02. ỤKA NKE CHI OBUBO (C)

UKWE MBATA

Taa, ihe ga-achakwasa anyị, maka na-amụrụ anyị Dinwenụ. A ga-akpọ Ya Chineke dị Ebube, Nwaeze Udo, Nna nke agbụrụ na-abịanụ: ọchịchị Ya agaghị enwe njedebe.

EKPERE MMEGHE

Mee, anyị arịọ, Chineke ji ike niile, ka etu a asagọrọ anyị ahụ site na mmuke ọh+ụrụ nke okwu emere ahụ, ka ihe nke okwukwe, nke na-achake echiche anyị, pụtakwazi ihe n’omume anyị.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 62:11-12)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

Lee, onye nzọpụta unu na-abịa

Lee, Dinwenụ ekwupụtala na ngwụcha akụkụ ụwa niile: gwa ada Zayọn, lee onye nzọpụta gi na-abịa, o ji ụgwọ ọrụ ya na-abịa, nkwụghachi ụgwọ ọrụ ya dị ya n’aka. A ga-akpọ ha ndị nsọ, ndị Dinwnụ gbapụtara. A ga-akpọ gị onye Chineke họpụtaara onwe ya, ‘Obodo a na-echefughị echefu’.

Okwu nke oseburụwa.

ABỤỌMA NA AZIZA (Abụ 96:1.6.11-12)

Azịza: Taa ihe ọhụrụ ga-achakwasị ụwa: a mutagoro anyị Dinwenu.

  1. Onyenweanyi bụ eze, ka ụwa ńụrịa ọńụ; ka akụkụ osimiri niile sorokwa ńụrịa. Eligwe na-ekwupụta ikpe nkwụmọtọ Ya; mba niile na ahụkwa otito ya (A)
  2. Ihe na- achakwasị ndị na-akwụba aka ha ọtọ. ańụrị na-adịrị ndị obi ha dị ocha. Ňụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume, tookwanụ aha ya dị nsọ.(A)

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ (Titus 3:4-7)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degara  Taịtus

Ọ bụghị n’ihi ihe ọbula, karia ebere ya ka o jiri zọpụta anyị

Mgbe obiọma na ịhụnaanya nke Chineke, bụ onye Nzọpụta anyị pụtara ihe, ọ zọpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ ndị anyị rụrụ, kama, ọ bụ site n’ebere ya, site na nsacha nke ọbara ya, nke Mmụọ Nsọ o ji amụ anyị ọzọ na nke o ji enye anyị ndụ ọhụrụ. O nyere anyị Mmụọ Nsọ ahụ n’uju site n’onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. Chineke mere nke a ka o nwee ike isi n’amara ya gụnye anyị na ndị eziomume, ka anyi nwee ike iketa ndụ ebeebe anyị na-ele anya ya.

Okwu nke Oseburụwa

MBEKU ( Lk 2:14) Aleluya, Aleluya! ‘Otito dịrị Chineke n’elu kacha elu, n’ụwa, udo dịrị ndị mmadụ ndị ihe ha na-asọ Chukwu.’ Aleluya.

OZIỌMA (LUK 2:15-20)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ndi ncheatụrụ ahụ hụrụ maria na Josef na nwata ahụ

Mgbe ndị Mmụọọma ahụ siri n’ebe ha nọ pụọ, laghachi n’eluigwe ndị ncheatụrụ ahụ gwakọrịtara onwe ha sị, ‘Ka anyị gaanụ Betlehem gaa hụ ihe a merenụ, nke Dinwenu merela ka anyị mata.’ Ha gara ọsịsọ hụ Maria na Josef na nwa ahụ ka o dina n’elu ihe e ji adọba nri anụụlọ. Mgbe ndị ncheatụrụ a hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha gbasara nwatakịrị a; akụkọ ndị ncheatụrụ a kọrọ tụrụ ndị niile nụrụ ya n’anya, ma Marịa dobere okwu ndị a niile, na-atụghari ha n’ime obi ya. Ndị ncheatụrụ a laghachiri ebe ha na-azu atụrụ na-eto ma na-ajakwa Chineke mma n’ihe niile ha nụrụ na nke ha hụrụ mezuru dịka Mmụọọma gwara ha.

Oziọma nke Oseburụwa.

EKPERE NHUNYE

Ka onyinye anyị taa bụrụ ihe tọsịrị etosi, anyị arịọ Gị, Ọ Dinwenụ, nke ihe omimi nke omumu Gị…ka etu a esi mụọ Kristi dika mmadụ, Ọ chawaputa dika Chukwu, ka onyinye nke uwa a nye anyị ihe nke mụọ.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Nụrịa! O Ada Zion; welite olu otito, Ada Jerusalem: Lee, Eze Gị ga-abịa, Onye di nsọ na Onye nzọpụta nke uwa.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Mee, anyị na-arịọ Gị, Dinwenụ, ka anyị jị ofufe anụrị akwanyere ọmụmụ Nwa Gị ugwu, ka anyị bịa mara site n’okwukwe zụrụ oke, ihe omimi a ezoro ezo ma na-afụwanye Ya n’anya.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị.