EIGHT WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Oseburuwa bụ ike m, o meela ka m nwere onwe m. O zoputago m n'ihina ohuru m n'anya.

EKPERE MMEGHE

Dinwenu chekwaba usoro ihe niile na-eme n'uwa anyị, nyekwazia uka Gị aṅụrị na udo nke ịgbara Gị odibo na-enweghị mmanye ọbụla. Site na Kristi Dinwenu anyi.

EKPERE NHUNYE

O Chukwu, onye na-enye anyị ihe onyinye anyị na-ehunyere aha Gị; onye na-agunyekwa aja nsuru-ọkụ anyị dịka ihe ngosi agụụ nke obi anyị ịgbara Gị odịbo; anyị na-arịọ Gị ka ihe ịnyere anyị dika ụzọ iketa oke, ritere anyị oke nke ruru anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Mụnwa bụ Dinwenụ nọnyere unu oge niile, wee ruo n'isi njedebe nke ụwa.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Ebe ejigoro onyinye ndị a were zụọ anyị nrị, O Dinwenu, anyị na-arịọ ebere Gị, ka otu Sakramenti a ị ji azụ anyị nri ụgbụa, mee k'anyị bụrụ ndị nketa oke nke ndụ

MONDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara n'akwkwozi mbu Pta d as dere (1:3-9)

b ezie na unu ejibegh anya unu h ya, ma unu hr ya n'anya. bkwa ezie na unu anagh ah ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya.

Ngọzị diri Chukwu na Nna Onyenweanyị Jesu Kristi! N'ihi oke ebere ya, Ọ nyere anyị ndụ ohuru ka anyị nwee nchekwube, site na mbilite n'onwu nke Jesu Kristi. Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighiebi o ga-enye umu ya niile. Onyinye a di n'eluigwe ebe Chineke dobere unu, n'ebe ahụ, ọ gaghị emebi emebi. O gaghikwa agbanwe odidi ya ma o bukwanụ ree ure. Ha ga-abụ nke unu, bụ ndị e ji ike nke Chineke chebe site n'okwukwe. Ka ha ruo nzopụta ahụ nke a ga-ekpughe n'oge ikpe azụ. Nurianụ ọnụ n'ihi nke a, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ugbu a ka unu nwee mwute nwa oge n'ihi ahụhụ dị icheiche nke unu na-ata. Ihe mere e ji ata unu ahụhụ ndị a bụ ka a mara ma unu nwekwara ezi okwukwe: N'ihina, o bụladị olaedo nke pụrụ imebi emebi, a na-aji okụ anụcha ya, ka o dị mma karịa. Otu aka ahụ, a ghaghị iji ahụhụ nwapụta okwukwe unu, nke bụ ihe oke onuahia karia olaedo, ka o nogide. Mgbe ahukwa, unu ga-anata otito na ebube, na nsopụrụ n'ubochi a ga-ekpughe Jesu Kristi. O bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya, ma unu huru ya n'anya. O bukwa ezie na unu anaghị ahụ ya anya ugbu a, unu nwere obi nke jupụtara n'udi ọṅụ ahụ nke ọnụ na-apughị ikowa. Ugwo ọrụ unu ga-enweta n'ihi ntukwasiobi unu n'ime ya, ga-abụ nzọpụta nke mkpuruobi unu.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara n'akwụkwọozi mbu nke Pịta dị asọ dere (1:10-16)

Amụma ha bụ maka amara nke Chukwu ga-abiara unu, ya bụ wepu obi n'ihe nchekasi niile.

Ndị m hụrụ na-anya: Ihe banyere nzọpụta a ka ndị amụma chọsiri ike, jụkwaa ajụjụ banyere ya. Ha bukwara amụma banyere amara ahụ nke Chineke ga-enye unu. Ha gbara mbọ ịchọpụta ihe mmụọ Kristi ahụ bi n'ime ha na-ekwu, n'ihina ọburula ụzọ gbaara ha ama banyere ahụhụ niile Kristi ga-ahụ na ebube niile ga-eso ya. Chineke mere ka ha mata na ọrụ ha rụrụ n'ụwa abụghị maka ọdịmma nke onwe ha, kama, maka nke unu. Ha rụụrụ unu ọrụ nke a mgbe ha gwara unu okwu banyere ihe ndị ahụ, nke ndị na-agbasa oziọma na-agwakwa unu ugbu a. Ha gwara unu ya site n'ike nke Mmụọ Nsọ, nke e siri n'eluigwe zita. Ihe ndị ahụ bụkwa ihe ndị mmụọọma n'onwe ha chọkwara ịmata. N'ihi nke a, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dookwa unu. Nweenụ nchekwube zuru oke n'amara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jesu Kristi. Dị ka unu na-erubeisi, unu esokwala na eme ihe ọjọọ ụfọdụ nke na-agụ unu agụụ na mbụ mgbe unu na-amaghị ihe. Kama dịnụ nsọ n'ihe niile unu na-eme dị ka Chineke onye nke kpọrọ unu. N'ihina o dere ya n'akwụkwọ Nsọ, sị: Unu ga-adị nsọ, n'ihina mụ onwe m dị nsọ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara n'akwụkwọozi Pịta nke Mbu (1:18-25)

Ihe e ji gbapụta unu bụ ọbara dị oke ọnụ nke Kristi, onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ọrụ mọbụ ntụpọ.

Unu matara ihe e jiri gbapụta unu na ndụ ọjọọ nke unu sị n'aka nna unu ha nata. Unu matakwara na ihe e ji gbapụta unu abụghị ihe pụrụ imebi emebi dị ka ọlaọcha, mọbụ ọlaedo. Kama, ihe e ji gbapụta unu bụ ọbara dị oke ọnụ nke Kristi, onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ọrụ mọbụ ntụpọ. A họpụtalarị Kristi tupụ e kee ụwa. E kpughekwara ya n'ihi unu mgbe oge ruru. Unu sitere n'aka ya kwere na Chineke, bụ onye nyere ya ebube. N'ihi nke a, okwukwe na olileanya unu dị n'ebe Chineke nọ. Ebe unu sitere n'irubere eziokwu nke oziọma ahụ isi, mee ka mkpụrụ obi unu dị ọcha, na-ahụkwa ndị kwere ekwe ibe unu n'anya n'ejighị aghụghọ ọbụla, werekwanụ obi unu niile na-ahụrịta ibe unu n'anya. Site n'okwu nke Chineke dị ndụ, a mụgharịala unu ọzọ, ka unu bụrụ ụmụ na-anaghị anwụ anwụ, na ndị na-adịgịdekwa. N'ihina: Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ebube ha dịkwa ka okooko ọcha. Ahịhịa kpọnwụọ, okooko ya adapụ. Ma okwu nke onyenweanyị ga-adịgịde ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara unu.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ e wetara n'akwụkwọ ozi Pịta dị asọ dere  (1  Pịta 2:2-5.9-12 )

“Ma ụnụ bụ agbụrụ a họtara ahọta, ndị nchụaja nọ n'ọkwa eze,  na-ekwupụta aka ọrụ onye kpọrọ gị”.

Dịnụ ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ okwu Chukwu na-agụsị ụnụ ike, dịka mmiri ara si agụ ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka ọ ga-abụ site n'ịnụ  ya, ụnụ etoruo nzọpụta. N'ihina, “ụnụ edetụla obiọma nke Onyenwanyị ire”. Bịakwutenụ onye ahụ, bụ okwute dị ndụ, nke ndị mmadụ jụrụ ajụ, nke Chineke họpụtara, nyekwa ya nsọpụrụ. Bịanụ ka e were ụnụ dịka okwute dị ndụ, wuo ụlọ nke Mmụọ Nsọ, ebe ụnụ ga-eje ozi dịka ndị nchuaja dị nsọ, na ndị na-achụ aja nke mmụọ nke na-adị Chineke mma, site na Jeso Kristi. Ma ụnụ bụ agbụrụ a họtara ahọta, ndị nchụaja nọ n'ọkwa eze, mba sị nsọ, ndị Chineke nwetaara onwe ya. Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị e sị n'ọchịchịrị kpọbata n'ihe nke ya dị ebube, na-ekwupụta aka ọrụ ya n'ụwa niile. N'oge mbụ, ụnụ abụghị ndị nke Chineke. Mana ugbu a, ụnụ bụ ndị nke ya. Mgbe ahụkwa, ụnụ amaghị ebere Chineke ma ugbu a, obi ebere ya erutela ụnụ aka. Ndị m hụrụ n'anya, ana m arịọ ụnụ ka ụnụ na-eme omume dịka ndị ije na ndị ọbịa n'elu ụwa. Ụnụ esokwala eme ihe ọjọọ dị icheiche na-agụ ahụ ụnụ agụụ, nke na-alụkwa ọgụ mgbe niile megide mkpụrụobi ụnụ. Na-ebinụ ezi ndụ n'etiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ ha na-akpọ ụnụ ndị ọjọọ, ha nwere ike site n'ezi ọrụ ụnụ niile nke ha na-elere anya too Chineke n'ụbọchị ọ ga-abịa.

Okwu nke Oseburuwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara n'akwụkwọozi nke Mbu Pịta deere (4:7-13)

“Bụrụ ezi onye aka ebe nke amara Chukwu”.

Ndi m huru n’anya: Ọgwụgwụ ihe niile dị nso. Nweenụ uche zuru oke nwekwaanụ anya udo ka unu nwee ike ikpe ekpere. Ma nke kachanụ hụrịtanụ ibe unu n'anya nke ukwu, n'ihina ịhụnaanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Na-eleritanụ ibe unu ọbịa nke ọma n'atamughị ntamụ. Unu niile n'otu n'otu natara onyinye amara nke Chineke. Werenụ ya jeere ibe unu ozi dịka ezi ndị nlekọta nke onyinye ahụ dị icheiche nke Chineke nyere unu. Onye ọbụla n'ime unu na-ekwu okwuchukwu ya kwuo naanị okwu sị Chineke n'ọnụ pụta. Onye ọbụla na-eje ozi ya were ike Chineke nyere ya jeere ya ozi. Na-emenụ otu a ka e nye Chineke otito n'ihe niile site n'aka Jesu Kristi onye nwe otito na ike niile mgbe ebeghịebi. Amen. Ndị m hụrụ n'anya, ya agbala unu gharịị na e ji oke ahụhụ dị otu a anya unu dị ka a  ga-asị na ihe na-adakwasị unu bụ ụdị ihe unu na-ahụbeghị mbụ. Kama ṅụrịanụ ọṅụ na unu so keta oke n'ahụhụ Kristi ka unu jụpụta n'ọṅụ mgbe a ga-ekpughe ebube Kristi.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (3)

SATURDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara n'akwụkwọozi Jude (17:20b-25)

Chineke pụrụ igbochiri ụnụ ọdida na onye ahụ nwekwara ike iji aṅụrị chee ụnụ n'enweghị ntụpọ ọbụla.

Ndị m hụrụ n'anya chetanụ ihe niile ụmụazụ Onyenweanyi Jesu Kristi kwuru na ọ ga-emezụ. Ma ndị m hụrụ n'anya jisienụ ike wulie onwe ụnụ elu dịka ụlọ n'ime okwukwe ahụ kacha nsọ ụnụ nwere. Na-ekpekwanụ ekpere n'ike Mmụo Nsọ. Nọdụnụ n'ịhụnaanya nke Chineke. Na-echenu ụbọchị Onyenweanyi Jesu Kristi ga-enye anyị ndụ ebighịebi site n'ebere ya. Menu ka ndị ka nwere obi abụọ ghọtazie nke a ọfụma. Zọputanụ ụfọdu site n'igbochị ha ịdanye n'ọkụ. Ụfọdụ bụ ndị ụnụ ga-eji egwu gosi ebere ma kpọọnụ ihe ọjọọ asị ọ bụladị uwe mmadụ yi n'ahụ nke ihe ọjọọ merụrụ. ka otito onye ahụ pụrụ igbochiri ụnụ ọdida na onye ahụ nwekwara ike iji aṅụrị chee ụnụ n'enweghị ntụpọ ọbụla n'ihu ebube ya dị nsọ. Ka otito dịrị Chineke onye nzọpụta anyị. Ka ịbụ eze niile na ọchịchị niile na ike niile dịrị ya otu ọ dị n'izizi na kịtaa na oge niile na ụwa ebeebe site na Jesu Kristi Onyenweanyị. Amen.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE EIGHT WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)