UKWE MBATA

Nwa Atụrụ ahu egburu egbu tozuru etozu inara ike, amamihe na nsopuru. Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile mee ka anyị bụ ndị hụgoro amara nke mbilite n'ọnwụ nke Dinwenu, jiri onwe anyị banye na-ndu ọhụrụ site na ihunaanya nke mmụọ nsọ gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (9:1-20)

Nwoke a bụ onye m họputara ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ebugara mba ndị amaghị Chineke oziọma.

N'ụbọchi ndi ahụ: Sọl ka nọ na-aba mba na ọ ga-egbu ndị na-eso ụzọ Onyenweanyị. Ọ gakwuuru onye isi nchụaja rịọ ya ka o denye ya akwụkwọ maka ụlọ nzuko ndị Juu nọ na Damaskọs, ka o wee nwee ike ịkpụrụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị niile ọ ga-ahụ na-eso ụzọ ahụ, kpụga Jerusalem. Ka ọ na abịaru Damaskọs nso, oke amụma gburu, ihè dị egwu achakwasị ya. Ọ dara n'ala, nụ otu olu ka ọ na-asị ya, “Sọl! Sọl! Gịnị mere iji ebuso m agha?” Sọl ajụọ sị, “Onye ka ị bụ Onyenweanyị” Ọ zaghachiri sị, “Abụ m Jesu, onye Ị na ebuso agha! Bilie banye n'ime obodo ebe a ga-agwa gị ihe ị ga eme.” Ihe a riri ndi ha na Sọl so aga ọnụ. Ha nụrụ olu ahụ ma ha ahụghị onye kwuru ya. Sọl si n'ala bilie, saghee anya ya, o nweghịkwa ike ịhu ihe ọbụla. N'ihi nke a, ha sekpụrụ ya n'aka dubata ya na Damaskọs. Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ. O righị ihe ọbụla nke ọ na ańụ ihe ọńụṅụ. E nwere otu onye na-eso ụzọ Jesu bi na Damaskos ana-akpọ Ananịyas. Onyenweanyi kpọrọ ya oku n'ọhụ sị, “Ananịyas!” Ọ zaa ya sị, “Lee m, Onyenwe m!” Onyenweanyị sịrị ya, “Bilie gaa n'ama ahụ a na-akpọ ụzọ kwụ ọtọ. Ị garuo jụọ n'ụlọ nwoke a na-akpọ Judas, maka otu nwoke onye Tasọs, aha ya bụ Sọl. Ọ nọ ebe ahụ ugbu a na-ekpe ekpere, ọ hụrụ ọhụ ebe otu nwoke a na-akpọ Ananịyas batara, bịkwasa ya aka n'isi ka o hụbakwa ụzọ.” Ananịyas zara sị, “Onyenweanyị, ọtụtụ mmadụ akọọrọla m ọtụtụ ihe maka nwoke a banyere ihe ọjọọ na arụrụ ala ọ rụrụ n'ebe ndị nso gị na Jerusalem nọ. Ugbu a, ọ natara ike n'aka ndi isi nchụaja iji jide ndị niile na-akpọkụ aha gị.” Onyenweanyị zara ya sị, “Gaba! N'ihina ahọpụtala ya ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ebugara mba ndị amaghị Chineke, ndị eze na ụmụ Izrel aha m. Aga m egosi ya na ọ ga-atarịrị ahụhụ n'ihi aha m. Ananịyas gabara banye n'ụlọ ahụ, bikwasa Sọl aka n'isi si, “Sọl, nwanne m! Onyenweanyị Jesu onye mere ka ị hụ ya anya n'ụzọ ị si bịa, zitere m ka m mee ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.” Ozigbo ahụ ihe dịka mkpekere azụ siri ya n'anya dapu. Ọ hukwa ụzọ ọzọ, o bilizie mee ya mmirichukwu. O rie nri, nwetakwa ume. Sọl nọnyere ndị na-eso ụzọ Jesu ụbọchị olemaole na Damaskọs. N'atụfụghị oge, ọ gagharịrị n'ụlọ nzukọ niile nke ndị Juu na-ekwusa maka Jesu, na-asị, “Ọ bụ Nwa nke Chineke.”

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (Ps. 117:1-2 (R/v. Mk. 16:15)

AZỊZA: Gaanụ na mba niile, kwusabanụ oziọma.

 

  1. Toonụ Onyenweanyị, mba niile, Toonu ya, ndị mmadụ niile. A/
  2. N'ihina ịhụnaanya ya siri ike, nkwụdosiike ya na-adị ọkpụ. A/

MBEKU: (Jọn. 6:56) Alleluia, alleluia! Onye ọbụla nke na-eri ahụ m, nke na-aṅụkwa ọbara m, na-anọgide n'ime, mụ onwe m n'ime ya. Dinwenu n'ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:52-59)

Ahụ m bụ nri n'ezie, ọbara m bụkwa ihe ọńụńụ n'ezie.

N'oge ahụ: Ndị Juu malitere ịrụrịta ụka n'etiti onwe ha na-asị: “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị ahụ ya ka anyị rie?” Jesu wee sị ha, “Ọ bụrụ na unu erighị ahụ nwa nke mmadụ, Ọ bụrụkwa na unu ańụghị ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ n'ime unu. Onye na eri ahụ m, na ańụkwa ọbara m nwere ndụ ebeebe. Aga m akpọlite ya n'ọnwu n'ụbọchị ikpeazụ. N'ihina ahụ m bụ nri n'ezie, ọbara m bụkwa ihe ọńụńụ n'ezie. Onye ọbụla nke na-eri ahụ m, nke na-ańụkwa ọbara m, na-anọgide n'ime m, mụ onwe m n'ime ya. Dịka Nna ahụ dị ndụ siri zite m, m site na ya na-adị ndụ, otu ahụ ka onye na-eri m ga-esite na m na-adị ndụ. Nke a bụ nri ahụ nke si n'eluigwe rịdata. Ọ bụghị ụdị nri ahụ nke nna unu ha riri ma nwụọ, kama onye na-eri nri a ga-adị ndu ruo mgbe ebighịebi.” Jesu kwuru ihe ndị a n'ụlọ nzukọ mgbe ọ na-akụzi ihe na Kapanaum.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

 Nna di ebere, doo onyinye ndia asọ ma mee ka aja nke Mmụọ anyị na-ehunyere Gị mee anyị onyinye dị ebeebe n'ihu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyi.

UKWE MBATA

Ezigbo onye nche atụrụ ebịligo n'ọnwu. Onye were ndụ ya nye maka ụmụ atụrụ ya. O bịlịgo n'ọnwụ, Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nụrụ arịrịọ anyi, Chineke jị ike niile, mee,  dika anyị na-ahapụ ndụ ochie anyị, kanyi wee bie ndụ dịka Kristi  makana site na ọgwụgwọ nsọ nke Paska ịmela k'anyi nomie Kristi.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (6:8-15)

Ma ha enweghị ike ịkwụgidenwu amamihe ike nke Mmụọ Nsọ Stivin ji agwa ha okwu.

N'ụbọchi ndi ahụ: Ebe Stivin jupụtara n'amara na ike nke Mmụọ Nsọ, ọ rụrụ oke ọrụ ịtụnaanya na ihe ịrịbaama dị iche-iche n'etiti ndị Juu. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu ndị sị n'ụlọ nzukọ nke “Ndị nweere onwe ha” (dịka esi akpọ ya) na nke ndị Saịriin, Na nke ndị Elegzandrịa, na nke ndị si Silisia na Eshịa bịara rụsa Stivin ụka. Ma ha enweghị ike ịkwụgidenwu amamihe ike nke Mmụọ Nsọ Stivin ji agwa ha okwu. Ihe ha meziri bụ isi na nzuzo kpalie ndị mmadụ ndị kwuru sị: “Anyị nụrụ mgbe ọ na ekwu okwu megide Mosis, na Chineke.” Ka ha kpalitechara ndị mmadụ, ndị okenye na ndị odeakwụkwọ megidere Stivin, ha jidere Stivin na mberede kpụga ya n'ụlọ ikpe. Ha kpọtara ndị bịara gbaa aka ebe na-asị, “Nwoke a enwebeghị mgbe ọ kwụsịrị ịkwu okwu megide ụlọ nsọ na iwu Mosis. Anyị nụrụ mgbe ọ na ekwu na Jesu onye Nazaret ga akwatu ụlọ nso nke a, gbanwekwa omenaala niile nke Mosis nyere anyị n'aka idobe.” Mgbe ha legidere ya anya n'ihu, ndi niile nọ n'ụlọ ikpe ahụ hụrụ na ihu ya na-amuke ka nke mmụọọma.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS. 119:23-24.26-27.29-30  (R/V.  IB)

AZỊZA: Ngọzi na-adịrị ndị omume ha kwụ ọtọ.

  1. N'agbanyeghị na ndi ọchịchị na-agba izu imegide m, aga m na achịgharị okwu Gị n'uche m. Iwu Gị na-atọ m ụtọ, na-adụkwa m ọdụ. A/
  2. Mgbe m kwupụtara omume m, ị zara m, ugbu a, kuziere m iwu Gị. Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ Gi pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya Gị n'obi m. A/
  3. Ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ, ma nye m amara nke iwu Gị. Ahọrọla m ikwụdosiike, atụkwasịrị m obi n'iwu Gị. A/

MBEKU: (Mt. 4:4) Alleluia, alleluia!, Ọ bụghi naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n' okwu ọbụla nke si n'onu Chineke pụta. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:22-29)

“Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke ga-adigide ruo ndụ ebeebe.”

 

Ka Jesu zụchara puku mmadụ ise ndị ahụ, ụmụazụ ya hụrụ ya ka Ọ na-aga ije n'elu mmiri. N'ụbọchị nke ọzọ ndị mmadụ nọọrọ n'ofe nke ọzọ nke osimiri hụrụ na naanị otu ụgbọ dịzị n'ebe ahụ. Ha matakwara na Jesu esoghị ndị na-eso ụzọ ya baa n'ụgbọ, kama naanị ndị na-eso ụzọ ya jere. Ka osila dị, ụgbọ ndị ọzọ sị Tiberias bịaruru nso n'ebe ahụ igwe ndị mmadụ riri achịcha ahụ ka Onyenweanyị nyechara ekele. Mgbe ha hụrụ na Jesu na ndị na-eso ụzọ ya anọghị n'ebe ahụ, ha banyere na ụgbọ ndị ahụ ga Kapanaum, na-achọ Jesu. Mgbe ha hụrụ Jesu n'ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ha jụrụ ya sị, “Rabaị (onye nkuzi) olee mgbe ị bịara ebe a?” Jesu zara ha: “Ana m agwa unu eziokwu, ọ bụghị maka ọrụ ebube unu hụrụ ka unu ji achọ m kama ọ bụ maka na unu ji achịcha rijuo afọ. Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke ga-adigide ruo ndụ ebeebe, nke nwa nke mmadụ ga enye unu. N'ihina ọ bụ na ya ka Chineke Nna kara akara nke ịrịbaama.” Nke a mere ha ji juo ya sị, “Kedu ihe anyị ga na emerịrị ka ọ bụrụ na anyị na arụ ọrụ Chineke?” Jesu zaa ha, “Nke a bụ ọrụ nke Chineke: ka unu kwenye na onye ahụ nke o zitere.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

 

EKPERE NHUNYE

Dinwenu nara ekpere anyị na onyinye anyị. Mee ka anyị tozuo oke na sakramenti nke ịhụnanya Gị site na ịgbaghara mmehie anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

UKWE ORIRI NSỌ

Onyenweanyị kwụrụ si; udo ka m na-ahapụrụ unu, udo nke m ka m na-enye unu. Udo m na-enye abughi nke ndị ụwa na-enye. Alleluia.

 

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu  ji ike niile, Ị nyeghachila  anyị ndụ site na ikpọlite Kristi n'ọnwụ. Were sakramenti nke Ịsta a gba anyị ume, mee ka anyị nweta ike nzọpụta ya site na ndụ anyị na-ebi. Site na Kristi Dinwenu anyị .

UKWE MBATA

Sitena mmirichukwu, anyị esorola Kristi nwụọ ọnwụ ma sorokwa ya kulie na ndụ ọhụrụ maka na anyị kwenyere n'ike nke Chukwu onye kunitere ya n'onwu. Alleluia

 

EKPERE MMEGHE

Chineke Nna anyị, site na mmiri nke baptism, Ị nyere ndị kwerenụ ndụ ọhụrụ. Biko mee ka anyị gharakwa idabanye kwa ọzọ na mmegharị anya nke ekwensu kama ka anyị nogidesie ike na ndụ Ị nyere anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (9:31-42)

Nzuko Kristi niile kwudosiriike na-abanwanye na agbamume nke Mmuo Nsọ.

 

N'ụbọchi ndi ahụ: N'ihi ya nzukọ Kristi niile dị n'ala Judia, Galilee na Sameria nwere udo. Ọ kwụdosiriike na-abawanye site n'ịtụ egwu nke Onyenweanyị na agbamume nke Mmụọ Nsọ. Ka Pịta na-agagharị na-agbasa oziọma, ọ gakwara hụ ndị otu Kristi bi n'obodo a na-akpọ Lida. N'ebe ahụ, ọ hụrụ ọtu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, a na-akpọ Eniyas nke nọrọla n'akwa ọrịa afọ asatọ. Pịta sịrị ya, “Eniyas! Jesu Kristi agwọọla gị! Bilie, dozie akwa gị “Ozigbo ahụ o bilie. Ndị niile bi n'obodo Lida na Sherọn hụrụ ọrụ ebube nke a, chegharịa, bịakwute Onyenweanyị. Na Jopa, o nwere otu nwaanyị na-eso ụzọ Jesu aha ya bụ Tabita, nke pụtara Dọkas n'asụsụ Grik. Ndụ nwaanyị a jupụtara na ezi ọrụ, na ọrụ ebere n'ebe ụmụogbenye nọ. N'oge ahụ, nwaanyị a dara ọrịa, nwụo. Ka ha sachara ya ahụ, ha nyibere ya n'ụlọ elu. Ebe Lida dị Jopa nsọ, ndị na-eso ụzọ Jesu bi na Jopa nụrụ na Pịta nọ na Lida, ziga ụmụnwoke ka ha rịọ Pịta sị, “Biko, were ọsọ bịakwute anyị”. Pita biliri soro ha gaba. Oge ọ bịarụrụ Jopa, ha duuru ya rịgooro n'ụlọ elu ahụ. Umụnwaanyị ajadụ gbara ya gburugburu na-ebe akwa, na-egosi Pịta uwe ndị Dọkas dụụrụ ha ka o dị ndụ. Pịta chụpụrụ ha niile n'ezi, gbuo ikpere n'ala kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihụ sị, “Tabita, bilie!” Nwaanyị ahụ meghere anya ya. O kuliri mgbe ọ hụrụ Pịta. Pịta nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ, kpọkwaa ndị ahụ kwere na Kristi na ndị ajadụ nwaanyị ahụ, kpọnye ha ya na ndụ. Akụkọ maka nke a gbasara n'ala Jopa niile. Ọtụtụ ndị mmadụ kweere n'Onyenweanyị.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 116:12-13.14-15.16-17. R/V. 12)

AZỊZA: Kedụ ihe m ga enye Onyenweanyị? Maka ihe ọma niile o mere m.

  1. Kedụ ihe m ga enye Oneyenweanyị? Maka ihe ọma niile o mere m. Aga ebuli iko nzọpụta, wee kpọkue aha nke Onyenweanyị. A/
  2. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị, n'ihu ndị nke ya niile. Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ, n'ebe Onyenweanyị nọ. A/
  3. Onyenweanyị abụ m nwodibo gị, nwa nwaanyị ezigbo omume, ị tọpụla m n'agbụ. Aga m achụrụ gị aja ekele wee kpọkue aha nke Onyenweanyị. A/

MBEKU: (Jọn. 6:63, 68) Alleluia, alleluia! Okwu Gị Dinewnu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ, ngị jị okwu nke ndụ ebeebe. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:60-69)

Onye ka anyị ga-ejekwu? O bụ ginwa ji okwu nke ndu ebeebe.

N'oge ahụ: Mgbe ọtụtụ n'ime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a ha sịrị, “Okwu nke a tara akpụ, onye ga-anabata ya?” Jesu matara n'ime onwe ya, na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu banyere okwu a. Ọ sịrị ha, “Okwu a, ọ na-ewute unu? Olee otu ọ ga-adịzi ma a sị na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n'ebe ọ nọrịị na mbụ? Ọ bụ mmụọ na enye ndụ, anụahụ enweghị ihe ọ bụ. Okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ma o nwere ụfọdụ n'ime unu ndị na-ekwenyeghị.” N'ihi na Jesu mataara site na mbụ ndị na-ekwenyeghị n'ime ha, na onye ọ bụ nke ga-arara ya nye. Ọ gwakwara ha sị, “Nke a mere m ji gwa unu na ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m, ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike ime nke a.” Mgbe nke a mechara ọtụtụ n'ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, hapụzie ị na-esoghari ya. Jesu jụrụ ụmụazụ iri na abụọ sị, “Unu chọkwuru iso ha pụọ?” Saịmọn Pịta zara ya sị, “Onyenweanyị, onye ka anyị ga-ejekwu? Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe. Anyị onwe anyị ekwerela, bịa matakwa na ị bụ Onye Nsọ ahụ nke Chineke.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, were obi ebere nara onyinye ndịa site n'aka ezinuulo Gi. Mee k'anyị kwudosiike na ndụ nke inyere anyị, ma nweta onyinye ebeebe nke  ikwere na nkwa. Sitena Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

 Nna, a na m ekpere ha ekpere: ka ha buru otu n'ime anyị, ka uwa wee kwere na o bụ gị zitere m, Alleluia.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSỌ

Dinwenụ, lekwasi ndị izoputara n'ime Kristi anya, ka anyị bụ ndị eji ahuhu na onwu ya gbaputa, na aṅurị oge niile na mbilite n'onwu ya. Sitena Kristi Dinwenu anyị.

 

UKWE MBATA

K'anyị kweerenu Onyenweanyị ukwe. Ojirila otito kpuchie onwe ya. Dinwenu bụ ike m, a na m eto ya, ọ bụ ya bụ onye nzọpụta m. Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile, n'oge a dị asọ, anyị amatala uju nke ịhụnaanya Gị, Ị zọpụtala anyị site n'ochịchịrị nke mmehie na njọ. Biko nyere anyị aka k'anyị were nkwudosike jidesie eziokwu Gị ike. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (8:26-40)

“Lee, ihe a bụ mịrị, gini ga-egbochi ime m mirichukwu?”

N'ụbọchị ndị ahu: Mmụọọma nke Onyenweanyị gwara Filip okwu, sị, “Bilie, gaa ụzọ ndịda ruo ụzọ nke sị na Jerusalem gbadaa rue na Gaza” Filip biliri gaba. Mana mgbe ahụ, otu nwoke, onye Etiopia, bụ onozi, onye na-agbara Kandeki Ezenwaanyị Etiopia odibo, na echekwara ya akụ n'ụba ya niile bịara Jerusalem ikpere Chineke. Ọ nọ na ụgbọ anyịnya ya na-alaghachi Etiopia. Ka ọ na-aga, ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Mmụọ Nsọ gwara Filip, sị, “Garuo ụgbọ anyịnya ahụ nso, ma sonyere ya.” Filip garuru ya nso, nụ ka onozi ahụ na-agụ Akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ jụrụ ya, sị, “Ị na-aghọta ihe Ị na-agụ?” Ọ zaa ya sị, “Kedụ ka m ga esi ghọta, ma ọ bụrụ na o nweghị onye na akọwara m?” Onozi ahụ rịọrọ Filip ka ọ rịgota n'ụgbọ anyịnya ya, ka ya na ya nọrọ. Ebe ọ na-agụ n'ime Akwụkwo Nsọ bụ ebe e kwuru, sị, “Dịka atụrụ a na-aga igbu egbu ma ọ bụ ka nwaatụrụ si ada ogbi n'ihu ndị na-akpuchasi ya aji, o megheghị ọnụ ya. Ha budara ya ala, jụ inye ya ikpe nkwụmọto onye ga akọwali maka agbụrụ ya? N'ihina a napụla ya ndu ya.” Onozi ahụ jụrụ Filip sị “Biko, gwa m, onye amụma a, ọ na-ekwu maka onye? Ọ na-ekwu maka onwe ya ka ọ bụ maka onye ọzọ?” Filip meghere ọnụ ya malite n'ebe ahụ ọ na-agụ n'Akwụkwo Nsọ, gwa ya okwuchukwu maka Jesu. Mgbe ha na-aga n'ụzọ, ha bịarutere na mmiri, onozi ahụ asị Filip, “Lee, ihe a bụ mmiri, gịnị ga-egbochi ime m mmirichukwu?” Filip asị ya, “Ọ bụrụ na ị ji obi gị niile kwere na Kristi, e nwere ike ime gị mmirichukwu,” Onozi ahụ zaghachiri ya, sị, “Ekwere m na Jesu Kristi bụ nwa nke Chineke” O nyere iwu ka ụgbọ ịnyịnya ahụ kwụsị, ya na Filip rịdaa, banye n'ime mmiri, Filip emee ya mmirichukwu. Mgbe ha sịrị na mmiri pụta, Mmụọ nke Onyenweanyị, wepụrụ Filip, onozi ahụ ahụghịkwa ya ọzọ, ma ọ weere ọńụ laba. Ebe a hụziri Filip bụ n'Azọtus. O jegharikwara n'obodo niile di n'ala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizeria.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PSALM 66:8-9.16-17.20. R/V. 1)

AZỊZA: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọńụ.

 

  1. Ụnu mba niile gozienu Chineke anyị, meenụ ka otito ya gbasaa n'ụwa niile, onye na enye mkpụrụobi anyị ndụ, na emekwa k'anyị ghara ijehie ụzọ. A/
  2. Bịanụ gee nti unu niile na-atụrụ Chineke egwu, ka m na-akọrọ unu ihe o meere m; Oge m bekuru ya. Ukwe otito dịkwa m n'ire. A/
  3. Ngọzi dịrị Chineke onye na-eledaghị ekpere ma ọ bụ jụ igosi m ịhụnaanya ya. A/

MBEKU: (Jọn. 6:51) Alleluia, alleluia! A bụ m achịchaa ndụ nke si n'eluigwe bịa, Dinwenu na ekwu. Onye ọbụla nke riri achichaa ga ebi ndụ ebeebe. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:44-51)

“Abụ m nri ahụ dị ndụ nke si n'eluigwe bịa.”

N'oge ahụ: Jesu gwara igwe mmadụ ahụ si: “Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m, ma ọ bụrụ na Nna zitere m akpọtaghịrị m ya. Aga m akpọlite ya n'ọnwụ n'ụbọchị ikpe azụ. E dere ya n'akwụkwọ ndị Amụma sị, 'Chineke ga-akuziri ha niile ihe.' Onye ọbụla nke gere nti ma mụtakwa ihe n'aka Nna m na-abịakwute m. Ọ bụghị na onye ọbụla ahụla Nna ahụ anya, ma ọ bụghị onye ahụ nke si n'ebe Chineke nọ bịa. N'ịgwa unu eziokwu, onye ọbụla nke na-ekwere na-enwe ndụ ebeebe. Abụ m nri nke ndụ, Nna unu ha riri mana ahụ n'ime ọzara ma mechaa nwụọ. Nke a bụ nri nke si n'eluigwe bịa, nke na onye riri ya agaghị anwụ anwụ. Abụ m nri ahụ dị ndụ nke si n'eluigwe bịa. onye ọbụla riri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighịebi. Nri ahụ nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa bụ ahụ m.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu Chineke anyị, site na mgbanwo nke onyinye a dị asọ, Ị na-eme k'anyị keta oke na ndụ nke ịbụ Chukwu Gị. Mee ka ihe niile anyị na-eme na-aga na ntuzi aka nke sitere n'amamihe nke eziokwu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Kristi nwụrụ maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ ghara ibi maka sọsọ onwe ha kama maka Kristi onye nwụrụ ma kụlitekwa n'ọnwụ, Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

 Dinwenu were amara Gị nonyere ndị nke Gị, ma mee ka ndị itinyegoro n'ime ha ihe omimi nke eluigwe gị sina ndu ochie gafe na ndụ ọhụrụ.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE MBATA

Kwerenu Chineke ukwe unu ndị nwere egwu nke Chineke, ndi ukwu na ndị nta, toonu ya n'ihi na ike na nzọpụta ya abịala. Ike nke Kristi abịakwala. Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

O Dinwenu Ị meheere ndị iji mmiri na Mmụọnsọ munwue ala-eze eluigwe, tinye n'ime umuodibo gị amara gị, ma site na-iwepu njo ha niile, ha ga enweta ihe oma ikwere ha na-nkwa. Site na  Kristi  Dinwenu.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (7:51-8:1)

“Onyenweanyị Jesu nara mkpụrụ obi m.”

N'ụbọchi ndị ahụ; Stivin gwara ndị mmadụ, ndị okenye na ndị odeakwụkwọ sị: “Unu ndị isi ike, ndị kpọchiri obi ha na nti ha ịnụ okwu Chineke, ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna unu ha si mee. O nwere onye amụma ọbụla nna unu ha emekpaghị ahụ? Ha gburu ndị ahụ buru ụzọ kwusaa okwu banyere ọbịbịa nke onye eziomume, onye unu raara nye ma gbuo ya. Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site n'aka ndị mmụọọma ma unu edebeghị ya.” Mgbe ọgbakọ ikpe ahụ nụrụ ihe ndi a, iwe were ha nke ukwu n'ebe Stivin nọ ha wee taa ikikere eze, ma Stivin onye jupụtara n'ike nke Mmuọ Nsọ lere anya n'eluigwe hụ ebube nke Chineke. Ọ si ha, “Lee! Ana m ahụ ka e meghere eluigwe, na nwa nke mmadụ ka ọ kwụ n'aka nri nke Chineke. Ha were oke olu tie mkpu, wee were aka kwuchie ntị ha, were ọsọ wakpo Stivin. Ha si n'obodo ahụ kpụpụ ya, were okwute tugbuo ya. Ndị aka ebe ụgha, ndị gburu Stivin, wụsara uwe ha n'ụkwụ otu nwaokorobịa ana akpọ Sọl. Ka ha na-atụgbu Stivin, o kpere ekpere sị, “Onyenweanyị Jesu nara mkpụrụ obi m!” o gburu ikpere n'ala, werekwa oke olu tie mkpu sị, “Onyenweanyị ekwekwala ka njọ nke a dị ha n'isi!” Mgbe o kwuchara nke a, ọ daa n'ala nwụọ. Sọl gbara mbọ nke ukwu ime ka nzukọ Kristi daa.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 31:3bc-4.6 and 7b-8a.17 and 21ab(R/v.  6a)

AZỊZA: N'aka Gị Dinwenu ka m tinyere mmụọ m.

  1. Bụrụ nkume nke mgbaba m, ide nke ga-azọpụta m! N'ihina ị bụ nkume m, na ike m; n'ihi aha Gị dube m, ma chekwaba m. A/
  2. N'aka Gị ka m tinyere mmụọ m, Ị gbapụtala m Osebụrụwa, Chineke nke eziokwu. Atukwasịrị m obi m na Gị. Aga m awụli elu, nwee ańụrị n'ime ịhụnaanya Gị. A/
  3. Ka ihu Gị chakwasị nwodibo Gị, were ịhụnaanya Gi zọpụta m. N'ihu Gị ka Ị na-ezobe ha, Ka atụmmatụ ndị ajọ omume ghara imetụ ha. A/

MBEKU: (Jọn. 6:35) Alleluia, alleluia! A bụ m nrị nke ndụ Ọ bụ Dinwenu na-ekwu onye ọbụna biakwutere m agụụ agaghi agụ ya ọzọ. Onye obụna kwenyere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (6:30-35)

Ọ bụghị Mosis nyere unu nri ahụ nke si n'eluigwe, kama ọ bụ Nna m.

N'oge ahụ: Oke igwe mmadụ ahụ jụrụ Jesu sị, “Olee ọrụ ịrịbaama Ị ga arụrụ anyị, ka anyị hu, wee kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga arụ? Nna anyị ha riri Mana n'ime ọzara dịka e dere ya sị, 'O nyere ha nri nke si n'eluigwe ka ha rie.” Jesu gwakwara ha sị, “Ana m agwa unu eziokwu, ọ bụghị Mosis nyere unu nri ahụ nke si n'eluigwe, kama ọ bụ Nna m na enye unu ezi nri ahụ nke si n'eluigwe. N'ihina nri nke Chineke bu nri nke ahụ si n'eluigwe  bịa, na-enyekwa ụwa ndụ.” Nke a mere ha ji sị ya, “Onyenweanyị, nye anyị udị nri a mgbe niile.” Jesu sịrị ha, “Abụ m achịcha nke ndụ; onye na-abịakwute m agụụ agaghị agụ ya, onye na-ekwerekwa na m akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu nara onyinye ndị a site n'aka uka Gị. Ma ka inyegoro ha nchekwube maka nnukwu ańụrị mee ka onyinye anyị mịta ezi nkpụrụ n'ime ańụrị na-enweghị ngwụcha. Site na  Kristi Dinwenu anyị.

 

UKWE ORIRI NSỌ

N'ihi na anyị esorola Kristi nwụọ, anyị kwenyere na anyị ga-esorokwa ya kulite n'ọnwụ, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu were obioma lekwasi ndị nke Gị anya ma anyị na-arịọ Gị ka ndị nke Gị bụ ndị agbanwogoro n’ihe omimi Gị dị ebebe nweta n’anụ ahu ha emebi emebi nke otito mbilite n’ọnwụ. Site na  Kristi Dinwenu anyị.

UKWE MBATA

Ọnụ m jupụtara na otito Gị, ka m tie mkpu maka ya. Ire m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe ọbụna mụ na-ekwere Gị ukwe, Alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

O Dinwenu, nọnyere ndị ezi n'ụlọ Gị, ma were amara mee ka ndị I nyegoro amara nke okwukwe keta oke di ebebe na mbilite n'ọnwụ nke sọ otu nwa Gị.  Site na  Kristi Dinwenu anyị.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n' Akwụkwọ Ọrụ ndịozi (8:1b-8)

Ha na-agagari na-ekwusa oziọma.

N'oge ahụ oke ogbugbu ndị kwerenụ dakwasịrị ndị otu Kristi  bi na Jerusalem. Ndị  niile kwere na Kristi ma e wepụ ụmụazụ gbasara n'ala Judịa na Sameria  niile. Ụfọdụ ụmụnwoke na-atụ egwu Chineke liri Stivin, ruoro ya uju nke ukwu. Sọl gbara mbọ nke ukwu ime ka nzuko Kristi daa. Ọ na-aba n'ụlọ ndị mmadụ n'otu n'otu na-akpụpụta ndị kwere ekwe, ụmụnwoke na ụmụwaanyi, na-atụba ha n' ụlọ mkpọrọ. Ugbu a, ndị ahụ kwere na Kristi, ndị sị na Jerusalem gbasachaa, jegarịrị ebe niile, na-agbasa okwu Chineke. Filip gara n'otu obodo dị na Sameria gwa ha maka Kristi. Igwe ndị obodo ahụ nabatara ozi Filip mgbe ha nụrụ ma hụkwa ihe ịrịbaama dị iche-iche o mere.  Ọtụtụ mmụọ ọjọọ si n' ahụ ndị ha ji pụta, were oke olu na-eti mkpu. O mekwara ka ahụ dị ọtụtụ mmadu mma, ma ndị akụkụ ahu ha nwụrụ anwụ ma ndị dara ngworo. Nke a wetara oke  ọṅụ n' obodo ahụ. 

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (Psalm 66: 1-3a.4-5.6-7a. R/v.1)

AZỊZA: Ụwa niile tijerenụ Chineke mkpu ọṅụ.

  1. Tikuenụ Chineke mkpu ọṅụ ụwa niile tierenu aha ya dị otito egwu. Jirinu ija mma ụnụ nye ya otito. Sịnụ Chineke, lee ka Ị si dị oke egwu! A/
  2. Ụwa niile na-akpọ isi ala nye Gị, na- akụrụ Gị egwu na-akụ egwu na-asọpụrụ aha Gị. Bia lee ọrụ ịtụnaanya Chineke rụrụ. O kwesịrị ịtụ egwu n' ihi ọrụ ya n' etiti ụmụ mmadu. A/

3.O mere ka osimiri gbọọ ala kpọrọ nkụ, ha ji  ukwụ gafee osimri ahụ n' ihi ya ka anyị nụria n'ime ya. Onye ji ike ya achị mgbe ebighịebi. A/

MBEKU: (John 6:40) Alleluia, alleluia! Onye ọbụla nke kwere na nwa nke mmadu ga-enwe ndụ ebeebe, ma agam ekunitekwe ya n'ubọchị ikpeazụ; Ọ bụ Dinwunu na-ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ ewetara n' Oziọma dị asọ nke Jọn dere (6:35-40)

“Nke a bụ uche nke Nna m, ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe.”

N'oge ahụ: Jesu gwara igwe mmadụ ahụ si, “Abụ m achịcha nke ndụ; onye na-abịakwute m agụụ agaghi agụ ya, onye  na ekwerekwa na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. Ana m  agwa ụnụ, na ụnụ ahụla m, mana ụnụ ekweghị. Onye ọbụla Nna m  na-enye m, ga-abịakwute m, agaghi m achụpụkwa onye ọbụla nke na-abịakwute m. N'ihi na esighị m n'eluigwe bịa ime uche m, kama ọ bụ ime uche onye zitere m. Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtufụ ihe ọbụla n' ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n' ọnwụ bilie n'ụbọchi ikpe azụ. Nke a bụ uche nke Nna m, ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe. Aga m akpọlitekwa ya n'ọnwụ n'ụbọchị ịkpeazụ.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

O Dinwenu, biko mee ka anyi na-enwe ọṅụ mgbe niile na ihe omimi nke mbilite n'ọnwụ a, ka mgbanwe ọ na-ewetere anyi oge niile bụrụ anyi ụzọ aṅụri ebeebe. Site na  Kristi Dinwenu anyị.

 

UKWE ORIRI NSỌ

Dinwenu ebilitego n'ọnwụ. Ọ chakwasịla anyi bụ ndị o jiri ọbara ya gbapụta ihè. Alleluia!

 

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

O Dinwenu, nụrụ ekpere anyi ka mgbanwe a dị asọ bụ nke I sitere na ya gbapụta anyi, wetere anyi enyemaka Gị n'oge a, ma duruo anyi na ndụ ebeebe. Site na  Kristi Dinwenu anyị.