UKWE MBATA

Ebe Chineke mere ka Kristi si n'ọnwụ bilie, Ọ gaghi anwụkwa ọzọ, ọnwụ enwekwaghị ike ọzọ n'ebe ọnọ,  Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

Chukwu ji ike niile di ebeebe, Mmụọ Gi mere k'anyị bụrụ ụmụ Gi, wee nwekwazị ike ikpọ Gi Nna. Bawanye Mmụọ nke ihụnaany n'ime anyị; ma mee, k'anyị nweta ihe ahụ ekwere anyị na nkwa. Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

 

Ihe ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru Ndịozi (4:23-31)

 

Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu Chineke n'atụghị egwu ọbụla.

 

N’ụbọchị ndị ahu: Mgbe ndị nzukọ ahụ hapụrụ Pita na Jọn, ha gara kọọrọ ndị ụmụnna n'ime Kristi ihe ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara ha. Mgbe ha nụrụ nke a, ha ji otu olu kpeere Chineke, sị, “Onyenweanyị, gị onye kere eluigwe na ụwa na oke osimiri na ihe niile nke dị ha n'ime, gị onye sitere n'ike Mmụọ Nsọ gị mee ka nwodibo gị bụ nna anyị Devid sị, “N'ihi gịnị ka mba niile ndị amaghị Chineke ji eme oke mkpọtụ, ndị niile bi n'ụwa ji nọdụ na-atụgharị uche n'ihe efu?” Ndị eze nke ụwa jikeere onwe ha, ndị isi ọchịchị zukọkwara n'otu ebe imegide Onyenweanyị na onye o tere ude.” N'ime obodo a, ikwu eziokwu, Herọd na Pontus Paịlet zukọrọ, ha na mba ndị ọzọ amaghị Chineke, na ndị Izrel imegide nwodibo gị dị nsọ bụ Jesu onye nke Ị tere ude. Ha zukọrọ imezu ihe niile nke Ị sitere n'ike gị na uche nsọ gị nke Ị bụ ụzọ kwuo na ha ga-emezu. Ugbu a Onyenweanyị, nye ụmụodibo gi ike iji gbasaa ozi gi n'atụghị egwu ọbụla. Setịa aka gi ịgwọ ọrịa niile, ma kwe ka e gosi ọtụtụ ihe ịrịbaama, ka a rụkwaa ọrụ ebube dị iche-iche site n'aha Onye Nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jesu.” Mgbe ha kpechara ekpere, ụlọ ebe ha zukọrọ mara jijiji. Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu Chineke n'atụghị egwu ọbụla.

 

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  2: 1-3.4-6.7-9 (R.V 12D)

 

AZỊZA: Ańụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenu.

 

  1. Gịnị ka mba niile ji eme mkpọtụ, gịnị ka ndị ọgọ mmụọ ji ebu agha? Ndị eze ụwa na-enupụ isi; ndị ụmụ eze na-akpa nkata ọjọọ na-emegide Dinwenu na onye nke ya O tere ude. Ha na-ekwu sị, “Ugbu a k'anyị kụjie mkpara igwe ha ji achị anyị, k'anyị zọpụta onwe anyị n'aka ochịchị ha.” A/

 

  1. Mana onye ahụ oche eze ya dị n'eluigwe; no ala achị ọchị; Onyenweanyị na akwa ha emu, Ma mgbe ahụ O ji iwe gwa ha okwu, egwu ejide ha niile, O kwuru sị, “Nke a bụ eze nke m kwụbara na Zayọn, ugwu nke m dị nsọ. Aga m ekwupụta iwu nke Onyenweanyị. A/

 

  1. Onyenweanyị gwara m sị, 'Ị bụ nwa m, taata A bụrụla m Nna gị. Rịọ m arịrịọ, aga m enye gị mba niile, ka ha bụrụ ebe ọchịchị gị. Ị ga eji mkpara igwe kụwaa ha, ma kụrichaa ha dịka ite onye ọkpụ ite. A/

 

MBEKU

(Col. 3:1) Alleluia, alleluia! Ọ bụrụ na unu so Kristi bilie n'ọnwu na-achọnụ ihe dị n'eluigwe ebe Kristi nọ n'akanri nke Chukwu. Alleluia!

 

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (3:1-8)

Ọ bụrụ na amụgharịghị mmadụ ọzọ, ọ gaghi ahụ ala eze Chineke anya.

 

O nwere otu nwoke n'ime ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdemus, onye ọchịchị nke ndị Juu. Nwoke a bịakwutere Jesu n'otu abali, sị ya, “Rabaị (onye nkuzi) anyị maara na ị bu onye nkuzi sitere na Chineke. N'ihina ọ dịghị onye nwere ike irụ ihe ịrịbaama ndị a Ịna-arụ, ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” Jesu zara ya sị, “Ana m agwa gị eziokwu, ọ bụrụ na amụgharịghị mmadụ ọzọ, ọ gaghi ahụ ala eze Chineke anya.” Nikọdemus jụrụ ya sị, “Olee otu a ga esi mụgharịa mmadụ mgbe o tozuru dimkpa? O nwere ike iba nke ugboro abụọ n'afọ nne ya ka e wee mụgharịa ya ọzọ?” Jesu zara ya sị: “N'ịgwa gị eziokwu, ọ bụrụ na ejighị mmiri na Mmụọ Nsọ mụgharịa mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịba na ala eze Chineke. Ihe esi na-anụahụ mụọ bu anụahụ, ma ihe amụrụ site na Mmụọ Nsọ bụ mmụọ. ya atụla gị n'anya, na m sị, 'A ga-amụghariri gị ọzọ 'Ifufe na-efe ebe ọbụla ọ sọrọ ya. Ị na-anụ mkpọtụ ya, ma Ị maghị ebe o si abịa na ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dị onye ọbụla amụrụ site na Mmụọ Nsọ.”

 

Oziọma nke Osebụrụwa

Otito dịrị Gị Kristi.

 

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nara onyinye ndia sitere na aka Nzuko Gi, mee ka nnukwu añụrị nke Ị nyere anyị zuo oke n'eluigwe.  Site na  Kristi Dinwenu anyị.

 

UKWE ORIRI NSỌ

 Jesu biara kwụrụ n'etiti ndi na-eso ụzọ ya si ha: udo diri unu, Alleluia.

 

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu were obi ọma lekwasi ndi nke Gi anya, site n'ihe omimi nke Ista a, dubata anyị n'otito nke mbilite n'ọnwụ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE MBATA

O Dinwenu ijirila obara Gi gbaputa anyị sitena agbụrụ niile na asụsụ niile sitena mba niile na mmadụ niile. Ị meela k'anyị bụrụ Aleze nke Chukwu, Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Ekpere Mmeghe: 0 Chukwu nchekwube na okwukwe ndi aka ha di ocha, anyi ji umeala na-ario ka I mehe obi anyi, ka otosi ikpere Gi ekpere ma bunie aha Gi enu. Site na Kristi Dinwenu.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (5:34-42)

 Ha na-ańụrị na Chineke gụnyere ha na ndị kwesịrị ịnara nkpari n'ihi aha Jesu.

 

N’ ụbọchi ndi ahu: Otu onye nzukọ Sanhedrin ahụ bụ onye Farisii na onye nkuzi iwu Mosis, onye ndị Juu niile na-asọpụrụ, a na-akpọ Gamaliel, biliri, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ n'ezi nwaobere oge. Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel! Kpacharanụ anya n'ihe unu na-achọ ime ndị a. chetanụ na n'oge gara aga otu nwoke a na-akpọ Teudas biliri na-egosi onwe ya ka onye dị mkpa nke mere ụfọdụ ndi mmadụ ruru narị anọ ji sobe ya. Ma emesịrị gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya gbasachaa, otu ya adakpọọ. Mgbe otu Teudas dachara, otu onye Galili ana-akpọ Judas bilikwara n'oge ọgụgụ mmadụ, duhie ụfọdụ ndị Juu ka ha sobe ya. Ya onwe ya lakwara n'iyi, ndị ụmụazụ ya gbasachaa. Ka nke a pụtakwara ugbu a, ana m agwa unu, hapụnụ ha ma nyekwara ha efe; n'ihina ọ bụrụ na nzube nke a na ọrụ ha na-arụ bụ nke sitere  na mmadụ ọ ghaghị ịda. Ma ọ bụrụ na o si n'aka Chineke, unu enweghi ike ịkwatu ya ma ọ bụ kwusi ya. Kpacharanụ anya unu ka ọ ghara ịbụ na unu na-alụso Chukwu ọgụ.” Ndị nzukọ nabatara ndụmọdụ Gamaliel ma mgbe ha kpọbatara ndị ozi ahụ n'ụlọ, ha pịara ha ụtarị, tiere ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jesu ọzọ, bịa hapụ ha ka ha laa. Ndi ozi ahụ sịrị n'ụlọ nzukọ ahụ laa, na-ańụrị na Chineke gụnyere ha na ndị kwesịrị ịnara nkpari n'ihi aha Jesu. Ma kwa ụbọchị, ha ahapụghị ịdị na-akụzi ma na-ekwusa, n'ụlọ nsọ Chineke ma ọ bụ n'ụlọ ndị mmadụ, na Jesu bụ Kristi ahụ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  27:1.4.13-14 (R/v 4ac)

AZỊZA: Otu ihe ka m na-achọ, ka m biri n'ụlọ nke Dinwenu.

  1. Dinwenu bụ ihe na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu? Dinwenu m bụ ebe mgbaba m, onye ga eyi m egwu? A/
  2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenu, otu ihe ka m na-achọ. Ka m biri n'ụlọ nke Dinwenu ụbọchị niile nke ndụ m, ka m nweta ịdi ụtọ nke Dinwenu, ka m na-ahụ ya n'ụlọ nsọ ya. A/
  3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chinekem n'ala ndị dị ndu. Chekwube na Dinwenu. Obi sie gị ike; tụkwasi ya obi, chekwube na ya. A/

MBEKU: (Mt. 4:4) Alleluia, alleluia! 'Ọ bụghi naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n' okwu ọbụla nke si n'onu Chineke pụta.  Alleluia!

 

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:1-15)

O kesaara ha ndị ahụ niile nọdụrụ ala. Onye ọbụla riri otu o si chọọ.

 

N’oge ahu, Jesu gara n'ofe nke ọzọ nke osimiri Galili nke bụ osimiri Tiberias. Oke igwe mmadụ sobere ya, n'ihina ha hụrụ ọrụ ebube dị iche-iche ọ rụrụ site n'ịgwọ ndị ọrịa. Jesu rigooro n'elu ugwu, nọdụ ala n'ebe ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya. Ugbu a Emume nke Ngabiga bụ emume nke ndị Juu adịla nso. Jesu legharịrị anya hụ na oke igwe mmadụ na-abịakwute ya. Ọ jụrụ Filip sị, “Olee otu anyị ga-esi zụta achịcha ka ndị mmadụ a nwee ike iri ihe?” O kwuru nke a ka o wee nwalee Filip, ma ya onwe ya amaralarị ihe ọ ga-eme. Filip zara ya sị, “Narị dinarị abụọ agaghị azụtali achịcha ga-ezu ka onye ọbụla n'ime ha nweta ntakịrị.” Otu onye n'ime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saịmọn Pita wee sị ya, “O nwere otu nwatakịrị nwoke nọ n'ebe a ji ogbe achịcha ise na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ n'etiti igwe mmadụ ha otu a?” Jesu gwara ha sị, “Meenụ ka ndị mmadụ nọdụ ala.” Ahịhịa hiri nne dị n'ebe ahụ. Ndị mmadụ ọnụ ọgụgụ ha ruru puku ise nọdụrụ ala n'ebe ahụ. Jesu naara ogbe achịcha ise ahụ, mgbe o nyechara ekele, o kesaara ha ndị ahụ niile nọdụrụ ala. Otu ahụkwa ka o si kesaa azụ ahụ. Onye ọbụla riri otu o si chọọ. Mgbe ha rijuchara afọ, Ọ gwara ndị na eso ụzọ ya sị, “Kpokọtanụ iberibe achịcha fọdụrụnụ ka ihe ọbụla ghara ila n'iyi.” Ha kpokọtara ha ọnụ, kpojuo nkata iri na abụọ site n'iberibe fọdụrụ n'ogbe achịcha ise ahụ ndị mmadụ rifọrọ. Mgbe ndị mmadụ nọ n'ebe ahụ hụrụ ihe ịrịbaama nke Jesu rụrụ, ha sịrị, “N'ezie onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa n'ụwa!” Mgbe Jesu matara na ha na-achọ ịbịa dọkpụrụ ya n'ike mee ya eze, o wezụgara onwe ya ọzọ, gaa n'ugwu nọdụ naanị ya.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

 

EKPERE NHUNYE

Nna, nara onyinye nke ndị ezi na ụlọ Gị, k'anyị kwudosike na ndụ nke Ị nyere anyị, k'anyị were nata onyinye nke ikwere anyị na nkwa. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Kristi Dinwenu anyị nwụrụ maka njọ anyị, okulitere n'onwu ka ome k'anyi tosi inwe ndụ, Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Onyenweanyị, lekwasi anya na ndị Ị zọpụtara site n'ọnwụ Kristi, mee k'anyị bụ ndi azọpụtagooro site n'ahụhụ na onwụ ya ńụrịa oge niile na mbilite n'ọnwụ ya, Onye di ndụ n'achị ebeebe ebeebe.

SATURDAY OF THE SECOND WEEK OF EASTER, YEAR B

UKWE MBATA

Unu bụ ndi Chineke họtara ka ha bụụrụ ndi nke ya. Ka unu na-eto onye ahu kpọpụtara unu na ochichiri banye na ihè nke ya di egwu, Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Wezugara anyi, O Dinwenu, ahuhu diri iwu nke njo, bu nke isitegolu na ihe omimi nke paskal mebie site na mbilite n'onwu nke nwa Gi Kristi. Site na Kristi Dinwenu anyi.  

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (6:1-7)

Ha họpụtara umunwoke asaa ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ.

 

N'oge a, ka ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu na-abawanye, esemokwu dapụtara: ndị Juu ndi a mụrụ na mba, ndị na-asụ asụsụ Grik, tamuru ntamu megide ndị Juu ndị a mụrụ n'ụlọ ndị na-asụ asụsụ Hibru. Iwe ha bụ na a na-eleghara ụmụnwaanyị ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya n'ihe ndị a na-eke kwa ụbọchị. Ndị ozi iri na abụọ ndi ahụ kpọro ọgbako nke ndị na-eso ụzọ Jesu, gwa ha si, o zighị ezi na anyị ga-ahapụ igbasa oziọma Chineke na-ahụ maka ihe oriri. Ya bụ ụmụnna n'ime Kristi, họpụtanụ n'etiti unu ụmụnwoke asaa ndị unu tụkwasara obi, jupụtakwara na Mmụọ Nsọ na amamihe, ndị anyị ga-etinye ọrụ a n'aka. Anyị onwe anyị ga anọgidesi ike na ikpe ekpere na n'ikwusa oziọma. Atụmaatụ a masịrị mmadụ niile. Ha họpụtara Stivin, bu nwoke jupụtara n'okwukwe na Mmụọ Nsọ, na Filip, Prokọrọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas, na Nịkọlas onye Antịọk a kpọbatara n'okpukpe ndị Juu.Ọgbakọ ahụ chere mmadụ asaa ndị a n'ihu ụmụazụ, ụmụazụ kpeere ha ekpere, bikwasa ha aka n'isi. Okwu Chineke wee na-aga n'ihu. Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu na-abawanyekwa nke ukwuu na Jerusalem. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu nabatakwara okwukwe nke ndị otu Kristi.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 32:1-2.4-5.18-19 RI v.22) AZỊZA: Ka ịhụnaanya gị dị n'ebe anyị nọ, O Chineke, ebe nchekwube anyị dị na gị.

  1. Tierenụ Chineke mkpu ọńụ ndị eziomume, n'ihina otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ. Werenụ ụbọ akwara too Chineke; werenụ une kụọrọ ya egwu. A/
  2. N'ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu. Ọ na-akwụdosiike n'ọrụ ya niile. Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n'anya, ịhụnaanya ya jupụtara n'ụwa. A/
  3. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya, ndị niile tụkwasịrị obi ha n'ịhụnaanya ya, ka o wee zọpụta mkpụrụ obi ha na ọnwụ. A/

MBEKU: (Rom. 6:9) Alleluia, Alleluia! Ebe Chineke mere ka Kristi si n'ọnwụ bilie, Ọ gaghị anwụkwa ọzọ, ọnwụ enweghịkwa ike ọzọ n'ebe ọ nọ. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:16-21)

Ha hụrụ Jesu ka ọ na-aga ije n'elu osimiri.

N'oge uhuruchi ndị na-eso ụzọ Jesu gbadatara n'oke osimiri. Ha banyere ụgbo igafe osimiri ije Kapanaum. Mgbe ahụ ọchịchịrị agbala, ma Jesu abịakwutebeghị ha. Ebilimmiri tibere n'ihina oke ifufe na-efe. Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka maịl atọ ma ọ bụ anọ mgbe ha hụrụ Jesu ka ọ na-aga ije n'elu osimiri, na-abịaru ụgbọ ha nso. Egwu tụrụ ha. Ma Jesu sịrị ha, “Ọ bụ m; egwu atụla unu.” Ha nwere obi ańụrị ịkpọbata ya n'ime ụgbọ, ma ozigbo ahụ, ụgbọ ha ruru n'ala ebe ha na-aga.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

 

EKPERE NHUNYE

Nna dị ebere, doo onyinye ndia asọ ma mee ka aja nke Mmụọ anyị na-ehunyere Gị mee anyị onyinye dị ebeebe n'ihu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Nna achọrọ ka mu na ndị ahụ i nyere m nọrọ, ka ha wee hu otito nke inyere m. Alleluyia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Dinwenu, anyị esonyego na emume nke ihe omimi a dị asọ, anyị jị umeala arịọ Gị ka ihe nwa Gị nyere anyị na-iwu ka anyị na-eme na ncheta nke ya mee ka anyị na-eto na-ihunaanya.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

 

UKWE MBATA

O Chukwu oge I na-edu ndị nke Gị ma binyekwara ha, ala mara jijiji, mmiri siri n'eluigwe zoo. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Dinwenu, onye sitere na nzoputa nke uwa wetara anyi aja nke pascha, biko nụrụ arịrịọ ndị nke gị ji umeala rịọ. ka Kristi nnukwu Ụkochukwu anyi riotara anyi arịrịọ ya na ma ka anyi site na oyiyi anyi yiri ya nweta mgbahara, ma sitekwa udị nke ya na Gi tọrapụ anyi na njọ.  Site na Kristi Dinwenu  anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (5:27-33)

Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndi a, anyị na Mmụọ Nsọ.

N’ụbọchi ndi ahụ; Ha kpọtara ndị ozi ahụ kwụba ha n'etiti ọgbakọ ikpe nke Sanhedrin. Onye isi nchụaja jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ kwa anyị dosiri unu aka na nti ike ka unu ghara ikuziri ndị mmadụ ihe n'aha a, mana unu agbasaala ozi unu n'obodo Jerusalem niile na-achọ ibogide anyị ọnwu nwoke a. Pita na ndị ọzọ zaghachiri sị, “Anyị ga-egerịrị Chineke nti karịa mmadụ. Chineke nke nnanna anyị ha mere ka Jesu si n'ọnwụ bilie, bụ onye unu kpọgburu n'elu osisi. Chineke buliri ya elu nye ya ọnọdụ n'aka nri ya dịka onye ndu na onye nzọpụta, iji wetara ụmụ Izrel nchegharị na mgbaghara nke njọ. Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndi a, anyị na Mmụọ Nsọ nke Chukwu nyere ndị niile na erubere ya isi. Mgbe ha nụrụ nke a, Ọ gbawara ha obi ha wee chọọ igbu ndị ozi ahụ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 34:2,  9.17-18.19-20. R/v. see 7a)

AZỊZA: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

  1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile, Otito ya ga-adi n'egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla. Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma! Ańụrị na-adịrị onye gbabara n'Onyenweanyị. A/
  2. Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n'ebe ndị ajọ omume nọ, Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n'ụwa. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ za ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile. A/
  3. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso, na enyere ndị dara mba na mmụọ aka. Ọ bụ eziokwu na nsogbu onye eziomume karịrị akarị, mana Onyenweanyị na-esi na ha niile zọpụta ya. A/

MBEKU: (Jọn. 20:29) Alleluia, alleluia!  I kwere Thomas, maka na ịhụla m,  Ọ bụ Dinwenu m na-ekwu, Ngozi dịrị ndị na-ahụnụro ma kwere. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (3:31-36)

Chineke hụrụ nwa ya n'anya, o ji were ihe niile nye ya n'aka.

 

Jeso gwara Nicodemus si: Onye si n'elu bịa kacha ihe niile elu, ma onye si n'ụwa pụta bụ mmadụ nke ụwa, okwu ya bụ naanị maka ihe nke ụwa. Onye si n'eluigwe bịa kacha ihe niile elu. Ọ na-agba aka ebe banyere ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ ma ọ dịghị onye na-anara ya. Onye nabatara aka ebe ya ji nke a mere akara na  Chineke bụ eziokwu. Onye ahụ Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke n'ihi na Chineke na-enyezu Mmụọ enyezu. Chineke hụrụ nwa ya n'anya, o ji were ihe niile nye ya n'aka. Onye kwere na nwa ahụ nwere ndụ ebeebe, ma onye na-ekweghị na ya agaghị ahụ ndụ anya, kama ikpe ọmụma nke Chineke ga-adịrị ya.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

 

EKPERE NHUNYE

Dinwenu ka ekpere na aja onyinye anyị biakwụte gị, ma site na nwụcha nke amara Gị, ka anyị wee dị ka ihe omimi nke ihunanya gị dị ike. Site na Kristi Dinwenu anyị

UKWE ORIRI NSỌ

Lee, anọnyeere m unu oge niile ruo na njedebe nke oge.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Chineke ji ike niile, onye na-enyeghachi anyị na-ndụ  ebebe n'ime mbilite na-onwu Kristi anyị na arịọ Gị, ka itinyekwuo n’ime anyị mkpụrụ nke Sacramenti Paska ma wunye n’ime obi anyị ike nke nri nzopụta. Site na Kristi Dinwenu anyị.

TUESDAY OF THE SECOND WEEK OF EASTER, YEAR B

 

UKWE MBATA

K'anyị tienu mkpu ọṅụ ma nyee Chineke nke ihe niile otito n'ihi na ọ bụ eze anyị, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chukwu ji ike niile, nyere anyi aka ikwuputa ike nke mbilite n'onwu Dinwenu anyi. Mee k'anyi bu ndi nabatara ihe ngosi nke ihunaanya Kristi bia keta oke na ndu ebeebe nke O na- egosiputa. Site na Kristi Dinwenu anyi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọrụ ndịozi (4:32-37)

Jikọrọ ọnụ n'otu mmụọ na n'otu obi

N'oge ahụ, ọha ndị kwere na Kristi jikọrọ ọnụ n'otu mmụọ na n'otu obi, nwekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị onye ọbụla n'ime ha na-asị na ihe ọbụla ya nwere bụ nke naanị ya. Ha ji ike ha niile na-agba aka ebe banyere mbilite n'ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu. Amara nke Chineke pụtakwara ihe n'ahụ ha niile n'ụba n'ụzọ pụrụ iche. Ọ dịghị onye ọbụla n'etiti ha a hapụrụ ka ọ nọdụ n'ụkọ. Ndị nwere ala ubi, ma ọ bụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, dobe ha n'ụkwụ ndị ụmụazụ. Ha na ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọbụla n'otu n'otu dịka mkpa ya sị dị. Otu a ka Josef, bụ onye Levai, onye amụrụ n'ala Saịprọs, onye ndị ozi kpọrọ Banabas nke pụtara: “Nwa nke nkasiobi,” si ree ala ubi weta ego ya dobe n'ukwụ ndị ụmụazụ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 91:1-2.5)

AZỊZA: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.

  1. Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe; kere ike n'ukwu ka aji O mere ka ụwa kwụrụ chim; nke na-enweghị ike ịkwagharị ya. A/
  2. O mere ka uwa kwụrụ chim; nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya. Oche eze Gị dị bido na mgbe ochie, Ị dirii tupu e kee ụwa. A/
  3. Iwu Gị niile kwụsiri ike, ebe obibi Gị dị nsọ Onyenweanyị ruo mgbe ebighịebi. A/

MBEKU: (John3:6) Alleluia, Alleluia!  Jesu Kristi, ị bụ onye akaebe dị ntụkwasịobi, onye mbu si na ndị nwụrụ anwụ pụta, ị hụrụ anyị n'anya, were obara Gị sachapụ njọ anyị. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (3:7-15)

O nwebeghị onye ọbụla rịgorola n'eluigwe mbụ ma ọ bụghị naanị Nwa nke mmadụ onye sị n'eluigwe rịdata.

 

N’oge ahu: Jesu gwara Nịkọdemus sị, Ya atụla gị n'anya, na m sị, 'A ga-amụghariri gị ọzọ' Ifufe na efe ebe ọbụla ọ sọrọ ya. Ị na anụ mkpọtụ ya, ma Ị maghị ebe ọ sị abịa na ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dị onye ọbụla amụrụ site na Mmụọ Nsọ,” Nịkọdemus jụrụ ya sị, “Olee otu nke a ga-esị mee?” Jesu jụrụ ya sị, “Ị bụ onye nkuzi Izrel ma Ị maghị ihe ndị a? N'ezie agwa m gị, anyị na-ekwu ihe anyị maara na-agbakwa aka ebe ihe anyị hụrụ, ma unu anaghị anara ịgba aka ebe anyị. Ọ bụrụ na Ị kwereghị mgbe m gwara gị ihe nke ụwa, olee otu Ị ga esi kwere ma m kọọrọ gị ihe nke eluigwe? O nwebeghị onye ọbụla rịgorola n'eluigwe mbụ ma ọ bụghị naanị Nwa nke mmadụ onye sị n'eluigwe rịdata. Dịka Mosis sị welie agwọ elu n'ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esị welie Nwa nke mmadụ elu. Ka onye ọbụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebeebe.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

O Dinwenu, mee, anyị na-arịọ Gị, k'anyị nwe mmasi n'ebe ihe omimi nke Paska dị, ka mgbanwo nke ọ na eweta nọgịde n'ọrụ n'ime anyị, ma bụrụ isi ańụrị anyị na-enweghị ube. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Kristi tara ahuhu ma bilie n'onwụ ka o wee baa n'ebube ya, Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nụrụ arịrịọ anyị, O Dinwenu, k'onyịnye nyekọrita a kacha nsọ, bụ nke I si na ya gbapụta anyị wetere anyị enyemaka Gị na ndụ nke a, ma nyekwazi a anyị nkwa nke ndụ ebeebe n'ụwa ọzọ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

 

WEDNESDAY OF THE SECOND WEEK OF EASTER, YEAR B

Ukwe Mbata

A ga m agbara gị aka ebe n'ụwa, O Dinwenu. A ga m a kọọrọ umu nne m gbasara gị, Alleluia

EKPERE MMEGHE

Chineke onye-ebere, Ị jụpụtala obi anyị na nchekwube nke mbilite n'ọnwu site n'ikpọghachi mmadụ n'ugwu mbu ya. Mee ka anyị bụ ndị na-ebipụta ihe omimi nke a n'afọ ọbụla, bịa ketakwa ya n'ịhụnaanya na enweghị njedebe. Site na Kristi Dinwenu anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (5:17-26)

Ụmụnwoke ahụ unu tụbara n'ụlọ mkpọrọ kwụ n'ụlo nsọ Chineke na-akuziri ndị Juu ihe.

N'ụbọchị ndị ahụ: Obi onye isi nchụaja na ndị otu ya so n'otu ndị Sadusii jupụtara n'ekworo, ha wee bilie jide ndi ozi tụkpuo ha n'ụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. Mmụọ ozi nke Onyenweanyị bịara n'abali, meghee ọnụ ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndị ozi ahụ, sị, ha, “Gaanụ guzoro n'ụlọ nsọ Chineke, gwanụ ọha ndị mmadụ maka ndụ ọhụrụ nke a.” Mgbe ndị ozi ahụ nụrụ nke a, ha banyere n'ụlọ nsọ Chineke n'ụtụtụ, malite ikuzi ihe. Onye isi nchụaja na ndị otu ya bịara kpọọ ọgbakọ ikpe nke ndị Juu na nzukọ ndị okenye Izrel niile. Ha wee ziga ozi n'ụlọ mkpọrọ, nye iwu ka akpụta ndị ozi ahụ n'ihu ha. Mgbe ndị ha ziri ozi bịaruru, ha ahụghị ndị ozi ahụ n'ụlọ mkpọrọ. Ha wee laghachi kọọrọ ndị nzukọ Sanhendrin ihe ha hụrụ, sị, “Anyị hụrụ ụlọ mkpọrọ ka a kpọchiri ya nke ọma, hụkwa ndị nche ka ha nọ na nche n'ọnụụzọ niile. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ, Ọ dịghị onye ọbụla anyị hụrụ n'ime ha.” Mgbe ochịagha nke ụlọ nsọ Chineke na ndị isi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị otu e si achọ ha achọ. Ha na atụghari n'uche ha ihe nke a ga apụta. N'oge ahụ otu nwoke batara si ha, “Geenụ ntị! Ụmụnwoke ahụ unu tụbara n'ụlọ mkpọrọ kwụ n'ụlo nsọ Chineke na-akuziri ndị Juu ihe.” Mgbe ahụ ọchịagha nke ụlọ nsọ Chineke na ndi agha nke ụlọ nsọ Chineke na ndi agha ya jere kpọta ndi ozi ahu n'ihu nzukọ. Ma ha akpụtaghị ha n'ike, n'ihina ha na atụ egwu, ka ọha ndị Juu ghara ịtụ ha okwute.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 34:2-3.4-5.6-7.R-9 (R.V 7a)

AZỊZA: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

  1. Aga m eto Onyenweanyị n'oge niile, Otito ya ga-adi n'egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla. Mkpụrụobi m na egori n'Onyenweanyị, ka ndị umeala nụrụ ma ńụrịa. A/
  2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị, soronụ m too aha ya. akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ zaa m, Ọ zọpụtara m n'egwu niile na-atụ m. R/
  3. Ihu ọbụla chere n'ebe Onyenweanyị nọ na-amụke-amụke, ihere anaghị eme ya ma ọli. Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye, Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile. A/

 

  1. Mmuọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha; Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si di mma! Ańụrị na-adịrị onye gbabara n'onyenweanyị A/

MBEKU: (Jọn. 3:16) Alleluia, Alleluia! N'ihina Chineke hụrụ ụwa n'anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n'iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (3:16-21)

Chineke zitere nwa ya n'ime ụwa, ka azọpụta ụwa site n'aka ya.

Jesu gwara Nịkọdemus sị: “N'ihina Chineke hụrụ ụwa n'anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n'iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe. Chineke zitere nwa ya n'ime ụwa, ọ bụghị ka ọ maa ya ikpe kama ka azọpụta ụwa site n'aka ya. A gaghị ama onye ọbụla kwenyere na ya ikpe, ma onye na-ekwenyeghị a malarị ya ikpe n'ihina o kwenyeghị n'aha sọ otu nwa Chineke. Nke a bụ ikpe ahụ, na ihè ahụ abịala n'ime ụwa, ma ndị mmadụ hụrụ ọchịchịrị n'anya karịa ihè, n'ihi omume ọjọọ. Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ na-akpọ ihè asị. Ọ naghị abịakwute ihè, ka a ghara ime ka ajọ omume ya pụta ihè. Ma onye na-eme eziomume na-abịakwute ihè ahụ, ka eziomume ya pụta ihè, na o mere ya n'itu egwu nke Chineke.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu Chineke, site na mgbanwe onyinye nke a, anyị na Gị na-ekekọrịta ndụ Gị dị nsọ. Mee ka ihe ọbụla anyị na-eme, bụrụ ihe sitere n'amamihe nke eziokwu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị

UKWE ORIRI NSỌ

Onyenweanyị kwụrụ si, ahọọrọ m gi n'elu ụwa ka I mita  mkpụrụ ga adigide. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna dị ebere, mee ka ihe omime nke a nye anyi ebum na uche ọhụru, bịa were kpọbata anyị na ndụ ọhụrụ n'ime Gị. Site na  Kristi Dinwenu anyị