Sunday readings in Igbo language for Christmas season, Yaer C

MMIRICHUKWU JESU KRISTI (C )

UKWE MBATA

Mgbe e mechara Dinwenụ mmirichukwu, eluigwe meghere, Mmụọ Nsọ wee dakwasara Ya n’ụdị nduru. Mgbe ahụ olu Nna dara ka egbe igwe sị: ‘Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya na-amasị M.

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile dị ebeebe, Onye, mgbe emechara Kristi mmiri Chukwu na orimiri Jodan na ka Mmụọ Nsọ dakwasara Ya kwụpụtara na ọ bụ Nwa Gị ịhụrụ n’anya, mee ka ụmụ Gị site na mgbaputa, ndị amụnworo site na mmịrị na Mụọ Nsọ, bụrụ ndi ihe ha gana-amasị Gị oge niile. Site na Kristi Dịnwenu anyị.

IHE GG NKE MB (AZAYA 40:1-5.9-11)

Ihe gg e wetara n’Akwkw Onye amma Azaya

Dozienu z Oseburuwa

1Oseburuwa kwuru si: kasie ndị nke m obi, kasienu ha obi.

2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya na ụbọchi ịgba ohu ya agwụla, na a gbagharala mmehie ya niile, na Chineke ga-enye mgbaghara ga-adị mmaji abụọ karịa mmehie niile o mere.

3Otu olu na-eti mkpu na-asị, “Dozierenu Dinwenu ụzọ ya, mekwanu ka ụzọ niile dị n’ime ọzara di larịị maka Chineke anyị.

4Kpojuonu ndagwurugwu niile, kposakwaanu ugwu niile, menu ka ebe niile gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ, meekwanu ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.

5Mgbe ahụ ebube nke Chineke ga-achawapụta, mmadụ niile ga-ahụ ya n’ihina Oseburuwa ekwuola ya.”

9Rịgoro n’elu ugwu, gị bụ onye ozi nke Zayọn, welie olu gị elu tisie mkpu ike, O onye ozi nke Jerusalem, tisie mkpu ike atụla egwu, gwa obodo niile nke Juda sị: “Leenu Chineke unu!”

10Lee, Oseburuwa Chineke anyị ji ike abịa, ọ ga-eji aka ya na-achị. Ọ ga-enye onye ọbụla ihe ruru ya. Dika onye ncheatụrụ,

11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya nri. Ọ ga-eji aka ya na-edu ụmụatụrụ ya. Ọ ga-ebu ha n’ubu ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.”     

Okwu nke Oseburwa.

Read more: : 05. MMIRICHUKWU JESU KRISTI (C )

04. ỤKA EZINAỤLỌ DI ASỌ (C)

UKWE MBATA

Ndị ncheatụrụ gara ọsịsọ, ha hụrụ Marịa na Josef na Nwata ahụ ka o dina n’elu ihe eji adọba nrị anụụlọ.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye ọmasịrị inye anyị ihe ọmụmatụ na-amụkesi na ndụ ezinụlọ dị asọ, site n’amara Gị, mee ka anyị na-eṅomi ha site na-imeputa n’omume anyị ezigbo ntọala nke ndụ ezinụlọ na n’ime njịkọ nke ịhunanya, n’anụrị nke ụlọ Gị, ma nụrịa otu ụbọchị na ndụ ebebe Ị ga-eji kwụọ anyị ụgwọ. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ ( Sirack 3:2-6.12-14)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Sirack

Onye ọbụla na-atu Dinwenu egwu, na-asọpụrụ ndi mụrụ ya.

Dinwenu enyela nna ike n’ebe ụmụ ya nọ; tinyerekwa ụmụ iwu idi na asọpụrụ nne ha. Onye ọbụla na-asọpụrụ nna ya na-akwụkwa ụgwọ njọ ya. Onye ọbụla na-asọpụrụ nne ya dịka onye na- akpakọta akụnụụba. Onye ọbụla na-asọpụrụ nna ya, ụmụ nke ya ga-eme ya obiụtọ, a ga-anụ arịrịo ya mgbe o kpere ekpere. Onye ọbụla na-enye nna ya ugwu ga-enwe ogologo ndụ, onye ọbụla na-akpachapụrụ nne ya anya, na-egosi nrubeisi n’ebe Chineke nọ. Nwa m, nyere nna gị aka mgbe ọ bụ okenye, emekwala ya ihe arịrị na ndụ ya niile. Ma ọbụladị na uche ya ezughị ezu, jiri nghọta na ndidi sobe ya, elelikwala ya n’okorobịa gị. Maka na a gaghị echefu iheọma e mere nna, ọ ga-ewetara gị mgbaghara maka njọ.

Okwu nke oseburụwa.

Read more: : 04. ỤKA EZINAỤLỌ DI ASỌ (C)

03. ỤKA UBOSI CHRISTMAS (C)

UKWE MBATA

A mụtaara anyị Nwa nwoke. Nwa nwoke ka e nyere anyị: Onye ike ọchịchị niile nọ n’ubu aka ya. Aha a ga-akpọ Ya bụ: Onyeozi Ndụmọdụ dị ukwu.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye were ebube kee ugwu mmadu ma gbapụtakwa ya n’ụzọ ka ịtụnanayaazu, mee, anyị arịọ Gị, ka anyị keta oke ị bụ Chukwu nke Kristi, Onye weturu onwe Ya ala wee keta oke na I bu mmadu nke anyị bụ.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 52:7-10)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

Akụkụ ụwa niile ga-ahụ mgbapụta nke Chineke anyị. 

Lee ka o siri maa mma n’elu ugwu, bụ ụkwụ nke onye ahụ na-eweta ozi ọma, onye na-eweta udo, onye na-ekwu maka nzọpụta na-agwa Zayọn sị, ‘Chukwu gị bụ Eze.’ Lee ndị nche gị na-ewelite olu, ha ejikọta ọnụ kwee ukwe ọńụ n’ihi ha ejila anya ha hụ Chineke m ka ọ na-alaghchị na Zayọn. Kwekọtanụ ukwe ọńụ, unu obodo Jerusalem tọgbọrọ n’efu n’ihina Dinwenu agbaala ndị nke ya ume, ọ zọpụtala Jerusalem. Dinwenu emegheela aka ya dị nsọ n’ihu mba niile, nsọtụ ụwa niile ga-ahụ mgbapụta nke Chineke anyị. 

Okwu nke oseburụwa.

Read more: : 03. ỤKA UBOSI CHRISTMAS (C)

02. ỤKA NKE CHI OBUBO (C)

UKWE MBATA

Taa, ihe ga-achakwasa anyị, maka na-amụrụ anyị Dinwenụ. A ga-akpọ Ya Chineke dị Ebube, Nwaeze Udo, Nna nke agbụrụ na-abịanụ: ọchịchị Ya agaghị enwe njedebe.

EKPERE MMEGHE

Mee, anyị arịọ, Chineke ji ike niile, ka etu a asagọrọ anyị ahụ site na mmuke ọh+ụrụ nke okwu emere ahụ, ka ihe nke okwukwe, nke na-achake echiche anyị, pụtakwazi ihe n’omume anyị.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 62:11-12)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

Lee, onye nzọpụta unu na-abịa

Lee, Dinwenụ ekwupụtala na ngwụcha akụkụ ụwa niile: gwa ada Zayọn, lee onye nzọpụta gi na-abịa, o ji ụgwọ ọrụ ya na-abịa, nkwụghachi ụgwọ ọrụ ya dị ya n’aka. A ga-akpọ ha ndị nsọ, ndị Dinwnụ gbapụtara. A ga-akpọ gị onye Chineke họpụtaara onwe ya, ‘Obodo a na-echefughị echefu’.

Okwu nke oseburụwa.

Read more: : 02. ỤKA NKE CHI OBUBO (C)

01. ỤKA ETITI ABALI

UKWE MBATA

Dinwenu gwara m sị: “Ị bụ Nwa M. Ọ bụ m mutara Gị taa.”

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye mere abanị a kasị nsọ ka ọ na amụkesi site n’ebube nke ezigbo ìhè. Mee, anyị na arịọ, ka anyị bụ ndị mara ihe omimi ìhè nke ụwa ṅụrịa n’ime aṅụrị ya n’eluigwe. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 9:1-7)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

E nyere anyị otu nwa nwoke.

Ndị na-aga ije n’ọchịchịrị ahụla nnukwu ìhè; Ndị bị na ndo nke ọnwụ, ìhè achakwasala; Ị mekwaala ka ańụrị ha dị ukwuu; I meela ka ańụrị ha bawanye. Ha ga-enwe ańụrị n’ihu gị dịka ha si enwe ọńụ n’oge owuwe ihe ubi, ya na otu ndị mmadụ si enwe ọńụ mgbe ha na-eke ihe ha lụtara n’agha. Ị kụjiela ịnyagba na-anyịgbu ya, na mkpara nke a na-akụ ya n’ubu, na mkpara igwe nke ndị na-emesi ya ike, dịka ọ dị n’ụbọchị nke ndị Midian. Akpụkpọ ụkwụ ọbụla ndịagha ji zọpịasịa ihe n’ọgbọ agha ma uwe a tụrụrụ n’ọbara, ha niile ga-abụ ihe a gbara ọkụ. N’ihina a mụpụtaara anyị otu nwa, e nyekwara anyị otu nwa nwoke; ọchịchị ga-abụkwa nke ya, aha a ga-akpọkwa ya bụ ‘Onye ndụmọdụ dị ebube, Chineke nke bụ dịke, Nna dị Ebeebe, Eze nke Udo. Ọ ga-achị n’ocheeze Devid; ọchịchị ya na udo nke ọ ga-enye agaghị enwe njedebe. Alaeze ya ga-akwụdosike n’ikpe nkwụmọtọ na eziomume bido ugbu a ruo mgbe ebeebe. Mmụọ ịnụ ọkụ nke Dinwenụ nke igwe ndịagha ga-emejupụta ihe ndị a.

Okwu nke oseburụwa.

Read more: : 01. ỤKA ETITI ABALI (C)