01. MONDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

N'elu ocheeze dị ebube ma dị elu, ahụrụ m nwoke nọ ala, onye ọtụtụ igwe ndị mmụ ọma na-esekpụrụ, ma na-ekwekọrịta ukwe ọṅụ. Leenu ya, onye aha alaeze ya ga-adị ebeebe.

EKPERE MMEGHE

Were nchekwaba nke eluigwe zaa ekpere na arịrịọ ndị nke Gị, O Dinwenu, anyị na-arịọ, ka ha wee nwe ike ihụ ihe kwesiri na a ga-emeriri, ma nwetakwa ike ime ihe ha hụrụ. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE GG NKE MB

Ihe gg e wetara n'akwkw mb nke Samel dere (1 Samel 1:1-18)

“Penina, b nwunye d ya, na-akpasu ya iwe mgbe bla, na-akpar ya, n'hna Dinwenu mere ya nwaanyaga.”

O nwere otụ nwoke aha ya bụ Elkana. Nwoke ahụ bụ onye agbụrụ Ifrem. O bị n'obodo Rama nke dị n'obodo Ugwu Ifrem. Nwoke ahụ bụ nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf. Elkana lụrụ ụmụnwaanyị abụọ. Aha otu bụ Hana, aha nke ọzọ bụ Penina. Penina mụtara ụmụ, ma Hana amụtaghị. Kwa afọ, Elkana na esi n'obodo ya bụ Rama jee Shịlọ ịchụrụ Dinwenu, Chineke nke Igwe ndịagha aja na ife ofufe ndụ. N'ebe ahụ, ụmụ Elaị abụọ. Hofni na Fineha, bụkwa ndị ụkọchukwu Dinwenu. Mgbe ọbụla Elkana chụụrụ Dinwenu aja, o na-ekenye Penina na ụmụ ya niile, onye ọbụla n'ime ha oke. Ma, ọ bụ ezie na ọ hụrụ Hana n'anya, o na-enye ya nnanị otu oke, n'ihina Chineke mechiri akpanwa ya. Penina, bụ nwunye dị ya, na-akpasu ya iwe mgbe ọbụla, na-akpari ya, n'ihina Dinwenu mere ya nwaanyịaga. Otu a ka Elkana na-eme kwa afọ. Mgbe ọbụla ha jere n'ụlọnsọ” Dinwenu, Penina ga-akpasurịrị hana iwe nke ukwu. Nke a mere Hana ji ebe akwa nke ukwuu gharakwa iri ihe. Elkana dị ya na-ajụkwa ya sị, “Hana, gịnị mere I ji ebe akwa? Gịnị mere I ji jụ iri ihe? Gịnị mere I ji eru uru? Ọ bụ na m adịghị gị mkpa karịa ụmụ iri”?

Okwu nke Osebrwa

Ekele diri Chukwu

Read more: : 01. MONDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

MONDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw mb nke Samuel (1:9-20)

“Dinwenu chetara Hana. O wee tr ime mụọ  Samuel.”

Otu ụbọchị, mgbe Elkana na ezinụụlọ ya richara ihe oriri ha, ṅụchakwaa ịhe ọṅụṅụ Ha n'ụlọ Dinwenu na Shịlọ, Hana biliri jee n'ihu Dinwenu. Mgbe ahụ Elaị onye ụkọchukwu nọ n'oche dị n'akụkụ ọnụ ụzọ Ụlọnsọ Chineke. N'ihi oke uru nke obi ya, o jiri anya mmiri kpeere Dinwenu ekpere, kwe ya nkwa sị: “Chineke nke igwe ndịagha! ọ bụrụ na I lekwasị anya na nsogbu nke ohu Gị nwaanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwaanyị wee nye m nwa nwoke, aga m edoro Gị ya nsọ ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agaghịkwa aga ya n'isi. Oge ahụ Hana na-ekpe ogologo ekpere n'ihu Dinwenu, Elaị no na-ele ka egbugbereọnụ ya sị emegharị. Ma Hana na-ekpe ekpere n'obi ya. Ọ bụ ezie na egbugbereọnụ ya na-emegharị emegharị, ma o nweghị onye nụrụ olu ya. Ya mere, Elaị chere na mmanya na-egbu ya. Elaị we sị ya, “kedu mgbe mmanya ga-akwusị igbu gị? Kwusi ịṅụ oke mmanya, anya doo gị.” Hana zara ya sị, “mba, nnamukwu, aṅụghị m nkwụ ọbụla mọbụ mmanya na-aba n'anya. Abụ m nwaanyị nọ na nnukwu nsogbu. Ana m akọrọ Osebụrụwa obi m. Echela na ohu gị nwaanyị bụ onye iberibe. N'oge a niile, esi m n'ihe mgbu nke ala obi m ekpe ekpere.” Elaị azaghachi ya, “Laa n'udo! Chineke nke Izrel nyekwa gị ihe ị rịọrọ ya!” Hana sị ya, “Biko, na-echeta ohu gị nwaanyị n'ekpere mgbe dum.” Hana wee sị n'ebe ahụ pụọ, rie ihe, ihu agbarụghịkwa ya ọzọ. Elkana na ezinụụlọ ya bilie n'isi ụtụtụ kpọọ isiala n'ihu Dinwenu, wee laghachi n'ụlọ ha na Rama. Elkana na Hana nwụnye ya nwere mmekọ, Dinwenu wee nụ ekpere ya. O wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Samuel n'ihi na ọ sị, “Arịọtara m ya n'aka Chineke.”

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 02. MONDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw mb nke Samuel (1:9-20)

“Dinwenu chetara Hana. O wee tr ime mụọ  Samuel.” 

Otu ụbọchị, mgbe Elkana na ezinụụlọ ya richara ihe oriri ha, ṅụchakwaa ịhe ọṅụṅụ Ha n'ụlọ Dinwenu na Shịlọ, Hana biliri jee n'ihu Dinwenu. Mgbe ahụ Elaị onye ụkọchukwu nọ n'oche dị n'akụkụ ọnụ ụzọ Ụlọnsọ Chineke. N'ihi oke uru nke obi ya, o jiri anya mmiri kpeere Dinwenu ekpere, kwe ya nkwa sị: “Chineke nke igwe ndịagha! ọ bụrụ na I lekwasị anya na nsogbu nke ohu Gị nwaanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwaanyị wee nye m nwa nwoke, aga m edoro Gị ya nsọ ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agaghịkwa aga ya n'isi. Oge ahụ Hana na-ekpe ogologo ekpere n'ihu Dinwenu, Elaị no na-ele ka egbugbereọnụ ya sị emegharị. Ma Hana na-ekpe ekpere n'obi ya. Ọ bụ ezie na egbugbereọnụ ya na-emegharị emegharị, ma o nweghị onye nụrụ olu ya. Ya mere, Elaị chere na mmanya na-egbu ya. Elaị we sị ya, “kedu mgbe mmanya ga-akwusị igbu gị? Kwusi ịṅụ oke mmanya, anya doo gị.” Hana zara ya sị, “mba, nnamukwu, aṅụghị m nkwụ ọbụla mọbụ mmanya na-aba n'anya. Abụ m nwaanyị nọ na nnukwu nsogbu. Ana m akọrọ Osebụrụwa obi m. Echela na ohu gị nwaanyị bụ onye iberibe. N'oge a niile, esi m n'ihe mgbu nke ala obi m ekpe ekpere.” Elaị azaghachi ya, “Laa n'udo! Chineke nke Izrel nyekwa gị ihe ị rịọrọ ya!” hana sị ya, “Biko, na-echeta ohu gị nwaanyị n'ekpere mgbe dum.” Hana wee sị n'ebe ahụ pụọ, rie ihe, ihu agbarụghịkwa ya ọzọ. Elkana na ezinụụlọ ya bilie n'isi ụtụtụ kpọọ isiala n'ihu Dinwenu, wee laghachi n'ụlọ ha na Rama. Elkana na Hana nwụnye ya nwere mmekọ, Dinwenu wee nụ ekpere ya. O wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Samuel n'ihi na ọ sị, “Arịọtara m ya n'aka Chineke.”

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 03. TUESDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GUGU NKE MB

Ihe gugu ewetara n'Akwkw mb nke Samuel (3:1-10.19-20)

“Kwuwe Onye nwe m, nwa odibo g na-ege nt”.

N'oge ahụ: mgbe nwata ahụ bụ Samuel na-ejere Dinwenu ozi n'okpuru Elai, Dinwenu ịgwa ndị mmadụ okwu dị ụkọ; a naghị enwe ọhụ mgbe ọbụla. O ruo otu abalị, Elaị bụ onye anaghị ahụzi ụzọ nke ọma, nọ n'ụra n'ụlọ ya. Mgbe ahụ Samuel dina n'ụlọnsọ, ebe igbe ọgbụgbandụ Dinwenu dị, ọkụ dị ebensọ anyụbeghị. Dinwenu akpọọ ya: “Samuel! Samuel! Ọ zaa sị “Anọ ebe a!” Ọ gbara ọsọ, jekwuru Elaị, sị ya “Abịala m. Ọ kwa ị kpọrọ m?” Elaị sị ya, “Akpọghị m gị. Gaa dina ala”. Samuel wee laghachị dina ala. Ọzọkwa Dinwenu akpọọ ya! Samuel Samuel” Samuel kuliri jekwuru Elaị sị ya “Abịala m, Ọ kwa ị kpọrọ m?” Ọ sị ya “Akpọghị m gị, nwa m; gaa dina ala.” Mgbe ahụ Samuel n'onwe ya amabeghị ihe ọbụla gbasara Dinwenu, Dinwenu agwabeghị ya okwu na mbụ. Dinwenu wee kpọọ Samuel oku nke ugboro atọ. O kuliri jekwuru Elaị, sị ya, “Abịala m. Ọ kwa ị kpọrọ m?” Mgbe ahụ, Elaị ghọtara na ọ bụ Dinwenu na-akpọọ nwata ahụ oku. Ya mere, ọ sịrị ya, “Jee dina ala. Ọ bụrụ na Ọ kpọọ gị ọzọ sị ya, 'kwuwe Onyenwe m, nwa odibo gị na-ege ntị” Samuel wee jee, dina ala ọzọ. Dinwenu bịara guzo n'ebe ahụ, kpọọ ya oku dịka na mbụ: “Samuel! Samuel!” Samuel zaa sị “Kwuwe Onye nwe m, nwa odibo gị na-ege ntị”. Samuel wee na-eto. Dinwenu nọnyekwara ya, na-emekwa ka ịhe niile Samuel kwuru mezụọ. Ya mere, ndị Izrel niile, bido na Dan ruo na Biasheba matara na Samuel bụ onye amụma nke Chineke n'ezie.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GUGU NKE MBU

Ihe gugu ewetara n'Akwkw mb nke Samuel (4:1-11)

“Emeriri nd Izrel. Nd Filistia burukwara Igbe gbgband Chineke.”

Okwu Samuel ruru ụmụ Izrel niile ntị. N'oge ahụ, Elaị emeela agadị, ụmụ ya ka nọgịdesikwara ike n'omume ọjọọ ha. Mgbe ahụ, ndị Filistia biliri, ibuso ndị Izrel agha. Ha wuru ogige ha n'Afek, ebe ụmụ Izrel wuru ogige nke ha ebe dị nso n'Ebeneza. Ndị Filistia doziri ndịagha ha n'usoro wee malite agha. Agha ahụ siri ike nke ukwu nke mere na ndị Filistia meriri ụmụ Izrel, gbuo puku anọ nke ndịagha ha n'ọgbọ agha. Mgbe ndịagha Izrel ndị nwụfọrọ n'agha laghachiri n'ogige ha, ndị okenye Izrel sịrị, “Gịnị mere Dinwenu ji kwenye ka ndị Filistia merie anyị taa? Ya mere, ka anyị jeenụ Shilo bute Igbe ọgbụgbandụ Dinwenu, ka ọ bịa n'etiti anyị, zọpụta anyị n'aka ndịro anyị.” Ndi Izrel wee ziga ndịozi, ka ha jee Shilo bute Igbe ọgbụgbandụ Chineke nke igwe ndịagha, onye ndị mmụọọma a kpụrụ akpụ bụ ocheeze ya. Ụmụ Elaị abụọ, Hofini na Finehas bu Igbe ọgbụgbandụ ahụ bịa. Mgbe Igbeọgbụgbandụ ahụ rutere, ụmụ Izrel niile tiri oke mkpu nke mere na ala mara jijiji. Mgbe ndị Felistia nụrụ ụzụ ha, ha jụrịtara onwe ha sị, “Gini mere ndị Hibru ji eme ụzụ n'ogige ha?” Mgbe ha chọpụtara na ndị Hibru ebutela Igbe ọgbụgbandụ Dinwenu n'ogige ha, ha tụrụ egwu, wee sị, “Anyị ahụbeghị ụdị ihe a mbụ! Anyị efuola! N'ihi na chi ha abatala n'ogige ha. Onye ga-anapụta anyị n'aka chi a dị ike nke ukwuu? Ọ bụ ya bụ chi ji ajọ ọrịa dị iche iche gbuchapụ ndị Ijipt n'ịkpa! Mana ndị Filistia, nweenụ obiisiike! Lụonụ ọgụ ka nwoke! Unu emeghị otu a, unu ga-abụ ndị ohu ndị Hibru dịka ha onwe ha bụ ndị ohu unu. Ya mere lụonụ ọgụ ka nwoke!” Ndị Filistia wee lụsie ọgụ ike merie ndị Izrel. Ndị Izrel gbara ọsọ, laa n'ụlọ ha onye ọbụla n'ime ha. Ndị Izrel e gburu n'agha ahụ adị iri puku atọ, bụ ndị jiụkwụ alụ ọgụ. Ndị Filistia burukwara Igbe ọgbụgbandụ Chineke, gbukwaa ụmụ Elaị abụọ, Hofni na Finehas.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 05. THURSDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GUGU NKE MBU

Ihe gugu ewetara n'Akwkw mb nke Samuel (8:4-7.10-22a)

Ndị okenye Izrel zukọrọ, bịakwute Samuel na Rama, wee sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadị. Ma ụmụ gị anaghị eso ụkpụrụ Gị. Ya mere họpụtara anyị eze ga-achị anyị, ka anyị nwee eze dị ka mba ndịọzọ”. Arịrịọ ha rịọrọ ka e nye ha eze wutere Samuel. O wee kpee ekpere ịmata uche Dinwenu. Dinwenu gwara ya, “Gee ha ntị n'ihe ọbụla ha na-gwa gị, n'ihi na ọbụghị gị ka ha jụrụ; kama, ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ịbụ eze ha. Samuel gwara ndị Izrel, ndị na-arịo eze n'aka ya, ihe niile Dinwenu gwara ya. Ọ sịrị ha: “Otu a ka eze unu ga-esi emeso unu. Ọ ga-achịrị ụmụ unu ndị nwoke nuba ha n'agha. Ụfọdụ n'ime ha ga-anya ụgboinyịnya agha ya niile. Ụfọdụ ga na-eji ịnyịnya alụrụ ya agha. Ụfọdụ ga-ebutere ndị ụgbọịnyịnya agha niile ụzọ. Ọ ga-eme ụfọdụ n'ime ha ndị ịsị usu puku ndịagha. Ndị ọzọ ga-abụkwa ndị isi usu iri ndịagha. Ụmụ unu ndị nwaanyị ga-abụkwa ndị na-emere ya ude na-esi isi oma. Ha ga-abụkwara ya ndị na-esiri ya nri na ndị na-emere ya achịcha. Ọ ga-anarakwa unu ebe kachasị mma n'ala ubi unu, na ubi vaịn unu, na ọhịa osisi oliv unu, were ha nye ndị odibo ya. Ọ ga-anarakwa unu otu ụzọ n'ụzọ iri nke ihe unu wetere n'ubi, na nke ubi vaịn unu, nye ndị na-ejere ya ozi na ndị odibo no n'ezinụụlọ ya. Ọ ga-akpọrọkwa ụmụodibo unu ndị nwoke na ndị nwaanyị kacha mma, werekwa ndị kachasị mma n'ehi unu niile, na inyinyaibu unu, mee ka ha rụọrọ ya ọrụ. Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ n'ụzọ iri nke igwe ewu na atụrụ unu. Unu onwe unu ga-abụkwa ndị ohu ya. Mgbe oge ahụ ruru, unu ga-etikwa mkpu n'ihi ihe eze unu họpụtara onwe unu na-ame unu, ma Osebụrụwa agaghị ege unu ntị. Ma ndị Izrel aṅaghị Samuel ntị. Kama ha sịrị, “Mba! Anyị chọrọ eze ka anyị wee dị ka mba ndị ọzọ, Eze ga na-achị anyị, nke ga na-edu anyị eje agha, nke nwekwara ike ịlụrụ anyị agha.” Samuel nụchara ihe niile ndị Izrel kwuru, wee jee kọọrọ Dinwenu. Dinwenu gwara Samuel sị, “Meere ha ihe ha chọrọ, nye ha eze.” Ya mere Samuel wee gwa ụmụnwoke ndị Izrel niile ka ha laa n'ụlọ ha.

Okwu nke Osebrwa

Ekele diri Chukwu.

ABUMA NA AZZA Ps. 89:16-17.18-19 (R. 2a)

Azza: Agam ekwupta d mma nke Dinwenu ebeebe ebeebe.

  1. Ngọzị ga-adịrị ndị niile ji ukwe eto Gị, ndị na-aga n'ihe nke obi ọma Gị, O Onyenweanyị. Ha na-aṅụrị ọṅụ n'aha Gị ụbọchị niile na-enwekwa mbuli elu site n'ezi omume Gị. A.
  1. I bụ ike anyị na otito anyị; site n'obiọma Gị anyị na-enwe mmeri. Lee Onyenweanyị bụ nchedo anyị; Onye dị nsọ nke Izrel, eze anyị. A

MBEKU: (Luke 7:16) Alleluia, alleluia!  Nnukwu onye amụma ebilitela n'etiti anyị! Ozo, Chineke abịala ileta ndị nke ya. Alleluia!

OZIMA

Ihe ọgugu nke a si n' Oziọma di asọ nke Mak dere (2:1-12)

Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara mmehie n'ụwa.

Ka Jesu laghachiri na Kapanaum, akụkọ wee gazuo na Ọ nọ ma ọtụtụ mmadụ zukọtara nke mere na ohere ọbụla adịghịkwa, ọ bụladị n'ọnụzọ; ma ọ gwabara ha okwu Chineke. Mmadụ ụfọdụ buteere ya otu onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwu, nke mmadụ anọ n'ime ha bu. Ebe ha na-enweghị ike ịbịarụ ya nso n'ihi igwe mmadụ ahụ, ha meghere oghere n'elu ụlọ, n'akụkụ ebe ahụ Jesu nọ. mgbe ha meghechara ya, ha budara onye ahụ ahu ya kpọnwụrụ akpọnwụ  n'ute ọ na-edina. Ma mgbe Jesu hurụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ akụku ahu ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m, a gbaghagoro gị mmehie gị niile” Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọdụrụ ebe ahu na-aju n'ime obi ha sị, “Gịnị mere nwoke a ji ekwu okwu otu  a? Ọ bụ nkwuru! O nwere onye nwere ike igbaghara mmehie ma ọ bụghi Chineke”? Ngwangwa, Jesu chọpụtara na mmụọ Ya na ha na-atụle okwu a n'ime obi ha; Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atụle okwu a n'ime obi unu? Olee nke ka mfe ime, ịsị onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, 'agbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ịsị ya, 'bilie chịrị ute gị gagharịba? “Ma ka unu mara na Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara mmehie n'ụwa a.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ “ana m agwa gị, bilie, chịrị ute gị laba. O biliri, chịrị ute ya ngwangwa si n'ihu ha niile pụọ. Nke a tụrụ ha niile n'anya ha wee too Chineke sị, “anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a mbụ”!

Ozima nke Osebrwa

Otito diri Gi Kristi.

SATURDAY OF THE FIRST WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GUGU NKE MBU

Ihe Ọgugu ewetara n'Akwụkwọ mbụ nke Samuel (I Samuel 9:1-4.17-19; 10:la)

E nwere otu nwoke onye Benjamin, aha ya bụ Kish, nwa Abiel, nwa Zerọ, nwa Bekorat, nwa Afịa, onye agbụrụ Benjamin. Nwoke ahụ bụkwa ọgaranya a maara aha ya. Nwoke ahụ nwekwara nwa nwoke, aha ya bụ Sọl. Ma Sọl bụ nwaokorobia mara mma. Ọ dịghị nwoke ọbụla n'Izrel mara mma ka ya. Ihe o jiri kara ndị Izrel niile ogologo bụ site n'ubu ya ruo n'isi. Otu mgbe, ụfọdụ n'ime ịnyịnyaibu kish, bụ nna Sọl, kpafuru. Ya mere, ọ sịrị Sọl, “Kpọrọ otu n'ime ndị odibo m ka gị na ya jee chọọ ịnyịnyaibu m furu efu.” Ha gafere ugwu ala Ifrem, si ya garuo n'ala Shalisha, ma ha achọtaghị ha. Ha chọọrọ ha ruo ala Shaalim; ma ha anọghị ebe ahụ. Ha garuru oke ala Benjamin, ma ha achọtaghị ha. Ozigbo Samuel hụrụ Sọl, Dinwenu sịrị ya, “Lee nwoke ahụ m gwara gị maka ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị nke m. Sọl bịarụrụ Samuel nso n'etiti ọnụụzọ ama, jụọ ya sị, “Biko, olee ebe onye Ọhụụzọ bị?” Samuel zara Sọl sị, “Mụ onwe m bụ onye  Ọhụụzọ ahụ. Burunụ m ụzọ gaba ebe ofufe ndụ ahụ n'elu ugwu. Mụ na unu ga-eriko ihe taa. N'ụtụtụ echị, aga m agwa unu ihe niile dị unu n'uche, zilakwa unu. Samuel wee were karama mmanụ oliv, wụkwasị ya n'isi Sọl, susuo ya ọnụ sị, “Dinwenu eteela gị mmanụ ịbụ eze ndị nke ya, bụ Izrel. Ị ga-achị ndị nke ya, napụtakwa ha n'aka ndịịro ha niile. Nke a ga-abụrụ gi ihe ama na Dinwenu ahọpụtala gị ịbụ onye ndu ndị nke ya.

Okwu nke Osebrwa

Ekele diri Chukwu.

ABUMA NA AZZA (Ps. 21 :2-3.4-5.6-7 (R. 2a)

Azịza: Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze aṅụrị.

  1. Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze aṅụrị. Ọ na-enwe aṅụrị n'ihina I nyela ya mmeri Ị nyela ya ihe obi ya na-achọ; ị naghị ajụ ihe ọbụla ọ rịọrọ Gị. A
  1. N'ihi na I jirila ngozi pụrụ iche zute ya kpube ya okpueze e jiri ọlaedo na-enweghị ntụpọ mee; I nyere ya ndụ mgbe ọ rịọrọ Gị Nyekwa ya ogologo ndụ ebeebe ebeebe. A
  1. Otito ya abawanyela site n'enyemaka nke nzọpụta Gị; Ị jirila otito na ebube chọọ yam ma N'ezie. Ị meela ka ọbụrụ ya ngozi dị ebighịebi, Nyekwa ya ọṅụ site n'ịnọ ya nso mgbe niile. A

 MBEKU:(Lk. 4:18) Alleluia, alleluia! Mmụọ nke Dinwenu nọnyere m, O eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye oziọma. Alleluia! Alleluia!

OZIMA

Ihe gugu nke a si n' Ozima di as nke Mak dere (Mk. 2:13-17)

“Abagh m kp nd eziomume kama nd nj.”

N'oge ahụ: Jesu laghachiri ọzọ n'akụkụ osimiri, igwe mmadụ ahụ niile wee gbaa okirikiri, Ọ malitere ịkụziri ha ihe. Ma ka Ọ na-agafe, Ọ hụrụ Levaị nwa Alfeus ka ọ nọ n'ụlọụtụ na-anakọ ego, ma Ọ sịrị ya, “Sobe m” O bilie sobe Ya. Ma ka Jesu nọ n'ochenri n'ụlọ Levaị ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ soro Jesu na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ. Mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ na Jesu, ndị ọnaụtụ na ndị njọ na-erikọ nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ Ya sị, “Gịnị mere ya na ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ ji erikọ nri”? Mgbe Jesu nụrụ ya Ọ sịrị ha, “mkpa dibịa anaghị akpa ndị ahụ dị, kama ndị ahụ na-adịghị. Abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ”.

Ozima nke Osebrwa

Otito diri Gi Kristi.