MONDAY OF THE OCTAVE OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Dinwenu ekunitego n'ọnwụ, ka osi kwuo. Ka anyị nwebenu aṅụrị n'ihi n'o bụ eze anyị ebebe. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nna, Ị na eme ka Nzukọ Gị na-eto oge niile, site na ịmụbanye ọnụ ọgụgụ nke ezi-na ụlọ Gị. Nyere anyị aka ka anyị na etinye na omume na ndụ anyị, mmirichukwu nke anyị nabatara na okwukwe. Site na Kristi Dinwenu.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (2:14,22-33)

Chineke mere ka o si n'ọnwụ bilie dika unu n'onwe unu si hụ.

N'ubọchi Pentikọst, Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu ya gwa ọgbakọ ahụ okwu si, “Ndị Juu ibe m, na unu niile ndị bi na Jerusalem matanụ nke a! gekwaanụ m ntị! “Ndị Izrel! Geenụ m ntị! Jesu onye Nazaret bụ nwoke nke Chukwu gosiri unu site n'ọrụ dị ike na ọrụ ebube na ihe ịrịbaama, nke Chukwu rụrụ n'etiti unu site n'aka ya dịka unu ji anya unu hụ. Jesu a, onye a raara nye dịka Chineke siri n'uche aka ya chepụta, na dịka Chineke siri n'amamihe ya buru ụzọ mazuo, ka unu kpọgidere n'obe, gbukwaa ya, site n'aka ndị na-amaghị iwu anyị. Chineke mere ka o si n'ọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ya ihe mgbu nke ọnwụ n'ihi na ọnwụ enweghị ike ijideli ya. Devid na-ekwu maka ya sị, Ahụrụ m Onyenweanyị ka ọ nọ n'ihu m mgbe niile. N'ihina ọ nọ n'aka nri m, aga m akwụdosiike. N'ihi nka a mkpụrụobi m ńụrịrị ọńụ, ire m kọkwara akụkọ banyere ọńụ m ọzọkwa, anụ ahụ ga-ebikwa n'olileanya. N'ihi na ị gaghị ahapu mkpụrụobi m n'ime ala mmụọ, Ị gaghị ekwe onye Nsọ gị ka o ree ure. Ị meela ka m mata ụzọ na-eduba na ndụ. Ị ga-emekwa ka m jupụta n'ọńụ site na nnọnye nke gị. Ụmụnna m! O kwesịrị ka m were nkwuwa okwu chetara unu ihe banyere nna nna anyị Devid. Ọ nwụrụ e lie ya, ili ya dịkwa n'etiti anyị ruo ụbọchị taa. N'ihina ọ bụ onye amụma, ọ makwaara na Chineke ńụrụ iyi, kwe ya nkwa na ọ ga-eme otu onye si n'agbụrụ ya pụta ka ọ nọdụ n'oche eze ya.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 16:1-2.5.7-11 R.V.1)

AZỊZA: Chekwaba m, Chineke, n'ihi na Ị bụ nchekwube m.

  1. Agwara m Onyenweanyị sị, “Gịnwa bụ Chineke m, Iheọma niile m nwere si n'aka Gi bịa.” Sọ Gị Onyenweanyị bụ ihe m nwere Ị na-enyekwa m ihe niile m chọrọ. A/
  2. Aga m eto Onyenweanyị bụ onye na agbaziri m, n'ime abali, Ọ na enye m ndụmọdu; Ana m eche echiche Onyenweanyị mgbe niile, n'ebe Ọ nọ n'aka nri m, egwu agaghị atụ m. A/
  3. N'ihi nke a mkpụrụobi m nọ n'ọńụ, mmụọ m na-enwe ańụrị, ahụ m na ezukwa ike n'enweghị nsogbu ọbụla. N'ihina Ị naghị agbahapụ mkpụrụobi m n'ala mmụọ, ma ọ bụ kwe ka onye Ị hụrụ n'anya ree ure. A/
  4. Ị ga-akụziri m ụzọ nke ndụ, Ị ga-enye m ańụrị na-enweghi ube n'ihu Gị, n'aka nri Gị, aga m enwe ańụrị di ebeebe. A/

MBEKU: (Ps.118:24) Alleluia, alleluia! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee ańụrị na obi ụtọ na ya. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Matiu dere: (28:8-15)

Kọọrọ ụmụnna m. Gwa ha ka ha gaa Galili, n'ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.

N’oge ahụ: Ụmụnwaanyị ahụ ewere ọsọ si n'ili pụọ n'ihi egwu na oke ọńụ, gaa ịkọrọ ndị na eso ụzọ ya ihe merenụ. Na mberede Jesu zutere ha n'ụzọ sị ha, “Ekele!” Ha wee bịa makụọ ya n'ụkwụ abụọ kpọọrọ ya isi ala. Jesu gwara ha sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ, kọọrọ ụmụnna m. Gwa ha ka ha gaa Galili, n'ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.” Mgbe ụmụnwaanyị ahụ na-aga, ụfọdụ n'ime ndị agha na-eche ili ahụ nche laghachiri n'ime obodo kọọrọ ndị isi nchụaja ihe niile merenụ. Mgbe ha na ndị okenye zụkọrọ gbachaa izu, ha nyere ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, sị ha: “Ihe a bụ ihe unu ga na-ekwu: 'Ndị na-eso ụzọ ya bịara n'abali zuru ya n'ohi mgbe anyị nọ n'ụra. Ọ bụrụ na nke a eruo onye isi ọchịchị  ntị, anyị ga-emeta ya mma wee wepụ unu na nsogbu.” Ha naara ego ahụ, mee dịka a gwara ha. Akụkọ a ka gbasara n'etiti ndị Juu ruo taa.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Anyị na-arịọ O Dinwenu, ka I nara onyinye ndị nke Gị, ka site na mgbanwe ọhụrụ ha nwetara site na ikwupụta aha Gị, ya na site na mmirichukwu, ha ga enweta ańuri na-enweghị ube. Site na Kristi Dinwenu.

UKWE ORIRI NSỌ

Site na mbilite n' ọnwụ Kristi bilitere, ọ gaghi anwukwa ọzọ, onwu enwezighi ike ọbula n'ebe ọ nọ, alleluya.

EKPERE ANATACHA

Dinwenu, ka amara anyi natara site na sakramenti nke Paska nke a, na-aga n'ihu na-eto n'ime obi anyi. Dika I si edu anyị n' ụzo nke nzọputa ebighị ebi, mee ka anyi bụrụ ndị ga-etozu oke na onyinye Gị. Site na Kristi Dinwenu

TUESDAY OF THE OCTAVE OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

O nyere ha mmịrị nke amamihe ka ha ńụọ, Aga eme ka osie ike n'ime ha, mee  kwa ka ha kwudosie ike, ọ GA EBULI HA ELU EBEBE EBEBE, ALLELUYA.

EKPERE MMEGHEE

Nna, site n'ihe omimi nke Ịsta nke a, Ị metula ndu anyị aka site n'ike ọgwụgwọ nke ịhụnanya Gị.  nye anyi onyinye nke eluigwe mee ka anyi bụ ndị na-eri oriri nke onyinye Gị, nweta ańụrị ebeebe n'ime ya n'eluigwe. Site na Kristi Dinwenu.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndị ozi (2:36-41)

Chegharịanụ, ka e mee unu mmirichukwu n'aha Jesu Kristi.

N'ubọchị Pentikọst, Peter gwara ndị Juu sị: “Ya bụ ka ezinụụlọ Izrel niile mazuo na ọ bụ Jesu nke a, onye unu kpogburu n'obe ka Chineke mere ka ọ bụrụ Onyenweanyị na Kristi anyị.” Mgbe ha nụrụ nke a, ihe a metụrụ ha n'obi. Ha jụrụ Pita na ndị ozi ndi ọzọ sị “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga eme?” Pita azaa ha si, “Chegharịanụ, sịnụ na ihe ọjọọ pụta, onye ọbụla n'ime unu n'ọtu n'otu ka e mee unu mmirichukwu n'aha Jesu Kristi, maka mgbaghara njọ nke unu niile, unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. N'ihina ọ bụ unu, na ụmụ unu, na ndị niile nọ n'ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịịrị bụ ndị niile Onyenweanyị Chineke na-akpọkọtara onwe ya” Pita jikwa ogologo okwu Chukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike na-adụkwa ha ọdụ sị, “Zọpụtanụ onwe unu n'agbụrụ ọjọọ a” N'ihi nke a, ọtụtụ ndị nabatara okwu ya ka e mere mmirichukwu. N'ụbọchị ahụ; ihe dịka puku mmadụ atọ ka agbakwunyere  n'ọnụ ọgụgụ ha.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 33:4-5.18-20.22 R/v.5)

AZỊZA: Ụwa jupụtara n'ịhụnaanya nke Onyenweanyi.

  1. N'ihi na okwu nke Onyenweanyi bụ eziokwu, Ọ na akwudọsiike n'ọrụ ya niile. Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n'anya, ịhụnanya ya jupụtara n'ụwa. A/
  2. Ma lee ka Onyenweanyị sị eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya, ndị niile tụkwasiriobi ha n'ịhunaanya ya; ka o wee zọpụta mkpụrụobi ha n'ọnwụ ma chekwaba ha oge ụkọ. A/
  3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị; ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị. Ka ịhụnanya gị dị n'ebe anyị nọ, O Chineke, ebe nchekwube anyị dị na gị. A/

MBEKU: (Ps. 117:24) Alleluia, alleluia! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee ańụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (20:11-18)

Ahụla m Onyenweanyị, ọ gwara m okwu.

N' oge ahu: Meri kwụ n'akụkụ ili ahụ, na-ebe  akwa. Ka ọ na-ebe akwa, o hulatara ala leba anya n'ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n'isi, nke ọzọ n'ụkwụ, n'ebe ahụ a tọgbọrọ ozu Jesu. Ha jụrụ ya sị, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa?” Ọ zara ha si, “Ha ebupula Onyenwe m, ma amaghị m ebe ha dọbara ya.” Mgbe o kwuchara nke a, ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ. Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa? Onye ka I na-achọ?” Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya sị, “Nnamukwu, ọ bụrụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m ga buru ya.” Jesu akpọọ ya sị, “Meri” Nwaanyị ahụ atụgharịa, zaa ya na Hibru sị “Raboni! Nke pụtara “Onye nkuzi”. Jesu gwara ya sị, “E metukwala m aka, n'ihina arịgokwubeghị m Nna m. Gakwuru ụmụnna m gwa ha sị, “Ana m alakwuru Nna m na Nna unu, Chukwu m na Chukwu unu.” Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu sị, “Ahụla m Onyenweanyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ gwara ya ihe ndị a.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nabata onyinye ndị a sitere n'aka ezinaụlọ Gị. Mee k'anyị kwudosie ike na ndụ nke Ị nyere anyị, K'anyị wee  nwe ike ịbata n'onyinye ahụ dị ebeebe ị kwere anyị na nkwa. Site na  Kristi Dinwenu

UKWE ORIRI NSỌ

 Ọ bụrụ na ị so Kristị bilie, chọba ihe nke eluigwe, ebe Kristi nọ n'aka nri nke Chukwu, kpachapụ anya maka ihe nke eluigwe. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke ji ike niile, nuru arịriọ anyị ma dịka ihukwasagoro amara zuru oke nke mmirichukwu n'isi ezinụụlọ Gị, mee ka ha wee kwado obi ha maka nkwughachị ụgwọ nke ndụ ebeebe. Site na Kristi Dinwenu

WEDNESDAY OF THE OCTAVE OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Bianu unu ndị nna m gọziri agọzi. Werenu alaeze nke akwadobere unu site na mbido nke ụwa, alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, onye na-eme anyị obioma kwa afọ ọbụla sitena nnukwu emume nke Mbilite n'ọnwụ nke Dinwenu, sitena amara Gị, mee ka mmeeme ndịa anyị na-eme ritere anyị ndụ ebeebe. Site na Kristi Dinwenu

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (3:1-10)

 “Ihe m nwere ka m ga enye gị; n'aha Jesu Kristi onye Nazaret, bilie gaa ije.''

N' ụbọchị ndị ahụ: Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga n'ụlọ nso ikpe ekpere n'elekere nke atọ n'ehihie bu oge ekpere. Ha hụrụ otu nwoke dara ngwụrọ site na nwata. Ndi nwe nwoke a na-atọgbọchị ya kwa ụbọchị n'ọnụụzọ ụlọ nsọ Chineke, nke ana akpọ “Ọnụ ụzọ mma” ịrịọ onyinye ebere n'aka ndị na-aba n'ime ụlọ nsọ Chineke. Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ibanye n'ụlọ nsọ Chineke,  ọ rịọrọ ha ego. Ma Pita na Jọn legidere ya anya, “Lee anyị anya!” O lee ha anya na-atụ anya inata ihe n'aka ha. Ma Pita sịrị ya, “Enweghị m ọla ọcha na ọla edo kama ihe m nwere ka m ga enye gị; n'aha Jesu Kristi onye Nazaret, bilie gaa ije!” O jidere ya n'aka nri kpụlie ya elu, ozigbo ụkwụ ya abụọ na ikpere ya sikwaa ike ọzọ. Ọ wuliri elu, kwụrụ n'ụkwụ abụọ, jegharịa ije n'ebe ahụ. O sooro Pita na Jọn na-aga ije na-awụli elu na-etokwa Chineke. Igwe mmadụ ahụ niile hụrụ ya ka ọ na-aga ije, na-eto Chineke. Mgbe ha matara na ọ bụ onye ahụ na-anọdu n'ọnụ ụzọ ama nke ụlọ nsọ Chineke na arịọ arịrịo, otu ihe a si mee gbara ha gharịị tukwa ha n' anya nke ukwuu.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  105:1-2.3-4.6-7.8-9.RI v.3)

AZỊZA: Ka obi niile na-achọ Chineke ńụrịa

  1. Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonu aha ya, kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya! Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu, kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile! A/
  2. Nwebe ańụrị n'aha nsọ ya ka obi niile na-achọ Chineke ńụrịa. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya, chobanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile. A/
  3. Unu ụmụ Abraham bụ nwodibo ya, ụmụ Jekọb bụ onye nke o họọrọ! Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị, Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. A/
  4. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe, Iwu nke o tiiri puku agbụrụ gara aga, Ọgbugbandụ ya na Abraham gbara na iyi nke ọ ńụụru Aịzik. A/

MBEKU: (PS. 118:24) Alleluia, alleluia! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee ańụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya. Alleluia!

 

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Luk dere: (24:13-35)

Ha chọpụtara na ọ bụ ya, oge ọ nyawara achicha.

N'ụbọchị ahụ mmadụ abụọ n'ime ndị na-eso ụzọ Jesu gaje otu obodo nta a na-akpọ Emaus nke dị ihe dịka Maịlị asaa site na Jerusalem. Ha na-akọrịtakwa n'etiti onwe ha gbasara ihe niile a merenụ. Ka ha na akọrịta akụkọ ma na-ajụrịtakwa onwe ha ajụjụ, Jesu n'onwe ya bịaruru ha nso, sorokwa ha na-aga. Ma emechiri anya ha ịmata na ọ bụ Jesu. Ọ jụrụ ha sị: Gịnị ka unu na-akọrịta n'etiti unu ka unu na-aga?” Ha kwụsịrị ebe ahụ gbarụọ ihu. Mgbe ahụ ka otu onye n'ime ha a na-akpọ Kleopas jụrụ ya sị, “Ọ bụ naanị gị bụ onye ọbịa na Jerusalem na-amaghị ihe ndị a niile mere ebe ahụ n'ụbọchị ndị a?” Jesu jụrụ ha sị: “Ihe dịka gịnị?” Ha zara ya sị: “gbasara Jesu onye Nazaret, onye bụ onye amụma, bụrụkwa onye dị ike n'okwu na n'ọrụ ebube n'ihu Chukwu na n'anya mmadụ niile. Na otu ndị isi nchụaja na ndị isi ochịchị ji rara ya nye ka a maa ya ikpe ọnwụ ma kpọgbukwa ya n'obe. Anyị nweburu olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta ụmụ Izrel. Ọ bụghịkwa sọ nke a, mkpụru ụbọchị atọ agachaala kamgbe ihe a mere, ma nke kacha nke bụ n'ụfọdu ụmụnwaanyị n'ime ndị otu anyị mere ka obi fepụ anyị. Ha mara ụzọ gaa n'ili ebe e liri ya, ma ha ahụghi ozu ya. Ha loghachiri na-akọọrọ anyị na ha hụkwara ndị mmụọọma n'ọhụ, ndị sị na Jesu dị ndụ. Ufọdụ n'ime ndị otụ anyị gakwụrụ n'ili hukwa ya dika otu umunwuanyị ndị ahu siri kwuo ma ha ahughi Jesu n'onwe ya.” Jesu gwara ha sị: Unu ndị enweghị ọgụgụ isi, ndị o sirikwaara ike n'obi lkwenye  n'ihe niile ndị amụma kwuru! Ọ bụ na ọ dịghị mkpa na Kristi ahụ ga-ata ahụhụ ndị a wee banye n'ọchịchị nke ebube ya?” Jesu bidoro kọwara ha ihe niile e dere n'Akwụkwọ Nsọ banyere ya onwe ya, site n'Akwụkwọ Mosis wee ruo na nke ndị amụma. Ha gagidere bịaruo nso n'obodo nta ahụ ha na aga. Jesu mere ka ọ na agafe obodo nta ahụ, ma ha rịọsiri ya ike sị: “Nọnyere anyị n'ihi na chi ejiwela, ụbọchị agamikwaala ugbu a.” Jesu wee kwenye banye n'ụlọ ịnọnyere ha. Ka ha na Jesu nọ na-eri nri anyasị, O were achịcha gọzie, nyawaa ya were ya nye ha. Anya ha meghere, ha wee mata onye ọ bụ. Ozigbo ahụ ha ahụkwaghị ya ọzọ. Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ọ bụ na obi anyị anụghị anyị ọkụ mgbe Ọ na-agwa anyị okwu n'ụzọ, mgbe ọ na-ekpughere anyị ihe e dere n'Akwụkwọ nsọ?” Ha biliri n'otu oge ahụ laghachi na Jerusalem. Ha hụkwara ndị na-eso ụzọ Jesu iri na otu ahụ na ndị ha na ha nọ ka ha gbakọtara n'otu ebe. Ndị kwuru sị, “Onyenweanyị ebilitela n'eziokwu. O gosikwara Saịmọn onwe ya!” Ha bụ mmadụ abụọ kọọro ndị ọzọ ihe mere n'ụzọ, na ka ha si mata onye ọ bụ site n' ịnyawa achịcha.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nabata aja nke a bụ aja nke mgbapụta anyị, ma mejụpụta n'ime anyị mgbapụta nke ahụ na mkpuruobi. Site na Kristi Dinwenu

UKWE ORIRI NSỌ

Ndị umụazụ ya chọpụtara na ọ bụ Dinwenu Jesu, oge ọ nyawara achicha, alleluia.

UKWE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, mee ka iketa oke a anyị ketara na Sakramenti nke Nwa Gị tọrapụ anyị na ndụ ochie nke njọ anyị, ma mee anyị okike ohụrụ Gị. Site na Kristi Dinwenu

THURSDAY OF THE OCTAVE OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Ndị nke Gị na-eto nnukwu mmeri Gị, O Dinwenu. Amamihe emepeela ọnụ nke dara ogbi, ma mee ọnu ụmụaka ka ha kwuo okwu, alleluia

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, onye jịkogoro ọtụtụ mba ọnụ site n'ịkwupụta Aha Gị, mee ka ndị niile amụgharịrị sitena mmiri chukwu bụrụ otu  n'okwukwe nke obi ha na na nsọpụrụ nke omume ha. Site na Kristi Dinwenu.  

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru Ndịozi (3:11-26)

Unu egbuo onye na-enye ndụ, onye Chukwu mere ka o si n'ọnwu bilie.

 N' ọbọchi ndi ahu: Igwe mmadụ ahụ niile jiri ọsọ gbakọọ n'ebe ha nọ n'otu ụlọ dị na mpụta nke ụlọ nsọ Chineke, nke a na-akpọ Ịba Solomon. Ihe merenụ gbagwojukwara ha anya nke ukwu. Mgbe Pita hụrụ ha, ọ gwara ọgbakọ ahụ sị, “Ndi Izrel ibe m! Gịnị mere ihe a ji jụ unu anya otu a? Ọ bụ gịnị mere unu ji ele anyị anya otu a, dịka aga-asi na anyị mere ka o jee ije site n'ike aka anyị ma ọ bụ site n'ezi okpukpe anyị na-enye Chukwu? Chukwu nke Abraham, na nke Aịzik, na nke Jekọb, Chukwu nke nnanna anyị ha, enyela nwodibo ya bụ Jesu otito na ebube kacha elu. Onye nke unu nyefere n'aka ndị isi, gọnahụkwa ya n'ihu Paịlet, Ọ bụladị mgbe Paịlet kpebiri ihapụ ya. Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume ahụ ma rịọ ka a hapụru unu onye ogbu mmadụ. N'ime nke a, unu egbuo onye na-enye ndụ, onye Chukwu mere ka o si n'ọnwu bilie. Anyị onwe anyị bukwa ndị akaebe nke mbilite n'ọnwụ ya. Ọ bụ site n'ike nke aha ya ka nwoke a unu hụrụ, matakwa, si nweta ike iga ije. Ma ọ bụkwa site n'okwukwe e kwere n'aha ya ka e si nwee ike imezu nke a. Okwukwe ahụ nke sitere n'aka Jesu mere ka ahụ nwoke a zuo oke n'ihu unu niile. Ma ugbu a, ụmụnna m, amatala m na ihe unu na ndị isi unu mere Jesu, unu mere ya n'amaghị ama. Maka na Chineke mere ka ihe niile o buru ụzọ kwusaa site n'ọnụ ndị amụma ya niile, na Kristi ga-ata ahụhụ, mezuo. Ya bụ, chegharịanụ laghachikwutekwanụ Chineke ka ọ sachapụ mmehie unu niile, ka oge inweta ume ndu si n'ebe Onyenweanyị nọ bịa, ka Chineke wee zitekwa Jesu onye o si na mbụ họpụta ka ọ bụrụ Kristi unu. Ọ ghaghị ịnọdụ n'eluigwe ruo mgbe Chineke mezuru ihe niile ka ọ dị ọhụrụ dịka o siri kwuo site n'olu ndị amụma ya mgbe ochie. Mosis kwuru si, “Onyenweanyị Chineke ga-esi n'etiti unu kpọlitere unu onye amụma dịka o siri kpọlite m. Unu ga-ege ya nti n'ihe niile ọ na-agwa unu. N'oge ahụ, a ga-esi n'etiti unu mapụ onye ọbụla egeghị onye amụma ahụ ntị.” Ee ndị amụma niile site na Samuel na ndị niile so ya n'azụ sooro kwusaa okwu maka ụbọchị ndi a. Unu onwe unu bụ ụmụ ndị amụma bụrụkwa ndị nketa nke ọgbụgbandụ ahụ, nke Chineke na nnanna unu ha gbara mgbe o kwere Abraham nkwa sị, “site n'agbụrụ gị ka m ga-agọzị mba niile nke ụwa. Mgbe Chineke kpọlitere nwodibo ya, o buuru ụzọ zitere unu ya ka ọ gọzie unu site n'ịkpọghachi unu azu site na mmeghie unu.”

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

 

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS. 8:2AB AND 5.6-7A.7B-9 (R/V. 2AB)

AZỊZA: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gi siri dị elu n'ụwa niile.

  1. Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị siri dị elu n'ụwa niile, gịnị ka mmadụ bụ Ị ji eche echiche banyere ya, nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya? A/
  2. N'agbanyeghị, Ị mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta, Ị jịkwa ugwu na nsọpụru chọọ ya mma dịka okpu eze. Ị mere ya nna ukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n'okpuru ya. A/
  3. Ọ na-achị ụmụatụrụ na ehi, ya na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ di n'osimiri. Ọ na-achị ụmụ nnụnụ nke igwe, azụ dị na mmiri, na anụ ndị ọzọ dị na osimiri. A/

MBEKU: (Ps. 118:24) Alleluia, alleluia! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee ańụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Luk dere: (24:35-48)

Otu a, ka e si dee ya, na Kristi ahu ga-ata ahụhụ sikwa n'ọnwu bilie n'ụbọchị nke atọ

N' oge ahu: Ha mmadụ abụọ kọọrọ ndị ọzọ ihe mere n'ụzọ mgbe ha gaje Emaus, na ka ha si mata onye ọ bu site na-ịnyawa achịcha. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-akọ ihe ndị a, Jesu eguzoro n'etiti ha si ha: “Udo dịrị unu!” Mana ha kujara, tụkwaa egwu, chee na ha hụrụ ndị mmụọ. Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị mere egwu ji na-atụ unu, gịnịkwa mere unu ji enwe obi abụọ? Leenu aka m na ụkwụ m, ka unu mara na ọ bụ mụ onwe m. Metụnụ m aka ka unu marakwa na ọ bụ m, n'ihina mmụọ enweghi anụ ahụ na ọkpụkpụ dịka unu hụrụ na m nwere. Mgbe o kwuchara nke a o gosi ha aka ya na ụkwụ ya. Ańụrị ha ka di ukwuu nke na ha ekwetabeghị n'ihe ha hụrụ, n'ihina ọ tụrụ ha n'anya. Jesu jụrụ ha sị, “Unu nwere ihe oriri ọbụla n'ebe a?” Ha nyetụrụ ya azụ a ńara n'ọkụ. Ọ nara ha azụ ahụ, rie ya n'ihu ha. Jesu gwara ha sị: “Ihe ndị a bụ ihe ndị m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere n'Akwụkwọ iwu Mosis, n'Akwụkwọ ndi amụma na Abụọma banyere m aghaghị imezu.” Mgbe ahụ O Meghee uche ha, ka ha ghọta ihe e dere n'Akwụkwọ Nsọ. Ọ gwakwara ha sị: “Otu a, ka e si dee ya, na Kristi ahu ga-ata ahụhụ sikwa n'ọnwu bilie n'ụbọchị nke atọ. A ga-ekwusakwa nchegharị na mgbaghara njọ ga n'aha ya site na Jerusalem ruo mba niile. Unu onwe unu bụ ndị akaebe ihe ndị a niile.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Ka ọmasi Gị O Dinwenu I nara  onyinye anyi a anyi ji ọnụ achụchyere Gị maka ndi amunwogoro, ya na maka nchekwube nke anyemaka Gị, site n'eluigwu. Site na Kristi Dinwenu.

UKWE ORIRI NSỌ

Unu bụ ndị Chineke họọrọ ka ndị nke ya, toonu onye ahụ kpọpụtara unu na ọchịchịrịị ma kpọbata unu  na oke ihè, alleluia.

 

EKPERE ANATACHA ORIRI NSỌ

O Dinwenu, nụrụ ekpere anyi,  ka mgbanwe a dị asọ bụ nke isitegoro na ya zọpụta anyi wetera anyi enyemaka Gị na ndụ anyi a, ma mee anyi ndi tozuru inweta aṅụri ebeebe. Site na Kristi Dinwenu.

SATURDAY OF THE OCTAVE OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Onyenweanyi e meela ka ndị nke ya nwere onwe ha, ha na-eti mkpụ oṅụ, alleluiya.

EKPERE MMEGHE

Nna nke ịhụnaanya, site na uju nke amara Gị, Ị na abawanye n'ọnụ ọgụgu ndị kwere na Gị. Chekwaba ezi-na-ụlọ Gị. Nye ndị niile ejiri mmiri Chukwu mugharia ndụ na-enweghị ọgwụgwọ. Site na Kristi Dinwenu. 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (4:13-21)

N'ihina anyị onwe anyị aghaghị ikwusa ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.

N' ụbọchi ndi ahu: Mgbe ndi nchụaja na ndi okenye hụrụ na Pita na Jọn na ekwusi okwu ike, n'atụghị egwu ọbụla, chọpụtakwa na ha bụ ndị na-amaghị akwụkwọ, ndị mmadị nkịtị, ihe a gbagwo jụrụ ha anya; ma ha ghọtara n'otu oge ahụ na ha na Jesu anọọla. Ma ebe ha hụrụ nwoke ahụ e mere ka ụkwụ ya dị mma ka o guzo n'akụku Pita na Jọn, ihere ekweghị ha kpee ihe ọbụla kpegide ndị ozi ahụ. Mgbe ha gwara ndị ozi ahụ ka ha pụọ n'ezi, ha gbarịta izu n'etiti onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga eme ndị a?” Onye ọbụla bi na Jerusalem anụla na Chineke arụọla ọrụ ịtụnaanya di otu a site n'aka ha. Anyị apụghịkwa ịgọpụ ya. Iji mee ka ọ ghara ịdị na-agbasa, na-aga n'ihu n'etiti ndị mmadụ, ka anyị dọsie ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịdị na-agwa onye ọbụla okwuchukwu n'aha Jesu, bido ugbu a gaba. Nke a mere ha ji kpọbata ndị ozi ahụ n'ihu nzụkọ nye ha iwu ka ha ghara ikwu ma ọ bụ ikuzi ihe ọbụla n'aha Jesu. Pita na Jọn zara ha sị, “Kpebienụ n'onwe unu, ma ọ bụ ihe ziri ezi n'anya Chineke ige unu nti karịa ige Chineke ntị. N'ihina anyị onwe anyị aghaghị ikwusa ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” Ndị nzukọ ahụ dọkwara ha aka na ntị ọzọ, hapụ ha ka ha laa. Ha ahụghịkwa ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ n'ihina ọha ndị mmadu na-enye Chineke otito maka ọrụ ebube ha rụrụ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 118:1,14-15ab.15c-18.19-21 (R.V  21a)

AZỊZA: Ana m ekele Gi n'ihi na ị nụla olu m.

  1. Nyenụ Onyenweanyị ekele n'ihina ọ dị mma ịhụnaanya ya enweghị njedebe, Onyenweanyị bụ ike m na ukwe m; Ya bụkwa onye nzọpụta m. A na-enwe mkpu ọńụ na nke mmeri n'ụlọ ndị eziomume. A/
  2. Aka nri Onyenweanyị na-enwe mmeri, Aka nri Onyenweanyị ekulitele m. Mba, agaghị m anwụ, aga m adi ndụ, I gụpụta aka ọrụ niile nke Onyenweanyi. Ọ bụ ezie na Onyenweanyi ataala m ahụhụ nke ukwuu ma O nyefebeghị m n'aka ọnwụ. A/
  3. Megheere m ụzọ nke eziomume ka m bata bịa nye Onyenweanyị ekele. Nke a bụ ọnụ ụzọ nke Onyenweanyị, ebe ndị eziomume ga-esi bata. Ana m ekele Gi n'ihina Ị nụla olu m, Ị bụkwa onye nzọpụta m. A/

 

MBEKU: (Ps. 117:24) Alleluia, alleluia! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee ańụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Mak dere: (16:9-15)

Gaanụ n'ụwa niile, kwusaaranụ ihe niile ekere eke oziọma.

Mgbe Jesu sị n'ọnwụ bilite n'isi ụtụtụ nke ụbọchị mbụ nke izuka, O buru ụzọ gosi onwe ya Meri onye Magdala, onye ahụ Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ asaa n'ime ya. Ọ pụrụ gaa kọọrọ ndị ha na Jesu na-anọ na mbụ ebe ha na-eru uju na-ebekwa akwa. Ma mgbe ha nụrụ na ọ di ndụ, na Meri onye Magdala ahụkwala ya, ha ekwetaghị na akụkọ a bụ eziokwu. Mgbe nke a gachara, Jesu gosikwara ndi na-eso ụzọ ya mmadụ abụọ onwe ya n'ụdị Ọzo ka ha na-abanye n'ime obodo. Ha laghachiri azụ kọọrọ ndị ọzọ, ma ha ekwetaghị n'ihe ha kwuru. Ka e mechara o gosikwara onwe ya ndị na-eso ụzọ ya mmadụ iri na otu ka ha nọ n'oche nri. Ọ tara ha ụta maka ekweghị ekwe na mkpọchi obi ha n'ihina ha ekwetaghị ihe ndị hụrụ ya mgbe o bilitechara n'ọnwụ kọọrọ ha. Ọ gwara ha sị, “Gaanụ n'ụwa niile, kwusaaranụ ihe niile ekere eke oziọma.

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

O Dinwenu mee ka anyi na-enweta aṅuri  oge niile na ihe omimi nke Pascal ndịa. Ka ọrụ nke mgbanwe I na-arụ n' ime  anyi bụụrụ anyị  ụzọ nke anuri ebebe. Site na Kristi Dinwenu.

UKWE ORIRI NSỌ

Unu bụ ndị natara mmiri Chukwu bụ ndị Yịkwasara Kristi k'uwe. Alleluya.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSỌ

O Dinwenu, lekwasi ndi nke Gị anya ebere ka ndi ọ masiri Gị igbanwe site n'ihe omimi nkea di ebebe nweta otito nke mbilite n'onwu. Site na Kristi Dinwenu.