Sunday readings in Igbo language for Advent season, Yaer C

04. ỤKA NKE ANỌ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

UKWE MBATA (Is 45:8)

Ka eluigwe gbasa igirigi n’ala; ka urukpu zidata onye-ikpe-nkwumọtọ; ka ala meghee wee miputa onye-nzọpụta.

EKPERE MMEGHE

Anyi na-arịọ gi, O Chukwu, ka irunye grasịa gi n’ime obi anyi,  anyị bụ angel butere ozi, wee mara iwere ahụ nke Kristi nwa gi,  site n’afụfụ ya na obe ya wee bata n’otito nke mbilite n’onwu ya. Site na Kristi onye new anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (MAIKA 5:1-4)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye amụma Maika

1Ugbua e jirila mgbidi gbaa gi gburugburu. Ha e busola gi agha, ha ga-akụ onye ochichi nke Izrel mkpara na nti.

2Mana gi, Betlehem, Efreta, gi obodo kacha di nta na Juda, site na gi ka Onye ọchịchị nke Izrel n’ọdinihu ga-esi pụta, ọ bụ onye diiri site na mgbe ochie, dịrịkwa site na mbụ.

3Site n’ugbua gaba, Chineke ga-ahapụ ha rue mgbe nwanyị ahụ nke ime na-eme ga-amụ nwa ya. N’oge ahụ ka ndi agbụrụ ya ka di ndụ, ga-alaghachikwute Izrel.

4Ọ ga-ewere ọnọdụ ya, ma jiri ike na ebube aha nke Chineke zụọ ha. Ha ga-anọ n’udo n’ihina ebube ya ga-agbasa ruo n’akụkụ obodo a nile site na ugbua gaba n’ihu.

Okwu nke Osebruwa

Read more: : 04. ỤKA NKE ANỌ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

03. ỤKA NKE AtỌ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

UKWE MBATA

02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

UKWE MBATA

Ŋụriwa n’Osebruwa oge niile. Ka m gwa unu ọzọ, ŋụrịbanụ Osebruwa nọzị unu nso.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, lee ka ndi nke gi si were okwukwe na-atu anya maka oriri omụmụ nke nwa gi. Nyere anyị aka ka anyị nweta aŋụrị zuru oke nke nzọpụta ọ na-ewetara anyị. Biko, meek a anyị were aŋụrị na obi na-anụ ọkụ wee na-eme ya bụ emume oge niile. Site na---

IHE GG NKE MB (Zefanaya 3:14-18)

Ihe gg e wetara n’Akwkw Onye amma Zefanaya

Dinwenụ ga-eji nnukwu ukwe gorie na gị dịka ụbọchị emume.

Kwesie ukwe ike, gị ada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel!  Were obi gị niile ŋụrịa ma goriwe, gị ada Jerusalem! Dinwenụ akagbuola ikpe niile mara gị, Ọ chụpula ndịiro gị niile. Eze  Izrel bụ Dinwenụ nọ n’etiti gị, egwu ihe ọjọo ọbụla agaghị atụ gị ọzọ. N’ụbọchị ahụ a ga-agwa Jerusalem sị: “egwu atụla gị, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. Dinwenụ Chukwu gị nọ n’etiti gị, odogwu na-enye mmeri; ọ ga-eji obiụtọ ŋụrịa na gị, ọ ga-emekwa ka ị dị ọhụrụ n’ịhụnaanya ya, ọ ga-eji nnukwu ukwe gorie na gị dịka ụbọchị emume.

Okwu nke Oseburwa

Read more: : 02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

01. ỤKA NKE MBỤ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)

UKWE  MBATA (Ps 25:1-3)

N’ebe I nọ kam welitere mkpụrụobi m, O Chukwu, n’ebe I nọ kam timyere nchekwube. Ekwela ka ndi iro m jiri m mere ihe ọchị, n’ihi na ndi ji nchekwube atụ anya n’aka Gi ka uche gi mee, agaghi enwe ihere.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu puru ime ihe niile, biko, bawanye n’ime anyị, mmụọ nke ịrụ ezi-ọrụ; ka anyị wee tosi etosi izuta Kristi Nwa gi n’ọbịbịa ya, wee tosikwa ịbụ ndi ọ ga-edobe nso n’akụkụ ya n’alaeze eluigwe. Site na Dinwenu…

IHE GG NKE MB (Jeremaya 33:14-16)

Ihe gg e wetara nAkwkw Onye amma Jeremaya

Aga M eme ka Alaka nke eziomume puoro David

14Dịnwenu kwuru sị: Lee oge na-abịa, mgbe M ga-emejupụta  nkwa M kwere ezinụụlọ  Izrel na Juda.

15N’ụbọchị ndị na-abịa  n’oge ahụ, aga M eme ka Alaka nke eziomume puoro David. Ọ ga-emekwa ka ikpe nkwụmọtọ na eziomume dị n’ala ahụ.

16N’ụbọchị ndị ahụ a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa ndụ na nchedo n’enweghị nsogbu.  Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, “Dịnwenu bụ ịkwụba aka ọtọ anyị”.

Okwu nke oseburwa

Read more: : 01. ỤKA NKE MBỤ N’OGE OLILEANYA NZỌPỤTA (C)