FIFTEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

15. ỤKA NKE IRI NA ISE OGE N’OGE NKITI NKE ỤKA, ARỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA

Ma mụ onwe m, ụgwọ ọrụ eziomume ga-abụ ihụ, ihu gi; aga m ejuputa n’anụrị ịhụ ihu gi. (Abụ 17:15)

EKPERE MMEGHE

O Chuwku, ngi gosiri ndi nke gi na-ejefie ụzọ ihe nke eziokwu gi, ka ha wee chighazụ n’ụzọ nke eziokwu, biko, nye ndi nke gi bụ ndi agụnyere dịka ndi otu Kristi site n’okwukwe nke ha kwụpụtara, grasịa ha ga eji na-ezere ihe ọbụla na-egbu okwukwe, ka ha wee na-agbaso ihe niile na-eneyere ya bụ okwukwe aka. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE NHUNYE

Nara, O Osebụrụwa, onyinye ndia n’aka Nzukọ gi. Biko, mee ka ndi niile kwerenu, bu ndi na-anata ya, na-abawanye n’idi asọ. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI NS

Obere nnụnụ achọtagoro onwe ya ụlọ. eleke achọtago akwụ ebe ọ ga-edebe ụmụ ya n’akụkụ ebe nchụaja gi, O Osebụrụwa nke igwe ndi agha.  Ngozi diiri ndi bi n’ụlọ gi wee na-enye gi otito oge niile. (Abụ 85:4-5)

EKPERE ANATACHA ORIRI

Ebe anyị natasigoro onyinye gi ndịa, anyị na-arịọ gi, ọ Ọsebụrụwa, ka I meek a anyị na-abawany na grasịa nke nzọpụta site n’ihe omimi ndia anyị na-eme emume ya oge niile. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

 

MONDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (1:10-17)

Meen onwe unu ka d cha. Wepn aj mume unu n'ihu m, kwsn ime nj.

Ugbu a, nụrụnụ okwu nke Dinwenụ, unu ndị ọchịchị Sodọm! Geenụ ntị na nkuzi nke Chineke anyị unu ndị obodo Gomora! Dinwenu kwuru sị, kedụ uru aja niile ndị a unu na-achụnyere m baara m? Aja nsureọkụ nke ebule na abụba nwa ehie ndị a unu na-achụnyere m ejula m; achọkwaghị m ha ọzọ! Ihe na-atọ m ụtọ abụghị ọbara anụ ehi; ọbara nke atụrụ mọbụ nke mkpi. Mgbe unu bịara ife m ofufe, onye gwara unu ka unu metọchaa ụlọnsọ m? Unu ebutezirila m onyinye na-enweghị isi, mgbaisọma unu na-achụnyere m bụzi arụ n'ebe m nọ. Mmemme ọnwa ọhụrụ unu, Sabat na ọgbakọ nsọ unu niile agwụla m ike. Agaghị m edili arụ unu na-akpa na nnukwu mmemme unu. Mmụọ m kpọrọ emume ọnwa ọhụrụ na mmemme unu dị ịcheiche asị; Ha abụrụla m nnukwu ibu arọ; ike agwụkwala m idi ha. Mgbe ọbụla unu gbasara aka n'ekpere, agaghị m ele unu anya; Ọ bụrụgodu na unu ekpee ọtụtụ ekpere, agaghị m ege ntị n'ihina aka unu jupụtara n'ọbara. Sachaanụ onwe unu, meenụ onwe unu ka ọ dị ọcha; Wepụnụ ajọọmume unu n'ihu m, kwụsịnụ ime njọ. Mụtanụ ka e si eme eziomume, na-achọkwanụ ikpe nkwụmọtọ; Kwụsiṅụ mmegbu, chekwabanụ ụmụ ogbenye, na-ekwuchiterenụ ụmụnawaanyị ajadu.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 02. MONDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (7:1-9)

br na gwuzogh na akk m, gagh egwuzo.

N'oge nke Ahaz nwa Jotan, nwa Uziya, eze Juda, Rezin onyeeze Siria na Peka nwa Remalịa, onyeeze Izrel bịara Jerusalem ka ha bụso ya agha mana ha enweghị ike imeri ya. Mgbe a gwara ụlọ Devid na Siria na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ, obi mapụ eze na ndị obodo ya, ha mawa jijiji dịka osisi dị n'ọhịa ikuku na-ebughari. Dinwenu wee gwa Aịzaya sị, “Gị na nwa gị Shiiajashub gaa zute Ahaz n'ebe isi njedebe ụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị n'elu, garuo n'ụzọ ebe a na-eteji akwa, sị ya, lezie anya, nọrọ jụụ, egwu atụla gị, obi adakwala gị mba n'ihi iwe ọkụ nke Rezin, na nke nwa Remalịa maka na ha dịka icheku ọkụ abụọ na-anyụ anyụ. N'ihina Siria, Ifrem na nwa Remalia akpaala nkata ọjọọ megide gị na-asị: “Bịanụ k’anyị buso Juda agha, yie ya egwu; k’anyị merie ya, were ya dịka nke anyị; kpọrọ nwa Tabil mee ya eze ya.” Otu a ka Dinwenụ Chineke sị kwụ: “Ọ gaghị abụ eziokwu, ọ gaghị eme! N'ihina isi obodo Siria bụ Damaskọs, ebe isi Damaskọs bụkwa Rezin (Ma tupu afọ iri isii na ise agachaa a ga-etikpọsị Ifrem ka ọ ghara ibụ obodo ọzọ). Ọzọ isi obodo Ifrem bụ Sameria, isi Sameria bụkwa nwa Remalịa. Ọ bụrụ na I kweghị n'ezie a gaghị akwụwasị gị ike!

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 03. TUESDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (10:5-7.13-16)

Aǹyịịke, ga-anara otito kara onye ji ya awa nku?

Azị gbakwa gị, Asiria, mkpọ igwe nke iwe m, mkpara nke obi ọkụ m. Ana m eziga ya imegide mba na-amaghị Chineke; Ezipụrụ m ya maka ndị kpasụrụ m iwe; ka o mebie ha, kwakọrọ akụ ha; zọpịa ha ka apịtị dị nokporo ụzọ. Mana o cheghị otu a, uche ya adịkwaghị na nke a; kama o bụ n'obi imebi na ịkwatụ ọtụtụ mba; Maka na O kwuru sị; O bụ n'ike aka m ka m si wee mee ihe ndị a; ọ bụkwa site n'amamihe m, n'ihina enwere m nghọta; Ewepụta m oke jikọrọ mba na mba, kwakọrọkwa akụ ha niile; Dịka oke ehi, a kwatuola ndị nọ n'ocheeze. Aka m anwụchiela akụnụụba ndị mmadụ dịka akwụ ụmụnnụnụ; Dịka ndị mmadụ sị achịkọrọ akwa a hapụrụ ahapụ; ọtụ ahụ ka m sị chịkọta uwa niile; O nweghị onye megharịrị nku ya mọbụ saghee ọnụ ya, mọbụ mee mkpọtụ. Anyịịke, ọ ga-anara otito karịa onye ji ya awa nku? Mọbụ, nkwọ osisi ọ ga-asị na ya ka onye ji ya akwọ osisi ike? Ọ ga-adị ka a ga-asị na mkpọ igwe na-efegharị onye ji ya; mọbụ na mkpara na-eweli ihe na-abụghị osisi elu! N'ihi ya Dinwenụ nke igwe ndịagha, ga-ezigara ndị ya bụ dike n'agha ọrịa ga-ala ha n'iyi, Akụnụụba ya ga-agba ọkụ.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (26:7-9.12.16-19)

Unu nd n n'ili bilen kweben ukwe aṅụr.

Ụzọ nke onye eziomume kwu ọtọ; ịna-eme ka ụzọ nke ọ na-aga na ya dị larịị. N'usoro ikpe Gị anyị chekwubere na gị O Osebụrụwa; ncheta nke aha Gị bụ ihe mmụọ anyị na-achọ. Mkpụrụobi m na-achọ Gị n'abalị, mmụọ m na-achọsị Gị ike. N'ihina mgbe ikpe Gị pụtara ihe n'elu ụwa, ndị bị n'ụwa ga-amụta eziomume. O Osebụrụwa! ị ga-enye anyị udo n'ihina ị na-akwụ onye ọbụla ụgwọ ka ọrụ ya siri dị. O Chineke! Ha kpọkụrụ Gị mgbe ha nọ na nsogbu; ha kpọkuru Gị n'ekpere mgbe ị na-ata ha ahụhụ, Ị meela k’anyị tie mkpu akwa dị ka nwaanyị ime na-eme. Anyị dị ime, ime mere anyị, ma ihe anyị mụpụtara bụ sọ ikuku. O nweghị ọrụ mgbapụtaọbụla anyị rụrụ n'ụwa, ọ nweghị ndị ga-ebị n'ụwa a mụrụ. Ndị nke Gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, ahụ ha ga-ekulite. Unu ndị nọ n'ili bilenụ kwebenụ ukwe aṅụrị! Dịka igirigi si ayọsa n'ala, otụ ahụ ka Osebụrụwa ga-esi nyeghachi ndị nwụrụ  anwụ ndụ.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 05. THURSDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Isaiah (38:1-6.21-22.7-8)

Anla m ekpere g, ahkwala m anya mmiri g.

N'oge ahụ, Hezekaya dara n'oke ọrịa nke gaara igbu ya. Onyeamụma Aịzaya nwa Amọz bịakwutere ya sị: “Dinwenu kwuru sị 'Dozie ezinuụlọ gị nke ọma n'ihina ị ga-anwụ. Ị gaghị esite n'akwa ọrịa gị bilie.” Mgbe Hezekaya nụrụ ya, ọ tụgharịrị chee ihu n'aja kpọkuọ Chineke sị, “O Chukwu! Chetakwa otu m siri were obi m niile, kwudosie ike na Gị, chetakwa ụzọ niile m sị gbalisie ike ime ihe dị mma n'ihu Gị.” Hezekaya bere akwa nke ukwuu. Mgbe ahụ Chineke ziri Aịzaya ozi sị: “Jee gwa Hezekaya, 'otu a ka Osebụrụwa Chineke nke Devid bụ nnanna gị kwuru; Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri gị. Ugbu a, aga m agbakwụnyere gị afọ iri na ise ọzọ n'ihu. Aga m azọpụta gị n'obodo a site n'aka eze ndị Asiria. Aga m echekwa obodo a.” Aịzaya agwala ndịozi sị ha: “Werenụ mmanụ Fiig tee ya n'etuto ahụ toro Hezekaya, ahụ ga-adịkwa ya mma ọzọ.” Hezekaya jụkwara ajụjụ sị: “Olee ihe ịrịbaama ga-egosi na m ga-eje n'ụlọ nke Dinwenụ?” “Nke a bụ ihe ịrịbaama sị n'aka Osebụrụwa nke ga-egosi na ọ ga-emezu ihe ọ kwuru. N'ụzọ ihe nrugo nke Eze Ahaz rụrụ, Dinwenu ga-eme ka onyinyo gaghachi azụ nzọụkwụ iri.” Onyinyo wee laghachi azụ nzọụkwụ iri.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg Ewetara N'akwkw Onye Amma Micah (2:1-5)

Ha ji aka ike anara mmad mbara ubi na l ebe obibi.

Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ n'obi ha na ndị niile na-edina n'akwa hana-eche ajọ echiche. Ha anaghị echere ka chi bọọ tụpụ ha emewe ihe ọjọọ ebe ọ bụ na ha nwere ike ime ọtụ a, ha ji aka ike anara mmadụ mbara ubi na ụlọ ebe obibi. Ha na-akpagbu mmadụ na ezinụụlọ ya, nwoke na ihe nketa ya. Ya bụ, Dinwenụ na-ekwu nke a: “Ugbu a ana m eche maka ahụhụ m ga-ata agbụrụ a, nke o nweghị onye ọbụla ga-agbalahụ. Unu agaghị enwe ike ịwelite isi unu mgbe ọ ruru, n'ihina oge ahụ ga-adị oke egwu n'ezie, Ụbọchị ahụ ha ga-eme unu akaja, ha ga-agụrụ unu egwu akwa na-asị: “A narala anyị ihe niile, e kerichaala ha ala ndị nke m. O nweghị onye ọbụla nwere ike iweghachiri ha ya. E nyefeela mbara ubi anyị n'aka ndị meriri anyị n'agha. N'ihi nke a, unu agaghị enwe onye ọbụla ga-atụpụtara unu oke ọ bụla n'ime ọbodo nke Chineke.

Okwu nke Osebrwa

Read more: : 07. SATURDAY OF THE FIFTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)