ELEVENT WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

O Osebrụwa, nụrụ olu m oge m bekuru gi, bụrụ onye enye m’aka m.  Ahapụkwala m ma ọbụ gbahgapụ m, O Chukwu, onye nzọpụta m. (Abụ 26:7.9)

EKPERE MMEGHE

 O Chukwu, I bụ ike ndi niile na-atụkwasị gi obi, were ebere nụrụ arịrịọ anyị n’ihi na ewezuga gi, mmadụ pụrụ inwụ-anwụ enweghi ike ime ihe ọbụla.  Nye anyị oge niile, enyemi’aka nke grasia gi, k’anyị n’eme ihe na-asọ gi na echiche ma na-omume anyị site na idebe iwu gi.  Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE NHUNYE

O Chukwu, I si n’onyinye ndi a anyị  n’ebute n’ihu gi were nye anyị ụzọ ihe abụọ bu mkpa anyị, nri nke ahụ ma nyenwoo anyị ndụ nke mkpuruobi.  Biko mee, ka ike nke ha n’enye wetara anyị nchekwaba nke mmụọ na nke ahụ.  Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

Otu ihe ka m n’arịọ na-aka Dinwenụ; otu ihe ka m n’ acho; ka m biri n’ulo nke Dinwenụ ụbochi niile nke ndụ m. (Abụ 26:4)

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Dinwenụ, anyị kwenyere n’oriri di asọ, anyị natara n’egosi idikọ n’otu nke gi na ndi n’eso ụzọ gi, biko mee, anyị n’ariọ gi, ka o wetara anyị onyinye nke ịdịkọ n’otu n’ime Nzụkọ gi. Site na  Kristi Dinwenụ anyị.

 

 

MONDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ nke mbụ nke Ndịeze (21:1-16)

Ejirila ọkwute tụgbuo Nabọt

N’oge ahu: Nabọt onye Jezril nwere ubi vaịn na Jezril n'akụkụ ụlọ Ahab, eze Samerịa. Ahab gwara Nabọt sị, “nye m ubi vaịn gị ka m were ya mere ubi akwụkwọ nri m, ebe ọ bụ na ọ dị nso n'ụlọ m, aga m enye gị ubi vaịn ka ya mma, mọbụ ọ masị gị, aga m akwụgị ihe ọ dara n'ego.” Nabọt zara Ahab sị, “Chineke ekwekwala ka m nye gị ihe nnanna m ha.” Ahab ji ihu mgbarụ na iwe laa n'ụlọ ya, n'ihi ihe Nabọt onye Jezril sara ya sị, “Agaghị m enye gị oke si n'aka nnanna m ha rute m aka.” O dinara n'akwa ya, tụfụọ ihu ya jụkwa iri ihe ọbụla. Nwunye ya Jezibel bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị bụ iwe gị nke na ị naghịkwa eri ihe?” ma ọ zara ya sị, “Agwara m Nabọt onye Jezril ka o resị m ubi vaịn ya, mọbụ ọ bụrụ na ọ ka masị ya, ka m nye ya ọzọ maka ya. Ma ọ zara m sị, “agaghị m enye gị ubi vaịn mụ?” Mgbe ahụ ka nwunye ya Jezibel ji si ya: “Ọ bụ na ọ bụghị gị na-achị Izrel? Bilie rie nri, gbasapụ ihu aga m enye gị ugbo vaịn Nabọt onye Jezril ahụ.” Ọ bịara dee akwụkwọọzi n'aha Ahab, were akara e jiri mara ya bụ eze suchie ọnụ ha. O zigaara ya ndịokenye na ndị nwere agba n'obodo Nabọt. Ihe o dere n'akwụkwọọzi ndị a bụ, “kpọọnụ oku maka ebumọnụ ma guzobenụ Nabọt n'ebe pụtara ihe n'etiti ọha mmadụ. N'ebe ahụ unu ga-edunyere ya ndị efulefu abụọ ka ha boo ya ebubo sị, “Ị kpọọla Chineke na eze iyi. Kpụpụzienụ ya ezi were okwute tụgbuo ya.” Ndị obodo ya ahụ, ndị okenye na ndị niile nwere agba na ya mere dịka Jezibel sị deere ha n'akwụkwọọzi. Ha kpọrọ oku ebumọnụ guzobe Nabọt n'ebe pụtara ihe n'etiti ọha mmadụ obodo ahụ. Ndị efulefu abụọ kwụụrụ n'ihu Nabọt boo ya ebubo n'ihu ọha mmadụ si, “Nabọt ekwutọọla Chineke na eze anyị.” Ha kpọpụrụ ya n'obodo ahụ were okwute tụgbuo ya. Ha zigakwaara Jezibel ozi sị, “A tụgbuola Nabọt n'ọkwute, ọ nwuọla.” Mgbe Jezibel nụrụ na atụgbuola Nabọt n'okwute, ọ sị Ahab, “Kulie, gaa were ubi vaịn ahụ Nabọt onye Jezril juru iresi gị n'ihina Nabọt adịghịkwa ndụ, ọ nwụọla, Ozigbo Ahab nụrụ na Nabọt anwụọla, o kuliri ịga n'ubi Nabọt onye Jezril iweghara ya ka oke ya.

Okwu nke Oseburụwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Dinwenụ, nụrụ onu m mgbe m kpọkuru Gị. Gị bụ enyemaka m; biko achụpụla nwaodibo Gị, a gbarapụla m, onye mgbapụta m na Chukwu m.

EKPERE MMEGHE

O Chineke, ike nke ndị chekwubere na Gị, were amara Gị nuru arirọ anyị, ebe ọbụ na mmadụ enweghị ike ime ihe ọbụla ma ewepu Gị, nye anyị enyemaka nke amara Gị, ka site na imee ihe inyere anyị n’iwu anyị ga na-eme ihe na amasi Gị, site na ihe anyị kwere na nkwa na ihe anyị na-eme. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze (21:17-29)

I dubara Izrel na njọ.

Elijah onye Tishbe nwetara okwu nke Dinwenụ nke sịrị ya: “Bilie, gaa zute Ahab eze Izrel na Sameria. Ị ga-ahụ ya n'ubi vaịn Nabọt; ọ gbadala ebe ahụ ịweghara ya.  Ị ga asị ya, 'Osebụrụwa na-ekwu nke a sị: Ọ kwa I gbuola ọchụ were aka ike na-ewere ihe abụghị nke gị? N'ihi nke a, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu, n'ebe ahụ nkịta ndị ahụ rara ọbara Nabọt ka nkịta gakwa ara ọbara gị.” Ahab sịrị Elaija, “Ya bụ na I jidela m. Onyeiro m?” Elaija azaa ya sị, “Ejidela m gị maka ihu abụọ gị n'ebe ị merela ihe na-ewe Dinwenụ iwe. Aga m ezitere gị oke ọdachi, aga m azachapụ gị bịa kpochapụ nwoke ọbụla nọ n'ụlọ Ahab, ma ohu ma onye nwe onwe ya n'Izrel. Aga m emekwa ezinụụlọ gị dịka m si mee ezinụụlọ Jeroboam nwa Nebat nakwa nke Baasha nwa Ahija maka iwe ị kpasuru m na maka ihe ọjọọ nke ị dunyere Izrel. Osebụrụwa kwukwara gbasara Jezibel sị, “Nkịta ga-eri Jezibel n'ime Jezril. Onye ezinụụlọ Ahab ọbụla nwụrụ n'ebe ndị mmadụ bị nkịta ga-eri ya, nke nwụrụ n'ịkpa ụmụnnụnụ nke igwe ga-erikwa ya. Ma n'ezie o nweghị onye yiri Ahab na-ime mpụ nakwa na-ime ihe na-ewe Dinwenụ iwe site na mmanye nwaanyị ya Jezibel. Ọ rụrụ ala n'ụzọ kacha dị ukwuu site n'ife arụsị dịka ndị Amọ si mee, nke na Dinwenụ napụrụ ha akụ ha were ha nye Izrel. Mgbe Ahab nụrụ okwu ndị ahụ ọ dọkara uwe ya, bịa yiri naanị nkịrịka akwa, bịakwa buo onụ. O ji nkịrịka akwa ahụ na-arahụ ụra na-agakwa ka onye a na- emegbu emegbu. Elaija onye Tishbe nwetara okwu nke Dinwenụ nke sịrị ya: “Ị hụla ka Ahab si weda onwe ya ala n'ihu m? Ebe o wedara onwe ya n'ihu m, agaghị m ezite mbibi ahụ n'oge nke ya, mana aga m ezidata mbibi ahụ n'ezinụụlọ ya n'oge nke nwa ya.”

Okwu nke Oseburụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze (2:1.6-14)

Ụgbọịnyịnya ọkụ na-adọkpụ bịara Elaija wee soro oke ifufe laa n'igwe.

Ka Osebụrụwa chọrọ iji oke ifufe kpọrọ Elaija laa n'igwe, Elaija na Elaịsha sị Gịlga na-abịa. Oge ahụ, Elaija gwara ya, “Biko chere ebe a n'ihina Dinwenụ zigara m Jọdan.” Ọ zaa ya sị, “Ka Chineke dị ndụ, ka gị onwe gị dịkwa ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ha abụọ wee gaba. Umụ ndịamụma iri ise sokwara ha gaba ma kwụsị n'ebe tetụrụ anya, ka ha abụọ guzoro n'akụkụ Jọdan. Mgbe ahụ, Elaija apịakọọ uwe nwụda ya, pịa ya n'elu mmiri ahụ, ọ kewaa ụzọ abụọ, ha abụọ wee gafere n'ala ọkpọrọ.” Mgbe ha gafechara, Elaija agwa Elaịsha sị, “Rịọ ihe ọbụla m ga-emere gị tupu a kpọpụ m ebe ị nọ.” Elaịsha rịọrọ ya sị, “Mee ka m keta oke mmụọ gị mmaji abụọ.” Ọ zaa ya sị, “Ị rịọrọ ihe siri ike, ma ka o sila dị, ị hụ m mgbe a na-akpọpụ m ebe ị nọ, ọ ga-adị otu I siri rịọ, mana ọ bụrụ na ị hụghị m oge a na-akpọpụ m, ọ gaghị adị otu ahụ.” Ka ha abụọ na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọịnyịnya ọkụ na-adọkpụ bịara kewaa ha abụọ. Elaija wee soro oke ifufe laa n'igwe. Oge ahụ, Elaịsha hụrụ ya wee tie mkpu sị, “Nna m, Nna m Dike ndị Izrel ji aga mba!” ma ọ hụkwaghị ya ọzọ. O were uwe mwụda Elaija ahụ dapụnahụrụ ya laghachị bịa guzoro n'akụkụ osimiri Jọdan. O were uwe ahụ pịa n'elu mmiri ahụ tie mkpu si, “Olee ebe Dinwenụ, Chineke nke Elaija ahụ nọ?” Ozigbo ọ pịara ụwe ahụ na mmiri, o kewaa ụzọ abụọ, Elaịsha wee gafee.

Okwu nke Oseburụwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Sirach (48:1-15)

Oke ikuku gbuchiri Elaija. Elaisha wee jupụta na mmụọ.

Oge ahụ ka onye amụma Elaija ji bilite ka ọkụ na-enwu enwu. Okwu ya na-chawapụta ka ire ọkụ. O weteere ha ụganị. N'obiịnụọkụ ya, o belatara ọnụọgụ ha. Site n'okwu nke Chineke, o mechiri eluigwe mmiri kwụsị izo. Ugboro atọ kwa ka o sị n'elu kpọdata ọkụ. Elaija, ị dị ebube n'ọrụ ịtụnaanya gị, onye tosiri ịnya isi dịka ị pụrụ ime? I sila n'ala mmụọ kulite onye nwụrụ anwụ; ị dọtuola ndịeze tinye ha na mbibi si n'elu akwa dọtukwaa ndị a maara aha ha. Ị nụrụ mba na Sinaị, nkwa ikpe nke ịbọ ọbọ na Họreb; gị onye tere ndịeze ude ka ha bụrụ ndị na-abọ ọbọ, tekwaa ndị amụma ude ka ha nọchie anya gị. Gị bụkwa onye oke ikuku nke ọkụ bugoro n'elu; gị onye dị nkwadebe n'oge a kara dịka akwụkwọ nsọ siri kwu, ime ka iwe Chineke dajụọ tupu oke amụma ebido; Hụgharịa obi ndị bụ nna n'ebe ụmụ ha nọ, ma dozie ebe Jekọb niile dị ka ha dị na mbụ. Ngọzị na-adịịrị ndị ahụ ga-ahụ gị, ya na ndị nke ahụ ji ịhụnaanya daa n'ụra nke ọnwụ, maka na anyị onwe anyị ga-enwekwa ndụ. Mgbe oke ikuku kpuchiri Elaija, Elaịsha wee jupụta na mmụọ nke Elaija. N'ụbọchị niile nke ndụ ya, o nweghị onye ọchịchị ọ mara jijiji n'ihu ya, nke ọ na-enwe onye fọnyere ya n'akpa. O nweghị ọrụ taara ya akpụ, ọ bụladị n'ọnwụ, ozu ya mara amụma. Ka o siri ruo ọrụebube na ndụ ya, otu a ka ọrụ ya siri dị ịtụnaanya n'ọnwụ ya.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ  

Ihe Ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze (11:1-4.9-18.20)

Ha abịa mee ya eze, tee ya ude: wee kụọ aka ha ma sị, “Eze ị ga-adị ndụ ruo ebeebe.

N'ụbọchị ndị ahụ:  Mgbe nne Ahazaya bụ Atalịa hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, o biliri, jide ụmụ eze niile, gbuchapụ. Kama Jehosheba bụ adaeze Joram bụkwa nwanne nwaanyị Ahazaya duuru Joash bụ nwa Ahazaya wee si n'ime ụmụ eze ndị a ga-egbu egbu zopụ ya na onye na-eku ya. O zonahụrụ ya Atalịa n'ime ụlọ ebe akwa na-adị, nke a mere na e gbughị ya. O zoro ya afọ isii n'ime ụlọ nke Dinwenụ. Atalịa wee buru eze obodo ahụ. Ma n'ime afọ nke asaa, Jehoiada ziri ozi, kpọọ ndị isi agha na-elekọta ụlọeze na ndị isi agha na-eche Atalịa nche. Ọ kpọbatara ha n'ime ụlọ nke Dinwenu, o gosi ha nwa eze. Ndịisi usuu agha ahụ mere dịka Jehọiada bụ ụkọchukwu siri nye ha n'iwu, onye ọbụla duuru ndị ọ na-achị ndị ga-arụ ọrụ na ndị anọghị n'ọrụ n'ụbọchị ezumike (sabat) wee bịakwute Jehoiada onye Ụkọchukwu. Onye Ụkọchukwu ahụ nyere ndịịsi usuu agha ahụ ube na ụta nke Devid ndị nke dị n'ụlọ nke Dinwenu. Ndị nche ji ngwaagha gbaa ụlọ ahụ gburugburu bido na mgbago ruo n'ọdịda ụlọ ahụ ma n'ebe a na-achụ aja. Mgbe ahụ, o kpọtara nwaeze, kpube ya okpueze, nyekwa ya akwụkwọ ọgbụgbandụ, ha abịa mee ya eze, tee ya ude; wee kụọ aka ha ma sị, “Eze ị ga-adị ndụ ruo ebeebe.” Ma mgbe Atalia nụrụ mkpọtụ ndị nche na nke ndị mmadụ, ọ bịakwutere ha n'ime ụlọ nke Dinwenụ. Ma lee, mgbe ọ lere anya eze guzoro n'akụkụ ide, dika omenaala siri dị, ya na ndịisi na ndị ogbuopi ya guzo ya n'akụkụ. Ọha obodo niile na-aṅụrị na-egbukwa opi. Atalịa dọwara uwe ya tie mkpụ sị, “Nnupụisi! Nnupụisi!” Jehoiada, onye Ụkọchụkwu nyere ndịisi usuu agha iwu sị, “kpọpụnụ ya ebe a, gbuokwanụ onye ọbụla ga-eso ya. Unu egbula ya n'ụlọnsọ nke Dinwenụ.” Ha duuru ya ruo n'ụzọ ahụ ịnyịnya si abata n'ụlọeze ebe ha nọ gbuo ya. Jehoiada wee mee ka ndị obodo, eze ha na Dinwenụ gbaa ndụ, ka ha bụrụ ndị nke Dinwenụ. N'aka nke ọzọ, o mekwara ọgbụgbandụ n'etiti eze na ndị obodo. Ndị obodo niile wee banye n'ime ụlọ Baal, kutuo ya. Ha kụpịasịkwara onyinyoo ya na ekwuaja ya kpamkpam, wee gbuo Matan bụ ụkọchukwu Baal n'ihu ebe nchụaja ya. Onye ụkọchukwu ahụ wee họpụta m zipụkwa ndị nche ga na-eche ụlọ nke Dinwenu.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 06. FRIDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ nke Abụọ nke  Ihe E Mere (Krọnikụl) (24:17-25)

I gbụrụ Zekaraya na agbata ụlọ nsọ na-ebe nchụ-aja.

Ka Jehọịada nwụsịrị, ndịịsi Juda bịara inye eze nsopụrụ, eze tụgharịrị ịnara ndụmọdụ ha. Ndị Juda gbahapụrụụlọnsọ nke Dinwenụ Chineke nke nnanna ha, were fewe arụsị na ihe a pịrị apị. Maka njọ ha nke a, iwe Chineke dakwasara Juda na Jerusalem. O ziteere ha ndịamụma ịkpọghachị ha azụ n'ebe Dinwenụ nọ, mana ha egeghị okwu ha ntị. Mmụọ nke Chineke dakwasara Zakaraya nwa Jehọịada onye Ụkọchụkwu. O kwupụtara n'ihu igwe mmadụ sị, “Chineke kwụrụ nke a, 'Ọ bụ maka gịnị ka unu ji emebi iwu nke Dinwneu nke agaghị abara unu uru ọbụla? Unu agbahapụla Dinwenu, ugbu a ọ gbahapụla unu.” Ha gbara izu were okwute tụgbuo ya n'ogige ụlọnsọ dịka eze siri nye n'iwu. Eze Joash chezọrọ iheọma niile nke Jehọịada, nna Zekaraya gosịrị ya were gbuo nwa Jehọịada onye nke tiri mkpu mgbe ọ na-anwụ sị, “Dinwenu na-ahụ, ọ ga-abọrọkwa! Mgbe otu afọ gasịrị, ndịagha Aram lụsoro Joash ọgụ, ruo Juda na Jerusalem, gbuchaa ndịisi ọchịchị ha. Ha wegaara eze ha na Damaskọs ihe niile ha lụtara n'agha. Ọ bụ eziokwu na ndịagha ndị Aram adịghị ọtụtụ, mana Dinwenụ mere ka ha merie ndị Izrel, n'agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ndịagha n'ihina ha gbahapụrụ Chineke nnanna ha. Ndị Aram merụrụ Joash nnukwu ahụ. Ha hapụrụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma laghachị; ndịisi ọchịchị ya gbara izu ịbọ ọbọ ọnwụ nwa Jehọịda onye Ụkọchụkwu, were gbuo ya n'elu akwa ya. Ha liri ya n'obodo Devid n'ili ozu abughị nke ndịeze.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE ELEVENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)