FRIDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Kristi hụrụ anyi na-anya, O werela ọbara ya sachapụ njọ anyi, O meela anyi ndi ụkọchukwu k'anyi fee Chukwu. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

 Nna, site n'ịbụli Kristi elu na site n'ịzitere anyị mmụọ Gị, Ị megherela anyị ụzọ nke ndụ ebebe, ka nketa oke anyị ketara site na onyinye Gị bawanye ịhụnaanya anyị ma mee ka okwukwe anyị sie ike. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ  

Ihe Ọgụgụ ewetara n' Akwụkwọ Ọrụ ndịozi (25:13-21)

Otu nwoke a na-akpọ Jesu, nke nwụrụ anwụ, onye Pọl na-ekwusi ike na ọ dị ndụ.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mgbe ụbọchị olemaole gachara, Agrịpa, bụ eze obodo, na Benaịsị nwunye ya, bịara ịnabata Festus. Mgbe ha nọrọ ebe ahụ, otụtụ ụbọchị, Festus tọgbọrọ okwu banyere Pọl n' ihu ha sị: “Otu nwoke nọ ebe a, onye Feliks hapụrụ n' ụlọ mkpọrọ. Mgbe ahụ m gara Jerusalem, ndị isi nchụaja na ndị Juu boro ya ebubo, rịọkwa ka m ma ya ikpe. Ma agwara m ha na ọ bughị omenaala ọchịchị ndi Rom i were maka ihu ọma were onye ọbụla a na-ebo ebubo nye ma ọ bụrụna ndị na ebo ya ebubo ebughị ụzọ, kpekọọ ikpe ihu na ihu, ma ọbụrụkwa na e bụghị ụzọ nye ya ohere, ka o kpee ọnụ ya. N' ihi nke a, mgbe ha biara n' ebe a, atufughi m oge ọbula, kama n' ụbọchi nke ọzọ, anọdụrụ m n' oche ikpe, inye ikikere ka a kpọbata nwoke ahụ. Ndị na-ebo ya ebubo biliri, ma ọ dịghi otu n' ime arụ ndị m chere ha ga-akpọ aha, nke ha gụpụtara na o mere; ihe ha nwere megide ya bụ naanị mgbagha okwu ụfọdụ ya na ha nwere banyere okpukpe ha, na otu nwoke a na-akpọ Jesu, nke nwụrụ anwụ, onye Pọl na-ekwusi ike na ọ dị ndụ. Emechara m nwee obi abụọ otu m ga-esi achọpụta eziokwu, na otu a ga-esi ebi ya bụ ikpe. N' ihi ha, ajụrụ m Pọl ma ọ ga-ekwe ịga Jerusalem, ka a nọrọ ebe ahụ dozie ikpe ya.Pọl jụrụ ajụ. Ọ rịoọ ka m dobe ya n' ụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza Ọgọstus, eze Rom n' onwe ya ga-ekpebi ikpe ya. N'ihi nke a ka m ji nye iwu ka e dobe ya n' ụlọ mkpọrọ ruo mgbe m ga-enwe ike izigara ya Siza.”

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS:  103:1-2.11-1219-20ab (R.v. 19a)

Azịza: Onyenweanyị edotala oche eze ya n' eluigwe.

  1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m, gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n' ime m! Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m, echezọkwala obi ebere ya niile. A/
  2. Dịka eluigwe siri di elu n' ebe ụwa dị, otu ahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu n' ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ. Ọ na-ewepụ njọ anyị n' ebe anyi nọ. Karịa otu ọwụwaanyanwụ si dị anya n' ọdịda ya. A/
  3. Onyenweanyị edotela oche eze ya n'eluigwe, ọ na-achị ihe niile. Gozienụ Onyenweanyị, ndị mmụọọma ya niile, ụnụ ndị dị ike ịhụ na e dobere okwu ya. A/

 

MBEKỤ: (Jọn 14:26) Alleluia, alleluia! Mmụọ Nsọ ahụ, ga-akụziri unu ihe niile. Ọ ga-emekwa ka unu cheta ihe niile m gwara unu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ ewetara n' Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (21:15-19)

Zụba atụrụ m nri Chekwaba atụrụ m.

Mgbe ha richara nri ụtụtụ nke a, Jesu ajụọ Saịmọn Pita si, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n'anya karịa ndị a niile?'' Pita azaa Jesu sị, “Ee, Onyenwe m, ị ma na ahụrụ m Gi n' anya.” Jesu asi ya. “Zụba atụrụ m nri,'' Jesu jụrụ ya nke ugboro abuo si, 'Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n' anya?''  Pita azaa Jesu si “Ee, Onyenwe m, ị ma na ahụrụ m Gi n' anya.'' Jesu agwa ya sị, “Chekwaba atụrụ m.'' Jesu jụkwara ya nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n' anya?'' Pita asi ya, “Onyenwe m ị mazuru ihe niili, ị makwa na m hụrụ Gị n' anya.'' Jesu asị ya, Zuba atụrụ m nri. Ka m gwa gi eziokwu: Mgbe ị bụ nwata, ị na-ejegharị ebe ọbụla ị chọrọ. Ma mgbe ị ghọrọ agadị, Ị ga-amatị aka gị, onye ọzọ amanye gị ụdọ, kpụrụ gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.'' (Jesu kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ Pita ga-anwụ, iji nye Chukwu otito). Mgbe o kwuchara nke a ọ sịrị Pita “Sobe m.'' 

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị, Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nna nke ịhụnaanya na obi ebere, anyị ebutela onyinye anyị n'ịhụ Gị, zidata Mmụọ Nsọ Gị ka Ọ sachapụ ndụ anyị ka onyinye anyị bụrụ ihe ị ga anara nke ọma. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSO

Mgbe Mmụọ nke eziokwu biara, ọ bụ Dinwenu n'ekwu, Ọ ga-egosi unu eziokwu niile, alleluia.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSỌ

O Chukwu, onye nke e si n'ihe-omimi ya awụcha anyị, ma na-azụ anyị nrị, mee, anyị na-arịọ Gị, ka emume oriri Nsọ a I na-enye anyị dubata anyị na ndụ ebeebe.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

MONDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Unu ga anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasara unu. Unu ga-agbara m aka ebe n'akuku uwa niile. Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

Dinwenu, nye anyị ike nke Mmụọ Nsọ Gị ka anyị wee kwudosie ike ma na-eme uche Gi na ndụ anyị niile. Site na Kristi Dinwenu anyi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara N'akwụkwọ Ọru Ndịozi (19:1-8)

“Unu natara Mmụọ Nsọ mgbe unu kwenyere?”

 

N'oge ahụ Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl siri elu ala bịaruo Efesus. Ọ hụrụ ụfọdụ mmadụ ndi na-eso ụzọ Jesu. Ọ jụọ ha sị, “Unu natara Mmụọ Nsọ mgbe unu kwenyere?” Ha zara sị: “Mba! Ọ bụrụ na o nwere ihe ana-akpọ Mmụọ Nsọ anyị anụbeghị.” Ọ jụrụ ha sị: “Olee ụdị mmirichukwu nke e mere unu?” Ha zara ya sị “Mmirichukwu nke Jọn.” Pọl sịrị ha: “Mmirichukwu Jọn bụ nke chọrọ n'aka mmadụ naanị nchegharị, na agwakwa ndị mmadụ ka ha kwere n'onye ahụ nke na-esote ya, bụ Jesu.” Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha mmirichukwu n'aha nke Onyenweanyị Jesu. Mgbe Pọl bikwasara ha aka n'isi, Mmụọ Nsọ dakwasara ha. Ha kwuru okwu n'olu dị iche-iche, bukwaa amụma. Ha niile dị mmadụ iri na abụọ. Pọl banyere n'ụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ nọrọ n'Efesus ọnwa atọ, na-agwa ndị mmadụ okwu Chineke n'atụghị egwu. O weere ịrụ ụka na arịrịọ na-agwa ndị mmadụ okwu maka ala eze Chineke.

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 68:2-3.4-5ac.6-7ab (R/v. 33a)

AZỊZA: Bụọrọnụ Chineke abụ, unu ala eze nke ụwa.

  1. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya gbasasịa, ka ndị niile kpọrọ ya asị gbapụ n'ihu ya Ị na achụsa ha dịka anwụrụ ọkụ, dịka mgba sị agbaze n'ọkụ. A/
  2. Mana oge Chineke na-abịa nso, ndị eziomume na ańụri ọńụ, ha na-ańụrị oke ọńụ na-ekwekwa ukwe ańụrị. Bụọrọ Onyenweanyị abụ, kụọrọ ya egwu, ńụrịa na Dinwenu, nwee oke ọńụ n'ọbịbịa ya! A/
  3. Nna ndị na enweghị nne na nna, onye ogbugbo ndị ajadu, otu ahụ ka Chineke si dị n'ebe obibi ya dị nsọ; Chineke na-enye ndị ajụrụ ajụ ebe obibi, ọ na enye ndị nọ na mkpọrọ ańụrị site na ime ka ha nwere onwe ha. A/

MBEKU: (Col 3:1) Alleluia, alleluia! Ebe obụ na unu so Kristi bilie n'ọnwu na-achọnụ ihe dị n'eluigwe ebe Kristi nọ n'akanri nke Chukwu.  Alleluia!

 

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:29-33)

Ma nweenụ ańụrị, mụ onwe m emeriela ụwa!”

N'oge ahụ: Ndị na-eso ụzọ Jesu sịrị ya, “Lee, ugbu a ị na-ekwukwa okwu n'ụzọ doro anya. Ị naghịkwa agwa anyị okwu n'ilu! Ugbu a anyị amatala na ị mazuru ihe niile, na ọ dighị mkpa ka onye ọbula jụọ Gị ajụjụ. Nke a ka anyị ji kwere na ị si n'ebe Chineke nọ pụta,” Jesu zara ha sị: “Unu ekwerela ugbu a? Oge ahụ na-abịa, n'eziokwu, ọ bịala mgbe unu niile ga-agbasacha, onye ọbụla n'ụlọ ya, ma hapụ naanị m. N'agbanyeghị nke a, ọ bụghị naanị m nọ, mụ na Nna m nọ. Agwala m unu ihe ndịa, ka unu wee nwee udo n'ime m. N'ụwa unu ga-enwe mkpagbu. Ma nweenụ ańụrị, mụ onwe m emeriela ụwa!”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, ka onyinye ndị a n'enweghi ntupọ sachapụ njọ anyị niile ka obi anyị nogide n'onyinye nke amara Gị.  Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

A gaghim ahapụ unu dika ndị enweghị nne na nna. Aga m alọchikwute unu ka ọbi unu wee ṅụria, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, were amara Gị nọnyere ndị nke Gị. Biko duzie ndị ahụ I jigoro ihe omimi nke eluigwe wee nyejuo afọ ka ha wee si na ndụ ochie ha wee gafee na ndụ ohụrụ. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

 

SATURDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Ndị Ụmụazụ jị otu obi nọgidesie ike n'ekpere, ha na umunwanyị ụfọdụ na Meri Nne Jesu na ụmụnne ya. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

 Mee anyị na-arịọ, Chukwu pụrụ ime ihe niile, ka anyị bụ ndị mere emume nke Paskal, kwudosie ịke na ya site na udị ndụ anyị na-ebi. Site na Kristi Dinwenu anyi

 

ihe ogugu nke mbu

Ihe ọgụgụ ewetara n' Akwụkwọ Ọrụ ndịozi (28:16-20, 30-31).

Pọl nọrọ na Rom,ana-agbasa ozi alaeze Chineke.

K'anyị bịaruru Rom, ọchị agha kwenyere ka Pọl biri iche, ya na otu onye agha nke na eche ya nche. Ka ụbọchị atọ gachara, Pọl kpọrọ ndị isi nke ndị Juu, ndị bi na Rom, nzukọ. Oge ha zukọrọ, ọ gwara ha sị: “Ụmụnne m! N'eziokwu ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị Juu, ma ọ bụ megide omenaala anyị natara n'aka nnanna anyị ha. Ha jidere m na Jerusalem, mee ka m bụrụ onye mkpọrọ, harakwa m nye n'aka ndị Rom. Oge ha kpechara m ikpe ha chọrọ ihapụ m ka m laa, n'ihi na ha chọpụtara na ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ m mere. Ma mgbe ndị Juu ekwetaghị nzube ha ọ dịghịkwa ihe ọzọ m maara m ga-eme karịa ịkpọku Sịza, eze Rom. Mgbe ha na-ekwu nke a, ọ bụghị ebubo ka m na-ebogide obodo m. N'ihi nke a, ka m ji chọọ, rịọkwa, ka m hụ unu anya gwa unu okwu, n'ihi na ọ bụ ihe olile anya nke Izrel ka e ji kee m agbụ a.” Pọl biri na Rom afọ abụọ zuru oke n'otu ụlọ. Ọ na-anabata nke ọma ndị niile bịara ileta ya. O jikwa nkọwa okwu, n'asọghị anya na-ekwusa maka alaeze Chineke, na-akuziri ndị mmadụ maka Onyenweanyị Jesu Kristi. Ọ dịghịkwa onye ọbụla na egbochi ya.

Okwu nke Osebụrụwa

Ekle dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZIZA:  (Ps.  11:4.5 and 7 (R.v. 7b)

Azịza: Ndị eziomume ga ahụ ihu gị anya O onyenweanyị.

  1. Onyenweanyị nọ n'ụlọ nsọya, Onyenweanyị onye oche ezeya dị n'eluigwe; ọ na- eledata anya n'ụwa. Ọ na-elezukwa mmadụ niile. A/
  2. Onyenweanyị na- enyocha ma ndị eziomume ma ndị ọjọọ, ọ na- akpọkwa onye ọbụla hụrụ mmegbu na ọgụ n'anya asị. Onyenweanyị bụ onye eziomume, Ọ hụkwara eziomume n'anya, ndị eziomume niile ga-ahụ ihu ya anya. A/

MBEKU (Jon 16:7.13) Alleluia,   Alleluia! Agam ezitere unu mmụọ nke eziokwu ahụ, ọ ga eduba unu n'ezi okwu niile. Ọ bụ Dinwenu na-ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ ewetara n' Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (21:20-25)

Ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jesu dere ihe ndị a. Anyị ma na aka ebe ya bụ eziokwu.

N’oge ahu: Pịta tụgharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ Jesu bụ onye ọ hụrụ n'anya ka ọ na-eso ya n'azụ. Ọ bụ onye ahụ dabeere n'akụkụ Jesu na nri anyasị ahụ wee jụọ ya sị, “Onyenweanyị, onye ga-arara Gị nye?” Mgbe Pịta hụrụ ya ọ jụrụ Jesu sị, “Onyenweanyị kedụ maka onye a?” Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na m chọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa ọzọ, ọ gbasara gị?” Sobe m! Akụkọ a gbasara n'etiti ụmụnna n'ime Kristi na onye ahụ na-eso ụzọ Jesu agaghị anwụ. Kama ọ sịrị, “Ọ bụrụ na m chọọ ka ọ nọgide rụọ mgbe m ga-abịa ọzọ, ọ gbasara gị?” Ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jesu gbara aka ebe banyere ihe ndị a. Ọ bụ ya dekwara ihe ndị a. Anyị ma na aka ebe ya bụ eziokwu. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jesu ruru. Ọ bụrụ na edebe ha niile n'Akwụkwọ, Ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ aga-ede ya.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị, Kristi.

EKPERE NHUNYE

Ka Mmụọ Nsọ site na ibawanye nsọ kwado obi anyị maka Sakramentị dị asọ. Ebe Mmụọ Nsọ na onwe ya na-agbaghara njọ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Mmụọ Nsọ ga enyekwa m otito, n'ihi na Ọ ga esite n'aka m mata ihe Ọ ga-akọrọ unu, Ọ bụ Dinwenu na-ekwu. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Were ebere Gị nụrụ ekpere anyị, O Dinwenu, na site ka ndụ ochie nke esi na ya kpọbata anyị na ihe omimi nke ọhụrụ a, ka ọga abụ n'ime ndụ ọhụrụ a, aga amụnwo anyị n'ime adị m asọ nke ịme Mmụọ. Site na Kristi Dinwenu anyi

THURSDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

K'anyi werenu obi siri ike bia n'ihu Chineke, n'ihi na anyi ga enweta ike na ebere mgbe anyi chọrọ ya. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nna, ka Mmụọ Gị jiri ike dakwasi anyị, ka anyị wee juputa n'onyinye Gị. mee ka obi anyị di mma n'ebe ino bịakwa dị njikere ime uche Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (22:30, 23:6-11)

Ugbua I ga agbara m ama na Rom.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mgbe chi bọrọ, onye isi ọchi agha chọsiri ike ka ọ mata isi okwu, na ihe mere ndi Juu ji bo Pọl ebubo. Ọ gwara ndi isi nchụaja na ndị nzukọ Sanhedrin niile ka ha zukọọ. Ọ bịa tọpụ Pọl agbụ, kpọta ya kwụba ya n'ihu ha. Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ n'ime nzukọ ahụ bụ ndi otu Sadusii, ndi ọzọ abụrụkwa ndị otu Farisii, o tiri mkpu n'ime ụlọ nzukọ ahụ, sị: “Ụmụnne m! Abụ m onye Farisii, na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe n'ebe a banyere olile anya anyị nwere n'ebe mbilite n'ọnwụ dị.” Mgbe o kwuchara okwu a, esemokwu dapụtara n'etiti ndi Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ wee kewaa. N'ihina ndi Sadụsii na-akụzi na mbilite n'ọnwụ, ma ọ bu mmụọọma, ma ọ bụ mmụọ adịghị. Ma ndị Farisii kwekwara, na-akụzi na ihe ndi a di. Oke mkpọtụ bịara dapụta, ụfọdụ ndị nkụzi iwu, ndị nọ n'otu ndị Farisii, guzooro ọtọ, kwado Pọl sị: “O nweghị ihe ọjọọ anyị hụrụ nwoke a mere!  Kedụkwanụ ma ọ buru na ọ bu mmụọ, mọbụ mmụọọma gwara ya okwu?” Esemokwu a bịara karịa, nke mere onye isi ọchị agha bịara tụọ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya, ka ha banye n'igwe mmadụ ahụ, were ike napụta Pọl n'aka ha ziga ya n'ụlọ ndị agha. N'abalị sonụ, Dinwenu kwụụrụ n'akụkụ Pọl, sị ya: “Obị sie gị ike! N'ihina otu a ị si kwupụta m na Jerusalem, ka ị ga-esi agbara m ama na Rom.

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 16:1-2a and 5.7-8.9-10.11 CR. I)

AZỊZA: Chekwaba m, Chineke, n'ihina Ị bụ ebe mgbaba m.

  1. Chekwaba m, Chineke, n'ihina Ị bụ ebe mgbaba m. Agwara m Onyenweanyị sị, “Gịnwa bụ Chineke m, ihe ọma niile m nwere si n'aka Gị bịa.” A/
  2. Aga m na agozi Onyenweanyị onye n'enye m ndumodu. Onye n'eduzi obi m obuladi n'abali; Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile, n'ebe Ọ nọ n'aka nri m, egwu agaghị atụ m. A/
  3. N'ihi nkea mkpụrụobi m nọ n'ọńụ, mmụọ m na-enwe ańụrị ahụ m na-ezukwa ike n'enweghị nsogbu ọbụla. N'ihina Ị gaghị agbahapụ mkpụrụobi m n'ala mmụọ, ma ọ bụ kwe ka onye ị hụrụ n'anya ree ure. A/

 

  1. Ị ga-akụziri m ụzọ nke ndụ, ị ga-enye m ańụrị na-enweghị ube n'ihu Gị n'aka nri Gi, aga m enwe ańụrị dị ebeebe. A/

MBEKU: (Jọn 17:21) Alleluia, alleluia! Ana m ekpekwa ekpere ka ha bụrụ otu. Nna, mee ka ha dịrị n'ime anyị, dịka Gị onwe Gị si dị n'ime, mụ onwe m adị n'ime Gị. Mee ka ha bụrụ otu, ka ụwa niile wee kwere na Gị zitere m. Ọ bụ Dinwenu n'ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (17:20-26)

Ka ha bụrụ otu.

N’oge ahu: Jesu leliri anya n'eluigwe were kpee ekpere sị: “Ọ bụghị naanị ha ka m na ekpere ekpere. Kama ana m ekpekwa ekpere banyere ndi sitere n'okwu ha wee kwere na m. Ana m ekpekwa ekpere ka ha bụrụ otu. Nna, mee ka ha dịrị n'ime anyị, dịka Gị onwe Gi sị dị n'ime m, mụ onwe m adị n'ime gị. Mee ka ha bụrụ otu, ka ụwa niile wee kwere na Gị zitere m. Otito nke ị nyere m ka m nyere ha, ka ha wee bụrụ otu dika anyi onwe anyi si buru otu. Ka m biri n' ime ha, Gi onwe Gi ebiri n' ime m; ka ha bụrụ otu n' ụzo zuru oke, ka ụwa wee kwere na ọ bu Gi zitere m, na-mụ hukwara ha n' anya. Nna achọrọ m ka ndị niile ị nyere m soro m nọrọ n' ebe m nọ, ka ha nwee ike ịhu otito nke ị nyere m na n'ihuru m n'anya tupu ekee uwa. Nna nke eziomume, Ụwa amatabeghị Gị, ma ama m Gi. Ndị a makwa na ọ bụ Gi zitere m. Emere m ka ha mata aha Gị, aga m na- emekwa ya, ka ịhụnaanya nke ị nwere n' ebe m nọ diri n' ime ha, mụ onwe m ebirikwa n' imeha.

Oziọma nke Osebụrụwa

Ekpere Nhunye: Nna, nwere obi ebere mee ka onyinye ndi a di asọ mekwaa ka onyinye nke mụọ anyi na-enye Gi mee k'anyi bụụrụ onyinye ebighiebi n'ebe ị nọ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSO

O ga akara unu mma na m hapuru unu, n'ihi na Ọ buru na m ahapughi unu, Mmuo ahu agaghi abiakwute unu, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, mee k'anyi dị ọhụrụ site n' ihe omimi nke anyị natara, nyere anyị aka imata Gị, bịa kwadobe anyị maka onyinye nke Mmụọ Nsọ. Site na Kristi Dinwenu anyị

TUESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

A bu m is mbido na njedebe nke ihe niile. A hụla m ọnwụ mana adi m ndu, a ga m adigide ndu ruo mgbe ebighiebi. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chineke nke ike na ebere, zite mmụọ nsọ Gị, ka Ọ bịa n'obi anyị, k'anyị bụrụ ụlọ nsọ nke otito Gị. Site na Kristi Dinwenu anyi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara N'akwụkwọ Ọru Ndịozi (20:17-27)

A gbazugom ọsọ ma gazukwaa ozi nke m natara n'aka Onyenweanyị Jesu.

N'ụbọchị ndị ahụ: Pọl siri na Miletus ziga ozi n'Efesus ka ndi okenye nzukọ Krịsti nọ ebe ahụ bịakwute ya. Mgbe ha bịaruru, ọ sịri ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọọ n'etiti unu ogologo oge a niile site n'ụbọchị mbụ m zọrọ ụkwụ n'ala Eshịa ruo taa. Unu hụrụ na ejiri m obi umeala, na anya mmiri na-agara Onyenweanyi ozi, n'ime onwụnwa di iche-iche dakwasiri m site na ajo izu niile ndi Juu gbara megide m. Ụnu hụru na ahapụghị m ime ka unu mara ihe ọbula ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na akụziri unu ihe n'ụlọ ma ọ bu n'ihu ọha.  Adọrọ m ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ aka na ntị ka ha chegharịa, bịakwute Chineke, ka ha kwerekwa na Onyeneanyị Jesu. Ma ugbu a lee, ana m aga Jerusalem, site na mmanye nke Mmụọ Nsọ, amaghị m ihe ga-adakwasa m ebe ahụ. Naanị ihe m ma bụ na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama, n'obodo ọbụla m ruru, ịga mkpọrọ na mkpagbu chere m. O nweghị ihe m ji ndụ m kpọrọ. Agụghịkwa m ya n'ihe oke ọnụ karịa ije ozi m, ka m gbazuo ọsọ m gazukwaa ozi nke m natara n'aka Onyenweanyị Jesu, nke bụ ịgba aka ebe nye oziọma nke amara Chineke. Ugbu a, lee, amatala m na unu bụ ndị m gagharịrị n'etiti ha, na-ekwusa oziọma alaeze Chineke, agaghị ahụ m ọzọ. Ya bụ, n'ụbọchị taa ana m agba aka ebe na aka m di ọcha n'ebe ọbara ụnụ niile dị. N'ihina ahapụghị m ime ka ụnụ mara ndụmọdụ niile nke Chineke.

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 68: 10-11,20-21 (R.v.33a)

AZỊZA: Bụọrọnụ Chineke abụ, unu ala eze nke ụwa.

  1. Chineke ị mere ka ngọzi Gi na-erudata n'ala dịka mmiri ozuzo, oge ndị nke Gị dara mba ị nyere ha ike; Ndị ezinụụlọ Gi chọtara ụlọ ebe obibi, nke ị wetara site n'afọma Gị maka ndị dị umeala. A/
  2. Ngọzi dịrị Onyenweanyị n'ụbọchị niile, Chineke onye na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu arụ anyị: Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta, ọ bụ Onyenweanyị Chineke ji igodo nke ọnwụ. A/

MBEKU: (Jọn 14:16) Alleluia, alleluia! Aga m arịọ Nna ka o nye unu onye nkasiobi ọzọ ka ọ nọnyere unu mgbe niile. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (17:1-11)

Nna nye nwa Gị otito.

N’oge ahu: Mgbe Jesu kwuchara ihe ndị a, o leliri anya n'eluigwe, sị, “Nna, oge eruola; nye nwa Gị otito ka nwa Gi wee nye Gị otito. Ebe ọ bụ na ị nyere ya ike n'ebe mmadụ niile nọ, ka o nye ndị niile ị tinyere ya n'aka ndụ ebeebe. Nke a bụ ndu ebeebe ahụ: ka ha mara Gị onye naanị ya bụ ezi Chineke; marakwa Jesu Kristi onye nke ị zitere. Enyela m Gị otito n'elu ụwa, n'ihina arụzuola m ọrụ ị nyere m ka m rụọ. Ugbu a Nna m, nye m otito n'ihu Gị, ụdị otito ahụ nke mụ na Gị nwere tupu e kee ụwa.” Emeela m ka ndị ahụ ị sịrị n'ụwa kpọnye m mara onye ị bụ. Ha bu nke Gi ị were  nye m ha. Ha dobekwara okwu Gị. Ugbu a, ha amarala na ihe niile ị nyere m si n'aka Gị bịa, n'ihina eziela m ha ozi ị ziri m zie ha. Ha onwe ha naara ozi ahụ marakwa n'eziokwu na esi m n'ebe ị nọ bịa. Ha kwerekwaara na ọ bụ Gị zitere m. Ana m ekpere ha ekpere. Ọ bụghị ụwa ka m na-ekpere ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndi ahụ ị nyere m, n'ihina ha bụ ndị nke Gị. Ihe niile m nwere bụ nke Gị; ihe niile ị nwere bụkwa nke m. Aga m enwekwa otito n'ime ha. Ugbu a, anọghịkwa m n'ime ụwa, ha ka nọ n'ime ụwa, ma ana m alaghachikwute Gị. 

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nna, nara ekpere na onyinye nke ndi nke Gị ma duruo anyị na otito nke eluigwe ebe Jesu bụ Dinwenu ebebe-ebebe. 

UKWE ORIRI NSO

Onyenweanyi Kwuru si, Mmụọ Nsọ ahụ nke nna m ga ezite na aha m ga-akuziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile ahụ m kuziri unu. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, ka Eukraristia nke a, anyị chụrụ na ncheta nke nwa Gị nyere anyị aka ito n'ịhụnaanya Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

WEDNESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Mba niile kụọnụ aka tijerenu Chineke mkpu ọṅụ, alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu dị ebere, were afọma mee ka Nzụkọ Gị gbakọta ọnụ site n'ikike nke Mmụọ Nsọ, ka Nzụkọ were obi ya niile na obi dị ọcha were buru nke Gị.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (20:28-38)

Ugbu a, ana m ewere unu nye n'aka nchedo Chineke ma n'odudu nke okwu nke amara ya.

N'ụbọchị ndị ahụ: Pọl gwara ndi okenye nzụkọ Kristi nọ na Efesus sị: Kpachapụrunụ onwe unu anya. Kpachapụkwaranu igwe atụrụ ahụ niile anya, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta ha. Na-azụnụ nzukọ nke Chineke, nke Onyenweanyị ji ọbara ya gbata. Ama m na mgbe m lachaara, ajọ anụ ahụ ga-abata n'etiti unu nke agaghị emere igwe atụrụ ebere. Ụfọdụ mmadụ n'etiti unu ga-ebilikwa were okwu ụgha duhie ndị kwere na Kristi ụzọ, ka ha sobe ha. Ya bụ na-echenụ nche. Chetakwa etu m si were anya mmiri, abalị na ehihie n'ewepụghị aka, ihe ha ka afọ atọ, na-adụ mmadụ niile ọdụ n'otu n'otu. Ugbu a, ana m ewere unu nye n'aka nchedo Chineke ma n'odudu nke okwu nke amara ya, nke nwere ike iwulite unu elu, nke nwere ike ime ka unu keta ngọzi ukwu ahụ nke Chineke kwadobere ndi ya niile edoro nsọ. Ọ dịghị onye ọbụla n'ime unu jiri anya ukwu nara ọlaocha ya, ma ọ bụ ọlaedo ya, ma ọ bụ uwe ya. Unu onwe unu ma na ejiri m aka m abụọ rụpụta ihe dị mụ onwe m na ndị mụ na ha nọ mkpa. N'ihe niile, egosiri m unu onwe m na anyị aghaghị inyere ndị adịghị ike aka site n'ịrụ ọru n'ụzọ dị otu a, na-ncheta okwu nke Onyenweanyị Jesu kwuru sị: “Ọ dị ngọzị ịnye enye karịa ịnara anara.” Mgbe o kwuchara ihe ndi a ya na ha niile gburu ikpere n'ala, kpee ekpere. Ha niile bere akwa makụọ Pọl, susukwa ya onu. Ihe wutere ha karia bu okwu Pọl gwara ha, na ha agaghị ahụkwa ya ọzọ. Ha jisiri ike dupụ ya, ruo mgbe ọ banyere n'ụgbọ mmiri.

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 68 .33-35a,35b and 16b (R.v.33a)

AZỊZA: Bụọrọnụ Chineke abụ, unu ala eze nke ụwa.

  1. Nara mgbụcha Chineke, dịka o si kwesi ike Gị, ike ahụ, Chineke, I jirila meere anyị ọtụtụ ihe site n'ụlọ nsọ Gị dị elu karịa Jerusalem! Ndị eze ga-abịakwute Gị, na-eweta onyinye ha. A/
  2. Bụọrọnụ Chineke abụ, unu alaeze nke ụwa, kụọrọnụ Onyenweanyị egwu, onye na-agba ịnyịnya n'eluigwe, eluigwe mgbe ochie, Geenụ ya ntị ka ọ na-eti mkpu, ka ọ na-agba egbe igwe. Ma kwupụtakwa ike Chineke. A/
  3. Ebube ya di n'elu Izrel, ike ya dị n'urukpu, Chineke kwesịrị ịtụrụ nnukwu egwu n'ebe ya dị nsọ: Chineke nke Izrel, na-enye ndi nke ya ike. Ngọzi dịrị Chineke. A/

 

MBEKU: (Jon 17:7b.)  Alleluia, alleluia!  Okwu Gị bụ eziokwu O, Dinwenu. Doo anyị aso n'eziokwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (17:11-19)

Ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị sị bụru otu.

N’oge ahu: Jesu leliri anya n'eluigwe were kpee ekpere sị: “Ugbu a, anọghịkwa m n'ime ụwa, ma ana m alaghachikwute Gị. Ya bụ, Nna dị nsọ, dokwaa ha nke ọma site n'ike nke aha Gị, bụ aha ahụ nke ị nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị sị bụru otu. Mgbe mụ na ha nọ, edobere m ha nke ọma site n'ike nke aha Gị, bụ nke ị nyere m. Echekwabara m ha, ọ dịghịkwa onye ọbụla n'ime ha lara n'iyi ma ọ bụghị nwa nke ila n'iyi ahụ. Ma nke a mere ka ewe mezuo ihe edere n'Akwụkwọ Nsọ. Ugbu a, ana m alaghachikwute Gị. Ana m ekwu ihe ndị a otu a m ka nọ n'ime ụwa, ka ha wee nwee ọńụ n'uju n'ime ha. Agwara m ha okwu Gị, ụwa wee kpọọ ha asị, n'ihina ha abụghị ndị nke ụwa dịka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. Ekpere m abụghị ka ị wepụ ha n'ụwa, kama ka ị chekwaba ha ka ha ghara ibanye na njọ. Ha abụghị ndị nke ụwa, dika mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. Were eziokwu Gi doo ha nsọ, n'ihina okwu Gị bụ eziokwu. Ezigala m ha n'ụwa dịka ị si ziga m n'ụwa. N'ihi ha, edoola m onwe nsọ, ka e wee doo ha nsọ n'eziokwu.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nara onyinye anyị ji nrụbe isi na enye Gị, ka ihe omimi ndi a di asọ nke anyị na esite na ha wee na-efe Gị mee ka nzọpụta Gị zuo oke n'ime anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSO

Onyenweanyi kwuru si. Mgbe Mmụọ Nsọ ahụ ga-abiakwute unu, Mmụọ Nsọ ahụ m ga ezike, Mmụọ nke eziokwu nke ga-esite na aka nna, ọ ga-agbara m aka ebe, unu onwe unu ga abụkwa ndi aka ebe m. alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, ka nsonye anyị na Eukaristia dị asọ mubaa ndụ Gị n'ime anyị, ma mee anyị k'anyị kwudosie ike na Sakramenti nke a dị asọ.  Site na Kristi Dinwenu anyị.