NINETH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA (Ps. 95:1.6)

Tụgharịa mere m ebere O Chukwu, n’ihi na a bụ m ogbenye, e nwekwaghị m onye enyemaka. Leenu ahụhụ na ihe mgbu m, O Chukwu gbaghara njọ m niile. (Abụ 24:16.18)

EKPERE MMEHE

O Chukwu onwekwaghị ihe gbara gi gharịị n’ụzọ i si echekwaba ihe nile ikere eke, anyị ji umeala arịọ ka i wepụrụ anyị ajọ ihe niile, ma nyekwa anyị ihe ga abara anyị uru. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

UKWE ORIR NSO (JN 8:12)

Akpokuru m gi, O Chukwu, ama m na I ga-aza m, gee nti ma nụrụ ọnụ okwu m. (Abụ 16:16)

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu, anyị na-arịọ, ka I weere mụọ gi dube anyị ndi ijiri nri nke ahụ na ọbara nwa gi wee zụọ. Site na ikwupute aha gi, obụghị so n’okwu ọnụ, kama n’ezi ọrụ na ezi okwu, mee k’anyị kwesi ibata n’alaeze nke eluigwe. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

 

MONDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi nke Abuo Pịta dere (1:2-7)

O nyere anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, dịkwa okeọnụ nke ọ kwere anyị na nkwa ka unu sorokwa ya keta oke n'ọdịdị ya dị asọ.

Ndi m hụrụ n’anya: Ka amara na udo dịrị unu n'uju, site n'ịmata Chukwu na onye nzọpụta anyị Jesu Kristi. Site n'ike nke Chineke dị asọ e nyela anyị ihe niile dị anyị mkpa maka ibi ndụ na ịsọpụrụ Chineke. O mere nke a site n'ime k'anyị mara onye ahụ nke kpọbatara anyị n'otito ya na ịdị mma ya. N'ụzọ dị otu a ka o si nyekwa anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, dịkwa okeọnụ nke ọ kwere anyị na nkwa. O nyere unu ha, ka unu si na ha gbanahụ agụụ niile nke njọ dị n'ụwa, nke na-emebikwa mmadụ, ka unu sorokwa ya keta oke n'ọdịdị ya dị asọ. N'ihi nke a gbaanụ mbọ were omume ọma kwalite okwukwe unu, werekwanụ amamihe kwalite omume oma unu. Werenu ijide onwe unu kwalite amamihe unu. Werekwanụ ịkwụdosiike kwalite ijide onwe unu. Werenụ ịtụ egwu Chukwu kwalite ịkwụdosiike unu. N'ikpeazụ werenụ obi nwanne kwalite ịtụ egwu Chineke unu. Werekwanụ ịhụnaanya kwalite obi nwanne unu.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (2Pt. 3:12-15.17-18)

Ihe ogụgụ nke a si n' akwụkwọ ozi nke abụọ Pitadi asọ dere

Anyị na-atụ anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.

O kwesiri ka unu na-ebi ndụ nke idi nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke. Na-emenu otu a, ka unu nọrọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị nke Chukwu. Chọsịkwaanụ ya ike ka Ọ bịa ngwangwa, bụ ụbọchị ahụ Chineke ga-amunye eluigwe niile ọkụ ka ha repịa. Mana anyị na-atụ anya ihe Chineke kwere na nkwa, bu eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe eziomume ga-adịgịde. Ndi m hụrụ n'anya, ebe unu nọ na-ele anya ụbọchị ahụ, gbaanụ mbọ dobe onwe unu ọcha, ka unu ghara inwe ntụpọ ọbụla n'ihu Chineke, ka unu dịkwa n'udo mgbe Ọ ga-abịa. Ghọtanụ na ogologo ndidi Onyenweanyi nwere n' ebe unu nọ bụ ohere nzọpụta O nyere unu.Ndi m hụrụ n'anya, ebe ọ bụ na unu amarago ihe ndi a, kpacharanụ anya, ka ndi arụrụ ala ghara iduhie unu ụzọ, si otu ahụ mee ka unu dapụ n'okwukwe unu. Na- abawanyenu n'amara na omuma nke Dinwenu anyị na onye nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. Otito diri ya ugbu a, ruo mgbe ebighiebi. Amen.

Okwu nke Osebruwa

Read more: : 03. TUESDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timothy (1:1-3,6-12)

Mme ka onyinye nke Chineke nyere gị mgbe m bịkwasịrị Gị aka m abụọ na-enwu dịka ọkụ.

Pọl onyeozi nke Jesu Kristi, site n'ọchịchọ nke Chineke, dịka nkwa nke ndụ ahụ dị n'ime Jesu Kristi siri dị, na-edegara Timotị, nwa m hụrụ n'anya, akwụkwọ ozi nke a. Ka amara, ebere na udo nke sị n'aka Chukwu Nna na Onyenweanyị Jesu Kristi dịịrị Gị. Ana m ekele Chineke, onye m ji ezi akọnuuche ejere ozi, otu ndị nna nna m ha siri mee. Ana m echeta gị n'ekpere oge niile. Ya mere, ana m echetara Gị ka I mme ka onyinye nke Chineke nyere gị mgbe m bịkwasịrị Gị aka m abụọ na-enwu dịka ọkụ. Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ kama mmụọ nke ike, nke ịhụnaanya na nke ịkwanyere onwe anyị ugwu. Ihere emela gị igbara Onyenweanyị mọbụ mụnwa bụ onyemkpọrọ n'ihi ya, akaebe. N'ike nke Chineke, kerekwa oke nke gị n'ahụhụ dịịrị gị n'ihi oziọma ahụ. Chineke zọpụtara anyị, wee kpọọ anyị ịbụrụ ya ndị nsọ. Ọ bụghị n'ihi ọrụ ọma anyị, kama n'ihi amara na nzube ya. O nyere anyị amara nke a n'ime Jesu Kristi tupu e kee ụwa. O gosipụtara nke a ugbu a site na mpụta ihe nke onye nzọpụta anyị Jesu Kristi. Ọ mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụanwụ pụta ihe site n'oziọma ahụ. N'ihi oziọma nke a, a họpụtara m ka m bụrụ onye nkwusa oziọma onyeozi na onyenkuzi. O bụ n'ihi ya ka m ji ata ahụhụ ndị a. Mana ihere anaghị eme m n'ihina amaara m onye m kwenyere na ya. O doro m anya na ọ pụrụ ichekwa ihe o tinyere m n'aka ruo ụbọchị ahụ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timothy (2:8-15)

E keghị okwu Chineke agbụ Ọ bụrụ na anyị sooro ya nwụkọọ onwụ anyị ga-esokwa ya dịkọọ ndụ.

Cheta Jesu Kristi, onye si n'agbụrụ Devid pụta, onye sikwa n'ọnwụ bilie, dịka oziọma ahụ m na-ekusa sị dị. Ọ bụ n'ihi oziọma nke a ka m ji na-ata ahụhụ, nọrọkwa n'agbụ dịka onye ohi. Ma otu ọ dị, e keghị okwu Chineke agbụ. Ya mere, ana m edị ihe niile n'ihi ndị a họọrọla, ka ha wee nwetakwa nzọpụta nke ya na otito ebeebe na-agakọ n'ime Jesu Kristi. Okwu a kwesịrị ntụkwasịobi: Ọ bụrụ na anyị sooro ya nwụkọọ onwụ, anyị ga-esokwa ya dịkọọ ndụ. Ọ bụrụ na anyị nwee ntachiobi, anyị ga-esoro ya bụkọọ eze. Ọ bụrụ na anyị agọnaraị ya, ya onwe ya ga-agọnarị anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwesighị ntụkwasịobi ya onwe ya kwesịrị ntụkwasịobi; n'ihina ọ pụghị igọnarị onwe ya. Chetara ha nke a ma dọkwaa ha aka na ntị n'ihu nke Dinwenụ: ka ha ghara ịrụụka banyere okwu ndị ahụ na-abaghị uru nke na-ewetara ndị nụrụ ya ịla n'iyi. Gbaa mbọ gosị onwe gị n'ihu Chineke dịka onye ọrụ a họrọla nke na-etosịghị ime ihere ọbụla. Ị ga-abụkwa onye na-akuzi okwu nke eziokwu ahụ nke ọma.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE NINETH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG MB

The gg nke a si n'akwkw ozi nke abụọ Pl di as degara Timoti (3: 10-17)

A ga-akpagbu ndi niile na-ach idi nd di as n'ime Jesu Kristi.

I chọpụtala nkuzi m, omume m, ebumnuuche m banyere ndụ nke a, ndidi m, ịhụnaanya m na nkwụdosiike m. I matakwara mkpagbu m na ahụhụ m niile, na ihe niile dakwasara m n'Antiok, Aikonium na Listra, na mkpagbu niile diirim, ma Onyenweanyi zọpụtara m na ha niile. N’eziokwu, a ga-akpagbu ndi niile na achọ idi ndụ di asọ n'ime Jesu Kristi. Ma ndi ajọmume na ndimpako ga na-aga n'ihu n'ikwanye njọ na ajọomume ha. Ha na-eduhie ndiọzọ, ndiọzọ na-eduhie ha. Ma gi onwe gi, nogidesieike n'ihe I mụtara na ihe I kwenyesiriike na ya, ebe I maara onye I si n'aka ya mụta ha. I maara na ọ bụ site n'oge I bụ nwata ka ihe e dere n'akwụkwọ nsọ doro gi anya, nke nwere ike ikuziri gi maka nzọpụta site n'okwukwe I nwere na Jesu Kristi. Ihe niile e dere n'Akwụkwọ Nsọ si na mkpalite nke Chukwu. Ha bakwara uru iji na-akuzi ihe, igwa mmadụ mmehie ya, igbaziri na inye ọzụzụ na ndụ eziomume. N’ụzọ di otu a, onye nke Chukwu ga-ezu oke, di nkwadebe maka ezi ọrụ ọbụla.

Okwu nke Oseburuwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timothy (4:1-8)

Mee igbasa oziọma ọrụ nke ndụ gi. Mụ onwe m, ewerele m ndụ m nye maka oziọma. Site ugbu a e doberela m okpu eze nke eziomume.

Ndi m hụrụ n’anya: Ana m adọ gị aka na ntị n'ihụ nke Chineke na Jesu Kristi, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwuru anwụ ikpe. Ma site n'ọbịbịa ya n'alaeze ya, kwusaa oziọma. Dị uchu n'ọrụ a, ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, ma mmiri ọ na-ezo ma anwụ ọ na-acha. Mee ka ha kwenye, baara ha mba ma gbakwaa ha ume. Adala mba n'inwe ndidi na nkuzi. N'ihina oge na-abịa mgbe ndị mmadụ na-agaghị anagide ezi nkuzi, ma site na ntị ịkọọkọ ha nwere, ha ga-ekpokọtara onwe ha ndị nkuzi ga-akuziri ha ihe ga-amasị ha. Ha ga-agbakụta eziokwu azụ ma na awagharị n'akụkọ na-enweghị isi. Banyere gị onwe gị, guzosie ike mgbe niile. Na-edi ahụhụ na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Na-emejupụta ihe kwesiri ọrụ gị. Adị m njikere ruo n'iji m chụọ aja, oge ụla m ezuola. Alụọla m ezigbo ọgụ, agbaruola m ọsọ ahụ n'isi, akwụdosiela m ike n'okwukwe. Site ugbu a e doberela m okpu eze nke eziomume, nke Onyenweanyị, ezi onye ọkaikpe ga-enye m n'ụbọchị ahụ. Ọ bụghị nanị m ka o ga-enye okpu eze ahụ. Ọ ga-enyekwa ya ndị niile ji ịhụnaanya na-eche ọbịbịa ya.

Okwu nke Oseburụwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE NINETH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)