01. ỤKA ETITI ABALI

UKWE MBATA

Dinwenu gwara m sị: “Ị bụ Nwa M. Ọ bụ m mutara Gị taa.”

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye mere abanị a kasị nsọ ka ọ na amụkesi site n’ebube nke ezigbo ìhè. Mee, anyị na arịọ, ka anyị bụ ndị mara ihe omimi ìhè nke ụwa ṅụrịa n’ime aṅụrị ya n’eluigwe. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 9:1-7)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

E nyere anyị otu nwa nwoke.

Ndị na-aga ije n’ọchịchịrị ahụla nnukwu ìhè; Ndị bị na ndo nke ọnwụ, ìhè achakwasala; Ị mekwaala ka ańụrị ha dị ukwuu; I meela ka ańụrị ha bawanye. Ha ga-enwe ańụrị n’ihu gị dịka ha si enwe ọńụ n’oge owuwe ihe ubi, ya na otu ndị mmadụ si enwe ọńụ mgbe ha na-eke ihe ha lụtara n’agha. Ị kụjiela ịnyagba na-anyịgbu ya, na mkpara nke a na-akụ ya n’ubu, na mkpara igwe nke ndị na-emesi ya ike, dịka ọ dị n’ụbọchị nke ndị Midian. Akpụkpọ ụkwụ ọbụla ndịagha ji zọpịasịa ihe n’ọgbọ agha ma uwe a tụrụrụ n’ọbara, ha niile ga-abụ ihe a gbara ọkụ. N’ihina a mụpụtaara anyị otu nwa, e nyekwara anyị otu nwa nwoke; ọchịchị ga-abụkwa nke ya, aha a ga-akpọkwa ya bụ ‘Onye ndụmọdụ dị ebube, Chineke nke bụ dịke, Nna dị Ebeebe, Eze nke Udo. Ọ ga-achị n’ocheeze Devid; ọchịchị ya na udo nke ọ ga-enye agaghị enwe njedebe. Alaeze ya ga-akwụdosike n’ikpe nkwụmọtọ na eziomume bido ugbu a ruo mgbe ebeebe. Mmụọ ịnụ ọkụ nke Dinwenụ nke igwe ndịagha ga-emejupụta ihe ndị a.

Okwu nke oseburụwa.

ABỤỌMA NA AZIZA (Abụ 95:1-3.11-13 (Az. Lk 2:11)

Azịza: Taa, a mutagoro anyị Onye Nzọpụta: Ọ bụ Kristi Dinwenu

  1. Kwerenu Oseburụwa ukwe ọhụrụ. Mba niile, kweerenu Oseburụwa ukwe. Bụwaranụ Ya abụ, gọzienụ aha Ya.(A)
  2. Kwupụtanụ enyemaka Ya kwa ụbọchị niile; Gwanụ mba niile maka  otito Ya; Gwanụ mmadụ niile ọrụ ịtụnanya Ya.(A)
  3. Ka ihe niile nọ n’igwe na n’ụwa ńụrịwa; ka osimiri na ihe niile bi n’ime ya were oke olu tie mkpu ọńụ. Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịbanu, Ka osisi niile dị n’ọhịa tie mkpu nke ańụrị n’ihu nke Dinwenụ, maka na Ọ na-abịa, Ọ na-bịa ịchị ụwa niile (A )
  4. Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ were chị ụwa. Ọ ga-eji ezi okwu Ya wee kpee mmadụ niile ikpe.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ (Titus 2:11-14)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degara Taịtus

Chineke egosipụtala  ụwa niile amara Ya

Chineke egosipụtala amara ya iji wetara mmadụ niile nzọpụta. Amara ahụ na-akuziri anyị ka anyị jụ omume niile megidere ife Chineke, na ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa. Ka anyị na-ejide onwe anyị aka, na-ebi ndụ eziomume na ndụ ịtụ Chineke egwu n’ụwa a. otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị, bụ ọbịbịa nke otito nke Chineke anyị dị ukwu na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. O nyere onwe ya n’ihi anyị, iji zọpụta anyị na njọ niile, ka o wee wụchapụtara onwe ya ndị dị ọcha, ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi ime nyere eziomume.

Okwu nke Oseburụwa.

MBEKU ( Lk 2:10-11)

Aleluya, Aleluya! Ewetaara m unu oziọma nke oke ọńụ: ụbọchị taa, a muuru unu onye nzọpụta, onye bụ Kristi Dinwenu. Aleluya.

OZIỌMA (Luk 2:1-14)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Taa, a mutagonu unu onye nzọpụta

N’oge ahụ Siza Ọgọstus nyere iwu ka e nwee ọnụọgụgụ mmadụ niile dị n’ụwa. Nke a bụ ọgụgụ mmadụ mbụ a gụrụ mgbe Kwirinus bụ onyeisi na-achị mba Siria. Mmadụ niile gara, onye ọbụla n’obodo nke ya, ka e deba aha ya n’akwụkwọ. Josef, n’otu aka ahụ, sikwara n’obodo Nazaret nke dị n’ala Galili gaa Judia, n’obodo nke Devid, a na-akpọ Betlehem, n’ihina o si n’ụlọ na agbụrụ Devide pụta. Ọ gara ka o dee aha ya na Marịa n’akwụkwọ, onye ọ ga-alu, bụ onye dịkwa ime. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ime bidoro mebe Marịa. Ọ mụtara nwanwoke mbụ ya, were akwa fụchie ya, yibe ya n’elu ihe e ji adọba nri anụụlọ, n’ihina ohere apụtarịghị ha n’ụlọ ndị ije. Ụfọdụ ndị ncheatụrụ nọ n’ọhịa n’otu akụkụ ala ahụ, na-eche igwe atụrụ ha nche n’abanị. Otu Mmụọọma nke Dinwenụ bịakwutere ha, ebube nke Dinwenụ chawapụtara gburugburu ha. Ụjọ wee jide ha. Mmọọma ahụ sịrị ha, ‘Ụjọ atụla unu; n’ihina ewetaara m unu oziọma nke oke ọńụ, nke ga-adịrị mmadụ niile; n’ihina ụbọchị taa, a mụụrụ unu onye nzọpụta, onye bụ Kristi Dinwenụ. Nke a ga-abụrụ unu ihe nrịbaama; unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e ji akwa fụchie, nke dina n’ihe e ji adọba nri anụụlọ.’ Na mberede, igwe ndị Mmụọọma ahụ, nke eluigwe bịara nọnyere Mmụọọma ahụ, na-eto Chineke na-asị ‘Otito dịrị Chineke n’elu kacha elu, n’ụwa, udo dịrị ndị mmadụ ndị ihe ha na-asọ Chukwu.’

Oziọma nke Oseburụwa.

EKPERE NHUNYE

Ka ihe nhunye nke ọrịrị ubọchị taa masị Gị ịnaranụ, Ọ Dinwenụ, anyị na arịọ Gị, ka site na mgbanwọ a kasị nsọ ka afụta n’ime anyị oyiyi Kristi, onye anyi sin a Yak eta oke n’udo Gị. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Okwu emere ahụ, Anyị a hụgo otito Ya.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Nye anyị, anyị arịọ Gị, O Dinwenụ, ka anyị bụ ndị na-anụrị maka isonye n’ọrịrị nke ọmụmụ Onye mgbapụta anyị, site na ndụ dị ọgọ wee tosi k’anyI na Ya bụrụ otu.Site na Kristi Dịnwenụ anyị.