SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

O Chukwu, bụrụ uru onye nchekwaba m. N’ebe mgbaba nke nzọpụta m.  N’ihina ịbụ nkume m, na onye nchedo m, dube m ma gbazibere m n’ihi aha. (Abụ 30:3-4)

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, gi onye kuziere anyị na inwere ọnọdụ n’ime obi ndi ezi omume na ndi n’ekwu ezi okwu, mee, anyị na arịọ gi, ka anyi sonye n’ụzọ amara gi, ma bụrụ ebe obibi nke ga amasị gi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE NHUNYE

Mee anyị na arịọ gi O Dinwenụ ka aja nkea sacha ma gbanwe anyị, ma mekwa ka ọ bụọrọ ndi na eme uche gi ụzọ nke nzọpụta ebeebe.  Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

Ha riri, ma rijuo afọ; ihe niile ha chọrọ ka Dinwenụ nyere ha, ihere emeghi ha n’ihi ihe ha chọrọ. (Abụ 77: 29-30)

EKPERE ANATACHA ORIRI

Ebe anyị jiri nri nke eluigwe rijuo afọ, anyị na arịọ gi O Dinwenụ, ka anyị na-achọ ya bụ nri nke anyị ji adị ndị.  Site na  Kristi Dinwenụ anyị.

 

 

 MONDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

IHE OGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi James di asọ dere (1:1-11)

Na-nnwale okwukwe unu na-eme ka unu kwụdosie ike ka unu zuo oke ma nwezuo ihe niile.

Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara n'elu ụwa niile akwụkwọozi: Ndewonụ! Ụmụnna m! Gụọnụ onwe unu na ndị iheọma mere, mgbe ọbụla ana-anwa unu mọbụ mgbe unu zutere ọnwụnwa n'ụzọ dị icheiche. N'ihina, dịka unu mara, nnwale a na-anwale okwukwe unu na-eme ka unu kwụdosie ike. Ka nkwụdosike unu merie ọnwụnwa niile, ka unu zuo oke ma nwezuo ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke dị mkpa kọrọ n'ime unu. O buru na o nwere onye ọbụla n'ime unu nke na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, “onye na-enye mmadụ niile n'efu, n'ebughị ụzọ taa mmadụ uta. Ọ ga-enyekwa onye ahụ amamihe! Mgbe ị na-arịọ ya arịrịọ dị otu a, jide okwukwe. Enwela obi abụọ. Onye nwere obi abụọ n'ekpere yiri ebili mmiri oke osimiri, nke ifufe na-ebugharị na-atụli elu. Onye dị otu a echekwala na ya ga-arịọta ihe dị ya mkpa n'aka Onyenweanyị. N'ihina mmadụ dị otu a bụ onye uche abụọ, onye na-adighị eguzo n'otu ebe n'ihe ọbụla ọ na-eme. Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ńụrịa ọńụ mgbe ọbụla Chineke weliri ya elu. Ka nwanna ọbụla bụ ogaranya ńụrịkwa ọńụ mgbe ọbụla e wedara ọnọdụ ya n'ihina. Dịka okooko ọcha, ọgaranya ga-ewuchaa gafee. Anyanwụ na-awalite, ya na ọkụ ya na-eresi ike, kpọnwụọ ahịhịa; Okooko ọcha ya adaa, imamma ya alaa n'iyi. Otu a ka ogaranya ga-esi daa mgbe ọnọ na-achụso akụnụụba.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 02. MONDAY OF SIXTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

TUESDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE OGG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkwozi James di aso dere (1: 12-18)

Chineke anaghi-anwa onye bla.

Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-enwe ntachibo n'ọnwụnwa. N'ihina mgbe ọ meriri ọnwụnwa, ọ ga-anata, dịka ụgwọ ọlụ ya okpueze ahụ, bụ ndụ nke Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n'anya. Ka onye ọbụla ghara ịsị mgbe a na-anwa ya: Ọnwụnwa nke a si n'aka Chineke! Maka na mmadụ apụghị iji ihe ọjọọ nwatalie Chineke. Kama a na-anwa onye ọbụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ ya dọtara ya rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ ya ewere mụta mmehie. Mmehie n'onwe ya, mgbe ọ tozuru oke ewee mụta ọnwụ. Ụmụnna m hụrụ n'anya! Unu ekwela ka e duhie unu! Onyinye ọbụla dị mma na nke zuru oke na-esite n'eluigwe abịa. Ha sị n'aka Chineke bụ Nna nke ihe onye na-adịghị agbanwe agbanwe. Ọ naghị ezonahụ ụmụ mmadụ ihu ya ka ọchịchịrị gbachiere ha ụzọ. Site n'uche nke aka ya o jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe O kere eke.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 03. TUESDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE OGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi James di aso dere (1:19-27)

Bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ eme. Unu abukwala ndị na-anụ naanị ọnụnụ.

Maranụ nke a ụmụnna m hụrụ n'anya! Ka onye ọbụla jisie ike na-anụ ihe ngwangwa. Ma onye ọbụla emekwala ngwa n'ikwu ihe ọ nụrụ, mobụ n'iwe iwe. N'ihina iwe anaghị ekwe mmadụ rụọ ọrụ eziomume Chineke. Ya bụ hapụnụ omume niile ruru unyị na omume obi ọjọọ niile na ihe juru unu n'ahụ. Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n'obi unu dị ka mkpụrụ nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi unu. Ma bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ eme. Unu abukwala ndị na-anụ naanị ọnụnụ. Ndị dị otu a na-arafu onwe ha. Onye na-anụ okwu ahụ naanị ọnụnụ ma ọ naghị eme ya eme dị ka onye na-ekiri ihu ya otu chi si kee ya n'inyo. Ọ na-ekiricha onwe ya pụọ chefuo ngwangwa otu ihu ya dị. Ma onye nyochara nke ọma n'ime iwu ahụ zuru oke nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya onye na-anọgidekwa n'ime ya ghara ịbụ naanị onye na-anụ sọ ọnụnụ ọnụnụ wee chefuo kama onye na-eme ya eme Chineke ga-agọzi onye ahụ n'ihe niile ọ na-eme. Ọ bụrụ na onye ọbula na-eche na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka mọbu kwaa ire ya nga onye ahụ na-arafu onwe ya. Okpukpe Chineke nke onye dị otu a bụkwa ihe efu. Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke na-emerụghị nmerụ n'anya Chineke Nna bụ nke a: ileta ụmụ ogbenye na ụmụ nwaanyị dị ha nwụrụ n'ime mkpagbu ha. Ọ bụkwa mmadụ idobe onwe ya n'enweghị ntụpọ site n'aka ndị ụwa.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkwozi James di aso dere (2:1-9)

b na Chineke ahrbegh nd b ogbenye nke wa? Ma unu akparala nwa ogbenye.

Ụmụnna m! Dịka ndị kwere n'onyenweanyị Jesu Kristi, bụ onye nwe ebube niile unu ejila ile mmadụ anya n'ihu, na ịkpa oke emeso onye ọbụla. A sị na otu ọgaranya yi uwe mara mma nke ukwu, gbarakwa mgbaaka ọlado, abata n'ụlọ nzuko unu: a sịkwa na otu ogbenye yi uwe ruru inyi abatakwa otu mgbe ahụ gịnị ka unu ga-eme? Ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ anya sị ya: Bịa nọdụ n'otu oche a e dobere iche n'ihi gị ma unu asị onye ogbenye ahụ, dị anyị, I nwere ike iguzo n'ebe ahụ, mọbụ Bịa nọdu ala n'ebe a ụkwụ m dị; Ọ bụ na unu akpabeghị oke n'etiti onwe unu bụrụkwa ndị ji ile anya n'ihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? Geenụ ntị, ụmụnna m hụru n'anya! Ọ bụ na Chineke ahọrọbeghị ndị bụ ogbenye n'ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị ọgaranya n'okwukwe bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ nke ọ kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n'anya? Ma unu akparịala nwa ogbenye! Ọ bụ na ọ bụghị ndị ọgaranya unu na-asọpụrụ na-emegbu unu? Ọ bụ na ọ bụghị ha na-akpụpụ unu n'ụlọikpe? Ọ bụ na ọ bụghị ha na-ekwutọ aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? Ọ bụrụ na unu edebezuo iwu nke Eze anyị dịka e dere ya n'Akwụkwọ Nsọ sị: Hụ mmadụ ibe gị n'anya dịka onwe gị! Unu mere nke ọma. Ọ bụrụ na unu na-eji ile anya n'ihu na-emeso mmadụ ibe unu, unu na-eme njọ. Iwu Chineke amala unu ikpe dịka ndị na-emebi iwu.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 05. THURSDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkwozi James di aso dere (2:14-24.26)

Otu ah si br ihe nwr anw ma br na mmụọ adgh ya et ah ka okwukwe s br ihe nwr anw ma br na r adgh ya.

Ụmụnna m, Uru gịnị ka ọ baara mmadụ ịsi: Enwere m okwukwe! Ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe n'ọrụ ya? Okwukwe dị otu a ọ pụrụ ịzọpụta ya? Mba! Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke mọbụ nwanne anyị nwaanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya n'ụbọchị, otu onye n'ime unu asị ya: Gaa nke ọma! Kpuchikwaa onwe gị ọfụma! Rijukwaa afọ! N'enyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? N'otu aka ahụ okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ n'onwe ya. E leghị anya otu onye ga-asị: Gị onwe gị nwere okwukwe, mụ onwe m nwere ọru. Ọsịsa m bụ nke a: Gosi m ihe bụ okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị? Aga m egosi gị okwukwe m site n'ọrụ m! I kwere na Chukwu bụ naanị otu? I mere nke ọma! Ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kwere, wee kuja, makwaa jijiji n'ihi egwu. Gị onye nzuzu! Ị na-eche ka mmadụ gwa gị agwa n'okwukwe na-enweghị ezi ọrụ bụ ihe abaghị uru ọbụla? Ọ bụ na nna anyị Abraham abụghị onye a gụrụ n'onye eziomume site n'ọrụ ya mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja n'ekwu nchụja? Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ ya soro rụkọọ ọrụ n'otu? E sitekwara n'ọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. N'ụzọ dị otu a e mezuola ihe e dere n'Akwụkwọ nsọ sị Abraham kwere na Chineke. Chineke gụrụ ya onye eziomume n'ihi okwukwe ya. N'ihi nke a a kpọrọ ya enyị Chineke. Nke a ga-egosi unu na Chineke na-esite n'ọrụ mmadụ gụọ ya onye eziomume ọ bụghị site naanị n'okwukwe ya. Ya bụ otu ahụ sị bụrụ ihe nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na mmụọ adịghị ya etụ ahụ ka okwukwe sị bụrụ ihe nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ọrụ adịghị ya.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE OGUGU NKE MBU

Ihe ogugu nke a si n'akwukwoozi Jemis di aso dere (3:1-10)

Odibeghi onye obula puru izuta

Ụmụnna m! Otụtụ n'ime unu abụkwala ndi nkuzi. Unu mara na anyị bụ ndi nkuzi na-anata ikpe buru ibu karịa. N'ihina anyị niile na-emehie otụtụ mgbe. Ọ bụrụ na onye obụla anaghị emehie n'okwu, onye ahụ bụ onye tozuru oke, bụrụkwa onye pụrụ ikwa ahụ ya niile nga.Ọ bụrụ na anyị ekechie inyinya ibụ anyị ọnụ, ka O rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. Tulekwanụ ụgbọ mmiri! ọ bụ ezie na O buru ibu nke ukwuu, oke ifufe na-efegharịkwa ya. Onye isi ụgbo na-eji nani umara isi ụgbọ kịkarịsịrị nta na-agbagharị ya, mee ka ọ gaa ebe ọbụla Ọ chọrọ. Otu a ka ire di. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe nta di n'ahụ, ọ na-anyafe isi oke, banyere ihe bụrụ ibu. Leenụ oke ọhia out ọ ha ibu! Nanị ire ọkụ ntakịrị na-atunye ya ọkụ! Ire n'onwe ya bụ ọkụ, ọ bụkwa ụwa nke juru na mmejo. Ire na- efesa ahụ niile ntụpọ. Ọ na- amunye ọkụ nregbu n'ogologo ndu mmadụ. O na-amunye ire okụ site n'ọkụ ala mmụo. Mmadụ nwere ike izu ụmụ anụ ohia di iche iche, anụ ufe, anụ na- akpụ akpụ, na anụ ndi bi na mmiri. O dibeghi onye ọbụla n'etiti mmadụ pụrụ izụta ire, ajo ihe anaghi ezu ike. O juputara na nsi na-egbu egbu! Ire ka anyị ji eto Onyenweanyi, na Nna anyị. Otu ire ahụ ka anyị jikwa abụ mmadụ ibe anyị ọnụ ndi Chineke kere n'oyiyi nke ya. N'otu ọnụ ahụ ka ngọzị na obụbụ onụ si apụta. Ụmụnna! O kwesighi ka ọ di otu a!

Okwu nke Osebruwa

Read more: : 07. SATURDAY OF THE SIXTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)