TENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Dinwenụ bụ ìhè na nzọpụta m, oney ka m ga-atụ egwu?Dinwnenu bụ ebe  mgbaba m, onye ga-eyi m egwu? Mgbe ndi ajọ-omume na-achụ m, ha ga-akpọbị ụkwụ ha, daa.(Abụ 26:1-2)

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, ìhè ọma nile si n’aka abịa, biko mee k’anyị bụ ndi na-akpoku gi n’ime nsogbu anyị, site na ntuzi aka gi mata ihe di mma, ma sitekwazị na nchekwa nke gi a-eme ya. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKEPRE NHUNYE

O Dinwenụ, biko were ebere nekwasi anya n’ofufe anyị, anyị na-arịọ, k’ihe anyị na-ebunye gi bụrụ aja nke kwesiri gi I nara, ma meekwa k’anyị na-eto na ihunanya. site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

Dinwenụ bụ nkume m; n’ebe nkwudosike m, na onye nzọpụta m; Dinwenụ m bụ ike nke nzọpụta m (Abụ 17:3)

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Dinwenụ, anyị na-arịọ gi, site na ọrụ nke iji enye anyị ọgwụgwọ nsọ, mee k’anyị nwere onwe anyị n’ajọ ihe nile, ma n’eduzikwa anyị n’ụzọ eziokwu. Site Kristi Dinwenụ anyị.

 

MONDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (17:1-6)

Elijah kwụrụ na-iru Chineke Dinwenu nke Isreal.

N'ụbọchị ndị ahụ: Elaija onye Tishbe nke nọ na Giled gwara Ahab sị, “Ka Dinwenu Chineke nke Izrel dị ndụ, onye m na-efe, igirigi agaghị ada nke mmiri ga-ezo n'afọ ndị a na-abịanụ ma ọ bụrụ na m ekwugharịghị ya.” O nwetere okwu nke Chineke nke sị, “Si ebe a bilie, chewe ihu n'ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị n'akụkụ Kerit nke dị n'ọwụwa anyanwụ Jọdan. Enyele m ụmụnnụnụ iwu  ka ha na-ebutere gị nri, ebe ị ga na-ańụ mmiri bụ nke iyi ntakịrị ahụ. O mere ka Chineke siri gwa ya. Ọ gara biri n'akụkụ Kerit, iyi ntakịrị ahụ dị n'ọwụwa anyanwụ Jọdan. Ụmụnnụnụ na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na mgbede; ọ na-ańụkwa mmiri iyi ntakịrị ahụ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (17:7-16)

Dịka Dinwenu siri n'ọnụ Elaija kwuo, udu ntụọka ahụ agwụghị, nke mmanụ jiri kọọ n'ite.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mmiri ahụ (ebe Elaija zoro) nọkatara takpọọ n'ihi ụkọ mmiri ozuzo e nwere n'ala ahụ. Ọ bịa nụ okwu nke Onyenweanyị nke sị ya: “Bilie gaa biri na Zarefat nke dị na Sidọn; enyele m otu nwaanyị isimkpe nọ ebe ahụ iwu ka ọ zụọ gị nrị.” Elaija ebilie gawa Zarefat. Mgbe o rutere n'ọnụụzọ ama obodo ahụ ọ hụrụ otu nwaanyị isimkpe nọ ebe ahụ akpa nkụ. Ọ kpọọ ya sị, “kunyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” Ka ọ na-aga ime nke a, ọ kpọghachiri ya azụ sị ya, “Biko wetakwuoro m otu ibe achịcha.” Ọ zara ya sị, “N'aha Chineke dị ndụ, o nweghị ihe oriri m nwere karịa nwa obere ntụọka na nwa ntakịrị mmanụ dị n'ite. Nkụ olemaole a ḷ hụrụ mụ na-atụtụkọta bụ ka m were ha ga sie ya, ka mụ na nwa m nwoke rie cherezie ọnwụ.” Ma Elaija sịrị ya, “Atụla egwu, gaa mee ka I siri kwuo, ma buru ụzọ metere m ntakịrị. E mechaa, I mezie nke gị na nwa gị. N'ihi na Osebụrụwa Chineke nke Izrel na-ekwu sị, 'Ntụọka agaghị agwụ n'udu, nke mmanụ ga-akọ n'ite ruo mgbe Dinwenu ga-ezite mmiri n'ụwa.” Ọ gara mee dịka Elaija si kwuo. Elaija, nwaanyị a na ezinụụlọ ya nwegideziri ihe oriri ogologo oge. Dịka Dinwenu siri n'ọnụ Elaija kwuo, udu ntụọka ahụ agwụghị, nke mmanụ jiri kọọ n'ite.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (18:20-39)

Mee ka ndị a mata na Gị Dinwenụ bụ Chineke, ka ha matakwa na ị gbanweela obi ha.

N'ụbọchị ndị ahụ: Ahab kpọkọtara ụmụ Izrel na ndịamụma ahụ ọnụ n'ugwu Kamel. Elaija bịarutere ha nso jụọ ha sị, “Olee mgbe unu ga enwe otu  ebe unu kwu? O bụrụ na Dinwenụ bụ Chineke, sobenu ya; ma ọ bụrụkwanụ Baal, sobenụ ya. Ndị mmadụ azaghị ya ihe ọbụla. Ọ gakwara n'ihu jụọ ha sị, “Ndịamụma nke Dinwenụ ha fọdụrụ ole? Ọ bụ sọọsọ mụ onwe m. Ma ndị nke Baal dị narị anọ na ire ise. Ngwa nyenụ anyị oke ehi abụọ. Ha họrọ otu ehi gburisịa ya, tọgbọ ha n'elu nkụ ma ha amụnyekwala ha ọkụ. Aga m emekwa ehi nke m otu ihe ahụ, agaghị m etinyekwa ọkụ. Ha kpọkuo chi ha na-efe, ma m kpọkuokwanụ Dinwenụ m. Onye nke zara site n'izite ọkụ, ọ bụ ya bụ Chineke ezie.” Ndị mmadụ azaa sị ya, “Otu a dị mma.” Elaija agwa ndịamụma Baal ahụ sị, “burunụ ụzọ họrọ otu oke ehi kwadoo n'ihina unu dị ọtụtụ. Unu amụnyekwala ya ọkụ ma kpọkụwenụ chị unu na-efe.” Ha were otu okeehi ahụ e nyere ha kwado ya. Ha bịdoro n'ụtụtụ kpọkugide Baal ruo n'ehihie, na agba egwu gburugburu ekwuaja ha ahụ na-asị, “Biko Baal zanụ anyị o!” Ma o nweghị olu ọbụla ha nụrụ, o nwekwaghị onye zara ha. N'etiti ehihie, Elaija malitere mewe ha akaja na-asị; “Ọ kwa unu si na ọ bụ chi, kpọsienụ ya ike, ikekwe ọ nọ n'echiche, mọbụ na-ezu ike, mọbụ na ọ pụrụ apụ, ikekwe ọ na-arahụ ụra nke na ọ dị mkpa na a ga-akpote ya.” Ha tisiri mkpu ike, were mmaagha na ube merụchaa onwe ha ahụ dịka usoro ha si dị, nke n'obara na-agụsịsị ha n'ahụ. Ka ehihie gafere ha tikwaara ka ndị ara na-aga ruo mgbe e jiachụnye aja onyinye ma ọ nweghị ihe ha nụrụ, ọ nweghị onye zara ha, o nwekwaghị onye gere ha ntị. Elaija abịa gwa ndị mmadụ ahụ niile sị ha, “Bịanụ m nso.” Ha abịaruo ya nso dịka ọ gwara ha. Ọ rụziri ekwuaja nke Chineke ahụ a kụturu akutu. Elaija e were okwute iri na abụọ nke nọchitere anya agbụrụ ụmụ Jekọb onye nke Osebụrụwa gwara sị; “Izrel ga-abụ aha gị,” rụọrọ Dinwenụ ebe nchụaja. O gwukwara olulu gburugburu ekwuaja ahụ nke nwere ike ịbata ite mmiri iri na anọ. Ọ hazie nkụ ahụ, bọkwaa ehi ahụ, gburicha ya, tọgbọ ha n'elu nkụ ahụ. Ọ gwa ndị mmadụ sị, “kutenụ ite mmiri anọ wụọ n'elu nkụ na ihe aja nsureọkụ ahụ.” Ọ gwara ha sị, “Mekwaanụ ya ọzọ,” ha emee ya nke ugboro abụo. Ọ sịkwa ha mee ya nke ugboro atọ. Ha emekwaa otu  ahụ. Mmiri jupụtara ekwuaja ahụ tojuokwa olulu ahụ dị ya gburugburu. Mgbe oge ịchụ aja onyinye ruru, Elaija onye amụma kwụpụtara, tikuo Chineke sị, “O Dinwenu Chineke nke Abraham, Aịzik na Izrel, mee ka a mata n'ụbọchị taa n'Izrel na Ị bụ Chineke nakwa na mụ onwe m bụ nwodibo Gị, na m mekwara ihe ndị a dịka I si gwa m. Zaa m O Onyenweanyị, zaa m ka ndị a mata na Gị Dinwenụ bụ Chineke, ka ha matakwa na ị gbanweela obi ha.” Mgbe ahụ ọkụ nke Dinwenụ dara were repịa ihe niile, ma ihe nchụaja, ma nkụ, ma okwute, ma ntụ bịa mịkọchakwa mmiri dọọrọ n'olulu ahụ. Ka ndị mmadụ hụrụ nke a, ha makpuru, kpudochaa ihu n'ala na-ekwu sị, “Dinwenu bụ Chineke, ee ọ bụ Chineke n'ezie.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ nke Mbụ Ndịeze (18:41-46)

Elaija kpere ekpere mmiri ezoo.

N'ụbọchị ndị ahụ: Elaija agwa Ahab sị, “Laa n'ụlọ gị, na-eri, na-aṅụ n'ihina anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-asụ abịa.” Ahab gawara iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Elaija gbagoro ugwu kamel, kpọọ isiala, nke na ihu ya metụrụ ikpere ya. Elaija dunyere nwodibo ya, ka o che osimiri ihu lezie anya n'akụkụ ahụ. O jere mee otu ahụ, lọghachi sị ya, “Ahụghị m ihe ọbụla.” Ọ gwakwa ya sị, “Mee ya ugboro asaa.” Na nke asaa, nwaodibo ahụ kwuru sị, “obere urukpu ojii dika aka mmadụ si n'osimiri apụta.” Elaija ewee zie ya ka ọ gaa gwa Ahab ka  o kwado ụgbọịnyịnya ya gbadaa n'ihina ọ bụrụ na o meghị otu a mmiri ga-amakpo ya. O teghị aka urukpụ ojii agbachie eluigwe, oke ikuku kuwekwara; nnukwu mmiri wee bido zobe. Ahab agbagoro Jezril. Ike nke Osebụrụwa nọnyere Elaija, ọ wasie akwa ya ike, were ọsọ bụrụ Ahab ụzọ gbaruo Jezril.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (19:9a.11-16)

Guzoro n'elu ugwu ahụ n'ihu Dinwenu.

N'ụbọchị ndị ahụ: Ka Elijah ruru (Họreb), ọ banyere n'otu ọgba nọrọ ebe ahụ. Mgbe ahụ ka Dinwenu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Elaija gịnị ka ị na-eme ebe a?” Dinwenu gwara ya sị, “Gaa guzoro n'elu ugwu ahụ n'ihu Dinwenu.” Mgbe ahụ Dinwenu abịa gafee. Oke ikuku agbawaa ugwu ahụ tiwasịa okwute dị na ya n'ibe n'ibe. Ma Dinwenu anọghị n'oke ikuku ahụ. Ka oke ikuku kuchara, e nwere ala ọmajijiji, ma Dinwenu anọghị n'ime ala ọmajijiji ahụ. Ka nke a kwụsịrị, ọkụ gbawara. Ma Dinwenu anọghị n'ọkụ ahụ. Ka ọkụ ahụ gafere, olu ntakịrị dị nwayọọ bịara. Oge Elaija nụrụ nke a, ọ ji akwa mkpuchi kpuchie ihu ya, gaa guzoro n'ọnụụzọ ọgba ahụ. Mgbe ahụ ka olu bịara sị ya, “Gịnị ka ị na-eme n'ebe a Elaija?” Ọ zaa sị, “Ejuputara m n'oke mmasị na Dinwenu Chineke nke igwe ndịagha, ma ndị Izrel echefuola ọgbụgbandụ gị, kwadachaa ekwuaja gị, bịakwa jiri mmaagha gbuo ndịamụma gị; ọ bụ naanị m fọrọ, ma ugbu a ha chọrọ igbu m.” Dinwenu gwara ya sị, Lawa sị n'ụzọ ikpa Damaskọs gaa tee Hazel ude, chie ya eze Siria. Ị ga-etekwa Jehu nwa Nimishi ude dịka eze Izrel, bịakwa tee Elaịsha nwa Shafat nke Abalmehola ude dịka onye amụma ga-anọchị anya gị.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 06. FRIDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (19:19-21)

Elaịsha biliri sobezie Elaija.

Ka Elaija hapụrụ ugwu Họreb, ọ chọtara Elaịsha nwa Shafat ebe o ji iri ehi abụọ na anọ e kekọrọ abụọ abụọ na-akọ ugbo. Ya onwe ya so nke iri na abụọ n'ime ha. Elaija siri n'akụkụ ya gafere wụkwasa ya uwe mkpuchi ya. Elaịsha hapụrụ okeehi ya ndị ahụ gbasobe Elaija rịọ ya sị, “ka m susuo nne m na nna m ọnụ tupu esobe m gị.” Ma Elaija zara ya sị, “Laghachi azụ, ọ nwere ihe m mere gị?” Elaịsha laghachiri azụ gbuo ehi ya ndị ahụ, were osisi niile e ji kekọọ ehi ndịahụ ọnụ were sie ha nye ha ndị mmadụ ha rie, O biliri sobezie Elaija ka onye enyemaka ya.

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 07. SATURDAY OF THE TENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)