FRIDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

 Nwaaturu ahu egburu tosiri inweta ike na ibu chi, amamihe na ike na ugwu, alleluia.

 

EKPERE MMEGHE

 Dinwenu ka anyị na-esonye na emume nke ihe omimi nke Paska, anyị na-arịọ Gị ka emume a anyị jị obi ańụrị eme nwetere anyị nchekwaba na nzoputa site na ike Gị di ebeebe. Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (15:22-31)

Ọ dị anyị na Mmụọ Nsọ mma, ka a ghara ibo unu ibu arọ karịa naanị ihe ndị a dị mkpa.

N'ụbọchị ndị ahụ: Nke a masịrị ndị ozi na ndị okenye na nzukọ Kristi niile nọ na Jerusalem. Ha kpebiri ịhọpụta mmadụ ụfọdụ n'etiti ha, ziga ha na Pọl na Banabas n'Antịọk. Ha họpụtara Judas onye ana-akpọkwa Basabas na Sailas, bụ ndị ana-asọpụrụ n'etiti ụmụnna. Ha nyekwara ha akwụkwọ ozi dị otu a ka ha ziga, sị: “Anyị bụ ndị ozi na ndị okenye, na ụmụnna unu. Anyị na ewetara unu ozi ekele, ụmụnna anyị ndị bi n'Antịọk na Siria na Silisia, unu niile bụ ndị a mụrụ na mba ọzọ, ndeewonụ. Anyị anụla na ụfọdụ ndi otu anyị siri ebe a bịakwute unu, na esogbu unu were okwu mee ka obi lọọ unu mmiri. Ma ọdịghị mgbe ọbụla ha natara ike n'aka anyị ime otu a. N'ihi nke a anyị ezukọọla, were otu obi kpebie izitere unu ndi ozi ụfọdụ ha na ndị anyị hụrụ n'anya bụ Banabas na Pọl, ndị werela ndụ ha tinye n'ihi aha na ozi nke Onyenweanyị Jesu Kristi. Nke a mere, anyị ji ezite Judas na Saịlas, ndị ga-akọwara unu ihu n'ihu, ihe ndị a anyị dere n'Akwụkwọ ozi. N'ihina ọ dị anyị na Mmụọ Nsọ mma, ka a ghara ibo unu ibu arọ karịa naanị ihe ndị a dị mkpa.” Unu erila ihe ọbụla a chụrụ na-aja nye arụsị, unu erila ọbara; unu erila anụ anyagburu anyagbu, unu akwala ịko, unu jide onwe unu ghara ime ihe ndị a, unu ga-eme nke ọma, nọdụnụ mma.” Mgbe e zipuru ndị ozi ahụ, ha gara Antịọk. Ka ha ruru, ha kpọrọ nzukọ nke ndị kwere ekwe, nye ha akwụkwọ ozi ahụ. Mgbe ọgbakọ ahụ guchara akwụkwọ ozi ahụ, ọńụ juru ha obi, n'ihi ozi igba ume ha natara.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  57:8-9.10-12 (R. v.I0a)

AZỊZA: Aga m ekele gi n'etiti ndị mmadụ niile, O Onyenweanyị.

  1. Obi m dị nkwadebe. O Chineke, obi m di nkwadebe; Aga-ekwere Gị ukwe kụọkwara Gị egwu. Obi m tete n'ụra, tie ụbọ akwara, na opi, aga m akpọte chi ọbụbọ! A/
  2. Aga m ekele Gị n'etiti ndi mmadụ, Onyenweanyị, aga m akụrụ Gi egwu n'etiti mba niile, ịhụnaanya Gị dị elu dịka eluigwe, gosipụta ike Gị n'eluigwe, Chineke. Ka ebube Gi dịrị n'elu ụwa. A/

 

MBEKU: (Jọn 15:15b) Alleluia, alleluia! Ana m akpọzi ụnụ ndị enyi, n'ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n'ọnụ Nna m. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (15:12-17)

Nke a bụ iwu m nyere unu: ka unu hụrịta onwe unu n'anya.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Nke a bụ iwu m nyere unu: ka unu hụrịta onwe unu n'anya, dịka m si hụ unu n'anya. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnaanya karịrị nke a: Na mmadụ ga-atufụ ndụ ya n'ihi ndị enyi ya. Unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu edobe iwu m nyere unu. Anaghị m akpọkwa unu ndị odibo ọzọ, n'ihi na odibo anaghi ama ihe nna ya ukwu na eme.Kama ana m akpọzi  unu ndị enyị, n'ihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ n'ọnụ Nna m. Ọ bụghị unu họọrọ m, kama ahọọrọ m unu; wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ; mkpụrụ nke ga anọgide. Nke a ga-eme ka Nna m nye unu ihe ọbụla unu rịọrọ ya n'aha m. Ya bụ, nke a ka m na-enye unu n'iwu: Hụrịtanụ onwe unu n'anya.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nna dị ebere, doo onyinye ndia asọ ma mee ka aja nke Mmụọ anyị na-ehunyere Gị mee anyị onyinye dị ebeebe n'ihu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Nwoke ahụ nwụrụ n'elu obe esila n'ọnwụ bilie, o sigo n'ọnwụ wechighatara anyi ndụ, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Dinwenu, anyị esonyego na emume nke ihe omimi a dị asọ, anyị jị umeala arịọ Gị ka ihe nwa Gị nyere anyị na-iwu ka anyị na-eme na ncheta nke ya mee ka anyị na-eto na-ihunaanya.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

MONDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Ezigbo onye nche atụrụ ebiligo n'ọnwụ! Onye ahụ were ndu ya nye maka atụrụ ya, onye nwụrụ maka igwe atụrụ ya, o kuligo, alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Dinwenu, anyị na-arịọ Gị, k'i were ikike nke aka-nrị Gị gbaa ndị Gị ogige site na enyema-aka Gị na-enweghị ube; ka ọga bụ a zọpụtacha anyị n'ajọ ihe niile sitena mbilite n'onwu nke naani otu Nwa Gị, anyị enwe ike iga n'ihu site n'onyinye nke ime eluigwe Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (14:5-18)

Anyị wetaara unu oziọma, ka unu hapụ ihe efu ndi a, bịakwute Chukwu dị ndu.

N'ụbọchị ndị ahụ: Ndị mba ọzọ, ndị Juu na ndị isi ha, gbara mbọ n'obodo Aịkonium imegide ndị ozi na ịtụ ha okwute. Ha nụrụ nke a gbaa ọsọ ndu, gbaga obodo Listra na Debe bụ obodo ndị dị n'ala Lịakonịa na obodo ndị gbara ya gburugburu. Ha gbasakwara oziọma na obodo ahụ. N'obodo Listra, o nwere otu nwoke agabeghi ije kamgbe a mụrụ ya. Ọ nọ na-ege okwuchukwu Pọl, Pọl legidere ya anya hụ na o nwere okwukwe, na aga agwọ ya, were oke olu si ya, “Bilie, kwụrụ ọtọ.” Nwoke ahụ wulie, bido gaba ije. Oge igwe mmadụ hụrụ ihe Pọl mere ha tiri mkpu n'asụsụ Laịkonịa si, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị n'ụdị mmadụ.” Ha kpọro Banabas, Zeus kpọkwaa Pọl, Hemes, maka na ya bụ onye ọka okwu. Onye nchụaja arụsị bụ Zeus, nke ụlọ arụsị ya di nsọ n'ihu obodo ahụ wetara chi ụfọdụ na okooko osisi, chọọ ka ya na ndi mmadụ chụọrọ ha aja. Oge Pọl na Banabas nụrụ ihe ndị obodo ahụ chọrọ ime, ha dọwara uwe ha, were ike gbaba n'etiti ndi mmadu na-eti mkpu sị, “Ndị enyi anyị gịnị mere unu ji eme ihe a? Anyị bụ mmadụ ibe unu, anyị abụghị mmuọ. Anyị wetaara unu oziọma, ka unu hapụ ihe efu ndi a, bịakwute Chukwu dị ndu, onye kere eluigwe na ala, kee oke osimiri na ihe niile di n'ime ha. N'oge gara aga, Ọ hapụrụ mba niile ka ha mewe  ihe masịrị ha. N'agbanyeghi nke a ọ hapụghị idobere onwe ya ihe ndi ga na-agbara ya aka ebe, site n'ihe ọma ndị ọ na emere unu Ọ na ezitere unu mmiri ozuzo site n'eluigwe, na-emekwa ka ihe niile a kụrụ n'ụbi mịa mkpụrụ n'oge ha. Ọ na enye unu ihe oriri, na-emekwa ka obi unu jupụta n'ọńụ.” Site na okwu ndị a, ha jisiri ike gbochie ndi mmadụ ịchụnyere ha aja.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  115:1-2.3-4.15-16 (R.v. 1ab)

AZỊZA: Ọ bụghị maka anyị, O Onyenweanyị, kama ka enye aha Gị otito.

  1. Ọ bụghị maka anyị, O Onyenweanyị, ọ bụghị maka anyị, kama ka enye aha Gị otito, n'ihi na ịkwụdosiike n'ịhụnaanya Gị. Maka gịnị ka ndị mba ọzọ ga-eji na-asị, olee ebe Chineke ha nọ? A/
  2. Chineke anyị nọ n'eluigwe, na eme ihe ọbụla masịrị ya. Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka ndi mmadụ. A/
  3. Ka Chineke gọzie gị, onye mere eluigwe na ụwa. Eluigwe niile bụ nke Onyenweanyị, mana o nyela ụmụ mmadụ ụwa. A/

MBEKU: (Jọn. 14:26) Alleluia, alleluia!  Mmụọ Nsọ, ahu ga-akuziri unu ihe niile. Ọ ga-emekwa ka unu cheta ihe niile m gwara unu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (14:21-26)

Ma onye nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna ga-ezite n'aha m, ga-akuziri unu ihe niile.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzo ya sị: “Onye ọbụla natara iwu m, na-edobe ha, bụ onye hụrụ m n'anya. Onye hụrụ m n'anya ka Nna m na-ahụ n'anya. Aga m ahụkwa onye ahụ n'anya, gosikwa ya onwe m.” Judas (nke na-abụghi nke Iskarịọt) siri ya, “Olee otu I ga esi gosi anyị onwe Gị, n'egosịghị ụwa onwe Gị?” Jesu zara ya sị, “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n'anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya n'anya. Anyị ga-abịakwute ya, biri n'ime ya. onye na-ahụghị m n'anya anaghị edobe okwu m niile. Okwu nke unu na-anụ abụghị nke m, kama nke Nna, bụ onye zitere m. Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu ka nọ. Ma onye nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna ga-ezite n'aha m, ga-akuziri unu ihe niile. Ọ ga-emekwa ka unu cheta ihe niile m gwara unu.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu ka ekpere na aja onyinye anyị biakwụte gị, ma site na nwụcha nke amara Gị, ka anyị wee dị ka ihe omimi nke ihunanya gị dị ike. Site na Kristi Dinwenu anyị

UKWE ORIRI NSỌ

Dinwenu kwuru si, udo ka m na ahapuru unu, udo nkem ka m na enye unu, obughi etu uwa si enye udo ka m na enye unu, alleluia.

 

 EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Chineke ji ike niile, onye dị ebeebe, onye na-eweghachi anyị na ndụ ebeebe sitena mbilite n'onwu nke Kristi, mụbaa n'ime anyị, anyị na-arịọ Gị, mkpụrụ Sakramenti nke Paska, ma wujuoo n'ime obi anyị ike nke nri nke mgbapụta a. Site na Kristi Dinwenu anyị

SATURDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Elikọrọ unu na Kristi sitena mmiri-chukwu. Sitena ya k'unu siri bilie n'ọnwụ site n'okwukwe, site n'oru nke Chukwu bụ onye mere k'osi n'inwụ bilie. alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nna nke ihunanya site na imunwo anyi ọzọ na mmiri chukwu nye anyi ndu Gi na nkwa nke anwu anwu. Site na nchekwaba Gi di ọkpụ duba nzọ ụkwụ anyi na ndụ nke otito. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (16:1-10)

Gafeta na Masedonia, nyere anyị aka.

N'ụbọchị ndị ahụ: Pọl bịaruru Debe na Listra. N'ebe ahụ ka ọ hụrụ otu onye na-eso ụzo Jesu, a na-akpọ Timoti. Nne ya bụ onye Juu nke kwere na Kristi. Nna ya bụ onye Grik. Ụmụnna niile ndị nọ na Listra na Aịkonium gbara nnọọ ezi ama maka Timoti. Ebe Pọl chọrọ ka Timoti soro ya n'ije, o biri ya ugwu, n'ihina ndị Juu niile bi ebe ahụ maara na nna Timoti bụ onye Grik. Mgbe ha nọ na njem n'obodo dị iche-iche, ha nyefere n'aka ndị ụmụnna iwu ahụ ụmụazụ na ndi okenye nọ na Jerusalem nyere ha. Ndị ozi ahụ dụkwara ha ọdu ka ha jisie ike idobe ha. Nke a mere ka nzuko Kristi siwanye ike n'okwukwe ha. Ọnụ ọgụgụ ha na-abakwa ụba kwa ụbọchị. Ha siri n'ala Fijịa, na Galeshịa gafee, n'ihina Mmụọ Nsọ gbochiri ha ikwu okwu Chineke na Eshịa. Mgbe ha garuru n'oke ala Misịa, ha chọsiri ike ịga ozi na Bitinịa, ma Mmụọ nke Jesu ekweghị ha; ka ha si n'akụkụ Misịa gafee, ha garuru Troas. Pọl hụrụ ọhụ n'abali, ebe otu nwoke, onye Masedonia, guzo, na-arịọ ya sị: “Gafeta na Masedonia, nyere anyị aka.” Mgbe Pọl hụchara ọhụ nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masedonia, ebe anyị ji obi mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 100: 1-2.3.5 (R. v.I)

AZỊZA: Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọńụ.

  1. Ụwa niile tijerenu Onyenweanyị mkpu ọńụ, werenu iti mkpu ọńụ bịa n'ihu ya. A/
  2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke, ya kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya. A/
  3. N'ihina Onyenweanyị dị mma, Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe, ntụkwasịobi ya na-adịgide bido na-ndụdụgandụ ruo na ndụgụgandụ. A/

 

MBEKU: (Jọn Col 3:1) Alleluia, alleluia! Ọ bụrụ na unu so Kristi bilie n'ọnwu na-achọnụ ihe dị n'eluigwe ebe Kristi nọ n'aka-nri nke Chukwu Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (15:18-21)

Unu abụghị ndị nke ụwa, esiri m n'ụwa họpụta unu.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọ ụnụ asị, chetakwanụ na O buru ụzọ kpọ m asị. Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke ụwa, uwa ga-ahụ unu n'anya dị ka ndị nke ya. Maka na unu abụghị ndị nke ụwa, esiri m n'ụwa họpụta unu; n'ihi nke a ụwa ga-akpọ unu asi. Chetanụ ihe m gwara unu; ohu anaghị aka onye nwe ya. Ọ bụrụ na ha dobere okwu m, ha ga-edobekwa nke unu. Ihe ndị a niile ka ha ga-eme unu n'ihi m, n'ihina ha amaghị onye zitere m.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, were obi ebere nara onyinye ndịa site n'aka ezinuulo Gi. Mee k'anyị kwudosiike na ndụ nke inyere anyị ma nweta onyinye ebeebe nke ikwere na nkwa. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Nna, ana m ekpere ha ekpere, ka ha buru otu n'ime anyi, ka uwa were kwenye na obu Gi zitere m. alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Dinwenu, lekwasi ndị izoputaa n'ime Kristi anya, ka anyị bụ ndị eji ahuhu na onwu ya gbaputa, na ańụrị oge niile na mbilite n'onwu ya. Site na Kristi Dinwenu anyị.

THURSDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Ajula m alaeze nke uwa na ihe niile dị n'ime ya maka ihunaanya nke Dinwenu, Jesụ Kristi, onye nke m họrọgoro, onye nke m huru na anya, onye nke m kwenyere na ya, onye nke na enye m obi ańụrị alleluia.

EKPERE MMEGHE

Dinwenu tinye n'ime anyị amamihe na ike nke obe, nke ọmasiri Gị ibunye Rita dị asọ, ma ka anyị so Kristi ata ahụhụ n’ime onwụnwa dị iche iche ka anyị sonyesie ike na-emume nke ihe omimi nke Paska.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (15:7-21)

Anyi agaghi e bu ibu arọ bokwasi ndi na-eso ụzụ Jesu.

N'ụbọchị ndị ahụ: Ka ha sichara agụgọ okwu ogologo oge, Pita biliri sị ha, “Ụmụnna m, unu maara na site na mbụ Chineke họpụtara m iche site n'etiti unu ka m zisaa oziọma ahụ gwa ndị mba ọzọ, ka ha si n'ọnụ m nụ ya, ma kwerekwa. Chineke, onye maara obi mmadu gbaara ha aka ebe site na inye ha Mmuọ Nsọ dịka o nyere anyị. O gosighi ihe dị iche n'etiti anyị na ha. Ọ mere ka obi ha dị ọcha n'ihina ha kwere na Kristi. Ugbu a gịnị mere unu ji anwa Chineke, na ele ihe ọ ga-eme, site na iwere ibu arọ nke Iwu Mosis bokwasị ndị na-eso ụzọ Jesu, Ibu nnanna anyị ha na anyị onwe anyị ebulighị? Anyị kwere na-aga azọpụta anyị na ha site n'amara nke Onyenweanyị Jesu.” Mgbe ha nụrụ nke a nzukọ niile ahụ gbara nkịtị. Ha bidoro gewe ntị na-akụkọ Pọl na Banabas na akọrọ ha maka ihe ịrịbaama niile, na ọrụ ịtụnaanya niile nke Chineke jiri ha rụọ n'etiti ndị mba ọzọ. Mgbe ha kwuchara okwu nke a, Jemis kwuru sị: “Ụmụnna m, geenụ m ntị! Saịmọn akọọrọla anyị otu Chineke siri buru ụzọ leta ndị mba ọzọ, si n'etiti ha họpụtara onwe ya otu ndị ga-ekwupụta aha ya. Nke a na okwu ndị amụma dakọtara dịka e dere ya n'Akwụkwọ Nsọ sị: “Mgbe nke a gachara, aga m alọghachi, Aga m ewulite ụlọ Devid nke dara ada; n'ebe ya niile a kwadara akwada; Aga m emekwa ya ka o guzosie ike, ka ndị fọdụrụ n'etiti ndị mmadụ chọọ Onyenweanyị; bụ ndị mba ọzọ m kpọrọla ka ha bụrụ ndi nke m. Chineke kwuru nke a, onye mere ka a mara ihe ndị a site na mgbe ochie.” Ya bụ mkpebi m bụ k'anyị ghara isogbu ndi mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, kama, k'anyị dee akwụkwọ gwa ha ka ha ghara imerụ onwe ha site n'iri ihe e jiri chụọ aja, na isonye na ihe arụsi niile, ka ha wepu onwe ha n'ịkwa ịko na iri anụ anyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara. Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu n'obodo niile. A na agụkwa ya n'ụlọ nzukọ niile n'ụbọchi Sabat niile.”

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS  96:1-2a.2b-3.10 (R. see 3)

AZỊZA: Kwụpụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya n'ebe mba niile nọ.

  1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ; ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe, too aha ya. A/
  2. Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile. Mee ka ụwa niile mara maka otito ya, kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya ya n'ebe ndị mmadụ nọ. A/
  3. Kwusachaanụ n'ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze, ọ kwụwasịrị ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya. Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. A/

MBEKU: (Jọn 10:27) Alleluia, alleluia! Atụrụ m na-anụ olu m, ọ bụ Dinwenu n'ekwu amakwara m ha, ha na-esokwa m. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (15:9-11)

Nọgidenụ n'ịhụnaanya m ka ọńụ unu wee zuo oke.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Otu Nna m si hụ m n'anya, ka m si hụ unu n'anya. Nọgidenụ n'ịhụnaanya m. Ọ bụrụ na unu edobe iwu m niile, unu ga-anọgide n'ịhụnaanya m, dịka m si dobe iwu niile nke Nna m, wee nọgide n'ịhụnaanya ya. Ihe ndị a ka m gwara unu, ka ọńụ m wee dị n'ime unu, na ka ọńụ unu wee zuo oke.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, anyị ji obi anyị ebutere Gị onyinye ndịa ka ido ha asọ na ncheta nke Rita dị ngọzị. Site na-enyemaka ị na-enye anyị na ndụ anyị, ịgosigo anyị na-anyị ekwesighị inwe mgbanwo uche na nkwa dị ebebe ikwere anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Otu ihe kacha mkpa. Ọ họrọgo nke ka mma nke agaghị anapu ya. alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, ka amunwogoro anyị n’ụmị nke nzọpụta, anyị ji umeala arịọ Gị, ka site na arịrịọ nke Rita dị asọ, k’anyi jidesie Kristi ike ubọchi niile nke ndu anyi, ka anyị wee nweike ikete oke na-alaze amara Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

TUESDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Unu niile bụ di na atụrụ Chukwu egwu, ma ndi di ukwuu, ma ndi di nta, nyenu Chineke ekele, n'ihi na nzoputa n'ike ya abiala, ike nke Kristi, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chineke, inyechigo ndi nke Gi ndu ebebe site na ime ka Kristi si n'ọnwụ kulie. Mee ka okwukwe anyi sie ike, ka nchekwube anyi di okpu. K'anyi ghara itu uche na i ga emejuputa ihe I kwere anyi na nkwa. Site na Kristi Dinwenu anyị.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (14:19-28)

Ha kpọkọrọ ndi otu Kristi niile kọrọ ha ihe niile Chineke jiri ha rụọ.

 

N'ụbọchị ndị ahụ: Ụfọdụ ndị Juu sịrị na Antịọk na Aịkoninum bịaruo ebe ahụ, mee ka ndị mmadu tụgharịa imegide ha. Ha tụrụ Pọl okwute, dọkpụrụ ya pụọ n'obodo ahụ, chee na ọ nwụọla. Ma n'oge ndị na eso ụzọ Jesu bịara gbaa ya gburugburu o biliri laghachi n'ime obodo. N'echi ya, ya na Banabas sooro gaa Debe. Pọl na Banabas zisara oziọma na Debe, mee ka ọtụtụ ndi mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jesu. E mechaa, ha laghachiri na Listra, Aịkonium na Antịọk. Ha mere ka obi ndị na-eso ụzọ Jesu nọ n'obodo ndị a sie ike, gbakwaa ha ume, ka ha kwụdosie ike n'okwukwe. Ha gwakwara ha sị, “Anyị niile aghaghị ịta ahụhụ tupu anyị abanye n'Alaeze Chineke.” N'ime nzukọ Kristi niile ndị a, ha họpụtara ndị okenye ga-abụ ndi ndu ha. Ha ji ekpere na ịbuọnụ, nyefee ha n’aka Chineke, onye ha kwenyere na ya. Ha gafere Pisidia, ruo Pamfilia. Mgbe ha gbasachara oziọma na Pega, ha gbadara Atalịa, si ebe ahụ banye ugbọ mmiri ruo Antiok nke Siria n'ebe ahu e jiburu ekpere rara ha nye na nchedo na amara nke Chineke, maka ọrụ ịgbasa oziọma nke ha rụzuru ugbu a. Oge ha garuru Antịọk nke Siria, ha kpọkọrọ ndi otu Kristi niile kọrọ ha ihe niile Chineke jiri ha rụọ, na otu o si meghere ndị mba ọzọ ọnụ ụzọ nke okwukwe. Pọl na Banabas nọnyere ndi na-eso ụzo Jesu bi n'Antịọk ogologo oge.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 145:10-11.12-13ab.21 (R.v 12a)

AZỊZA: Ndị enyi Gị na-ekwusa otito nke eze Gị, O Onyenweanyi.

  1. Onyenweanyị ihe niile I kere ga-ekele Gị, ndi kwere na Gị ga-agọzi Gị. Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze Gị, ma kwupụtakwa ịdị ike Gị. A/
  2. Ka mmadụ niile mara ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube di elu nke alaeze Gị. Alaeze Gi ga-adị ebeebe, ọchịchi Gi na-adị na ndụdụgandụ niile. A/
  3. Ọnụ m ga-ekwupụta otito nke Onyenweanyị, ka ihe niile O kere gọzie aha nsọ ya, ebeebe ebeebe. A/

 

MBEKU: (Lk 24:46.26) Alleluia, alleluia! Ọ gwakwara ha sị: “Otu a, ka e si dee ya, na Kristi ahụ ga-ata ahụhụ sikwa n'ọnwụ bilie n'ụbọchi nke atọ. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (14:27-31)

Udo nke m ka m na enye unu.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na enye unu.Ọ bụghị dịka ụwa si enye udo ka m si enye unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri ka unu gharakwa ịtụ ụjọ. Unu anụla na agwara m unu na aga m ala, ma e mechaa aga m abịakwute unu. N'ihi nke a, ọ bụrụ na unu hụrụ m n'anya, unu gaara ịna-ańụrị ọńụ na ana m alakwuru Nna, n'ihina Nna m ka m. Ugbu a agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike ikwere. Bido ugbu a, ọ dịghị ọtụtụ okwu mụ na unu ga-ekwu, n'ihina onye ọchịchị nke ụwa na-abịa. O nweghị ike ọbụla n'ebe m nọ. Ana m eme dịka Nna nyere n'iwu, ka ụwa were mara na ahụrụ m Nna n'anya. Bilienụ ka anyị si n'ebe a pụọ.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu nara onyinye ndị a site n'aka uka Gị. Ma ka I nyegoro ya nchekwube maka nnukwu ańụrị a, meekwaa ka onyinye anyị mịta ezi mkpụrụ n'ime ańụrị na-enweghị ngwụcha. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Ebe obu n'anyi na Kristi anwugo, anyi kwenyere n'anyi ga eso ya bata na ndu, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu were obioma lekwasi ndị nke Gị anya ma anyị na-arịọ Gị ka ndị nke Gị bụ ndị agbanwogoro na ihe omimi Gị dị ebebe nweta na-anụ ahu ha emebi emebi nke otito mbilite na-ọnwụ. Site na Kristi Dinwenu anyị.