03. ỤKA UBOSI CHRISTMAS (C)

UKWE MBATA

A mụtaara anyị Nwa nwoke. Nwa nwoke ka e nyere anyị: Onye ike ọchịchị niile nọ n’ubu aka ya. Aha a ga-akpọ Ya bụ: Onyeozi Ndụmọdụ dị ukwu.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye were ebube kee ugwu mmadu ma gbapụtakwa ya n’ụzọ ka ịtụnanayaazu, mee, anyị arịọ Gị, ka anyị keta oke ị bụ Chukwu nke Kristi, Onye weturu onwe Ya ala wee keta oke na I bu mmadu nke anyị bụ.

Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (AỊZAYA 52:7-10)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Onye Amụma Aịzaya

Akụkụ ụwa niile ga-ahụ mgbapụta nke Chineke anyị. 

Lee ka o siri maa mma n’elu ugwu, bụ ụkwụ nke onye ahụ na-eweta ozi ọma, onye na-eweta udo, onye na-ekwu maka nzọpụta na-agwa Zayọn sị, ‘Chukwu gị bụ Eze.’ Lee ndị nche gị na-ewelite olu, ha ejikọta ọnụ kwee ukwe ọńụ n’ihi ha ejila anya ha hụ Chineke m ka ọ na-alaghchị na Zayọn. Kwekọtanụ ukwe ọńụ, unu obodo Jerusalem tọgbọrọ n’efu n’ihina Dinwenu agbaala ndị nke ya ume, ọ zọpụtala Jerusalem. Dinwenu emegheela aka ya dị nsọ n’ihu mba niile, nsọtụ ụwa niile ga-ahụ mgbapụta nke Chineke anyị. 

Okwu nke oseburụwa.

ABỤỌMA NA AZIZA (ABỤ 97:1-6 R.V.3)

Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị

  1. Kweerenụ Dinwenụ ukwe ọhụrụ n’ihi na ọ rụọla ọrụ ebube. Aka nri Ya na ogwe aka Ya dị nsọ ewetala nzọpụta. (A)
  2. Onyenweanyị emeela ka a mata nzọpụta Ya. O gosịla ụwa niile ikpe nkwụmọtọ Ya. O chetala ezi okwu na ịhụnanya O nwere maka ụlọ Izrel.(A)
  3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. Ụwa niile, tierenụ Onyenweanyị mkpu ọńụ. Kwupụtanụ na obi unu otito ya. (A)
  4. Werenu ụbọ akwara bụọrọ Dinwenu abụ ọma; werenu ụda egwu. Fụọnụ opi ike, gbuonụ ụja, toonu Dinwenụ na Eze anyị. (A)

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ (NDỊ HIBRU 1:1-6)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ Ozi e degara Ndị Hibru

Chineke a gwala anyị okwu site na nwa ya.

N’oge ochie, Chineke sitere n’ụzọ dị icheiche gwa nna anyị ha okwu site n’ọnụ ndiamụma; mana n’oge nke anyi n’ọgwụgwụ oge ndị a, ọ gwala anyị okwu site na nwa ya, onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ onye nketa nke ihe niile, onye o si na ya kee ụwa. Ọ na-achawapụta otito nke Chineke na akara nke ụdị ya, site n’ike nke okwu ya ka o ji jide ụwa. Mgbe ọ sachapụchara njọ, ọ nọdụrụ n’aka nri nke onye kacha elu. Ugbu a ọ bụ onye dị elu karịa ndị mmụọọma dịka aha o nwetara si karịa nke ha elu. Olee mmụọọma Chineke gwarala sị, ‘Ị bụ nwa m, taa amụtara m gị’ mọbụ, ‘Aga m abụ nna ya, ya onwe ya ga-abụkwa nwa m. Ọzọkwa, mgbe o zitere nwa ya n’ụwa, o kwuru sị, ‘Ka ndị mmụọọma Chineke niile kpọọrọ ya isiala.

Okwu nke Oseburụwa.

MBEKU Aleluya, Aleluya! ‘Ụbọchị dị nsọ abịakwasịla anyị. Mba niile! Bịanụ sekpuoro Dinwenụ; N’ihi na taa, nnukwu Ihe achakwasala ụwa.’ Aleluya.

OZIỌMA (JỌN 1:1-18)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Okwu emere ahụ o wee binyere anyị.

Na mbụ tupu e kee ụwa, okwu ahụ dịrịị. Okwu ahụ na Chineke dịrịị. Okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke dịrịị site na mbụ. Site na ya ka Chineke siri kee ihe niile. E wezuga ya ọ dịghị ihe ọbụla e kere eke nke gaara adịnụ. N’ime ya ka ndụ dị. Ndụ ahụ bụkwa ihe nke ndị mmadụ. Ihe ahụ na-enwu n’ọchịchịrị, ma ọchịchịrị apụghị imenyu ya. Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgba ama, ịgbara ihe ahụ akaebe, ka mmadụ niile site n’ihe ahụ kwere. Ya onwe ya abụghị ihe ahụ, kama ọ bịara ịgbara ihe ahụ akaebe. Ezi ihe ahụ nke na-enye mmadụ niile ihe na-abịa n’elu ụwa. Ọ nọrịị n’ụwa, site na ya ka e si kee ụwa; ma ụwa amataghị ya. Ọ biakwutere ndị nke ya, ma ha anabataghị ya.  Ma ndị niile nabatara ya, kwerekwa n’aha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ nke Chinkeke. Ha bụ ndị a mụrụ, ọ bụghị site n’ọbara nke ọ na-abụ site n’echiche nke mmadụ kama site na Chineke. Okwu ahụ bụụrụ mmadụ wee binyere anyị. O juputara n’amara na eziokwu. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke o nwere dịka sọọsọ otu Nwa nke Nna. Jọn gbara akaebe maka ya sị, ‘Onye na-esote m karịrị m, n’ihina o bu m ụzọ dịri.’ Site n’uju nke ya, anyị niile nwetara amara kwuru amara. Site n’aka Mosis ka e si nye iwu, ma amara na eziokwu sị na Jesu Kristi bịa. Ọ dịghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ọ bụ sọọsọ otụ nwa ahụ, onye bụ Chineke, onye nke ya na Nna nọ, mere ka a mara ya.

Oziọma nke Oseburụwa.

EKPERE NHUNYE

Nabata, O Dinwenụ, ihe nhunye anyị n’emume taa, mgbe ị gosịpụtara mkpezi ahụ mere ka anyị nwee mmasị zụrụ oke n’ihu Gị ma wubere anyị ofufe zụrụ oke. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Mee O Chineke di ebere, ka etu Onye Nzọpụta ụwa amụrụ taa si bụrụ isi agbụrụ nke Chukwu, ka ọbụrụkwa Onye ga-enye anyị ndu ebebe. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.