THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Kweerenu Osebrụwa ukwe ọhụrụ, Kweerenụ Osebrụwa ukwe, mba niile. Ebube na ugwu bu nke ya, ike na nsọpụrụ  juputara n’ụlọ ya di asọ. (Abụ 96:1.6)

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile di ebeebe, biko, mee k’anyị na-eme ihe niile n’ụzọ ga-asọ gi, wee si n’aha Nwa gi I hụrụ n’anya nweta ụba na iheọma nke ezi-ọrụ. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

 

EKPERE NHUNYE

Anyị na-ario gi, O Osebrụwa, ka I nara onyinye anyị na-enye gi. Dika I na edo ha aso, mee ka ha wetara anyị nzọpụta  Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

Abụ m ihe nke ụwa: ọ bụ Dinwenụ na-ekwu: onye obụla na-eso m, agaghi aganata n’ochichiri, kama onye ahụ ga-enwe ihe nke ndụ. (Jn 8:12)

 

EKPERE ANATACHA ORIRI

Mee, anyị na-arịọ gi, O Chukwu pụrụ ime ihe niile, ebe anyị natara grasia gi, nke iji wee kpọbata anyị na ndụ ọhụrụ, ka anyị n’enwe aṅụri oge niile n’onyinye gi.   Site na Kristi Dinwenụ anyị.  

 

 MONDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (5:1-7,10)

ga-ab eze na onyendu nd nke m  Izrel.

N'ụbọchị ndị ahụ: Agbụrụ Izrel niile bịakwụtere Devid na ebrọn, sị ya, “Anyi na gị bụ otu ọbara. Na mgbe gara aga, mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel eje agha. Dinwenu kwekwara gị nkwa na ị ga-abụ eze na onyendu ndị nke ya Izrel.” Ndị okenye Izrel niile wee bịakwute Devid na Hebron, ha na ya gbaa ndụ n'ebe ahụ n'ihụ Dinwenu. Ha wee tee Devid mmanụ ịbụ eze ha.” Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara Izrel iri afọ anọ. Na Hebron, Devid chịrị Juda afọ asaa na ọnwa isii. Ọ sikwara na Jerusalem chịa Izrel niile na Juda iri afọ atọ na atọ. N'oge ahụ, Devid na ndịagha ya jere Jerusalem ibuso ndị Jebus, ndị bi n'obodo ahụ agha. Ndị Jebus chere na Devid agaghị emerili ha. Ya mere, ha sịrị ya, “I gaghị abatalị n'ebe a. Ọbụladị ndị isi na ndị ngwụrọ bị n'obodo a ga-egbochi gị.” Ma Devid meriri ha, nara ha ebe e wusiri ike nke Zayọn. O wee bụrụzie “Obodo Devid”. Devid dịwanyere ukwu, na-aga n'ihu, n'ihina Dinwenu, bụ Chineke nke igwe ndịagha nọnyere ya.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 02. MONDAY OF THIRD WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

TUESDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (6:12-15,17-19)

Devid na nd Izrel niile  bubatara igbe ah na iti mkpu ń .

 

N'ụbọchị ndị ahụ: A gwara Devid na Dinwenu agọziela ezinụụlọ Obed-Edọm na ihe niile ọ nwere, n'ihi Igbe Ọgbụgbụgbandụ ahụ. Ya mere, o jiri ọńụ sị n'ụlọ Obed-Edọm bute ya na Jerusalem. Mgbe ndị bụ Igbe ahụ gara naanị nzọụkwụ isii, Devid chụọrọ Dinwenu aja oke ehi na nke nwa ehi gbara abụba. Devid ma uwe efọd n'ukwu ya, were ike ya niile tee egwu n'ihu Dinwenu, iji sọpụrụ ya. Otu a ka Devid na ndị Izrel niile siri were iti mkpu ọńụ na ịfụ opiike buteruo Igbe Ọgbụgbandụ ahụ na Jerusalem. Ha bubatara igbe ahụ, doba ya n'ọnọdụ ya, n'etiti Ụlọikwu nsọ ahụ nke Devid wuuru ya. Devid wee chụọrọ Dinwenu aja nsureọkụ na aja udo. Mgbe ọ chụchara aja ahụ niile, ọ gọziri ndị Izrel n'aha Osebụrụwa Chineke nke igwe ndịagha. O keesaara ndị Izrel niile ihe oriri. O kenyere nwoke na nwaanyị ọbụla n'izrel, otu ogbe achịcha, otu ọkpụrụkpụ anụ na otu mkpụrụ vaịn a mikpọrọ amịkpọ. Ha niile richara, laa n'ụlọ ha.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 03. TUESDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (7:4-17)

“Aga m eme ka otu n'ime m g nd nwoke br eze, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike”

N'ụbọchị ndị ahụ:  Dinwenu ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m bụ Devid, na m sị ya, 'Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga-ebi? Site n'oge m siri n'Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel ruo taa, ọ nwebeghị oge m biri n'ụlọ, kama ana m ebigharị n'ụlọikwu ka onye ije. Oge niile m so ndị Izrel na-ejegharị, o nweela mgbe m jụrụ onye ọbụla n'ime ndị ndu ha niile m họpụtara, ihe mere o jibeghị wuoru m ụlọ osisi sida.' Ya mere, jee gwa odibo m bụ Devid, na mụ bụ Chineke nke igwe ndị agha sị, “esiri m ebe ị na-azu atụrụ n'ọhịa kpọpụta gị mekwaa ka ị bụrụ onyendu ndị nke m bụ Izrel. Anọnyekwaara m gị ebe ọbụla ị jere, merikwaa ndị iro gị niile n'ihu gị. Aga m emekwa ka aha gị dị ukwu dịka ndị aha ha kacha dị ukwuu. Aga m ahọpụtara ndị nke m bụ Izrel otu ebe, kụọkwa ha dịka osisi n'ebe ahụ. Ha ga-ebikwa n'ebe ahụ na-enweghị nsogbu ọzọ; ndị obi ọjọọ agaghị akpagbukwa ha ka na mbụ, bido mgbe m họpụtaara ndị nke m Izrel ndị ikpe; aga m enye ha ezumike site n'aka ndị iro ha. Aga m eme ka ị dị ukwuu, aga m ewuru gị ụlọ. Mgbe ị nwụrụ, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n'ime ụmụ gị ndị nwoke bụrụ eze. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ya onwe ya bukwa onye ga-ewuru m ụlọ nsọ. Aga m emekwa ka ọchịchị ya dị ebeebe. Aga m abụ nna ya; ọ ga-abụkwa nwa m. Mgbe ọbụla ọ mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna sị adụ nwa ya ọdụ site n'ịnye ya ahụhụ. Ma agaghị m ahapụ ịnọnyere ya dịka m sị kwụsị ịnọnyere Sọl, bụ onye m wepụrụ ka ị wee bụru eze. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe”. Natan gwara Devid ihe niile Chineke kpughere ya.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg e wetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (7:18-19,24-29)

“Ab m onye, Dinwenu Chineke? Gn ka ezinụụl m b.

Eze Devid banyere n'Ụlọikwu nsọ Dinwenu nọdụ-ala. O wee kpee ekpere sị, “Abụ m onye, Dinwenu Chineke? Gịnị ka ezinụụlọ m bụ I ji mere m iheọma niile a? Ma n'anya gị Dinwenu Chineke, nke a abụghị ihe ọbụla; I mere ka nkwa gị ruo n'ọdịniihu n'ebe ụlọ nwodibo gị dị. I meela ka Izrel bụrụ ndị nke gị ebeebe. Gị onwe gị Dinwenu abụrụla Chineke ha. Ugbu a Dinwenu Chineke mezuo nkwa I kwere nwodibo gị na ezinụụlọ ya. Mekwaa dị ka I kwuru. Aha gị ga-adị ukwu ebeebe. Ndị mmadụ ga na-ekwu sị, “Osebụrụwa nke igwe ndịagha bụ Chineke nke Izrel. Ezinụụlọ nwa odibo gị Devid ga-akwụdosikwa ike n'ihu gị”. Dinwenu Chineke nke igwe ndịagha! Gị, Chineke nke Izrel! Enwere m obi siri ike ikpe ekpere nke a n'ihi na ị kpugheere m bụ odibo gị ihe ndị a niile, wee gwakwa m na ị ga-eme ka ụmụ m bụrụ eze. Dinwenu Chineke, gị onwe gị bụ Chineke! Okwu gị niile bụkwa eziokwu. Ugbu a, I kwela nwa odibo gị nkwa ọma nke a. Ya mere, ana m arịọ ka ị gọzie ndị agbụrụ m, ka ha nọgide n'ihu gị ebeebe. Gị onwe gị. Dinwenu Chineke, ejirila ọnụ gị kwe nkwa nke a. Site na ngọzị gị, ụlọ nwa odibo gị ga-abụ ụlọ a gọziri agọzi ebeebe.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 05. THURSDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (11:1-4,5-10,13-17)

mejola m, wee kpr nwunye Yuria ka br nwunye g

N'isi ngwụcha afọ, n'oge ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab na ndịagha ya, na ndịagha Izrel niile. Ha meriri ndị Amọn, chebichikwa obodo Raba n'agha. Ma Devid n'onwe ya nọdụrụ na Jerusalem. Otu ụbọchị, n'oge mgbede, Devid siri n'akwa ya bilie, rigoro n'elu ụlọ ya ilegharị anya. O wee si n'elu ụlọ ya hụ otu nwaanyị ka ọ na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu. O jụrụ ajụjụ banyere nwaanyị ahụ. Ha kọọrọ ya na nwaanyị ahụ bụ Batsheba, ada Eliam, bụ nwunye Yuria onye Het. Devid zijere ndịozị ka ha kpọta ya. Ha kpọtaara ya Batsheba. Ya na ya wee dina. (Mgbe ahụ Batsheba ka sị na nwụcha nsọ ya pụta). O mechara laghachi n'ụlọ ya. Nwaanyị ahụ we tụrụ ime, zie Devid na ya adịla ime. Ya mere, Devid ziri Joab ozị, sị, “Zitere m Yuria onye Het.” Joab wee zijere Devid Yuria. Mgbe Yuria bịaruru, Devid jụrụ ya maka Joab na ndị agha Izrel, na otu agha si aga. O sịkwara Yuria, “Laruo ụlọ, jee zuru ike.” Ozigbo Yuria sị na ụlọ eze pụọ, Devid zijeere ya ihe oriri. Ma Yuria ekweghi ala n'ụlọ ya. Kama, ọ dinara n'ọnụ ụzọ ama obi eze, ya na ndị nche ụlọ nna ya ukwu bụ Devid. Mgbe Devid nụrụ na Yuria ekweghị ala n'ụlọ ya. O jụrụ ya, sị, ị ka siri n'ije lọta; gịnị mere ị chọghị iru ụlọ? Devid kpọrọ ya oriri n'anyasi, mee ka ọ ńụfee mmanya oke. Ma ọ laghị n'ụlọ ya. Kama, ọ pụrụ dinara n'akwa, ya na ndị nche eze. N'ụtụtụ ya, Devid dere akwụkwọozi nye ya Uria ka o nye Joab. O dere n'akwụkwọozi ahụ sị, “Dobe Uria n'ihu agha, ebe agha siri ike nke ukwu, laghachitenụ azụ, ka ndị iro sugbuo ya, ka o wee nwụọ.” N'ihi nke a, mgbe Joab nọchibidoro obodo ahụ gburugburu, o zijere Uria ebe ọ maara na ndị iro ha na-alụ agha siri ike nọ. Ndịagha obodo ahụ pụtara buso Joab agha, gbuo ụfọdụ n'ime ndịagha Devid. Uria, onye Het sokwa na ndị e gburu egbu.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw abụọ nke Samuel (12:1-7,10-17)

“Emehiela m megide Dinwenu.”

N'ụbọchị ndị ahụ: Dinwenu ziri Natan onye amụma ka o jekwuru Devid. Natan bịakwutere ya sị, “ụmunwoke abụọ bị n'otu obodo, otu n'ime ha bụ ọgaranya, nke ọzọ bụ ogbenye. Ọgaranya ahụ nwere igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi nke ukwu. Ma ọgbenye ahụ nwere naanị otu nwatụrụ ọ zụtara n'ahia. Ọ zụrụ ya nke ọma, mee ka o tolite n'ụlọ ya, ya na ụmụaka ya. Ọ na-enye ya nri ya, werekwa iko ya na enye ya mmiri; ọ na ekukwa ya n'obi ya. O were ya dị ka ada ya nwaanyị. Otu ụbọchị, otu onye ije bịara n'ụlọ ọgaranya ahụ. Ma ọgaranya ahụ achọghị igbu otu n'ime igwe anụ ụlọ ya, iji siere onye ọbịa ya ihe oriri. Kama, o weere otu atụrụ nke ọgbenye ahụ, siere onye bịara n'ụlọ ya ihe oriri.” Iwe Devid dịịrị ọkụ n'ebe ọgaranya ahụ nọ, o wee gwa Natan, “Eji m aha Chineke dị ndụ na-ańụrụ gị iyi, na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ọnwụ. Ọnye mmere omume ọjọọ dị otu a, na emeghị ebere ga-akwụghachị onye ọgbenye ahụ nwaatụrụ ahụ mmaji anọ.” Natan wee sị Devid “Gị onwe gị bụ nwoke ahụ! Ya mere bido ugbu a gaba mmagha agaghị esi ezinụụlọ gị pụọ, ebe ị lelịrị m, kpọrọ nwunye Yuria onye Het, ka ọ bụrụ nwunye gị. Lee, aga m esi n'ụlọ gị kpalitere gị ajọ ihe, aga m akpọnye onye agbataobi gị ndị nwunye gị, ha na ya ehie na mbara ezi n'ihụ gị. I mere nke gị na nzuzo, ma aga m eme ka nke a mee n'ihe ka Izrel niile hụzuo ya!” Devid wee sị Natan, “Emehiela m megide Dinwenu.” Natan asị ya, “Dinwenu n'onwe ya agbagharala gị mmehie gị. I gaghị anwụkwa. Ma, n'ihi na ị lelịrị Dinwenu n'ihe a I mere, nwa ahụ a mụụrụ gị ga-anwụ.” Natan wee laghachị n'ụlọ ya. Dinwenu mere ka nwata ahụ nwunye Yuria mụụrụ Devid daa n'ahụ ọnwụnwụ. Devid rịọsiri Chineke ike ka nwata ahụ dịrị. O buru ọnụ, banye n'ime ụlọ ya tọgbọrọ n'ala nkịtị ogologo abalị niile. Ndị okenye bi n'obi ya, bịakwutere ya, na-rịọ ya ka o bilie, ma o kweghị. O soghịkwa ha rie nri.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 07. SATURDAY OF THE THIRD WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)