04. ỤKA EZINAỤLỌ DI ASỌ (C)

UKWE MBATA

Ndị ncheatụrụ gara ọsịsọ, ha hụrụ Marịa na Josef na Nwata ahụ ka o dina n’elu ihe eji adọba nrị anụụlọ.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, Onye ọmasịrị inye anyị ihe ọmụmatụ na-amụkesi na ndụ ezinụlọ dị asọ, site n’amara Gị, mee ka anyị na-eṅomi ha site na-imeputa n’omume anyị ezigbo ntọala nke ndụ ezinụlọ na n’ime njịkọ nke ịhunanya, n’anụrị nke ụlọ Gị, ma nụrịa otu ụbọchị na ndụ ebebe Ị ga-eji kwụọ anyị ụgwọ. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ ( Sirack 3:2-6.12-14)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ  Sirack

Onye ọbụla na-atu Dinwenu egwu, na-asọpụrụ ndi mụrụ ya.

Dinwenu enyela nna ike n’ebe ụmụ ya nọ; tinyerekwa ụmụ iwu idi na asọpụrụ nne ha. Onye ọbụla na-asọpụrụ nna ya na-akwụkwa ụgwọ njọ ya. Onye ọbụla na-asọpụrụ nne ya dịka onye na- akpakọta akụnụụba. Onye ọbụla na-asọpụrụ nna ya, ụmụ nke ya ga-eme ya obiụtọ, a ga-anụ arịrịo ya mgbe o kpere ekpere. Onye ọbụla na-enye nna ya ugwu ga-enwe ogologo ndụ, onye ọbụla na-akpachapụrụ nne ya anya, na-egosi nrubeisi n’ebe Chineke nọ. Nwa m, nyere nna gị aka mgbe ọ bụ okenye, emekwala ya ihe arịrị na ndụ ya niile. Ma ọbụladị na uche ya ezughị ezu, jiri nghọta na ndidi sobe ya, elelikwala ya n’okorobịa gị. Maka na a gaghị echefu iheọma e mere nna, ọ ga-ewetara gị mgbaghara maka njọ.

Okwu nke oseburụwa.

ABỤỌMA NA AZIZA (ABỤ 127:1-5 AZ 1)

Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụrụ Chukwu egwu na-eso uzo Ya.

  1. Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụrụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya. Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri. Ańụrị na aga m n’ihu ga-abụ nke gị.(A)
  2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mmịmị n’ime ụlọ gị, umu gị ga- agarube oche nri gị dịka ome osisi oliv.(A)
  3. Otu a ka a ga-esi gọzi onye na-atụrụ Chukwu egwu. Ka Dinwenụ si na Zayọn gọzie gị, ụbọchị ndụ gị niile .(A)

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ (KOLOSIA 3:12-21)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degara ndị  Kolosia

Ndụ ezi na ụlọ na-ebi n’ime Dinwenu

Dịka ndị Chineke họrọla, ndị dị nsọ, na ndị ọ hụrụ n’anya, yikwasanụ obi ebere, obioma, umeala, ịdị nwayọọ na ndịdị dịka uwe. Na- anagidenu ibe unu. Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere mkpesa megide ibe ya, gbagharanụ onwe unu. Dịka Onyenweanyị si gbaghara unu, unu kwesịkwara ịgbaghara onwe unu. Ma nke kacha ihe ndị a niile, yikwasanụ ịhụnaanya, nke na-ejikọta ihe niile ọnụ n’ịdịkọ n’otu nke zuru oke. Kweenụ ka udo nke Kristi na-enye na-achị n’obi unu, nke e si na ya kpọbata unu n’otu ahụ. Na-enyekwanụ ekele. Ka okwu nke Kristi biri n’ime unu n’uju ya. Werenụ amamihe niile na-akuzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụọma na ukwe nke mmụọ kweere Chineke ukwe ekele n’obi unu. N’ihe ọbụla unu na-eme, mọbụ okwu, mọbụ omume, meenụ ha niile n’aha nke Dinwenu Jesu. Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na ya. Ndị bụ nwunye, na-asọpụrụnụ di unu dịka o kwesịrị n’usoro nke Dinwenu. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, unu ejikwala akaike emeso ha omume. Ụmụ, na-eruberenu ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihina nke a na-amasị Dinwenu. Ndị mụrụ ụmụ, unu akpasula ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba.

Okwu nke Oseburụwa

OZIỌMA (Luk  2:41-52)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Kwa afọ, nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge emume ngabiga. Mgbe Jesu gbara afọ iri na abụọ, ya na nne na nna ya soro gaa dịka omenaala si dị; oge e mechara emume ahụ, ka ha na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jesu nọdụrụ na Jerusalem. Nne na nna ya amataghị. Ha chere na o sonyere n’etiti ndị mmadụ. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha bido chọba ya n’etiti ndị ikwuniibe ha na ndị ha mara. Mgbe ha na-achọtaghị ya, ha laghachiri azụ na Jerusalem na-achọgharị ya. Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha hụrụ ya n’ime ụlọnsọ Chineke, ka ọ nọ n’etiti ndị nkuzi na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. Nghọta na ọgụgụ isi o ji aza ajụjụ tụrụ ndị niile nụrụ okwu ya n’anya. Mgbe nne na nna ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha n’anya. Nne ya wee sị ya, ‘Nwa m, gịnị mere I ji mee mụ na nna gị otu a? Lee, mụ na nna gị na-achọgharị gị kamgbe.’ Ma ọ zara ha sị, ‘Gịnị ka unu na-achọgharịrị m, ọ bụ na unu amaghị na aga m anọrịrị n’ụlọ nna m na-arụ ọrụ.’ O soro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndị a niile n’obi ya. Jesu na-abawanye n’amamihe, na-agba dimkpa, ọ na-etolitekwa na mmasị nke Chukwu na mmadụ.

Oziọma nke Oseburụwa.

MBEKU (KOLOSIA 3:15.16) Aleluya, Aleluya! Ka udo nke Kristi na-enye na-achị n’obi unu, ka okwu nke Kristi biri n’ime unu n’uju ya.’Aleluya,

EKPERE NHUNYE

Anyị na-ehuyere Gị, Dinwenụ, aja nke mgbaghara, were umeala na-arịọ ka site na-ekpere nke Vegin Marịa Nne nke Chukwu na Josef dị asọ, ka Ị wube ezinụlọ anyị n’amara n’udo Gị. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Chineke anyị abịala n’ụwa, wee binyere anyị.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Nna kasị ebere, mee ka ndị Ị mere ka ha dị ọhụrụ site na Sakramentị eluigwe a, na-eṅomi mgbe niile ụkpụrụ nke ezinụlọ di asọ, ka ọ ga-abụ mgbe ọnwụnwa nke ụwa gachara, ka anyị keta oke na-ibinyere ha ebebe. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.