Sunday readings in Igbo language for Easter, Yaer C

1. Ihe gg nke Mb

Ihe gg nke ewetara n'akwkwo Genesis (1:1-2:2)

Chineke hr ihe niile O kere, ma n'ezie ha niile d mma

N'isi mbido, Chineke kere elu na ala. Ugbu a ụwa enweghị ụdị nke ọ na-enwe ihe dị n'ime ya: itiri ọchịchịrị gbachitere n'elu ndagwurugwu ahu ebe mụọ Chineke nọ na-erughari n'elu mmiri ndị ahụ.

Ya bụ e kechara Eluigwe na ụwa na ihe niile dị n'ime ya. Ka Chineke rụchara ọrụ okike nke ọ na-arụ, o zuru ike n'ụbọchị nke asaa. Chineke gọziri ụbọchị nke assa ahụ bịakwa doo ya nsọ, n'ihina ụbọchị ahụ, Chineke zuru ike mgbe ọ rụchara ọrụ okike ya. Nke a bụ usoro akụkọ Eligwe na ụwa dịka e si kee ha.

N'oge ahụ, mgbe Yahweh Chineke kechara Eligwe na ụwa, enweghị nnukwu oke ọhịa ọbụla n'elu ụwa nke a na-enwe nnukwu oke osisi toliterenụ, n'ihina Osebụrụwa Chineke ezitebeghị mmịrị ozizo n'elu ụwa, nke a na-enwe mmadụ nwere ike ịkọ ihe ubi n'oge ahụ. Kama mmịrị si n'ime ala ahu na-agbapụta bịara gbasaa n'elu ala ahụ niile. Yahweh Chineke abịa si n'ụrọ ala ahụ kpụọ mmadụ, bịakwa fụnye ikuku ndụ n'imi ya; mmadụ ahụ we ghọọ onye dị ndụ.

Yahweh Chineke wuru ogige n'Eden, nke dị n'ofe ọwụwa anyanwụ; ọ bu n'ebe ahụ ka o mere ebe obibi mmadụ ahụ o kere. Yahweh Chineke mere ka osisi dị icheiche dị mma ile anya ma dịkwa mma oriri si n'urọ ala ahụ toputa; o mere ka osisi nke na-enye ndụ nakwa osisi nke imata iheọma na nke ọjọọ dịrị n'etiti ogige ahụ.

Otu iyi si n'Eden agbapụta na-gbasa mmiri n'ogige ahụ. O sikwara nebe ahụ kewaa onwe ya, ghọọ ụzọ iyi anọ. A kpọrọ nke mbụ n'ime ha Pishịọn, nke sọọrọ gazuo gburugburu ala Havila ebe e nwere ọlaedo. Ọlaedo si n'alaa dị ezigbo ọcha; Budelium na okwute Oniks dịkwa n'ebe ahụ. Aha iyi nke abụọ bụ Gịhọn; Ọ bụ ya bụ nke na-agbasa na gburugburu ala Kush niile. Iyi nke atọ ka a na-akpọ Taigris, nke na-asọga n'ọwụwa anyanwụ nke obodo Asirịa. Iyi nke anọ bụ Yufretes.

Yahweh Chineke kpọorọ mmadụ ahụ bia nye ya ebe obibi n'ogige nke Eden ka ọ na-etize ala ya, nakwa echekwa ya. E mechara Yahweh Chineke enye nwoke ahụ iwu sị, “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị n'ogige a. Ma I gaghị ata mkpụrụ osiri nke si n'osisi nke na-enye amamihe, iheọma na nke ọjọọ, n'ihina ụbọchi ị tara ya, ị ga-anwụ”.

Yahweh Chineke sị, “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ naanị ya; aga m enye ya onye enyemaka”. Yahweh Chineke si n'ụrọ ala ahụ kpụpụta anụ niile bi n'ọhịa nakwa ụmụnnụnụ niile na-efe n'elu; ihe ndị a niile ka ọ kpọtaara nwoke ahụ ka ọ mara aha ọ ga-agụ ha; nke ọbula n'ime ha ga-aza aha nwoke ahu gụrụ ya. Nwoke ahụ nyere anụụlọ niile, ụmụnnụnu igwe niile na anụọhịa niile ndi ahụ aha; ma o nweghị onye enye maka tosiri etosi a chọtara nwoke ahụ. Ya mere, Yahweh Chineke ji mee ka nwoke ahụ rahụ oke ụra. N'oge o dị n'ụra ahụ, Yahweh amiri otu mkpịsị akụkụ ya bịa were anụ ahụ kpuchie oghere ebe ahụ o si weta ya. Yahweh Chineke ji mkpịsị akụkụ nwoke ahu ọ mịputara kputa otu nwaanyị nke ọ kpọtaara nwoke ahụ. Oge ahu nwoke ahụ ekwuo sị, “N'ikpeazụ, nke a bụ ọkpụkpụ si n'ọkpụkpụ m nakwa ahu si n'ahụ m; a ga-akpọ ya nwanyị n'ihi na  e siri na nwoke mepụta ya”. Nke a mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya bịa rapara n'ahụ nwunye ya ha abụo abụrụ otu ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ha enweghị ihere ọbụla n'etiti onwe ha.

Okwu nke Osebrwa

Ekele dr Chukwu.

Read more: : 01. ỤKA NCHE NKE EASTER