TWELFTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Dinwenụ bụ ike ndị nke ya, onye nche nke onye otere ude, zopụta ndị nke gi, gozie ndị ihoro ka oke gị, ma bụrụ onye ndu ha ebeebe. (Abụ 27:8-9)

EKPERE MMEGHE

 O Chukwu, biko mee k’anyị n’ahu aha gi di aso n’anya, na-atu ya egwu oge nile, n’ihi na I naghị ahapu ichekwaba ndi nke gi I guzosiri ike n’ihụnanhya gi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE NHUNYE

O Chukwu, nara aja otito nkea n’emeda gi obi maka njo.  Site n’ọrụ nke nwucha ya, mee k’anyị weere obi anyị na-achunyere gi aja onyinye nkea na-amasị gi. .  Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

Ihe niile ikere ji ntụkwasi obi enekwasị gi anya O Osebrụwa Ị na enye ha nri n’oge ya. (Abụ 144:15)

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu , I na-enye anyị ahu na obara nwa gi di oke onụ nke n’eme ka ndu gi di ohuru n’ime anyị, biko mee, ka emume nkea anyị ji esekpuru gi oge niile wetara anyị nkwa nke nzopụta. . Site na  Kristi Dinwenụ anyị.

 

MONDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw nke Abụọ nke Ndeze (17:5-8.13-15.18)

Dinwenu chpru m Izrel n'ebe n, sọọs agbr Juda ka hapr.

N'ụbọchị ndị ahụ: Mgbe ahụ, eze Asiria lụsoro obodo ahụ niile agha. Mgbe o rutere Sameria, ya na ndịagha ya gbakwara ya gburugburu chebido ya, na-ebuso ha agha ruo afọ atọ. N'afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria, kpụga ụmụ Izrel n'Asiria, nye ụfọdụ ebe obibi na Hala, ụfọdụ, n'ikpere mmiri Habọ bụ osimiri Gozan, ndịọzọ, n'obodo ndị Medes. Nke a mere n'ihina ndị Izrel emehiela Dinwenu, Chineke ha, onye siri n'Ijipt kpọpụta ha site n'aka Fero bụ eze Ijipt. Ha febere chi ndịọzọ, Ha sooro omenaala obodo ndịọzọ, bụ ndị Chineke chụpụru n'ihi ụmụ Izrel na omenaala ndịeze Izrel webatara. N'agbanyeghị omume ndị a, Dinwenu sikwara n'ọnụ ndịamụma, ndị ọhụụzọ, dọọ ha aka na ntị sị, “Sịnụ n'omume ọjọọ unu pụta ma dobe iwu na ọkwa ndị a site n'igbaso usoro iwu niile nke m nyere nna nna unu ndị m si n'ọnụ ndịamụma ndịodibo m kwuputara ha.” Ma na ha achọghị ige ntị. Ha kpọchiri ntị, gbaa isi akwara dịka nna nna ha ndị enweghị okwukwe na Dinwenụ Chineke ha. Ha ledara iwu ya na ọgbụgbandụ ya na nna nna ha mere anya wee nupu isi na ndụmọdụ na ọkwa ndị ọ maara ha. Ha gbasoro chi ndịọzọ bụ ihe efu, si otu a bụrụkwa ihe efu n'onwe ha; site n'iṅomi obodo ndị gbara ha gburugburu n'agbanyeghị na Dinwenụ dọrọ ha aka na ntị ka ha kwusi ihe ha na-eme. Maka ihi ya, Dinwenu were ụmụ Izrel nnukwu iwe, chụpụ ha n'ebe ọ nọ. Sọọsọ agbụrụ Juda ka ọ hapụrụ.

Okwu nke Oseburụwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw nke Abụọ nke Ndeze (19:9-11.14-21.31-36)

Aga m echedo obodo a, zpta ya maka ihi m n'ihi nwodibo m, Devid.

N'otu oge ahụkwa eze Asiria nụrụ akụkọ na Tịhaka, eze Etiopia dụ ndịagha ya abịa ibuso ya agha, o zigara ndịọzi ka ha jekwuru Hezekaya sị, “Ihe a ka unu ga-agwa Hezekaya, eze Juda sị, 'Ekwela ka Chineke gị, onye ị tụkwasara obi na ya duhie gị, site n'ime ka I nwee, nchekwube na agaghị m emeri  Jerusalem. Lee, ị nụla ihe ndịeze Asiria merela mba niile mebichaa ha kpamkpam, ọ bụ Gị ka a ga-azọpụta?” Hezekaya naara akwụkwọọzi site n'aka ndịozi ya, gụọ ya, ọ gbagokwara n'ime ụlọ Osebụrụwa, gbasakwa ya nihu Osebụrụwa. Hezekaya kpere ekpere n'ihu Chineke sị, “Biko Dinwenu nke Izrel,onye nọ n'etiti ndị mụọma, ị bụ Chineke, naanị Gị, nke ala eze niile nke ụwa, Gị mere eluigwe na ụwa. Dinwenụ, gee ntị nụrụ, meghee anya Gị ka ị hụ, nụrụ okwu nke Senakerib zitere iji kparịa Chineke dị ndụ. O Dinwenụ, n'eziokwu ndịeze Asiria emebichaala ọtụtụ obodo n'aka ha. Ha suru chi ha niile ọkụ, n'ihina ha abụghị chi, kama ọrụ aka mmadụ, osisi na nkume. Ya mere e ji mebie ha. Ugbu a biko Dinwenụ Chineke anyị, ana m arịọ Gị, si n'aka ya zọpụta anyị, ka obodo niile nke ụwa mara na sọ Gị bụ Dinwenụ na Chineke.” Aịzaya nwa Emọz wee zigara Hezekaya ozi sị, “Dinwenu Chineke nke Izrel kwuru sị, 'Anụla m arịrịọ Gị banyere Senakerib, eze Asiria.' Nke a bụ okwu nke Dinwenụ kwurula gbasara ya: Ada Zayọn, agbọghọ amaghị nwoke elelịala gị anya ma chịnye Gị ihere; ada Jerusalem efufeela isi, n'azụ gị. Ndị ahụ fọdụrụ afọdụ ga-esi Jerusalem na elu ugwu Zayọn pụta. Dinwenu ga-emerịrị nke a site na mmasị ya. Ihe a ka Dinwenụ kwuru banyere eze Asiria: 'Ọ gaghị abata n'ime obodo a mabụ gbabata akụ na ya. Ọ gaghị eji ọta ya bata n'ime ya, nke ọ na-arụrụ onwe ya nkwasa ọ ga-eji megide ya. Site n'ụzọ o siri bịa ka ọ ga-esi laghachị, ọ gaghị abata n'ime obodo a,' ọ bụ Osebụrụwa kwuru nke a. Maka na aga m echedo obodo a, zọpụta ya maka ihi m n'ihi nwodibo m, Devid. N'abalị ụbọchị ahụ mmụọọma nke Dinwenụ gara gbuo narị puku mmadụ na pụku iri asatọ na ise n'ụlọagha ndị Asiria. Senakerib eze Asiria wee laghachi, ga biri na Ninive.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw nke Abụọ nke Ndeze (22:8-13.23:1-3)

Eze agụpụtara ha okwu niile dị n'ime akwụkwọ ọgbụgbandụ nke a hụrụ n'ime ụlọ Dinwenụ. Eze guzoro n'akụkụ ogige dị n'ụlọnsọ ahụ,n'ihu mmadụ niile mesie ọgbụgbandụ ahụ ike.

N'ụbọchị ndị ahụ: Hilkaya, onye ụkọchukwu agwa Shafan onye odeakwụkwọ sị, “Achọtala m akwụkwọ nke iwu n'ime ụlọ nke Dinwenụ.” O nyere Shafan akwụkwọ ahụ, o wee gụọ ya. Shafan onye odeakwụkwọ bịakwutere eze gwa ya sị, “ndịodibo gị enyepụchaala ndị nlekọta ọrụ ụlọ nke Dinwenụ ego niile a hụrụ n'ụlọ ahụ.” Shafan, onye odeakwụkwọ gwara eze na Hilkaya onyeisi ụkọchukwu nyere ya akwụkwọ. Ọ gụụrụ eze akwụkwọ ahụ. Mgbe eze nụchara okwu nke akwụkwọ iwu ahụ ọ dọwaa akwa ya. Eze nyere Hilkaya, onye ụkọchukwu, Ahịkam nwa Shafan, Akboa nwa Mikaya, Shafan bụ onye odeakwụkwọ, nakwa Aizaya nwodibo eze iwu sị, 'Jeenụ, jụpụtanụ Dinwenu, maka m, maka ndị mmadụ na maka ndị Juda niile, gbasara okwu nke dị n'ime akwụkwọ a chọtara n'ihina ọnụma nke Dinweun nwere n'ebe anyị nọ adịla ukwuu, ọ mụnyerela ka ọkụ n'ihina nna anyị ha egeghị ntị n'okwu nke akwụkwọ a ime ihe niile e dere gbasara anyị.” Eze ziri ozi ka a kpọkọọrọ ya ndị okenye niile nke Juda na Jerusalem. Eze na ndị Juda niile, ndị bi na Jerusalem, ndị ụkọchukwu, ndị amụma, ndị obodo niile ma ndị ukwu na ndị nta banyere n'ime ụlọ Dinwenu. Eze agụpụtara ha okwu niile dị n'ime akwụkwọ ọgbụgbandụ nke a hụrụ n'ime ụlọ Dinwenụ. Eze guzoro n'akụkụ ogige dị n'ụlọnsọ ahụ,n'ihu mmadụ niile mesie ọgbụgbandụ ahụ ike site n'ikwe nkwa ime ihe niile Osebụrụwa nyere n'iwu, iji obi ya niile debe ha, na iso ụkpụrụ niile e dere n'akwụkwọ ahụ. Ndị mmadụ ahụ niile kwere nkwa idebe iwu ndị ahụ.

Okwu nke Oseburwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw nke Abụọ nkeNdeze (24:8-17)

“Nebukadeza wee kpr Jehoyakin na ndi agha ya niile kpchie na Babln”.

Jehoyakịn gbara afọ iri na asatọ oge o bidoro bụrụ eze, ma ọ chiri na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Nehushta ada Elnatan, nke si Jerusalem. O mere ihe ọjọọ n'ihu nke Dinwenụ dịka nna ya. N'oge ahụ, ndịagha Nebukadneza, eze Babịlọn bịara gbaa obodo ahụ gburugburu, ka ha buso ha agha. Ma Nebụkadneza n'onwe ya banyere n'obodo ahụ oge ndịagha ya na-aba ya gburugburu. Jehoyakịn eze Juda nyefere onwe ya, nne ya, ụmụodibo ya, ụmụ ya, na ndịisi ọrụ ya n'aka eze Babịlọn. Nebukadneza tinyere Jehoyakin n'ụlọ mkpọrọ n'ime afọ asatọ nke ọchịchị ya. Dịka Osebụrụwa sị kwuo, Nebụkadneza bukọọrọ akụ niile dị n'ụlọ Dinwenụ, nke dị n'ụlọ onyeeze, nke Solomọn eze Izrel mere maka ụlọ Dinwenụ. Nebukadneza chịkọọrọ Jerusalem, ụmụ eze niile, ndịagha, na ndị ọrụ dum na ndịagha ma ndị ọrụ nwere agba ọnụ ọgụ ha pụtara puku iri. Ọ chịkọkwaara ndị ọrụ aka na ndị ọrụ ọkpụụzụ nọ n'obodo ahụ. O nweghị ndị fọdụrụ n'obodo belusọ ndị ogbenye ọnụ ntụ. Nebukadeza wee kpọrọ Jehoyakin kpọchie na Babịlọn. O bukwaara nne eze, ndị nwunye ya, ndị ọrụ ya na ndị na-achị obodo wee si Jerusalem gaa Babịlọn. Eze Babịlọn bulatakwara na Babịlọn ndịagha ahụ niile dị puku asaa, ndị mmụọ ha siri ike maka agha, ya na otu puku bụ ndị ọrụ aka na ndị okpụ ụzụ. Nebukadneza mere Matanaya, nwanne nna Jehoyakịn eze n'ọnọdụ ya, gụgharịa ya Zedekaya.  

Read more: : 05. THURSDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GGNKE MB

Ihe gg nke a si n' akwkw abụọ nke Ndieze (25: 1-2)

A kppr Juda n 'ala ya.

N'afọ nke itoolu n'ime ọchichi Zedekaya, mgbe ọnwa nke iri gbara mkpụrụ ụbọchi iri, Nebukadneza, eze Babilon na ndiagha ya niile busoro Jerusalem agha. Ọ nọ na mpụta obodo were ndiagha ya gbaa ya gburugburu, were ruo n'afọ nke iri na otu n'ime ọchichi Zedekaya. Mgbe ọnwa nke anọ gbara mkpụrụ ụbọchi itoolu, ụnwụ dara n'obodo a nke mere na 0 nweghikwa nri nke ndi mmadụ ga-eri. N' etiti abali ụbochi ahụ, Zedekaya na ndiagha ya tipuru mgbidi obodo ahụ, bido igba ọsọ. Ha si ọnụụzọ di n' etiti mgbidi abụọ di 080 n'ubi eze; ha gbara gaba ụzọ Araba n'agbanyeghi na ndi Kaldia gbara obodo ahụ gburugburu. Ma ndiagha Kaldia chụwara eze ahụ, wee gafee ya n' obosara ala Jeriko. Ndiagha ya wee gbasasia. Ha wee jide eze, kpụgara ya eze Babilon na Ribla onye nke mara ya ikpe. Ha gbụchara ụmụ Zedekaya n'ihu ya. Ha ghupuru ya anya, wee tụọ ya iga n' aka kpụga ya Babilon. Na mkpụrụ ụbọchi asaa nke ọnwa ise n'ime afọ nke iri na itoolu nke ochichi Nebukadneza, eze Babilon, Nebuzaradan, onyeisi ọchiagha ndi na- eche nche biaara na Jerusalem. 0 tinyere ọkụ n'ụlọnsọ Yahweh, ụlọ onyeeze na ụlọ niile di na Jerusalem. Ndiagha Kaldia niile nọ n' okpuru ọchiagha a, were kutuo mgbidi niile gbara Jerusalem

Okwu nke Osebrụwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Abakwaarr (2:2.10-14.18-19)

Ada Zayn tigara Chineke mkpu akwa

N'emeghị ebere ọbụla, Osebụrụwa emebichaala ebe obibi niile nke Jekọb. Na nnukwu iwe ya ọ kwadachaala ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Omenyela alaeze ya na ndị ọchịchị ya ihere. Ndịokenye ada Zayọn nọ ọdụ n'ala nkịtị mechie ọnụ. ha awụọla ntụ n'isi ha yinyekwa akwa iru ụjụ. Ụmụagbọghọ Jerusalem ekpudola ihu n'ala. Ebekpọchaala m anya n'akwa; Mkpụrụobi m nọ n'ọgbaaghara. Uru agbawaala m obi n'ihi mkpochapụ ndị nke m ya na maka ụmụntakịrị m na maka ndị e ku n'aka na-ada mba n'okporo ụzọ nke obodo. Ha na-ebere nne ha akwa nri na-asị: “kedụ nrị, kedụ ihe ọṅụṅụ?” ka ha na-ada mba n'okporo ụzọ nke obodo ahụ dịka ndị e merụrụ ahụ, ha na-ekubi ume n'aka nne ha. Ada Jerusalem kedụ ihe m ga-agwa gị? Kedu ihe m ga-ejị tụnyere gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Kedụ ihe m ga-asị na ị dịka ya iji kasie gị obi? Ọnya dị gị n'ahụ miri emi dịka oke osimiri, onye ga-agwọlị gị, onye nwekwara ike ịgwọ gị? Ọhụ niile nke ndịamụma gị hụụrụ gị bụ ụgha na nrafu. Ha ekpugheghị mmehie gị iji weghachi gị n'ọnọdụ Ada Zayọn tigara Chineke mkpu akwa ọma. Ọhụhụ ha hụụrụ unu bụ asị na ndụhie. Ka anyammiri gị na-ezo ka mmiri ehihie na abalị. Enyela onwe gị ezumike ekwela ka anya mmiri akwa gị kwụsị ịgba. Bilie, bee akwa n'uchichi na mbido nche niile nke abalị. Mee ka ihe dị gị n'obi sọpụta n'ihu Osebụrụwa dịka mmiri si asọ. Chilierenụ ya aka unu elu maka ndụ ụmụntakịrị unu ndị na-ada n'isi okporo ụzọ niile maka ihi agụụ.

 Okwu nke Oseburwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)