01. MONDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọọzi James (3:13-18)

Ma ọ bụrụ na ajọ ekworo na oke ọchịchọ nke onwe juru n'obi unu, unu anyala isi”

Onye bụ onye ma ihe na onye nwere nghọta n'etiti unu? Ya site na ndụ ọma ya gosi ọrụ ya niile, n'ime ịdị nwayọọ nke amamihe na-eweta. Ma ọ bụrụ na ajọ ekworo na oke ọchịchọ nke onwe juru n'obi unu, unu anyala isi, unu ekwukwala okwu ụgha megide eziokwu ahụ. Amamihe dị otu a esighị n'eluigwe bịa. Kama ọ bụ nke ụwa, bụrụkwa nke anụ ahụ na-achị na nke ndị mmụọ ọjọọ na-akuzi. N'ihina ebe ekworo na oke ọchịchọ nke onwe dị n'ebe ahụ ka ọgbaaghara na ajọọmume niile na-adịkwa. Ma amamihe nke si n'eluigwe bịa bụ nke dị ọcha. O jupụtakwara n'udo, obiọma na ịdị nwayọọ. Ọ na-atụle okwu nke ọma. O jupụtara n'ebere na-amịpụtakwa ezi mkpụrụ. Amamihe nke a anaghị eme mmadụ obi abụọ. O nweghịkwa ihu abụọ. Ịdị mma na ezi ọrụ ka ndị na-eme udo na-ewepụta dịka mkpụrụ ha ji anya udo kụọ.

Okwu nke Oseburụwa.

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 01. MONDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

02. TUESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara n'akwụkwọozi James (4:1-10)

Ndi M huru n’anya: Olee ihe na-akpata ibu agha? Gịnị na-ewetakwa ịlụ ọgụ ọtụtụ mgbe n'etiti unu? Ihe na-eweta ha bụ ọchịchọ, anya ukwu na oke agụụ ihe ụtọ nke na-agụ unu, na-ebu agha n'ime ahụ unu. Ọ bụrụ na unu chọọ, ma unu achọtaghị ya unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu n'ihe onyeọzọ nwere, ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka na unu arịọghị ya n'ekpere. Unu na-arịọ, ma unu adịghị anata n'ihina unu na-arịọ n'obi ọjọọ. unu na-arịọ maka ihe unu ga-emefu n'ihe ụtọ nke ụwa. Unu ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi! Unu amaghị na ịbụ enyị nke ụwa bụ ịbụ onyeiro nke Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyị nke ụwa na-eme onwe ya onyeiro nke Chukwu. Unu na-eche na ọ bụ n'efu ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu sị, Agụụ banyere anyị na-agụsi Mmụọ ahụ ike n'ụzọ ekworo bụ mmụọ ahụ nke Chineke mere ka ọ biri n'ime anyị. Amara nke Chineke na-enye buru ibu karịa. Ya mere Akwụkwọ Nsọ kwuru sị Chineke na-emegide ndị mpako. Ọ na-enyekwa ndị dị umeala amara. Doonụ onwe unu n'okpuru Chineke. Jụnụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n'ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenụ ka aka unu dị ọcha unu ndị ome njo! Mekwaanụ ka obi unu dị ọcha unu ndị ihụ abụọ! Ruonụ uju! Kwakaanụ akwa! Meenụ ka ọchị unu ghọọ iru ụjụ ka ọńụ unu bụrụkwa mgbarụ ihu! Wedanụ onwe unu n'ihu Onyenweanyị. Ọ ga-ewelikwa unu elu.

Okwu nke Oseburụwa

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 02. TUESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

03. WEDNESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

 

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi James (4:13-17)

“Ndụ unu dịka gịnị? Kama ihe kwesịrị ka unu kwuo bụ nke a: Ọ bụrụ na Onyenweanyị kwe”

Ugbu a geenụ ntị unu ndị na-asị,. Taa, mọbu echi, anyị ga-eje obodo nke a mọbụ nke ọzọ nọọ ebe ahụ otu afọ zụọ ahịa, kpata ego buru ibu. Ma unu amaghị ihe ga-eme echi. Ndụ unu dịka gịnị? Ndụ unu dị ka igirigi nke na-apụta ihe nwa oge e mechaa o mie ala. Kama ihe kwesịrị ka unu kwuo bụ nke a: Ọ bụrụ na Onyenweanyị kwe, anyị gị-adị ndụ mee nke a mọbụ nke ọzọ. Ma otu ọ dị, unu na-anya isi na-afụli onwe unu elu. Inya isi dị otu a dị njọ. Ya mere onye ọbula maara iheọma ma o meghị ya ọ bụụrụ onye ahụ njọ.

Okwu nke Oseburụwa.

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 03. WEDNESDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

04. THURSDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ ozi James (5:1-6)

“Unu jidere ego ha na mmegbu. Iti mkpu akwa nke ndị na-ewetaa unu ihe n'ubi eruola Chineke nke igwe ndịagha ntị”.

Ugbu a geenụ ntị, unu ndị ọgaranya! Kwaanụ akwa, tikwaanụ mkpu n'ihi ihe nhụjụ anya dị icheiche nke ga-abịakwasa unu! Akụ unu alaala n'iyi uwe niile unu nwere aghọọkwala ihe akịka ripịarala. Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara ha gbara ga-abụ ihe akaebe megide unu. Ọ ga-eripịakwa ahụ unu dịka ọkụ. Unu kpadoro akụ ụwa nke a maka ụbọchị ikpe azụ. Lee, unu akwubeghị ndị ọru bịara ọrụ n'ubi unu ụgwọ ọrụ ha. Unu jidere ego ha na mmegbu. Mmegbu unu na-emegbu ha na-eti mkpu. Iti mkpu akwa nke ndị na-ewetaa unu ihe n'ubi eruola Chineke nke igwe ndịagha ntị. Unu na-ebi ndụ mmefu, nke oke oriri na oke ọńụńụ na ihe ụtọ nke anụ ahụ n'elu ụwa. Unu emeela ka obi na ahụ unu maa abụba maka ụbọchị mgburi. Unu mara ndị mmadụ ikpe ụgha, gbuo onye na-enweghị ihe o mere ọ bụ ezie na o gbochighị unu.

Okwu nke Oseburụwa.

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 04. THURSDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

05. FRIDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi James (5:9-12)

“Lee, onye ọkaikpe anyị, bụ Chineke, guzo n'ọnụụzọ.”

Unu atamula megide onwe unu, ụmụnna m ka Chineke ghara ikpe unu ikpe Lee, onye ọkaikpe anyị, bụ Chineke, guzo n'ọnụụzọ. Ụmụnna m chetanụ ndịamụma ochie ndị buru amụma n'aha Onyenweanyị. Werenụ ha mere ihe ilere anya maka inwe ndidi na ogologo ntachiobi n'oge ahụhụ. Lee anyị na-akpọ ha ndị a gọziri agozi n'ihi nkwụdisiike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere n'ọnwụnwa. Unu ahụkwala nzube Chineke n'ebe ọ nọ, na otu o si nyere ya aka n'ikpeazụ. N'ihina Onyenweanyị jupụtara n'ebere na ọmịiko. Ma nke kachasịnụ ụmụnna m! unu ańụla iyi ọbụla mgbe unu na-ekwe nkwa. Unu ejikwala eluigwe mọbụ ala mọbụ ihe ịńụ iyi ọbụla ọzọ ńụọ iyi, kama ka ee unu bụrụ ee ka mba unu bụrụkwa mba ka unu ghara ịdaba n'ikpe ọmụma nke Chineke.

Okwu nke Oseburụwa.

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 05. FRIDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

06. SATURDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B

UKWE MBATA

 Onyenweanyị, ebere gị bụ nchekwube m, mkpuruobi m n'aṅụrị n'ike nke nzọpụta Gị. Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe  maka ihi obi ọma ya n'ebe m nọ.

EKPERE MMEGHE

 Nna, dobe n'ihu anyị amamihe na ihụnaanya nke I kpughere n'ime Nwa Gị. Nyere anyị aka ịdị ka Ya site n'okwu anyị na omume anyị, ebe Ọ dị ndụ na achị eze ebeebe.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ ozi James (5:13-20)

“Ekpere nke onye eziomume dị ike nke ukwu”. 

O nwere onye n'ime unu na ata ahụhụ? Ya kpee ekpere. O nwere onye n'ime unu nwere obi ụtọ? Ya kwee ukwe otito. O nwere onye n'ime unu ahụ na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ ka ha kpeere ya ekpere tee ya ude n'aha nke Onyenweanyị. Arịrịọ nke okwukwe na-azọ onye ọrịa. Dinwenu ga-ekulite ya elu. Ọ bụrụ na ọ nọ n'ime njọ a ga-agbaghara ya. Na-ekwupụtanụ mmehie unu ebe ibe unu nọ. Na-ekperenụ ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Ekpere nke onye eziomume dị ike nke ukwu n'ịrụzu ihe a chọrọ ka ọ rụọ. Elaija bụ mmadụ ibe anyị. Ma ọ kpesiri ekpere ike ka mmiri ghara izo. Mmiri ezoghịkwa n'ala afọ atọ na ọnwa isii. O mechawara kpee ekpere ọzọ. Eluigwe enye mmiri ozuzo, ala amịpụtakwa mkpụrụ ya. Ụmụnna m! Ọ bụrụ na onye ọbụla n'ime unu na-esi n'eziokwu ahụ jehie otu onye akpọgbachi ya, ya mara na onye ọbụla kpọghachiri onye njọ site na njehie nke ụzọ ya ga-azọpụta mkpụrụobi onye njọ ahụ n'onwụ. Onye ahụ gbọchirila ya ọtụtụ njọ, mekwaa ka Chineke gbaghara ya ọtụtụ njọ ndị ọ merela.

Okwu nke Oseburụwa.

Ekele dịrị Chukwu.

Read more: : 06. SATURDAY OF THE SEVENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B