FOURTEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

14. ỤKA NKE IRI NA ANỌ OGE N’OGE NKITI NKE ỤKA, ARỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA

O Osebụrụwa, anyị anago ebere gi n’ime ọgbakọ nke ụlọ nsọ gi, otu aha gi si di, ka otito gi si garuo akụkụ ụwa niile. Aka nri gi jụpụtara n’ikpe nke nzọpụta.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, I kulitere ụwa dara ada site na nrubeisi nke nwa gi. Biko nye anyị bụ ndi kwere na gi aṅụri di asọ, meekwa ka anyị bụ ndi ịgbapụtara na ịgba ohu nke njo nweta anụrị di ebeebe.

EKPERE NHUNYE

O Chukwu mee ka aja nke anyị na-achụ maka ebube nke aha gi saacha anyị, mee ka site n’ụbọchị ruo n’ụbochị, ka omume anyị na-akpudebe nso na ndu nke eluigwe.

UKWE ORIRI NS

Leele ka ihụ na osebụrụwa di mma. Ngozi  na-adịrị ony ahụ nke gbabara n’ime ya.

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu, iwerego oninye nkea bụrụ ibu wee zụọ anyị nri, biko anyị na-arịọ gi, mee k’anyị nweta onyinye nke nzọpụta nkea, ma na-eto gi oge niile.

 

MONDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amuma Hosea (2:14bc.15cd-16.19-20)

Aga m ewere g ka onye m ga-al ebeebe:

“Ma lee, aga m arara ya, dube ya n'ime ozara ma were obi nwayọ gwa ya okwu. Ọ bụ Dinwenụ na-ekwu. Ebe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbia n'oge ahụ o si n'ala Ijipt pụta. Ma n'ụbọchị ahụ Dinwenụ na-ekwu I ga-akpọ m: “Dị m,” ị gaghị akpọkwa m “Baal m,” Aga m ewere gị ka onye m ga-alụ ebeebe: n'eziomume na n'ikpe nkwụmọtọ na nnukwu ịhụnaanya na n'obi ebere, ebeebe. Aga m eji nkwudosiike were gị dịka onye m ga-alụ, mgbe ahụ ị ga-amatakwa Dinwenụ.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Hosea (8:4-7.11-13)

Ebe ha na-ak ifufe, ha ga-aghtakwa oke ifufe.

Dinwenu kwuru si: ha eguzowela ndịeze n'anataghị m ike. Họpụtakwa ndịịsi n'emeghị ka m mara. Ha ejila ọlaọcha na ọlaedo kpụọrọ onwe ha arụsị maka mbibi ha. Ajula m arụsị nwa ehi ị kpụrụ, O Sameria! Iwe m na-enwu ka ọkụ megide ha; kedu mgbe ha ga-adịkwa ọcha ọzọ n'Izrel? Ọ bụ onye ọrụaka mere ya, ọ bụghị Chukwu. A ga-akụricha arụsị nwa ehi nke Sameria ahụ. Ebe ha na-akụ ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha amịtaghị mkpụrụ ọbụla, ma a sị na ọ mịtara ndị mba ọzọ ga-ata ya. N'ihna Ifrem arụọla ọtụtụ ebe nchụaja maka njọ ya, ebe nchụaja ndị a abụrụla ya ebe a na-eme njọ. Ọ bụrụ na edeturu m iwu m nye ha ugboro pụkụ kwuru puku, ha ga-ewere ya ka ihe si na mba ọzọ bịa. Ha hụrụ ịchụ aja n'anya ha na-eji ụmụanụmaanụ achụrụ m aja ma riekwa ya; mana Dinwenụ enweghị mmasị n'ebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta mmehie ha ma taa ha ahụhụ maka njọ ha, ha ga-alaghachị azụ n'Ijipt.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Hosea (10:1-3.7-8.12)

Ugbu a b oge a ga-eji chọọ Dinwen.

Izrel bụ osisi vaịn ahụ dị mma, na-amịta mkpụrụ nke ukwu. Ka mkpụrụ ya na-abawanye ka ọ na-arụwanye ebe nchụaja. Ka obodo ya na-enwe agamnihu, ọ na eme ka ide ya siwanye ike. Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka njọ ha. Dinwenu ga-akwatu ebe nchụaja ha ma mebichaa ide ha. Ma ugbu a, ha ga-asi, “Anyị enweghị eze n'ihina anyị anaghị atụ Dinwenụ egwu, ma kedụ ihe eze nwere ike imere anyị? Eze Sameria ga-ala n'iyi dịka mpekele osisi mmiri na-ebugharị. A ga-emebicha ụlọarụsị nke Aven ebe ndị Izrel mere njọ. Ogwu na ahịhịa ga-etochi ebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị nnukwu ugwu, 'kpuchie anyị!' gwa obere ugwu, sị, 'Dagide anyị!' Kụọnụ mkpụrụ eziomume maka onwe unu, weenụ ihe ubi nke ịhụnaanya kwụdosiriike. Kọrienụ ala unu hapụrụ ahapụ n'ihina ugbu a bụ oge a ga-eji chọọ Dinwenụ ka o wee bịa zokwasị unu nzọpụta dịka mmiri.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Hosea (11:1-4.8-9)

Obi agagh ekwe m ime ya.

Dinwenu kwuru si: Mgbe Izrel bụ nwata ahụrụ m ya n'anya, esikwa m n'Ijipt kpọpụta nwa m. Ma ka m na akpọ ha, ka ha na agate aka. Ha gara n'ihu na achunyere baal aja na esurekwa mgba-isioma n'ihu arụsi di iche iche. Ma, ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije: ekuuru m ha n'aka m, ma ha amaghị na ọ bụ m gwọrọ ha, na-elekọta ha anya. Ejiri m ịhụnaanya wee dụo ha. Ebụpụrụ m ha ibu arọ ha bụ, hulata ala nye ha nri n'ọnụ. Kedụ ka m ga-esi hapụ gị o Ifrem? Kedụ ka m ga-esi gbahapụ gị O Izrel? Kedụ ka m ga-esi mee gị ka Adam; mọbụ kpasọ gị agwa ka Zaboim? Obi agaghị ekwe m ime ya n'ihina ebere na ịhụnaanya m siri ike n'ebe ị nọ. Agaghị m ata unu ahụhụ n'oke iwe m agaghịkwa m emebi Izrel ọzọ. N'ihina abụ m Chineke, abụghị m mmadụ, onye dị nsọ nọ n'etiti unu, agaghị m abịa imebi gị ọzọ.

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'akwkw Onye Amma Hosea (14:1-9)

Any agagh akp ihe aka any mere Chineke any.

Izrel lọghachikwutenụ Dinwenụ Chineke unu; n'ihina ọ bụ njọ ụnụ wetaara unu ịsọ ngọngọ. Lọghachinụ azụ n'ebe Dinwenụ nọ, ma gwa ya sị, “Gbaghaara anyị njọ anyị niile, nabata ihe dị mma, anyị ga-ejikwa ọnụ anyị kwụpụta otito Gị. Asiria enweghị ike ịzọpụta anyị, anyị agaghịkwa akpu ịnyịnya ọzọ, mọbụ kpọọ ihe aka anyị mere Chineke anyị. Na gị ka ndị enweghị nne na nna na-enweta ebere.” Aga m agwọ enweghị okwukwe ha. Aga m eji obi m niile hụ ha n'anya, maka na iwe m esila n'ebe ha nọ pụọ. Aga m adakwasị Izrel ka igirigi, ọ ga-achawapụ dịka okooko lili, gbasapụkwa mgbọrọgwụ dika osisi Sida nke lebanọn. Ọ ga-epupụta ome ọhụrụ, maa mma dịka osisi oliv, ọ ga-enwe isiọma dịka osisi nke Lebanọn. Ha ga-alọghachị azụ biri na ndọ m ha ga-abawanye dịka ọka a kụrụ n' ugbo. Ha ga-achawapụta a dịka osisi vain, nweekwa isiọma dịka mmanya nke Lebanọn. gịnị ọzọkwa ka Ifrem ga-eji ụmụ arụsị mee ebe  ọ bụ m na- aza ekpere ya, na-elekọta ya anya? Adị m ka osisi saịpres anaghị agbu akwụkwọ. Ọ bụ m na-enye ya mkpụrụ ọ na- amịta, ka onye m’ihe ghọta okwu ndị a. ka onyenwereuche ghọta ihe ha pụtara, maka na ụzọ nke Dinwenu ziri ezi, ndị eziomume na- aga na ha, mana ndị omenjọ na-asọ ngọngọ.                                                                                        

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 06. FRIDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (6:1-8)

Ab m onye egbugberen ya rr ar anya m ahla eze Dinwen nke igwe ndagha.

N'afọ nke eze Uziya nwụrụ, ahụrụ m Dinwenụ ka ọ nọkwasara n'elu ocheeze nke dị elu, ebube ya jupụtakwara ụlọnsọ ahụ. Ndị mmụọọma guzoro n'elu ya; mmụọọma ọbụla nwere nku isii; abụọ n'ime nku isii ndị a ka ha ji kpuchie ihu ha, werekwa abụọ ọzọ kpuchie ụkwụ ha, ebe abụọ ọzọ ka ha ji efe efe. Ha na-eti, “Nsọ, Nsọ Nsọ ka Dinwenu nke igwe ndịagha dị; Ebube ya jupụtara n'elu ụwa niile.” Ụda olu ha mere ntọala niile nke ụlọ nsọ ahụ maa jijiji; anwụrụọkụ jupụtakwara n'ụlọnsọ ahụ. M wee sị, “Efuola m; leenụ ụdị ọnọdụ ọjọọ m nọ n'ime ya! Maka na abụ m onye egbugbereọnụ ya rụrụ arụ ma nọrọkwa n'etiti ndị egbugbereọnụ ha rụkwara arụ. Anya m ahụla eze, Dinwenụ nke igwe ndịagha.” Mgbe ahụ otu n'ime ndị mmụọọma ahụ fekwutere m, o jikwa n'aka ya otụ  icheku ọkụ nke ọ ji ihe gụta n'ebe nchụaja. O wee metụ m icheku ọkụ ahụ n'ọnụ sị: “Lee, nke a emetụla egbugbereọnụ gị; ya bụ na e kpochapụla ikpe ọmụma gị niile; a gbagharala gị njọ gị niile.” M wee nụ olu nke Dinwenụ ka ọ na-asị, “Ọ bụ onye ka m ga-eziga; onye ga-ejere anyị ya bụ ozi?” Ozigbo m zaa sị, “Anọ m ebe a, ziga m.”

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE FOURTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)