FRIDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Site na obara Gi, O Dinwenu, isigo na agburu na asusu di icheiche gbaputa anyi, site na mba na ndi di icheiche, imego anyi ndi alaeze nke Chukwu, Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nna, Ị nyela anyị ndụ ebebe site na Kristi nwa Gị onye bilitere n'ọnwụ ma nọrọ n'aka nrị Gị. k’ọga abụ na mgbe Ọ ga-abịa ọzọ n'ebube ka Ọ were anwụghị anwụ kpuchie ndị niile a mụrụ ọzọ na Baptism. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (18:9-18)

Enwere m  ọtụtụ mmadụ n’obodo a.

Mgbe Pọl nọ na Kọrint, n'otu abalị, Chineke gwara ya n'ọhụ sị: “Ụjọ atụla gị; kama na-ekwupụta m! Agbala nkịtị; n'ihi na a nọnyere m gị, mmadụ agaghị emeta gị ihe ọbụla. Maka na enwere m ọtụtụ mmadụ n'obodo a.” Pọl nọrọ na Kọrint otu afọ na ọnwa isii, na akuziri ndị mmadụ okwu Chineke. Ma n'oge Galio bụ gọvanọ na-achị ndị Rom ala Akaya, ndị Juu zukọrọ, jide Pọl kpụga ya n'ihu ọka ikpe, na ekwu sị: “nwoke a na amanye ndị mmadụ, ka ha na-ekpere Chineke n'ụzọ megidere iwu” Mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu Galio gwara ndị Juu sị: “Ndị Juu, agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a bụ ihe gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, ma ọ bụ arụ mmadụ mere megide obodo. Ma ebe ọ bụ esemokwu gbasara okwu ekwuru ekwu, na aha dị iche-iche ndi mmadụ na-ekwupụta, n'iwu ụnụ, dozienu nke ahụ n'onwe unu. Ajụrụ m ajụ ikpe ikpe dị otu a!” Ọ chụpụrụ ha n'ụlọ ikpe. Ha niile jidere Sostenes, bụ onye isi ụlọ nzukọ ha were iwe tie ya ihe n'ihu ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio mere anya ka ọ hụghị nke a. Pọl nọnyere ụmụnna n'ime Kristi ọtụtụ ụbọchị na Kọrint. O mechara hapụ ha, banye n'ụgbọ mmiri ruo Siria, ya na Prisila na Akwila. Ọ kpachasịrị isi ya na Kenkei, n' ihi na ọ kwere Chineke nkwa.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 47:2-3.4-5.6-7 (R. V.8a)

AZỊZA: Chineke bụ eze nke ụwa niile.

  1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka unu, were mkpu ọńụ tikuo Chineke. N'ihina Onyenweanyị onye kacha dị elu ka-anyị ga-atụrụ egwu, ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. A/
  2. Ọ na-edobe mmadụ n'okpuru anyị, meekwa ka mba niile nọrọ n'okpụru ụkwụ anyị. O bụ ya na-enye anyị oke ruuru anyị, nke O nyere Jekọb n'ihi ịhụnaanya O nwere n'ebe ọ nọ. A/
  3. Chineke ji mkpu ọńụ agbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo, kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe, kweerenụ eze anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe. A/

MBEKU: (Lk.24:46,26) Alleluia, alleluia! Kristi tara ahụhụ ma bilite n'ọnwụ, wee si otu ahụ banye n'otito ya. Alleluia!    

 

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:20-23)

O nweghịkwa onye ọbụla ga-anapụ unu ọńụ unu.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: N'eziokwu agwa m unu, unu ga-ebe akwa, nwekwaa mwute ma ụwa ga-enwe ańụrị. Unu ga-eru uju, ma nke a ga emechaa bụụrụ unu ihe ańụrị. Mgbe ime na eme nwaanyị ọ na anọ na mwute, n'ihi na oge ihe ufu nke ime omume abịala. Ma mgbe ọ mupụtachara nwa, ọ naghị echetakwa ahụhụ dị na ịmụ nwa, n’ihi ańụrị na-amụtara nwa n'elu ụwa. Ọ na-ewute unu ugbu a, ma aga m ahụ unu ọzọ. Obi unu ga ejupụta n'ańụrị. O nweghịkwa onye ọbụla ga-anapụ unu ọńụ unu. N'ụbọchị ahụ unu agaghị arịọ m ihe ọbụla. Ma ana m agwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọbụla n'aha m, ọ ga-enye ya unu.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, were obi ebere nara onyinye ndịa site n'aka ezinuulo Gị. Mee k'anyị kwudosiike na ndụ nke inyere anyị ma nweta onyinye ebeebe nke ikwere na nkwa. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Egburu Kristi Dinwenụ anyị maka njo, ma obilitere ozo k'anyi kwesi inwe ndụ, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, lekwasi ndị izoputara n'ime Kristi anya, ka anyị bụ ndị eji ahuhu na onwu ya gbaputa, na ańụrị oge niile na mbilite n'onwu ya. ya, onye di ndu na achi ebeebe ebeebe.

MONDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Kristi nke Kulitere n'ọnwụ agaghi anwụ ọzọ. Ọnwụ enweghikwa ike n'ebe ọ nọ. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

Mee, O Chukwu di ebere, ka nayi na-enweta oge nile mkpụrụ nke paska anyi na-eme emume ya na-amita.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Ọru ndịozi (16:11-15)

Dinwenu meghere obi ya, ige ntị n'ihe niile Pọl na-ekwu.

Ka anyị siri na Troas kwọrọ ụgbọ ruo Samọtres, anyị kwọrọ ụgbọ echi ya ruo Nịapolis. Anyị siri ebe ahụ garuo Filipi nke obodo mbụ nke ala Masedonia, nke so n'obodo ndị Rom na-achị. Anyị nọrọ n'obodo ahụ ụbọchị olemaole. N'ụbọchị Sabat anyị pụrụ n'ime obodo, gaa n'akụkụ osimiri, ebe anyi ghọtara na ụlọ ekpere ndị Juu dị: anyị nọdụrụ ala gwa ụmụnwaanyị ndị gbakọrọ ebe ahụ okwuchukwu. Otu n'ime ndị nụrụ okwu anyị bụ nwaanyị a na-akpọ Lidia, onye obodo Tịatira, onye na-ere akwa na- acha uhie-uhie. Nwaanyị ahụ bụ onye na efe Chineke. Dinwenu meghere obi ya, ige ntị n'ihe niile Pọl na-ekwu. Ma mgbe e mechara nwaanyị a na ezinụụlo ya mmirichukwu, ọ rịọrọ ka anyị bịa n'ụlọ ya sị: “Ọ bụrụ na unu atụleela, hụ na okwukwe m siri ike n'ime Onyenwanyị, bịanụ n'ụlọ m biri.” Ọ rịọsiri anyị ike.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 149:1-6.9 R/ v.4)

AZỊZA: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n'ebe ndị nke ya nọ.

  1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, ka ọgbakọ ndi kwere na ya kweere ya ukwe otito. Ka Izrel ńụrịa ọńụ n'ihi onye kere ya, ka ụmụ Zayọn ńụrịa n'ịhị onye eze ha. A/
  2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya, ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu. N'ihina Onyenweanyi nwere ịhụnaanya n'ebe ndị nke ya nọ, O kpubela ndi umeala okpu nke mmeri. A/
  3. Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n'ọnụ ha iji mejupụta ikpe a mara ha nke a bụ otito nke ndi nke ya kwere ekwe. A/

MBEKU: (Jọn 15:26-27) Alleluia, alleluia! Mmụọ nke eziokwu ahụ,Ọ ga-agbakwara m akaebe. Unu onwe unu ga-agbakwara m akaebe Dinwenu n'ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (15:26-16:4)

Mụọ nke eziokwu ga-agbakwara m aka ebe.

N’oge ahu: Jesu gwara ndi na-eso ụzọ ya sị: Mgbe onye nkasiobi ahụ, onye si na Nna m pụta, onye bu mmụọ nke eziokwu ahụ, onye nke m ga-esi na Nna zitere unu ga-abịa, Ọ ga-agbakwara m aka ebe. Unu onwe unu ga-agbakwa aka ebe, n'ihina mụ na unu nọ site na mbụ. “Agwala m unu ihe ndịa niile ka okwukwe unu ghara ịda. Ha ga-achụpụ unu n'ụlụ nzukọ ha. N'ezie, oge ga-abịakwa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-eche na ọ na-agara Chineke ozi. Ha ga-emekwa ihe ndị a, n'ihina ha amaghị Nna m, nke ha na-ama m. Ihe ndị a niile ka m na-agwa unu, nke ọ ga-abụ mgbe oge ahụ ruru unu echeta na m gwara unu. 

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nara, O Dinwenu anyi na-arịọ gi, onyinye ụka gi ji ọṅụ na-ebutere gi. Ebe I nyegoro ya nnukwu aṅụrị di otu a, mee ka onyinye ndi a anyi na-enbutere gi wetara anyị aṅụrị di ebeebe. Site na Krsti Onyenweanyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Jesu kwụrụ n’etitit ụmụazụ ya, wee si ha: Udo diri unu, Alleluia!

EKPERE ANATASỊA ORIRI NSỌ

Were ebere lekwasị ndi nke Gi anya, O Dinwenu, ma mee, anyị na-ariọ gi, ka ndi ọ masiri gi I gbanwe site n’ihe omimi ndia di ebeebe nweta anwụ anwụ nke ebube mbilite n’ọnwụ. Site na Kristi Dinwenuanyị.

 

SATURDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Unu bu ndi Chineke họtara ka ha bụrụ ndi nke ya. Ka unu na-eto onye ahu kpọputara unu na ọchịchirịị kpọbanye unu na oke ihe ya. alleluia.

EKPERE MMEGHE

Nna, na nrogo n'eluigwe nke nwa Gị, Ị kwere ndị ụmụ azụ Gị nkwa nke Mụọ Nsọ.Ị nyejụrụ ha amamihe nke si n'eluigwe; nyekwa anyị onyinye nke mụọ Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị .

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (18:23-28)

Apọlọs sitere n'Akwụkwọ Nsọ na-egosi ha na Jesu bụ Kristi ahụ.

Mgbe ọ nọchara nwa oge na Antịọk, Pọl biliri gaa ebe di iche-iche n'ala Galeshịa na Frijịa, na eme ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jesu sie ike. N'oge a, otu onye Juu, a mụrụ n'Elegzandrịa, aha ya bụ Apọlọs, bịaruru n'obodo Efesus. Nwoke a bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere n'Akwụkwọ Nsọ nke uukwa. Tupu ọ bịa, o nweela ndị kuzirila ya ụzọ nke Dinwenu. O jiri ịnụ ọkwụ n'obi na akuzị nke ọma ihe niile banyere Jesu. Ma ihe ọma maka ya mgbe ahụ bụ naanị mmirichukwu nke Jọn. Ọ malitere na-ekwu okwu, n'atụghị egwu, n'ụlọ nzukọ ndị Juu. Ma mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwuchukwu ya, ha kpọọrọ ya laa n'ụlọ, kọwaara ya nke ọma, ihe niile banyere ụzo nke Chukwu. Mgbe Apọlọs kpebiri ịga biri n'ala Akaya, ndị ụmụnna gbara ya ume, ma dee akwụkwọ ozi nye ndị na-eso ụzọ Jesu, ndị bi n'ebe ahụ, ka ha nabata ya nke ọma. O nyere ndị niile nọ n'ebe ahụ aka nke ukwuu, bụ ndị kwerenụ site n'amara nke Chineke. N'ihina o ji oke ịrụ ụka merie ndị Juu n'ihu ọha, sitekwa n'Akwụkwọ Nsọ na-egosi ha na Jesu bụ Kristi ahụ.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 46:2-3. 8-10 R/ v.8)

AZỊZA: Chineke bụ eze nke ụwa niile.

  1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka unu, were mkpu ọńụ tikuo Chineke. N'ihina Onyenweanyị onye kacha dị elu ka-anyị ga-atụrụ egwu, ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. A/
  2. Chineke bu eze nke ụwa niile, werenụ ukwe abụọma kweere ya ukwe otito, Chineke bụ eze na-achị mba niile, Ọ nọ n'ọche eze ya dị nsọ. A/
  3. Ndị ndu nke ụwa niile ezukọọla, dịka ndi nke Chineke Abraham. Ụta nke ndi agha nke ụwa bụ nke Chineke, Chineke bụ onye kacha dị elu. A/

 

MBEKU: (Jọn 16:28) Alleluia, alleluia! Esi m na Nna m pụta wee bịa n'ụwa. Ugbu a ana m ahapụ ụwa na-alakwurukwa Nna m.” Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:23-28)

Nna m hụrụ unu n'anya n'ihina unu hụrụ m n'anya, kwereke na m si n'ebe Chineke nọ bịa.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ma ana m agwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọbụla n'aha m, ọ ga-enye ya unu. Ma ruo ugbu a, o nwebeghị ihe ọbụla unu rịọrọ n'aha m. Rịọnụ unu ga-arịọta, ka ọńụ unu wee zuo oke.” Agwala m unu ihe ndị a n'ilu ma oge na-abịa mgbe m na agaghị agwakwa unu okwu n'ilu, kama aga m agwa unu ihe niile gbasara Nna m n'ụzọ na-agaghị agbagwoju unu anya. N'ụbọchị ahụ unu ga-arịọ ya ihe n'aha m, anaghị m asị unu na aga m arịọ Nna m ihe n'ihi unu. Nna m n'onwe ya hụrụ unu n'anya. Ọ hụrụ unu n'anya n'ihina unu hụrụ m n'anya, kwerekwa na m si n'ebe Chineke nọ bịa. Esi m na Nna m pụta wee bịa n' ụwa.Ugbu a na m ahapụ ụwa na alakwurukwa Nna m.''

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Nna dị ebere, doo onyinye ndi a nsọ, ma kwe ka aja nke a anyị na-achụnyere Gị mee anyị onyinye dị ebebe n'ihụ Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE MBATA

Nna achọrọ m ka ndi I nyere m nọrọ ebe m nọ, ka ha wee hu otito nke inyere m, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, mee ka Eukaristia nke a anyị mere na ncheta nke nwa Gị nyere anyị aka n'ito n'ịhụnaanya. Site na Kristi Dinwenu anyị.

THURSDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

ASCENSION THURSDAY

UKWE MBATA

Ndi Galili gini mere unu ji kwụrụ ebe a na-ele anya n'elu. Onyenweanyi ga alaghachi azụ dika osiri gbago, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Chineke Nna anyi mee ka anyi na-enwe aṅụrị na nrigooro nke nwa gi bu Jesu Kristi rigooro n'eluigwe. Mee ka anyị soro ya banye n'okike ọhụrụ, n'ihi na nrigooro ya bu otito na olilanya anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (1:1-11)

Ha nọ na-ele anya e welie Jesu elu.

Ezigbo Tiofilus, N'akwụkwọ nke mbụ edere m ihe banyere ihe niile Jesu mere na nke ọ kụziri n'oge ọ malitere ọrụ ya. Ruo ụbọchị ọ rịgooro n'eluigwe mgbe o nyechara ụmụazụ ya iwu site n'ike nke Mmụọ nsọ. Mgbe ọ tachara ahụhụ nke ọnwụ o gosiri ha onwe ya na ya dị ndụ n'ụzọ dị iche-iche n'ime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere ala eze Chineke. Mgbe ha na ya nọ, o nyere ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pụọ kama ka ha chere nkwa nke Nna kwere nke unu nuru n'ọnụ m. Ma Jọn jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu ma n'oge na-adịghị anya, a ga-eji mmụọ nsọ eme unu mmirichukwu. Mgbe ha gbakọrọ ha jụrụ Jesu sị, “Onyenweanyị, Ọ bụ n'oge a ka ị ga-enyeghachi Izrel alaeze?” Jesu azaa ha sị, “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge, ma ọ bụ ụbọchị nke Nna m debere n'ike nke aka ya. Kama unu ga-anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị unu. Unu ga-abụkwa ndi aka ebe m, n'ime Jerusalem na n'ime Judia na Sameria niile, ruokwa ngwụcha ụwa niile. Mgbe Jesu kwuchara okwu ndị a ha nọ na-ele anya e welie Jesu elu, igwe oji wee kpuchie ya wepụ ya n'anya ha. Ha legidere anya n'elu ka ọ na-aga, na mberede, ụmụnwoke abụọ yi uwe nruala ọcha kwụụrụ ha nso, sị ha, “Ndị Galili! Gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya n'eluigwe? Jesu a onye nke si n'etiti unu rịgoro n'eluigwe ga-abịaghachikwa ọzọ dịka unu siri hụ ya ka ọ na-ala n'eluigwe.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 46:2-3.6-9. R/ v.6)

AZỊZA: Chineke ji mkpu ọńụ gbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo.

  1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka unu, were mkpu ọńụ tikuo Chineke. N'ihina Onyenweanyị onye kacha dị elu ka-anyị ga-atụrụ egwu, ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. A/
  2. Chineke ji mkpu ọńụ agbago, Onyenweanyị ji olu opike arigo. Kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe, kweerenụ eze anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe. A/
  3. Chineke bu eze nke ụwa niile, werenụ ukwe abụọma kweere ya ukwe otito, Chineke bu eze na-achị mba niile, Ọ nọ n'oche eze ya dị nsọ. A/

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ndị Efesus (1:17-23)

O  mekwara ka ọ nọrọ n'aka nri ya n'ala eze eluigwe.

Ka Chineke nke Dinwenu anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, nye unu mmụọ nke amamihe na nke mkpughe iji mata ya. Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi unu, ka unu wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na ihe bụ nkụ nke nketa ahụ dị ebube n'etiti ndị nsọ ya; na ihe bụ ịdị ukwu na-enweghị atụ nke ike ya n'ime anyị, bụ ndị kwere ekwe, dika ọrụ nke ike aka ya siri dị. Nke a bụ nke o mejupụtara n'ime Kristi mgbe o siri n'ọnwụ kulie ya, mekwaa ka ọ nọrọ n'aka nri ya n'ala eze eluigwe, ka ọ nọdụ n'ebe dị elu karịchaa ọchịchị niile na ike niile na ịbụ isi niile bịa dịkwa elu karịa aha ọbụla a marala, ọ bụghị naanị n'ọgbọ nke a, kama ma ọgbọ nke ga-abịanụ. Chineke edobekwala ihe niile n'okpuru ụkwụ ya, mekwaa ya isi ihe niile maka nzukọ ya, nke bụ ahụ, ya na uju nke onye ahụ na-emezu ihe niile jupụtara ihe niile.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

MBEKU: (Mt 28:19.20) Alleluia, alleluia! Gaanu meenu ka mba niile bụrụ ndi na-eso ụzọ m. A ga m anọnyere unu ruo na ọgwugwu oge. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Matiu dere: (28:16-20)

Enyela m ike niile dị n'eluigwe na ụwa

Mmadụ iri na otu bụ ndị na-eso ụzọ Jesu gara Galili n'ugwu ahụ nke ọ gwara ha. Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọọrọ ya isi ala. Ma ụfọdụ nwere obi abụọ. Jesu bịakwutere ha, gwa ha sị: “Enyela m ike niile dị n'eluigwe na ụwa. Ya bụ, gaanụ, meenụ ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha mmirichukwu n'aha nna, na nwa na mmụọ nsọ. Kuzierenụ ha idobe ihe niile nke m nyere unu n'iwu. Lee, anọnyere m unu oge niile ruo na njedebe nke oge.”

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Onyenweanyi nara onyinye anyi ugbu a anyi na-eme emume maka nrigooro nke Nwa Gi Kristi rigooro n'eluigwe. Mee ka onyinye ya nyere anyi aka I soro ya rigooro n'aṅụrị nke eluigwe ebe ọ na achi ebeebe.

UKWE ORIRI NSỌ

Munwa bu Dinwenu ga a nọnyere unu ruo na ọgwụgwụ oge. alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, site na Eukaristia, anyi nwetere ihe nrite nke  ibu Chukwu nke ị nyere ụwa. Mee ka anyi jiri ihunaanya soro Kristi ruo ndụ ebebe ebe ọ bụ Dinwenu ebeebe ebeebe.

 

TUESDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Ka anyi ṅụrịanụ ma gorienu, ma nyekwa Chineke otito, maka na Onyenweanyi Chineke anyi ji ike niile na-achị eze. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile di ebere, biko mee ka anyi keta oke n'ezie na mbilite n'ọnwụ nke Kristi nwa Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọrụ ndịozi (16:22-34)

“Kwere n'Onyenweanyị Jesu, a ga-azọpụta gị na ezinụụlọ gị.”

N'ụbọchi ndi ahụ: Igwe mmadụ ndị ọzọ, ndị Filipi, biliri sonye imegide ha. Ndị ikpe ahụ dọwara uwe Pọl na Saịlas, nye ikikere ka apịa ha ụtalị. Mgbe ha tichara ha ihe, ha tụbara ha n'ụlọ mkpọrọ, nye onye nche ụlọ mkpọrọ iwu, ka o chesie ha ike, ka ha ghara ịpụ. Mgbe onye nche ahụ natara iwu nke a, ọ tụnyere ha n'ime ime ụlọ mkpọrọ, kpọsie ha ịga ike n'ụkwụ. N'etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ n'ekpere, na ekwe ukwe otito nye Chineke. Ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọkwa na-ege ntị, na mberede enwere oke ala ọma jijiji, nke a mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwa ngwa ọnụ ụzọ niile meghere, agbụ ndị mkpọrọ niile tọpụkwara. Onye nche ụlọ mkpọrọ tetara hụ na ọnụ ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ghe oghe. O chere na ndị mkpọrọ niile agbalagala. Ọ mịpụtara mma agha ya, ka ọ gbuo onwe ya. Ma Pọl tiri mkpụ n'oke olu sị, “Emerula onwe gị ahụ! Anyị niile nọ n'ebe a!” Ọ kpọrọ ka eweta ọkụ. Ọ mabara n'ime, daa n'ụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. Ọ kpọpụtara ha, na-ajụ ha sị, “Ndị nwe mmadụ. Gịnị ka m ga-emenụ ka m wee nweta nzọpụta?” Ha zara ya sị: “kwere n'Onyenweanyị Jesu, a ga-azọpụta gị na ezinụụlọ gị.” Ha gwara ya na ndị niile nọ n'ezinụụlọ ya okwu Chukwu. N'otu elekere ahụ, n'abalị ahụ, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ kpọọrọ ha sachaa ọnya nke ihe e tiri ha. N'atụfụghị oge, ha mere ya na ezinụụlọ ya mmirichukwu. Ọ kpọrọ Pọl na Saịlas banye n'ụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya na ezinụụlọ ya niile jụpụtara n'ọṅụ, n'ihi na ha abụrụla ndị kwere na Chineke.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (Ps: 138:1ac-2a.2bcd-3.7c-8 (R.v 7e)

AZỊZA: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.

  1. Eji m obi m niile na-ekele gị Onyenweanyị, n'ihi na Ị nụla ekpere m! N'ihụ ndị mmụọọzị niile aga m ekwere gị ukwe; Aga m akpọ isi ala n'ụlọ nsọ gị. A/
  2. N'ihi ịhụnaanya na ịkwụdosiike gị, n'ihi na aha gị na nkwa gị kacha dị elu. N'ụbọchị m kpọkụrụ gị, Ị zara m mekwaa ka ike m bawanye. A/
  3. Aka nrị gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị Chineke! ịhụnaanya gị na-adị ebeebe. Ahapụkwala anyị ndị Ị kere. A/

MBEKU: (Jn. 16:7-13) Alleluia, alleluia! Kristi bilitere n'ọnwụ, ma mee ihe niile ka ọ dị ọhụrụ, O gosila ebere ya n'ebe mmadụ nọ. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:5-11)

Ọ bụrụ na m alaghị, onye ntasịobi ahụ agaghị abịakwute unu.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ugbu a ana m alakwuru onye zitere m. Ọ dịghị onye n'ime unu jụrụ m sị, Olee ebe Ị na-eje? N'ihi na agwala m unu ihe ndị a, obi unu jupụtara n'ihe mwute. Ka o sila dị, ana m agwa unu eziokwu; Ọ bụ maka ọdịmma nke unu ka m ga-eji ala, n'ihi na ọ bụrụ na m alaghị, onye ntasịobi ahụ agaghị abịakwute unu. Ma ọ bụrụ na m laa aga m ezitere unu ya. Mgbe ọ bịara, ọ ga-ata ụwa ụta banyere mmehie, eziomume na ikpe. Ọ ga-ama ha ikpe mmehie n'ihina ha ekwenyeghị na m. Ọ ga-ama ha ikpe eziomume n'ihi na ana m alakwuru Nna m, unu agaghị ahụkwa m ọzọ. Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, n'ihi na ekpeela onye na-achị ụwa a ikpe.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nye anyị aṅuri nke ihe omimi Ịsta Gị, mee ka iga n'ihu na-achu aja nke gbanworu anyị dubata anyi n’aṅụrị ebeebe.  Site na Kristi Dinwenu anyị

UKWE ORIRI NSỌ

Okwesiri na Kristi ga-ata ahuhu, sikwa n'onwu bilite, ka o wee banye n'otito nke ya. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, mee ka ime emume nke nzoputa anyi nke a nyere anyi aka na ndụ nke a, ma dubaa anyị n'aṅụrị ebeebe.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

TUESDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

Ka anyi ṅụrịanụ ma gorienu, ma nyekwa Chineke otito, maka na Onyenweanyi Chineke anyi ji ike niile na-achị eze. Alleluia.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile di ebere, biko mee ka anyi keta oke n'ezie na mbilite n'ọnwụ nke Kristi nwa Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọrụ ndịozi (16:22-34)

“Kwere n'Onyenweanyị Jesu, a ga-azọpụta gị na ezinụụlọ gị.”

N'ụbọchi ndi ahụ: Igwe mmadụ ndị ọzọ, ndị Filipi, biliri sonye imegide ha. Ndị ikpe ahụ dọwara uwe Pọl na Saịlas, nye ikikere ka apịa ha ụtalị. Mgbe ha tichara ha ihe, ha tụbara ha n'ụlọ mkpọrọ, nye onye nche ụlọ mkpọrọ iwu, ka o chesie ha ike, ka ha ghara ịpụ. Mgbe onye nche ahụ natara iwu nke a, ọ tụnyere ha n'ime ime ụlọ mkpọrọ, kpọsie ha ịga ike n'ụkwụ. N'etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ n'ekpere, na ekwe ukwe otito nye Chineke. Ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọkwa na-ege ntị, na mberede enwere oke ala ọma jijiji, nke a mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwa ngwa ọnụ ụzọ niile meghere, agbụ ndị mkpọrọ niile tọpụkwara. Onye nche ụlọ mkpọrọ tetara hụ na ọnụ ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ghe oghe. O chere na ndị mkpọrọ niile agbalagala. Ọ mịpụtara mma agha ya, ka ọ gbuo onwe ya. Ma Pọl tiri mkpụ n'oke olu sị, “Emerula onwe gị ahụ! Anyị niile nọ n'ebe a!” Ọ kpọrọ ka eweta ọkụ. Ọ mabara n'ime, daa n'ụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. Ọ kpọpụtara ha, na-ajụ ha sị, “Ndị nwe mmadụ. Gịnị ka m ga-emenụ ka m wee nweta nzọpụta?” Ha zara ya sị: “kwere n'Onyenweanyị Jesu, a ga-azọpụta gị na ezinụụlọ gị.” Ha gwara ya na ndị niile nọ n'ezinụụlọ ya okwu Chukwu. N'otu elekere ahụ, n'abalị ahụ, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ kpọọrọ ha sachaa ọnya nke ihe e tiri ha. N'atụfụghị oge, ha mere ya na ezinụụlọ ya mmirichukwu. Ọ kpọrọ Pọl na Saịlas banye n'ụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya na ezinụụlọ ya niile jụpụtara n'ọṅụ, n'ihi na ha abụrụla ndị kwere na Chineke.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: (Ps: 138:1ac-2a.2bcd-3.7c-8 (R.v 7e)

AZỊZA: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.

  1. Eji m obi m niile na-ekele gị Onyenweanyị, n'ihi na Ị nụla ekpere m! N'ihụ ndị mmụọọzị niile aga m ekwere gị ukwe; Aga m akpọ isi ala n'ụlọ nsọ gị. A/
  2. N'ihi ịhụnaanya na ịkwụdosiike gị, n'ihi na aha gị na nkwa gị kacha dị elu. N'ụbọchị m kpọkụrụ gị, Ị zara m mekwaa ka ike m bawanye. A/
  3. Aka nrị gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị Chineke! ịhụnaanya gị na-adị ebeebe. Ahapụkwala anyị ndị Ị kere. A/

MBEKU: (Jn. 16:7-13) Alleluia, alleluia! Kristi bilitere n'ọnwụ, ma mee ihe niile ka ọ dị ọhụrụ, O gosila ebere ya n'ebe mmadụ nọ. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:5-11)

Ọ bụrụ na m alaghị, onye ntasịobi ahụ agaghị abịakwute unu.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ugbu a ana m alakwuru onye zitere m. Ọ dịghị onye n'ime unu jụrụ m sị, Olee ebe Ị na-eje? N'ihi na agwala m unu ihe ndị a, obi unu jupụtara n'ihe mwute. Ka o sila dị, ana m agwa unu eziokwu; Ọ bụ maka ọdịmma nke unu ka m ga-eji ala, n'ihi na ọ bụrụ na m alaghị, onye ntasịobi ahụ agaghị abịakwute unu. Ma ọ bụrụ na m laa aga m ezitere unu ya. Mgbe ọ bịara, ọ ga-ata ụwa ụta banyere mmehie, eziomume na ikpe. Ọ ga-ama ha ikpe mmehie n'ihina ha ekwenyeghị na m. Ọ ga-ama ha ikpe eziomume n'ihi na ana m alakwuru Nna m, unu agaghị ahụkwa m ọzọ. Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, n'ihi na ekpeela onye na-achị ụwa a ikpe.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu, nye anyị aṅuri nke ihe omimi Ịsta Gị, mee ka iga n'ihu na-achu aja nke gbanworu anyị dubata anyi n’aṅụrị ebeebe.  Site na Kristi Dinwenu anyị

UKWE ORIRI NSỌ

Okwesiri na Kristi ga-ata ahuhu, sikwa n'onwu bilite, ka o wee banye n'otito nke ya. Alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Dinwenu, mee ka ime emume nke nzoputa anyi nke a nyere anyi aka na ndụ nke a, ma dubaa anyị n'aṅụrị ebeebe.  Site na Kristi Dinwenu anyị.

WEDNESDAY OF THE FIFTH WEEK OF EASTER, YEAR B (Igbo)

UKWE MBATA

A ga m agbara gi aka ebe n'elu ụwa, O Dinwenu, a ga m ekwusa aha Gi n'etiti umu nne m, alleluia.

EKPERE MMEGHE

Dinwenu, etu anyị na-eme emume nke mbilite n'ọnwụ nke nwa Gị mee ka anyị soro ndị nsọ niile ńụrịa ọńụ mgbe nwa Gị ga-abịachi ọzọ n'otito ya. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Ọru ndịozi (17:15.22-18:1)

Chi ahụ unu na-ekpere na-amaghị ama ka m na ekwusara unu.

N'ụbọchị ndị ahụ: Ndị dupụrụ Pọl kpọruru ya n'obodo Atens, tupu ha alaghachi na Beroa. Mgbe ha na-ala Pọl ziri ha ozi ka Saịlas na Timoti gbaa mbọ, bịakwute ya ọsọọsọ. Pọl guzoro n'etiti nzukọ Ariopagus wee sị: “Ndị Atens! achọpụtara m na n'ụzọ ọbụla na unu na-ekpere chi dị iche-iche. N'ihina ka m na-akpagharị n'obodo unu, ahụrụ m ihe niile unu ji efe chi unu; ahụrụ m otu ebe ekwuaja nke e dekwasara n'elu ya, ihe e nyere chi nke amaghị ama. Chi ahụ unu na-ekpere na-amaghị ama ka m na ekwusara unu. Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị n'ime ya, bụ Chineke nke eluigwe na ụwa. Ọ naghị ebi n'ụlo arụsị nke mmadụ mebere, Ọ dịghị anara ije ozi n'aka mmadụ dika aga asị na o nwere ihe kọrọ ya, n'ihina ya onwe ya na enye mmadụ niile ndụ, ume na ihe niile. O sitere n'aka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ n'otu n'otu, ka ha biri n'elu ụwa dum. O jiri aka ya na mbụ kewachaa oge ọgbọ ọbụla na ndụdụgandụ ọbụla, ga-achịdebe. O kewakwara oke ala n'etiti mba na mba, Chukwu kere ihe ndị a niile, ka ụmụ mmadụ chọba ya. O bu n'obi na, eleghị anya, ọ ga-adị ha mkpa, ichọ Chineke chọta ya. Ma otu ọ dị Chineke nọ onye ọbụla n'ime anyị nsọ, n'ihina 'n'ime ya ka anyị na-adị ndụ, na-agagharị, na-adịkwa' ọ bụladị ụfọdụ n'ime unu ndị na-ede abụ, ekwuola otu ụdị okwu ahụ sị, 'N'eziokwu, anyị bụkwa ụmụ ya.' Ebe anyị bụ ụmụ Chineke, o kwesighị ka anyị na-eche na Chineke yiri ihe e jiri ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ma ọ bụ nkume rụọ, ọrụ aka nke mmadụ chepụtara n'obi ya. Chineke lefuru anya n'oge niile nke a maghị ihe. Ma ugbu a ọ na enye mmadụ niile iwu n'ebe niile ka ha niile chegharịa. N'ihina ọ wepụtara otu ụbụchị mgbe ọ ga-eji eziomume kpee ụwa niile ikpe, site n'aka otu nwoke ọ họpụtara. O nyela mmadụ niile ihe ha ga-eji kwere nke a, site n'ime ka o si n'ọnwụ bilie.” Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite n'ọnwu, ụfọdụ n'ime ha jiri ya mee ihe ọchị. Ụfọdụ sị: “Ị ga-akọro anyị akụkọ a ụbọchị ọzọ.” Nke a mere Pọl jiri si n'etiti ha pụọ. Ma ụfọdụ ndi mmadụ sonyere ya ma kwere, ụfọdụ n'ime ha bụ Diyonịshus, onye Ariopagus, ya na otu nwaanyi a na-akpọ Damaris, na ndị ọzọ. Mgbe ihe ndi a gachara, o siri n'Atens pụọ gaba Kọrịnt.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (PS 148:1-2.11-12.13.14 R/ v.1)

AZỊZA: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị, Onyenweanyị.

  1. Si n'eluigwe too Onyenweanyị, toonu ya n'ebe kacha elu. Toonu ya ndị mmụọozi ya niile, toonụ ya, igwe ndị agha ya niile. A/
  2. Ndị eze niile nọ n'ụwa, na mba niile; ụmụ ndi eze niile, na ndị ọchịchị nọ n'ime ụwa. Ụmụ okorobịa na ụmu agbọghọbịa, ndi okenye nakwa ụmụ ntakịrị. A/
  3. Ka ha niile too aha Onyenweanyị, n'ihina sọọsọ aha ya dị omimi, ebube ya karịrị eluigwe na ụwa. A/
  4. Ọ na-ewelite ike nke ndị nke ya, maka otito ndị ya dị nsọ, nke ụmụ Izrel bụ ndị ọ hụrụ n'anya. A/

MBEKU: (Jọn 14:16) Alleluia, alleluia! Aga m arịọ Nna ka o nye unu onye nkasiobi ọzọ ka ọ nọnyere unu mgbe niile. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'Oziọma dị asọ nke Jọn dere: (16:12-15)

Mmụọ nke Eziokwu ahu ga-eduba unu n'eziokwu niile.

N’oge ahu: Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Enwekwara m ọtụtụ ihe ndi ọzọ m ga-agwa unu, ma unu agaghị anabatalị ha ugbu a. Mgbe Mmụọ nke eziokwu ahụ bịara, Ọ ga-eduba unu n'eziokwu niile. Ọgaghị ekwu n'ike aka ya, ma ọ ga-ekwu ihe niile ọ nụrụ, kọkwara ụnụ ihe gaje ịbịa. Ọga-enyekwa m otito, n'ihina ọ ga-esite n'aka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu. Ihe niile Nna m nwere bu nke m. Nke a ka m ji sị na Mmụọ Nsọ ga-esite n'aka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịrị Gị Kristi.

EKPERE NHUNYE

Dinwenu Chineke, site na mgbanworita dị nsọ nke onyinye ndi a, Ị na-eme ka anyị keta oke na ndụ Gị, biko mee ka ihe niile anyị na-eme bụrụ nke ga-aga na nduzi nke amamihe na eziokwu Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị .

UKWE ORIRI NSỌ

Onyenweanyị kwụrụ si a họrọgo m gi n' ụwa a, ka ị ga mia mkpuru ga adịgịde, alleluia.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Nna onye ebere, mee ka ihe omimi nke a nye anyị nghọta ọhụrụ ma wetara anyị ndụ ọhụrụ n'ime Gị. Site na Kristi Dinwenu anyị .