13. THIRTEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

 Kụọnụ aka mba niile. Werenụ mkpu aṅụrị tikuo Chukwu.(Abụ 46:2)

EKPERE MMEGHE

 O Chukwu, I kpọrọ anyị k’anyị bụrụ ụmụ nke ihe site n’amara gi.Biko, anyị na-arịọ gi, k’anyị ghara idaba n’ọchịchịrị nke njọ, kama mee, k’anyị chawapụta oge niile n’ihe nke eziokwu gi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE NHUNYE

 O Chukwu, I sitere n’ụzọ di ifunanya were mejụpụta ọrụ nke ihe omimi ndịa, biko mee, ka omumue anyị na ọrụ nke anyị ji agbara gi odibo, bụrụ aja nke ga-ekwesi onyinye ndia di nso anyị na-enye gi. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NSO

 Mkpụrụ obi m, gozie Osebrụwa, ihe niile di n’ime m, too aha ya di nsọ. (Abụ 102:1)

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu, mee ka aja nkea  di nsọ anyị chunyere gi ma sorokwa kete oke na ya, na-enye anyị ndụ. Ebe ejịkọrọ anyị na gi n’ihunanya nke a di oge niile, biko mee, k’anyị si na ya mịta ezi mkpụrụ ga-adị ebeebe. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

 

 

 

 

 

MONDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Ams (2:6-10.13-16)

Ha na-echi mogbenye nd enwegh nd enyemaka n n'ala.

Dinwenụ na-ekwu nke a: “maka mmehie nke ugboro atọ na nke anọ nke Izrel, emeela m iwu m, na-agaghị m ahapụ ịta ha ahụhụ maka na ha erefuela onye eziomume n'ihi ego ọlaọcha na-erefukwa ụmụogbenye n'ọnụ ahịa akpụkpọ ụkwụ abụọ, ha na-echi ụmụogbenye ndị enweghị ndị enyemaka ọnụ n'ala, na-anapụkwa ndị a na-emegbu emegbu oke ruuru ha, nna na nwa ya na-akwasa otu nwaagbọghọ iko, ha wee site otu a na-emetọ aha nsọ m. Ha na-eyi akwa e ji gbara ha ibe na-edina n'akụkụ ekwuaja niile ma nọrọkwa n'ụlọnsọ Chi ha na-aṅụ mmanya ha jiri ego ha ritere na nha zụọ. Ma ọ bụ m bụ onye mebiri ndị Amọ mgbe ha busoro ha agha, ndị toro ogologo dịka osisi cida ma dịkwa ike dịka osisi Ook, Ọ bụ m lara ha n'iyi bido na mkpụrụ ha ruo na mgbọrọgwụ ha. Ọzọkwa ọ bụ m kpọpụtara unu n'ala Ijipt duo unu iri afọ anọ n'ọzara ka unu gaa nochie n'ala ndị Amọ. Lee, aga m abịada unu ala n'ọnọdụ unu otu ụgbọ anụ si adọda ala ma e bujuo ya ibu. Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị ike ọsọ, onye gbasiri ike agaghị adịkwa ike ọzọ, onye ike ọgụ agaghị enwe ike ịzọpụta onwe ya. Onye ọgba ụta agaghị enwe ike imelikwa ihe ọbụla, onye dị ike ọsọ agaghị enwe ike ịzọpụta onwe ya ọ bụladị onye nọ n'elu ịnyịnya enweghị ike ịzọpụta ndụ ya. N'ụbọchị ahụ onye sikarichara ike n'ime ndị bụ dike n'agha ga-atụfụ ngwaọgụ ya gbara ọtọ gbafuo,” Ọ bụ Dinwenụ na-ekwu.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MBU

Ihe gg ewetara n'Akwkw Onye Amma Amos (3:1-8;4:11-12)

Dinwenu ekwuola okwu; ked onye na-agagh ebu amma?

Geenụ ntị ụmụ Izrel n'okwu nke Chineke na-ekwu megide unu na ezinụụlọ ahụ niile m kpọpụtara n'ala Ijipt: “Naanị unu ka m họọrọ n'ime ezinụụlọ niile nọ n'elu ụwa; ya mere m ga-eji taa unu ahụhụ maka njọ unu niile. Mmadụ abụọ, ha nwere ike ịgakọ ọnụ ma ha ebughị ụzọ kwekọrịta ime otu a? Ọdụm ọ na-eti mkpu ike n'ime ọhịa ma ọ hụghị anụ oriri? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ n'efu n'ọgba ya ma o nweghị ihe o jidere? Nnụnụ ọ na-ama n'ọnya dị n'ala ma ọ bụrụ na e sighịrị ya ọnya? Ọnye ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? Ọ bụ na egwu anaghị atụ ndị mmadụ ma ha nụ ụda opiike n'ime obodo? Ihe ọjọọ o nwere ike mee obodo ọbụla ma o sighị n'aka Chineke bịa? N'ezie, Osebụrụwa Chineke anaghị eme ihe ọbụla ma ọ bughị ụzọ kpugheere ụmụodibo ya, ndịamụma atụmaatụ ya. Ọdụm ebigbọọla kedu onye na-agaghị atụ egwu? Dinwenu ekwuola okwu; kedụ onye na-agaghị ebu amụma? Etikpọrọ m ọtụtụ n'ime obodo unu dịka m mere na Sodọm na Gomora. Unu dịzi ka nkụ nke a gụpụtara n'ọkụ ma unu alọghachịkwuteghị m,” Dinwenu na-ekwu. Otu a ka m ga-esi mee gị o Izrel; ebe ọ bụ na m ga-eme gị otu a, jikerekwa izute Chineke gị ọ Izrel.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Ams (5:14-15,21-24)

Agaghkwa m ege nt n'egwu nke b akwara unu. Kama kweren ka ikpe nkwmt hudata ka mmiri.

Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka unu wee dị ndụ, ka Dinwenụ nke igwe ndịagha wee nọnyere unu, ka unu siri kwuo. Kpọọnụ njọ asị ma hụ iheọma n'anya, ma meenụ ka ikpe nkwụmọtọ bụrụ ihe kwụdọsiriike n'ọnụụzọ mbata; n'ihina o nwere ike bụrụkwa na Dinwenu Chineke ji ike niile ga-enwe amara n'ebe ndị ahụ fọdụrụ n'ezinụụlọ Josef nọ. Akpọrọ m emume oriri na ọṅụṅụ unu asị ma jụkwa ya. Ọgbakọ n’ofufe unu anaghịkwa amasị m. Ọ bụ eziokwu na unu na-erunyere m aja nsurọkụ unu na mkpụrụ ọka unu, ma agaghị m anabata ha, ọ bụladị aja udo nke unu ji ụmụanụ gbara abụba chụọ, agaghị m elekwasa ha anya. Ya bụ, wezuganụ ukwe unu ji eme ụzụ n'ebe m nọ, agaghịkwa m ege ntị n'egwu nke ụbọ akwara unu. Kama kwerenụ ka ikpe nkwụmọtọ hudata ka mmiri, ka eziomume hukwaa ka iyi na-asọ asọ, mgbe niile.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE TWELFTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Amọs (7:10-17)

Gaa buoro ndị nke m Izrel amụma.'

Mgbe ahụ, Amazaya onye ụkọchukwu nke Betel wee zigara Jeroboam eze ndị Izrel ozi sị, “Amọs agbaala gị mgba okpuru ka o megide gị n'etiti ụlọ Izrel, nke na ala apụghị ibu okwu ya niile. Nke a bụ ihe Amọs kwuru, Jeroboam ga-anwụ ọnwụ sịte na mmaagha, ebe Izrel ga-agbapụ ọsọ ndụ ma biri na mba ọzọ dịka ohu.” Ma Amazaya zara Amọs sị, “Biko gị onye na-ahụ ọhụ, gaba, gbaa ọsọ gbagaa n'ala Juda, rie achịcha ma bukwaa amụma gị ebe ahụ. Abịakwala ebu amụma gị ọzọ n'ala Betel n'ihina ọ bụ ebe nsọ nke eze, na kwa ụlọnsọ ala eze ahụ.” Ma Amọs zaghachiri Amazaya sị ya, “Abughị m onye amụma, nke m na-abụ nwa onye amụma, kama, abụ m onye ọchịatụrụ na kwa onye na-ebechasị osisi sikamọ. Ma Dinwenụ kpọpụtara m n'ebe m na-achị atụrụ, gwa m sị, 'Gaa buoro ndị nke m Izrel amụma.' Ya bụ gee ntị ugbu a ka ị nụrụ okwu nke Dinwenụ! Ị sị m, ebula amụma megide ụlọ Izrel nke ị na-ekwu megide ụlọ Aịzik! Ya bụ, nke a ka Dinwenụ na-ekwu: Nwunye gị ga-abụ akwụna n'obodo a, ebe ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-anwụ site na mmaagha a ga-esinyekwa ndịọzọ n'ala gị, gị onwe gị ga-anwụ n'ala rụrarụ, ma a ga-adọpụrịrị Izrel dịka ohu gaa n'ala mba ọzọ.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO) (2)

FRIDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Ams (8:4-6.9-12)

Aga m ezite unwu n'ala ah, ma gagh ab unwu nke nr, ka ma nke iṅụ okwu nke Chineke.

Nụrụnụ nke a ụnụ ndị na-azọgbu ndị mkpa na-akpa, ma na-ekpochapụ ndị ogbenye nọ n'ala a na-asị, “Kedụ oge ọnwa ọhụrụ ga-agwụ k’anyị wee nwe ike ree ọka anyị? Olee mgbe ezumike ga-agwụ ka anyị nwee ike ire ọka wiit anyị, k’anyị were iko anyị dị nta, meekwa ka ọnụ ahịa anyị la elu ka anyị jiri ike iko aghụghọ anyị ree ahịa. k’anyị were ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye jirikwa akpụko ụkwụ abụọ zụta ndị mkpa na-akpa, k’anyị reekwa efụlịfe ọka wiit anyị?” Ma ụbọchị ahụ, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu; aga m eme ka anwụ lakpuo n'etiti ehihie, meekwa ka ụwa jupụta n'ọchịchịrị n'ehihie ọcha nabọ. Aga m atụgharị oriri ụnụ ka ọ bụrụ iru ụjụ, ukwe unu niile ka ọ ghọrọ mkpụ akwa; Aga m eme ka onye ọbụla n'ime ụnụ yiri akwa mkpe, mee ka ụnụ kpụchaa isi ụnụ, aga m eme ụbọchị ahụ ka ọ dịka ụbọchị iru ụjụ, maka ọnwụ sọọsọ otu nwa, ebe ngwụcha ya ga-adị ka ụbọchị lukarịchara ilu. Lee ụbọchị ahụ na-abịa, Dinwenụ Chineke anyị na-ekwụ, mgbe m ga-ezite ụnwụ n'ala ahụ ma ọ gaghị abụ ụnwụ nri mọbụ nke agụụ mmiri, kama ọ ga-abụ nke agụụ ịnụ okwu Chineke. Ha ga-awagharị site n'otu osimiri ruo na nke ọzọ, site n'ugwu ruo n'ọwụwa anyanwụ: ha ga na-agbagharị ihu na azụ ịchọ okwu Chineke, ma ha agaghị achọta ya.”

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 06. FRIDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Ams (9:11-15)

Aga m enyeghachi nd nke m eji eji ihe ha, aga m aknye ha n'obodo ha.

“N'ụbọchị ahụ, aga m akwalite ụlọikwu Devid dara ada ma ruziekwa akụkụ ya niile dapịasịrị adapịasị. Aga m arụzikwa ya ma mekwaa ka ọ dị otụ ọ dị na mbụ, ka ha nwee ike nwere ndị fọdụrụ n'Edọm ya na mba niile ndị a kpọrọ aha m,” Ọ bụ Dinwenụ mere nke a na-ekwu. “Lee ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” Ọ bụ Dinwenụ na-ekwu, “mgbe onye na-akọ ugbo ga-agafe onye na-ewere akụkụ ubi, mgbe onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ga-agafekwa onye na-akụ mkpụrụ ya, mgbe mmanya na-atọ ụtọ nke ukwuu ga-esị n'ugwu na-atapụta, sikwa n'ugwu nta niile na-asọpụta. Aga m enyeghachikwa ndị nke Izrel iheọma ha ga-eji arụzikwa obodo ha ndị dakpọrọ adakpọ, ma birikwa na ha. Ha ga-akọ ugbo vaịn ma ṅụọkwa mmanya sina ya, ha ga-akọkwa ugbo ma riekwa mkpụrụ sina ya. Aga m akụnyekwa ha, n'ala ha ka ọ ghara inwe onye ga-efopu ha ọzọ n'ala ahụ m nyere ha.” ọ bụ Dinwenụ Chineke unu na-ekwu.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE THIRTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)