihi njọ anyị merụchaa ya ahụ maka arụ anyị mere: ọ bụ ya buuru ahụhụ mere ka anyị zuo oke, site n'ụtalị a pịara ya ka e ji gbaghara anyị. Anyị niile agahiela dịka atụrụ, one ọbụla esobe ụzọ nke ka ya mma; Chineke ebola ya arụ niile anyị mere. A kpagburu ya, merụọ ya ahụ ma ọ tụpụghị ọnụ dịka nwa atụrụ a kpụrụ gaba ebe a ga-egbu ya, dịkwa ka atụrụ a na-akpụchasị ajị ma o megheghị ọnụ ya. Amara ya ikpe jiri ike kpụrụ ya pụọ. O nweghị onye chọrọ ima ihe gbasara ya ọbụladị ngụpụ a gụpurụ ya site n'ala ndi dị ndụ mọbụ gbasara ogbugbu e gburu ya maka mmehie ndị nke ya. Ha gwukọrọ ili ya na nke ndị obi tara mmiri, e liri ya n'etiti ndị ọgbaghara n'agbanyeghị na o nweghịkwa ọgbaghara o butere, mọbụ okwu ụgha ọbụla si n'ọnụ ya pụta. Ma ọ bụ uche nke Chineke ịta ya ahụhụ; o tinyela ya n'iru ụjụ; mgbe o jiri onwe ya chụọ aja maka njọ. Ọ ga-ahụ ụmụụmụ ya, mekwaa ka ubọchị ya n'uwa too ogologo sitekwa na ya ka a ga-eji mee uche Chineke; Ọ ga-ahụ mkpụrụ nke ahụhụ ọ tara wee nwee afọ ojuju, site n'amamihe ya, ka nwodibo m nke na-eme ezigbo omume, na-akwubakwa aka ya otọ ga-esi mee ka ọtụtụ dịrị ka ya wee na-akwụba aka ha ọtọ; Ya onwe ya ga-ebu mmehie ha. Ya mere aga m ekenye ya oke n'etiti ndi oke mmadụ, ya na ndị ọchịagha ga-eke ihe e nwetara n'agha; n'ihina o jiri obi ya taa ahụhụ nke ọnwụ, ewee gụkọta ya na ndi njọ, ebe ọ bu njọ nke ọtụtụ mmadụ ka o buuru rịọ mgbaghara maka ndị mmehie.

 Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 08. FRIDAY ỌMA

07. EMUME ORIRI ANYASI NKE ONYENWEANYI

Ekpere Mmeghe

O Chukwu, anyị gbakọbalụ ebe a iketa oke na nnukwu oriri nke Otu Nwa Gị rapụlụ Ụka Ya, iji gosị ịhụnanya Ya O nyere Ya anyị mgba Ọ na akwado iwere Onwe Ya nye n'ọnwụ wee tiere anyị iwu ka anyị na-echata ya ka aja agba ọhụụ, aja dị ọkpu. Anyị na-arịọ ka anyị si na Yukaristia nụnwa nweta ịhụnanya na ndụ, n'uju. Sitena Kristi Dinwenụ...

Ihe gg nke Mb

Ihe gg ewetara n'akwkw nke pp (12:1-8.11-14)

Ihe aga-eme na Oriri Ngabiga

Osebụrụwa gwara Mosis na Erọn n'ala Ijipt sị, “Ọnwa nke a ga-abụrụ ụnụ isi mbido ọnwa niile; ọ ga-abu ọnwa nke mbụ n'afọ. Gwa ọgbakọ ndị Izrel, sị: 'Ụbọchị ọnwa a ga-adị na mkpurụ ụbọchị iri, nwoke ọbụla ga-eweta otu nwaatụrụ dịka otu ụlọ nna ha siri dị; otu nwaatụrụ maka ezinụụlọ ọbụla. Mana ọ burụ na e nwere ezinụụlọ dị nta nke na ha agaghị ericha otu nwaatụrụ, ha ga-esonyere ndị agbataobi ha dịkwa nta, ha na ha ga-enwe ike iricha otu nwaatụrụ. A ga-akpachapụ anya mata ole onye ọbụla ga-enwe ike iricha iji mata mmadụ ole ha ga-adị. Nwaatụrụ ahụ agaghị enwe ntụpọ ọbụla; ọ ga-adị ka chi si kee ya, gbaa naanị otu afọ. Unu ga-esi n'etiti atụrụ mọbụ ewu were ya. Ụnụ ga-edobe ya ruo mgbe ọnwa gbara iri na anọ, bu mgbe ọgbakọ Izrel niile ga-egbugbado nwaatụrụ ha n'oge mgbede. E mechaa ha ga-ewere ufọdụ n'ime obara anụ ahụ tee n'ide nke ọnụuzọ na n'elu mgbo nke dị n'ụlọ niile ha ga-anọ rie ụmụatụrụ ahụ. Ha ga-eri ha n'abalị ahụ ma a ga-ahu ya n'ọkụ; ha ga-eji achịcha ekoghị eko na akwụkwọ ilu were rie ya. N'usoro a ka ụnụ ga-esi rie ya, ụnụ ga-ekechisi akwa ụnụ ike, gbara akpụkpọ ụkwụ, jidekwa mkpọ ụnụ n'aka; wee rie ya ngwangwa. Ọ bụ oriri ngabiga nke Osebụrụwa. N'ihina aga m esi n'ala Ijipt gafee n'abalị ahụ, were gbuchapụ nwa nwoke mbụ niile nọ n'ala ahụ, ma mmadụ ma anụọhịa, aga m ekpekwa chi niile nọ n'ala ịjipt ikpe were nye ha ọnọdụ kwesirị ha, ọ bụ m bụ Chineke. Obara ahụ ga-abụrụ akara ịrịbaama nke ga-egosi ụlọ ndị unu bi n'ime ya. Mgbe M hụrụ ọbara ahụ, aga m esi ebe unu nọ gafee, o nweghị nsogbu ọbụla ga-adakwasa unu, mgbe M ga-atusasi ala Ijipt niile. Ụbọchị a ga-aburụ unu ihe ncheta, nke unu ga-edobe n'ụzọ purụ iche ka ọ bụrụ ụbọchị oriri nke Osebụrụwa. Unụ ga na-asọpụrụ ya ka iwu ndụdụgandu niile.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 07. EMUME ORIRI ANYASI NKE ONYENWEANYI

06. ỤKA IGU, AFỌ NKE ATỌ (C)

Antifon: (Mt. 21:9)

Ebube na otito dịrị Nwa nke Devid: Ọnye bịara n'aha Dinwenụ, Eze ndị Israel; ebube na otito (dịrị Ya) na elu kacha elu.

Then the Priest salutes the people in the usual way and gives a brief introduction, inviting them to take a full part in the celebration. He may use these or similar words:

Ụmụnna m na Kristi m hụrụ n'anya, ka mgbe izu ụka ise Lenti jiri bido, anyị ji ọrụ nke ịhụnanya na opịpịa were na-akwado obi anyi maka emume ihe omimi nke Paska nke Onyenweanyị, ihe omimi nke ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Ya. N'ụbochi taa, anyi gbakọbara n'ebe a iso Nzukọ Kristi n'akụkụ ụwa niile n'ime ya bụ emume.

Ọ bụ iji meju ihe omimi a ka Kristi jiri were añuri na ngori banye n'obodo Ya bụ Jerusalem. Ebe anyi ji okwukwe na ezi obi echeta mbanye a wetaara anyi nzọpụta ka anyi sobenụ Dinwenụ, ka ọ ga-abụ, anyi kwụnyere Ya n'ije obe ya, anyi ewere nwee ike isonyere Ya na mbilite n'ọnwụ na ndụ ọhụrụ.

 

After this admonition the Priest says the following prayers:

Ka any ro Arro:

Chineke pụrụ ime ihe niile onye di ụwatụwa, were ngozi Gi + doo igu ndị a nsọ. Taa anyị obi anụrị ekwputa Kristi dị ka Eze anyị n'onye nzọpụta anyị mee  ka anyi bụ ndị so na-eto Kristi Eze anyi, nwee ike iso Ya banye na Jerusalem dị ebebe, Onye dị ndụ na-achị ebebe ebebe. Amen.

Ma b:

Ka any ro Arro:

O Chukwu, mee ka okwukwe ụmụ Gi na-abawanye, were obị oma nara ekpere ndị na-akpoku Gi. Taa, anyi jicha igu iji nye Kristi Eze anyi otito. Anyi si n’ aka Kristi ebunye Gi mkpụrụ ezi ọrụ anyi. Ngi bụ onye di ndụ, na-achị ebebe ebebe. Amen.

Ozima:

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma di asọ nke Luk dere (Lk. 19:28-40)

  1. Otito dịrị Gi Dinwenụ anyị.

Ngozi dịrị onye bịara n’aha Onyenweanyi.

Jesu gara n'ihu igbago Jerusalem. Mgbe O rutere Betfeg na Betani nso, n'akụkụ ugwu Oliv, O zipụrụ ndi na-eso ụzọ Ya abụọ, si ha, Gaanụ n'ọnụmara nke cherịtara unu ihu. Ozigbo ụnụ na-abanye, ụnụ ga-ahụ nwa ịnyinyaịbu e libere n'osisi, nke o nwebeghi onye nọkwasara n'elu ya. Tọpụnụ ya, kpụtaranụ m ya. Ọ bụrụ na onye ọbula ajụọ ụnụ sị, “Gịnị mere ụnu ji atọpu ya?” Unu ga-agwa ya sị, “Ọ di Dịinwenụ mkpa”. Ndị ahụ O zigara garuru hụ ya otu O siri gwa ha. Mgbe ha na-atopụ nwa ịnyịnyaịbu ahu, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị kpatara ụnụ ji atọpụ ya?” Ha zara sị, “Ọ di Dinwenụ mkpa”. Ha kpụtaara ya Jesu, tụsaa akwa ha n'elu ya. Ha nyeere Jesu aka ka Ọ rigoro n'elu ya. Ka Jesu nọ n'elu ya na-aga n'ụzọ, ndị mmadụ gbasara akwa ha n'okporo ụzọ ahụ. Ka ọ na-abia nso na mgbada ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị na-eso ụzọ Ya bịdoro ñurịba ọñụ na-eto Chineke n'oke olu maka ọrụ ebube Ya nịịle nke ha hụrụla. Ha na-ekwu sị, “Ngọzi dịrị eze ahụ onye na-abịa n'aha Onyenweanyi. Udo n'eluigwe, otito n'elu kacha elu!” Ụfọdụ ndị Farisii nọ n'etiti igwe mmadụ ahụ gwara Ya si, “Onye nkuzi, baara ndị na-eso ụzọ Gị mba”. Ọ zara ha si, “Agwa m ụnụ, Ọ bụrụ na ndị a emechie ọnụ, okwute ndị a ga-eti mkpu.”

  1. Oziọma nke Osebụrụwa
  2. Otito dịrị Gị Kristi.
Read more: : 06. ỤKA IGU

05. ỤKA ISE N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ (C)

UKWE MBATA

O Chukwu, nye m ikpe ziri ezi, gbatara m ọsọ ọgụ n’ebe obodo n’enweghi okwukwe nọ; zọpụta m n’aka onye aruruala na onye aghụghọ maka na Gị O Chukwu bụ ike m.

EKPERE MMEGHE

Site n’enyemaka Gị, anyị na-arịọ Gị, O Dinwenu na Chineke anyị, mee ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-aga n’otu ụzọ nke ịhunanya ahụ nke mere ka nwa Gị jiri maka ịhụnanya O nwere maka ụwa were onwe Ya nye n’ọnwụ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 43:16-21)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye amụma Aịzaya

Lee, ana m eme ihe ọhụrụ; aga m eme ka ndị m họọrọla nwee mmiri ọńụńụ

Otu a ka Chineke siri kwuo, onye na-awa ụzọ n’ime mmiri, tinyekwa okporo ụzọ n’ime osimiri, onye na-edupụta ụgbọịnyịnya na ịnyịnya, na ndị dịke n’agha; kụtuo ha n’ala nke na ha enweghị ike ikuli ọzọ. A ga-emenyụ ha, pịnyụọ ha dịka ọkụ. Ọ baghị uru icheta ihe ndị a gara aga,” mọbụ tụgharịba uche n’ihe ndị mere na mbụ. Lee, ana m eme ihe ọhụrụ; ugbu a, ọ chawapụtala, ọ bụ na unu ahụghị ya? Aga m awa ụzọ n’ime ịkpa, mee ka mmiri dịrị n’ime ọzara. Anụọhịa niile ga-asọpụrụ m, ma nkịta ọhịa ma enyị nnụnụ, maka na emeela m ka mmiri dịrị n’ikpa, osimiri dịrịkwa n’ime ọzara, ka ndị m, ndị m họọrọla nwee mmiri ọńụńụ. Ha bụ ndị m họọrọ ka ha bụrụ ndị nke m, ka ha were kwupụta otito m.

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 05. ỤKA ISE N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ (C)

4. ỤKA ANỌ N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ (C)

UKWE MBATA

Jerusalem, ńụrịa, ńụrịwanu unu niile bụ ndị huru ya n’anya. Nweenu obi ụtọ, unu bụ ndị nọ n’uru, goriwenu ma nweenu afọ ojuju n’ara nke ntasi obi Ya.   

EKPERE MMEGHE

O Chineke, onye sitere n’Okwu Gị, wee kpeziere mmadụ n’onwe Gị n’ụzọ dị ịtụnanya, biko mee anyị na-arịọ Gị, ka ndị otu Kristi jiri ezi ofufe na okwukwe na-anụ ọkụ wee gazute emume ndịahụ na-abịanụ. Site na Dịnwenu anyị Jesu Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (Joshua 5:9-12)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Joshua

Ndi nke Chineke debere oriri Ngabiga mgbe ha batara n’ala ahụ e kwere ha na nkwa

Chineke gwara Jọshụa sị, “N’ụbọchị taa ewepụla m ihere ịbụ ohu nke Ijipt n’ebe unu nọ.” Ya mere e ji akpọ ebe ahụ Gịlgal ruo taa. Ụmụ Izrel mara ụlọikwu ha na Gịlgal, mee mmemme oriri Ngabiga n’ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ na mgbede n’ala Jeriko dị larịị. N’echi ya ka oriri Ngabiga gachara, n’ụbọchi ahụ ha riri ihe ubi ala ahụ mịtara, achịcha ekoghị eko na ọka a hụrụ n’ọkụ. Bido ụbọchị ahụ, ụbọchị ha riri ihe ala ahụ mịpụtara, nri mana kwụsịrị ịda. Ụmụ Izrel enweghikwa mana ọzọ naanị nri si n’ala Kenaan ka ha na-eri bido n’afọ ahụ. 

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 04. ỤKA ANỌ N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ (C)

3. ỤKA ATỌ N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ

UKWE MBATA

Anya m dị n’ebe Onyenweanyị nọ oge nile, n’ihina Ọ napụtara ụkwụ m n’ọnya. Tụgharịa mere m ebere n’ihina enweghị m onye enyemaka.    

EKPERE MMEGHE

 Nna I kuziri anyị ka anyị merie njọ site n’ ekpere na ebumọnụ nakwa n’ọrụ ebere. Mgbe anyị enweghizi agbamume, n’ ihi adighi ike anyị, nyeghachi anyị ike na ihunanya Gị. Site na Kristi Dịnwenu anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (Ọpụpụ: 3:1-8.13-15)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Mgbe Mosis na-echekwa igwe atụrụ ọgọ ya nwoke bụ Jetro, onye nchụaja nke Midian, o duuru igwe atụrụ ndị ahụ gaa n’akụkụ ọdịda anyanwụ ọzara wee garute na Họreb bụ ugwu nke Chineke. N’ebe ahụ ka mmụọọma nke Chineke bịakwutere ya n’ụdị ire ọkụ na-enwu n’ime ọhịa ma ọ naghị erepịa ahịhịa dị n’ọhia ahụ. Mosis wee kwuo sị, “Aga m agaru nso ma lee ihe ịtụnaanya nke a mere na ahịhịa ndị a dị n’ọhịa anaghị ere ọkụ.” Mgbe Chineke hụrụ ka ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, O si n’ime ọhịa ahụ kpọọ ya oku sị, “Mosis!, Mosis!” Ọ zara ya sị, “Anọ m ebe a.” Chineke asị ya, “Abịakwala nso; yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihina ebe I guzo bụ ala nsọ.” Chineke gwakwara ya sị, “Abụ m Chineke nke nna gị ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis were kpuchie ihu ya n’ihina egwu na-atụ ya ile Chineke anya n’ihu. Chineke gwara ya sị, “Ahụla m ahụhụ ndị nke m nọ n’Ijipt. Anukwala m mkpu akwa ha banyere ọnụ a na-echi ha n’ala. Abịala m ịzọpụta ha site n’aka ndị Ijipt, idupụta ha site n’ala Ijipt na iduba ha n’ala ọma ahụ, ala sara mbara, ala jupụtara na mmiri ara ehi na mmanụańụ. Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nke nnanna unu ha zitere m n’etiti ụnụ,’ ha jụọ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-agwa ha?” Chineke zara Mosis sị, “ABỤ M ONYE M BỤ.” Ọ gwakwara ya sị, “Gwa ụmụ Izrel nke a ‘Abụ m’ ziteere m unu. Chineke gwakwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel nke a, Dinwenụ, Chineke nke nnanna unu ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb, zitere m nye unu.’ Nke a bụ aha m ebeebe, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 03. ỤKA NKE ATỌ N’OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI, ARỌ NKE MBỤ (C)

2. ỤKA ABỤỌ N’OGE NCHETA AFỤFỤ KRISTI, AFỌ NKE ATỌ

O Dinwenu, Cheta obi ọmaiko Gị, na ihunanya ebere Gị, maka na ha dị bido na mbụ. E kwela ka ndị iro anyị gorie ebe anyị nọ. Zọpụta anyị, O Chineke nke ndị Izrel, na mkpagbu anyị niile.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye nyere anyị iwu ka anyị gee Nwa Gị ịhụrụ n’anya nti, biko ka ọmasị Gị, ịzụ anyị n’ime mmụọ site n’okwu Gị, ka site n’ime ka anya nke mmụọ dị ọcha, ka anyị ṅụrịa ihu ebube Gị. Site na Kristi Dinwenu  anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (Jenesis: 15:5-12. 17-18)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis

Okwukwe ndi agbụrụ ahọtara ahọta

Dinwenu kpọro Abram puta n’ezi sị ya: "Lelie anya n’igwe ma gụọ kpakpando dị na ya ọnụ, ọ bụrụ na ị nwere ike; otu a ka ụmụ ụmụ gị ga-adị. “Abram tụkwasara okwukwe ya na Chineke onye nke gụnyeere ya nke a dịka eziomume. Ọ sịrị ya, “Abụ m Osebụrụwa Chineke onye kpọpụtara gị site n’ala Ọọ nke Kaldia, inye gị ala a dịka oke nke gị.” Abram jụrụ ya sị “Onyenwe m Chineke, olee otu m ga-eji mara na m ga-eketa ya?” Ọ gwara ya sị, “Wetere m otu nwa ehi gbara afọ atọ, otu nne ewu gbara afọ atọ, otu ebule gbara afọ atọ, otu nwa nduru na otu kparakuku.” O wetaara ya ihe niile ndị a, gbubie ụmụ anụmaanụ ndị ahụ abụọ abụọ ma dobe otu isi n’ihu ibe ya; ma o kewaghị ụmụnnụnụ abụọ ndị ahụ. Mgbe ọbụla ụmụnnụnụ fedara bịa iri ozu anụ ndị ahụ, Abram achụfuo ha. Ugbu a, ka anwụ na-ada egwu jidere Abram, o wee daa na nnukwu ụra. Mgbe anwụ dara, ọchịchịrị gbaa, ite ọkụ nke na-eku anwụrụ ọkụ, na mpanaka ọkụ ya na-enwu enwu gafere n’etiti ụzọ anụ abụọ ndị ahụ. N’ụbọchị ahụ Chineke na Abram gbara ndụ n’ụdị okwu ndị a! “Ụmụụmụ gị ka m ga-enye ala site n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu ahụ, iyi Yufretes.

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI, ARỌ NKE MBỤ (C)

01. ỤKA NKE MBỤ N’OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI, ARỌ NKE ATỌ (C)

UKWE MBATA

Mgbe ọ kpọkuru m, a ga m aza ya; a ga ga m azọpụta ya ma nye ya ebube, a ga m eme ka ubochị ndụ ya dị ogologo.

EKPERE MMEGHE

Mee, Chineke ji ike niile, ka site na-isonye n’emume nke Lenti kwa arọ, ka anyị na eto na-ịghọta maka akụ n’ụba ezoro n’ime Kristi wee jịrị omume tosiri etosi na-achusi inweta elele ya ike. Site Kristi Dịnwenu anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (Diuterọnọmi 26:4-10)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Nkwuputa nke okwukwe ndị nke Chukwu.

Moses gwara ndị mmadụ sị: “Onye ụkọchukwu ga-anarakwa gị abọ ahụ, dọba ya n’ihu ebe nchụaja nke Dinwenu bụ Chineke gị. Mgbe ahụ, n’ihu Dinwenu, ị ga-ekwu okwu ndị a sị, ‘Nna nna m bụ onye Aramea nke wagharịrị oke mwagharị na ndụ ya. Ya na ezinụụlọ ya jere n’Ijipt, wee biri n’ebe ahụ dịka onye ọbịa. Ha dị mmadụ olemaole mgbe ha jere n’ebe ahụ. Ma ha mechara ghọọ nnukwu obodo nke dị ike, nke bakwara ụba mmadụ. Ndị Ijipt mesiri anyị ike, jirikwa mmegbu nye anyị ọrụ dịka ohu. Anyị wee tikuo Dinwenu bụ Chineke nnanna anyị ha. O wee nụlụ olu anyị, hụ nleda anya nke ha ledara anyị, na ndọgbu ha na-adọgbu anyị n’ọrụ na mmegbu ha na-emegbu anyị. O jiri ike aka dị egwu zọpụta anyị n’Ijipt. Ọ rụkwara ọtụtụ ihe ịrịbaama, na ọrụ ebube dị icheiche. O mekwara ka ọtụtụ ihe egwu mee n’Ijipt. Ọ kpọbatara anyị n’ala nke a mmiri araehi na mmanụaṅụ juru eju. Ma ugbu a, ana m ewetara Chineke mkpụrụ mbu nke mipụtara n’ala. Mgbe ahụ, ị ga-adọbakwa abọ ahụ n’ihu Chineke, wee kpọọrọ ya isiala n’ebe ahụ.            

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 01. ỤKA NKE MBỤ N’OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI, ARỌ NKE ATỌ (C)