UKWE MBATA

O Dinwenu ijirila obara Gi gbaputa anyị sitena agbụrụ niile na asụsụ niile sitena mba niile na mmadụ niile. Ị meela k'anyị bụrụ Aleze nke Chukwu, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chineke onye nyere anyị I nwere-onwe onye  na nzopụta, nụrụ mkpu akwa anyị, ma mee ka ndị azopụtagoro site n'obara nke nwa Gị, nweta ndụ site na-aka Gị ma nwetakwa nchekwaba Gị, na-ańụrị ebebe na-enweghị ihe ụfụ ọbụla. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (13:26-33)

Ihe ahụ Chineke kwere anyị na nkwa, ka o mezuru site n'ime ka Jesu si n'ọnwụ bilie.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mgbe Pọl ruru Antiọk nke dị n'ala Pisidịa, Ọ banyere n'ụlọnzụkọ ndị Juu kwuo sị: “Ụmụnne m, ndị sị n'agbụrụ Abraham, na ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n'etiti unu. Ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi nzọpụta nke a. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha aghọtaghị na Jesu bụ onye nzọpụta. Ha aghọtaghị ihe ndị amụma kwuru nke a na-agụpụtara ha ụbọchị Sabat niile. N'ihi ya, ha mezuru ihe ndi amụma kwuru site n'ịma ya ikpe ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere aga eji ma ya ikpe, ha rịọrọ Paịlet ka o gbuo ya. Mgbe ha mezuru ihe niile e dere n'Akwụkwọ Nsọ banyere Jesu, ha siri n'elu obe wedata ya, lie ya. Ma Chineke mere ka o si n'ọnwụ bilie. O gosiri ndi na-eso ụzọ ya ndị si Galili soro ya ruo Jerusalem, onwe ya. Ndị a bụzi ndi aka ebe ya ugbu a n'ihu ndị mmadu. Anyị bịara iwetara ụnụ oziọma na ịgwa unu na ihe ahụ Chineke kwere nnanna anyị ha na nkwa, ka o mezurula anyị bụ ụmụ ha site n'ime ka Jesu si n'ọnwụ bilie, nke a bụ dịka e si dee ya n'Akwụkwọ Abụọma, n'isi nke abụọ sị, “Ị bụ nwa m, n'ụbochị taa ka m mụtara gị!”

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : FRIDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Kristi nke bilitere n'ọnwụ agaghị anwụ ọzọ, ọnwụ enweghịzị ike ọbụla n'ebe ọ nọ, alleluia

 

EKPERE MMEGHE

Chineke, ihe nke ndị dị ngozi, o bụ site na onyinye gị ka anyị ji eme emume nke mbilite n’onwu Nwa Gị, anyị na-arịọ ka iwetere anyị uju amara Gị nke na-eweghị ngwucha na oge na-abianụ.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara N'akwkw ru ndozi (11:1-18)

Chineke enyekwala blad ndi mba z ohere icheghar nweta nd.

N'oge ahụ, ụmụazụ na ụmụnna n'ime Kristi nọ na Judịa niile nụrụ na ọ bụladị ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. Mgbe Pita garuru Jerusalem ndị Juu ndị na-akwado ka e bie ndị mba ọzọ ugwu, malitere na-ekwutọ ya, na-asị, “Gịnị mere I ji gakwuru ndị ebighị ugwu soro ha rie nri. Pita kọọrọ ha ihe niile merenụ site na isi mbido: “Anọ m n'obodo Joppa na-ekpe ekpere, hụ ọhụ. Ahụrụ m ihe dịka nnukwu ukwu akwa nke e jidere n'akụkụ anọ ka o si n'eluigwe gbadata ebe m nọ. Mgbe m lere ya nke ọma, ahụrụ m ụmụanụmaanụ dị iche-iche, anụ ọhịa ndị na eri ibe ha, anụ ndị na akpụ, na ụmụnnụnụ dị iche-iche. Anukwara m otu olu ka ọ na-asị m, “Pita! Bilie, gbuo ma rie” Azara m olu ahụ sị “mba, Onyenweanyị n'ihi na ihe ọbụla rụrụ aru ma ọ bụ nke adịghị ọcha ababeghị m n'ọnụ. Ma olu ahụ sị n'eluigwe zaghachi sị, “Ihe ọbụla Chineke mere ka ọ di ocha, ị nweghi ike ọbụla ịkpọ ya ihe rụrụ arụ.” Ihe a mere ugboro atọ, e bughachikwa ihe ahụ n'eluigwe. N'otu mgbe ahụ, ụmụnwoke atọ ndị e si Sizeria zite ka ha kpọọ m bịaruru n'ụlọ ebe anyị nọ. Mmụọ Nsọ gwara m ka m soro ha gaa, n'akpaghị oke ọbụla. Mụ na ụmụnna mmadụ isii ndi a soro gaa banye n'ụlọ nwoke ahụ. Ọ kọọrọ anyị otu o si hụ mmụọọma ka ọ kwụ n'ụlọ ya, na-asị, “Ziga ozi na Jopa, ka a kpọtaara gị Saịmọn onye a na-akpọkwa Pita. Ọ ga-agwa gị okwu nke Chineke ga-eji zọpụta gị na ezinụụlọ gị niile. Mgbe m malitere ịgwa ha okwu, Mmụọ Nsọ dakwasara ha otu o si dakwasa anyị na mbido. N'oge ahụ echetakwara m ihe Onyenweanyị kwuru, sị, “Jọn ji mmiri mee unu mmirichukwu, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu mmirichukwu. Ebe ọ bụ na Chukwu enyela ha ụdị onyinye ahụ ọ nyere anyị mgbe anyị kwenyere n'Onyenweanyị Jesu Kristi, onye ka m bụ igbochi ọrụ Chineke?” Oge ha nụrụ ihe ndi a, ha kwụsịrị nkagbu ha na-akagbu Pita, too Chineke sị, “O! Chineke enyekwala ọ bụladị ndi mba ọzọ ohere ichegharị nweta ndụ.”

Okwu nke Oseburwa

Ekele dr Chukwu.

Read more: : MONDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Unu bụ ndi Chineke họtara ka ha bụụrụ ndi nke ya. Ka unu na-eto onye ahu kpọpụtara unu na ochichiri banye na ihè nke ya di egwu, alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, onye sitere na mmemme nke oge Ista nye ụwa ọgwụgwọ nke amara eluigwe, gosi Nzụkọ Gị ebere Gị, ka mmemme anyị a wee ritere anyị ndụ ebeebe. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (13:44-52)

Anyị ga-ahapụ unu gakwuru ndị mba ọzọ.

N'ụbọchị Sabat nke sonụ, Ọ fọdurụ ntakịri ka obodo ahụ niile zukọọ ịnụ okwu Chineke. Oge ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ahụ, ha jụpụtara n'ekwọro. Ha malitere ịgbagha ihe niile Pọl kwuru na-enyekwa ya mkpari. Pọl na Banabas kwuru okwu n'asọghị anya, si, “Ọ di mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwuchukwu, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, gosikwa na unu ekwesịghị inweta ndu ebighịebi.  Lee, anyị ga-ahapụ unu gakwuru ndị mba ọzọ. Otu a ka Chineke nyere anyị n'iwu si, “Ahọpụtala m Gị ka ị bụụrụ ndi mba ọzọ ihè, ka ị wetara akụkụ ụwa niile nzọpụta” Mgbe ndi mba ọzọ nụrụ nke a, obi tọrọ ha ụtọ, ha toro okwu Chineke. Ndi niile e debeere ịnata ndu ebeghịebi kweere na Jesu. Okwu nke Chineke gbasara na mpaghara obodo ahụ niile. Ndi Juu kpalitere ụmụnwaanyị ndi na-atụrụ Chukwu egwu na ndị isi obodo, iji megide Pọl na Banabas. E mesiri ha ike, chụpụ ha n'obodo ha. Ndị ozi ahụ tichapụrụ aja di ha n'ụkwụ gaba Aịkonium. Ma ndị na-eso ụzọ Jesu jupụtara n'ọńụ na Mmụọ Nsọ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : SATURDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

O Chukwu oge I na-edu ndị nke Gị ma binyekwara ha, ala mara jijiji, mmiri siri n'eluigwe zoo. alleluia.

Ekpere Mmeghe: O Chukwu, onye nyeghachịrị ọnọdụ mmadụ ọkwa dị ugwu karịa nke ahụ o nwere n'isi mbido okike, lekwasa ihe omimi nke ihụnaanya Gị dị ịtụnaanya anya ebere, ma n'ime ndị ahụ ị họgoro ka I mee ha mmadụ ọhụrụ site n'ọmụmụ ọzọ ahụ dị ịtụnaanya, mee k'onyinye nke amara na ngọzị Gị nọgide n'ime ha. Site na Kristi Dinwenu anyi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ Ọrụ ndịozi (13:13-25)

Site n'agburu  David ka Chineke si wetara ụmụ Izrel onye nzọpụta Jesu.

Pọl na ndị otu ya siri Pafọs jiri ụgbọ mmiri ruo Pega nke dị n'ala Pamfilịa. Ebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem. Ha sikwara Pega ruo Antiọk nke dị n'ala Pisidia. N'ụbọchị Sabat, ha banyere n'ụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala. Mgbe a gụpụtachara ihe site n'Akwụkwọ Iwu Mosis na site n'Akwụkwọ ndị amụma, ndị isi ụlọ nzukọ ahụ zigaara ha ozi sị, “Ụmụnne anyị ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume unu ga-ekwu, bịanụ gwa anyị. Pọl biliri feere ha aka ka ha gee ntị, bido kwube okwu sị, “Ndị Izrel ibe m, na ndị mba ọzọ, ndị na-atụ egwu Chineke nọ n'ebe a, geenụ m ntị. Chineke nke Izrel, họọrọ nnanna anyị ha, mee ka ha bụrụ oke mba oge ha bi n'ala Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha n'ala ahụ. O dikwara omume ha ihe dịka iri afọ anọ n'ọzara. O kpochapụrụ ndị bi n'obodo asaa dị n'ala Kenaan, were ala ha nye ndị Izrel, ka ihe nketa, ihe dịka narị afọ anọ na iri ise. Ka nke a gachara, o nyere ha ndị ọkaikpe, dịka ndị ndu wee ruo n'oge nke Samuel onye amụma. Ha rịọrọ ya ka e nye ha eze, Chineke nye ha Sọl nwa Kish, onye si n'agbụrụ Benjamin, ka ọ bụrụ eze ha. Ọ chịrị ha iri afọ anọ. Mgbe Chineke wepụrụ ya n'ọchịchị. Ọ kpọlitere Devid ka ọ bụrụ eze ha, onye ọ gbaara akaebe, sị, “Ahụla m Devid nwa Jese dịka ụdị mmadụ m chọrọ, onye ga-eme ihe niile bụ uche m. Ọ bụ site n'ụmụụmụ nwoke a ka Chineke si wetara ụmụ Izrel onye nzọpụta dịka o si kwe na nkwa. Tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusaarala ndị Izrel banyere mmirichukwu nke nchegharị. Na ngwụcha ọrụ Jọn, o kwuru, sị “Onye ka unu chere na m bụ? Abụghị m onye ahụ unu na-atụ anya ya. Kama leenụ! otu onye na-esochi m n'azụ, onye mụ etorughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”

Okwu nke Osebụrụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : THURSDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

 K'anyị tienu mkpu ọṅụ ma nyee Chineke nke ihe niile otito n'ihi na ọ bụ eze anyị, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile, ka anyị na-eri oriri nke mbilite na ọnwụ, mee ka anyị na ekekorita na etiti onwe anyị ańụrị nke Kristi bilitere n'ọnwụ ritere anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (11:19-26)

Ha gbasaara ndi Grik oziọma nke Onyenweanyị Jesu.

N'ọbụchị ahụ: Mkpagbu nke pụtara n'oge e gburu Stivin mere ka ndi kwere na Kristi gbasachaa, gaa ebe dị iche-iche. Ụfọdụ garuru Fonishịa, Saịprus na Antịọk. Ma naani ndi Juu ka ha na agwa okwuchukwu. Otu o si na dị ụfọdụ ụmụnwoke ndi si Saịprus na Saịrin bịa, garuru Antịọk, gbasaara ndi Grik oziọma nke Onyenweanyị Jesu. Onyenweanyị nọnyekwara ha, nke na ọtụtụ ndi kwerenu chegharịrị. Akụkọ banyere nke a ruru nzukọ Kristi nke di na Jerusalem ntị. Ha zigara Banabas na Antịọk. Mgbe ọ bịaruru hụ amara Chineke, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwu. Ọ rịọro ha niile ka ha were obi ha kwusie ike n'okwukwe, nọgidesie ike n'ime Onyenweanyị. Banabas bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe na Dinwenu. Banabas pụrụ gaba Tasus ịchọ Sọl; oge ọ chọtara ya, ọ kpọọrọ ya laghachi Antịọk. Ha abụọ nọrọ n'Antiọk ihe karịrị otu afọ na-akuziri igwe mmadụ ihe. Ọ bụkwa n'Antiọk ka e bu ụzọ kpọọ ndị na eso ụzo ya “Ndị otu Kristi”

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : TUESDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

O bughị gi họọrọ m, ọ bụ Dinwenu na-ekwu; ọ bụ m họọrọ gi, Ma zịpụ gị ka I gaa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adị ebeebe. Alleluia

EKPERE MMEGHE

 Nna I kpọrọ Matiyas di asọ ka oketa oke n'ọrụ ndi ụmụazụ. Site n'ekpere ya mee k'anyi jiri ọṅụ nara ihunaanya nke ikenyere anyị ma sorokwa na ndị ahụ ahọpụtara. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (1:15-17. 20-26)

Nza ahụ mara Matiyas. Ọ banye n'otu ndịozi iri na otu ahụ imezu ọnụ ọgụgụ ha.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mgbe ụbọchị olemaole gachara ụmụnna n'ime Kristi ihe ha ka otu narị mmadụ na iri abụọ zukọtara. Pita kwụụrụ n'etiti ha sị, “Ụmụnna m n'ime Kristi, ihe e dere n'Akwụkwọ Nsọ aghaghị imezu, nke mmụọ nsọ siri n'ọnụ Devid kwuo n'oge gara aga, banyere Judas Iskarịọt, onye mechara bụrụ onye ndu nke ndị jidere Jesu. Unu maara nke ọma na ọ bụ onye otu anyị, na mbụ o nweburu oke n'ije ozi anyị. E dere ya n'Akwụkwọ Abụọma si, “Ka ụlọ ya tọgbọrọ n'efu, Ka mmadụ ọbụla ghara ibi na ya.” E dekwara sị, “Ka onye ọzọ were ọnọdụ ya.” Ya bụ, otu onye n'ime ndị anyị na ha nọ oge niile Jesu nọ n'etiti anyị, bido n'oge Jọn na-eme mmirichukwu ruo ụbochị Jesu si n'etiti anyị rigoro n'eluigwe - otu onye n'ime ndi a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite n'ọnwụ ya.” Ha họpụtara mmadụ abụọ Josef onye a na-akpọ Basabas, (nke aha nna ya bụ Jọstus), na Matiyas. Ha ekpee ekpere si, “Onyenweanyị Gị onye maara echiche mmadụ niile, gosi anyị onye ị họpụtara n'ime mmadụ abụọ ndị a ịnọchị ọnọdụ ije ozi nke a, na ịbụ onye ozi, nke Judas Iskarịọt hapụrụ gaba ebe ọnọdụ kwesịrị ya.” Ha feere mmadụ abụọ ndi a nza. Nza ahụ mara Matiyas. Ọ banye n'otu ndịozi iri na otu ahụ imezu ọnụ ọgụgụ ha.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : WEDNESDAY OF THE FOURTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)