MMIRICHUKWU JESU KRISTI (C )

UKWE MBATA

Mgbe e mechara Dinwenụ mmirichukwu, eluigwe meghere, Mmụọ Nsọ wee dakwasara Ya n’ụdị nduru. Mgbe ahụ olu Nna dara ka egbe igwe sị: ‘Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya na-amasị M.

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile dị ebeebe, Onye, mgbe emechara Kristi mmiri Chukwu na orimiri Jodan na ka Mmụọ Nsọ dakwasara Ya kwụpụtara na ọ bụ Nwa Gị ịhụrụ n’anya, mee ka ụmụ Gị site na mgbaputa, ndị amụnworo site na mmịrị na Mụọ Nsọ, bụrụ ndi ihe ha gana-amasị Gị oge niile. Site na Kristi Dịnwenu anyị.

IHE GG NKE MB (AZAYA 40:1-5.9-11)

Ihe gg e wetara n’Akwkw Onye amma Azaya

Dozienu z Oseburuwa

1Oseburuwa kwuru si: kasie ndị nke m obi, kasienu ha obi.

2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya na ụbọchi ịgba ohu ya agwụla, na a gbagharala mmehie ya niile, na Chineke ga-enye mgbaghara ga-adị mmaji abụọ karịa mmehie niile o mere.

3Otu olu na-eti mkpu na-asị, “Dozierenu Dinwenu ụzọ ya, mekwanu ka ụzọ niile dị n’ime ọzara di larịị maka Chineke anyị.

4Kpojuonu ndagwurugwu niile, kposakwaanu ugwu niile, menu ka ebe niile gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ, meekwanu ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.

5Mgbe ahụ ebube nke Chineke ga-achawapụta, mmadụ niile ga-ahụ ya n’ihina Oseburuwa ekwuola ya.”

9Rịgoro n’elu ugwu, gị bụ onye ozi nke Zayọn, welie olu gị elu tisie mkpu ike, O onye ozi nke Jerusalem, tisie mkpu ike atụla egwu, gwa obodo niile nke Juda sị: “Leenu Chineke unu!”

10Lee, Oseburuwa Chineke anyị ji ike abịa, ọ ga-eji aka ya na-achị. Ọ ga-enye onye ọbụla ihe ruru ya. Dika onye ncheatụrụ,

11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya nri. Ọ ga-eji aka ya na-edu ụmụatụrụ ya. Ọ ga-ebu ha n’ubu ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.”     

Okwu nke Oseburwa.

ABỤỌMA NA AZZA (PS. 103:1-2.3-4.24-25.27-30.RV.1

Aziza: Gozie Onyenweanyi mkpụụobi m, Onyenweany Chineke, lekene ka I si di ukwu

Gozie Onyenweanyi mkpụrụobi m,

1. Onyenweanyị Chineke, lekene ka I si di ukwu;

I juputara n’ebube na otito, I ji ihe ekpuchi onwe gi dika akwa

I gbasara eluigwe dịka akwa ụlọikwu (A).

 

2. I wụkwasara obi gi na mmiri di elu,

I ji urukpu mere ịnyịnya igwe gi

I na-akparịkwa na nku oke ifufe

I na-eme ifufe ka ọ bụrụ onye na-ejere gi ozi

mekwaa ka amụma eligwe bụrụ odibo gi

 

3. Onyenweanyi, lekele ihe di icheiche I kere,

I ji amamihe wee dozie ihe nile;

ụwa juputara na ihe ikere, otu n’ihe I kere bụ osimiri basara abasa

nke juputara n’ọtụtụ ihe e kere eke, ma nnukwu ma obere.

 

4. Ihe nile ekere eke chekwubere na gi ka I zụọ ha nri

n’ogologo afọ I na-eweta nri ha na-eri

I ji obi ọma gi enyeju ha ncha afọ.

 

5. Ọ bụrụ na I zoo ihu gi, ha ga-ata ahụhụ

I kwụsị ha I ku ume, ha anwụọ

ma laghachịkwa n’etum.

Ọ bụrụ na I nye ikuku, ndụ ọhụrụ ebidokwa

I na-eme ụwa ka ọ di ọhụrụ mgbe niile.

 

IHE GG NKE ABỤỌ (TITUS 2:11-14, 3:4-7)

Ihe gg e wetara n’ Akwkw ozi Pl d as degara Tatus

Chineke egosiptala  wa niile amara Ya

11Chineke egosipụtala amara ya iji wetara mmadụ niile nzọpụta.

12Amara ahụ na-akuziri anyị ka anyị jụ omume niile megidere ife Chineke, na ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa. Ka anyị na-ejide onwe anyị aka, na-ebi ndụ eziomume na ndụ ịtụ Chineke egwu n’ụwa a.

13Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị, bụ ọbịbịa nke otito nke Chineke anyị dị ukwu na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi.

14O nyere onwe ya n’ihi anyị, iji zọpụta anyị na njọ niile, ka o wee wụchapụtara onwe ya ndị dị ọcha, ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi ime eziomume.

3:4Oge obiọma na ihunanya nke Chineke bụ onye nzọpụta anyị pụtara ihe,

3:5Ọ zụpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ ndi anyị rụrụ, kama, ọ bụ site n’ebere ya, site na nsacha nke ọbara ya, nke Mmụọ Nsọ o ji amụ anyị ọzọ na nke o ji enye anyị ndụ ọhụrụ.

3:6O nyere anyi Mmụọ Nsọ ahụ n’uju site n’onye nzọpụta anyị bụ Jesu Christi. 3:7Chineke mere nke a, ka o nwee ike isi n’amara ya gunye anyị na ndi eziomume, ka anyị nwee ike iketa ndụ ebighiebi anyị na-ele anya ya.

Okwu nke Oseburwa.

 

OZIMA (LUK 3:15-16,21-22)

Ihe gg nke a si n’Ozima d as nke Luk dere.

15Ebe ọ bụ na ndị mmadụ nọ n’olileanya, mmadụ niile na-atụgharị n’ime obi ha, ihe gbasara Jọn, na-ajụ mọbụ ya bụ Kristi ahụ.

16Jọn azaa ha sị, ‘Eji m mmiri, eme unu mmiri chukwu, ma onye ka m ike na-abịa, onye m na-etosighi ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu mmirichukwu.

21Mgbe Jọn mechara ndị niile nọ ebe ahụ mmirichukwu, na n’oge e mechara Jesu Mmirichukwu, Jesu nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere;

22Mmụọ Nsọ bịakwasa ya n’ụdị nduru. Olu siri n’eluigwe daa, sị ‘Ị bụ Nwa m; m hụrụ n’anya, ihe gị na-amasị m.

Ozima nke Oseburwa.

 

EKPERE NHUNYE

Nara, O Dinwenụ, aja anyị na-ebute maka nsọpụrụ nke mkpughe nke Nwa Gị I hụrụ n’anya, ka ihe nhunye nke ndi kwere na Gị bụrụ ihe a ga-agbanwo ka ọ bụrụ aja nke Ya, Onye Ọ bụ uche Ya isite n’obi omaiko Ya sachapụ njọ nke Ụwa.  Site na Kristi Dịnwenu anyị.

 

UKWE ORIRI NS

Lee Onye ahụ Jọn kwuru maka Ya sị: ‘Ahụla m, bịakwa gbaa akaebe na Onye a bụ Nwa Chineke.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Ka azụchara anyị site n’onyinye  ndia dị asọ, anyị ewere umeala rịọ ebere Gị, O Dinwenụ, ka anyị site na-ige sọ otu Nwa Gị nti, ka anyị bụrụ ụmụ Gị n’aha ma n’eziokwu. Site na Kristi Dịnwenụ anyị.