ỤKA NKE IRI NA ISII N'OGE NKITI NKE ỤKA, ARỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA

Lee, Chukwu n’onwe ya bụ enyemaka m. ọ na-akwalite ndụ m. agam eji obi m niile chụnyere gi aja. Agam eto aha gi, O Osebrụwa, n’ihi na ọ di mma.

EKPERE MMEGHE

Ọ Chukwu, gosi ndi nke gi obi ọma gi, ma site n’ebere gi, mee ka onyinye nke amara gi na-abawanye, k’anyị wee si n’ezi nchekwube, okwukwe na ihụnanya kwụsie ike na-idebe iwu gi site na-iche nche oge niile. Site…

EKPERE NHUNYE

O chukwu, I sitere na so out aja zụrụ oke were mejuo ọtụtụ iwu nke agba ochie. Biko, nara onyinye ụmụ-odibo gin a-enye gi ka I doo ya asọ. Mee, anyị na-arịọ gi, ka ihe onye ọbụla n’ime anyị ji achunyere gi aja maka nsọpụrụ nke ebube eze gi, baara anyị niile uru maka nzọpụta ebeebe.

UKWE ORIRI NS

Lee, eguzo m n’onuzo na-akụ aka, ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m meghee ụzọ, aga m abiakwute ya, soro ya rie ihe. Ya onwe ya ga-esokwa m rie nri.

EKPERE ANATACHA ORIRI

Anyị na-arịọ gi O Osebrụwa, ka I mere ndi nke gi ebere, ndi I ji ihe-omimi nke eluigwe wee zuọ. Biko, meek a ha si n’ụdị ndu ochie ha na-ebi, banye na ndụ ọhụrụ.

MONDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Onye Amuma Micah (6:1-4.6-8)

“A gwala gị ihe Chineke chọrọ n'aka gị”.

Ugbu a nụrụnụ ihe Chineke na-ekwu. Kulienụ, kwuonụ ka m siri megide ụnụ, ka ugwu ukwu nụrụ mkpesa ụnụ, ka ugwu nta niile nụrụkwa ihe ụnụ nwere ikwu. Geenụ ntị ugwu ukwu niile, n'ihe Chineke nwere ikwu, geenụ ntị ebe ntọala niile nke ụwa n'ihina Chineke nwere okwu megide ndị nke ya. Ya na Izrel ga-arụpụtakwa n'ụka. Ndị nke m, gịnị ka m mere ụnụ? Kedụ ụzọ m sịrị mee ka ike m gwu ụnụ? Zaanụ m. N'ihina akpọpụtara m unu n'ala Ijipt, esiri m n'ala ohu ahụ gbapụta ụnụ, eziteere m unu Mosis, Erọn na Miriam ka ha bụrụ ndị ndu ụnụ. Kedụ ihe m ga-eji bịa n'ihu Chineke, were hulata ala n'ihu Chineke onye kacha elu? Aga m eji aja nsụreọkụ ka ọ bụ nwa ehi gbara otu afọ? Ọ ga-amasị ya ịnara ebube dị nnụkwurunnụ ka ọ bụ uju mmanụ na-asọpụta ka iyi? Aga m ejiri ọkpara m chụọ aja maka njọ m mere, nwa nke afọ m maka mmehie m? A gwala gị rịị ihe bụ ezi ihe nakwa ihe Chineke chọrọ n'aka gị. Ọ bụ naanị nke a. Ime ihe ziri ezi, I hụ irubeisi n'anya, ya na iji umeala na-eso Chineke.

Okwu nke Osebụrụwa.

Ekele dịrị Chukwu.  

 

ABỤỌMA NA AZỊZA: (Ps 50:5-6.8-9 16bc-17.21 and 23 (R.v. 23bc)

AZỊZA: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.

  1. Kpọkọtaranụ m ndị nke m kwere ekwe, ndị mụ na ha gbara ndụ site n'aja ha chụrụ! ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya; mgbe Chineke n'onwe ya bụ onye ọkaikpe. A/
  2. Ọ bụghị n'ihi aja unu ka m ji wee na-abara unu mba. Aja nsureọkụ unu nọ n'ihu m oge niile; agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ unu, mọbụ ewu ọbụla nke si n’ulọanụ unu. A/
  3. Kedụ ikikere unu nwere iji na-agụgharị iwu m, iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m? N'ihina unu jụrụ ịnabata nkuzi m, ma leghara okwu m anya. A/
  4. Unu na-eme nke a, chee na m ga-agba nkịtị? unu chere na m dịka unu? Ugbu a aga m abara unu mba, aga m eme ka o doo unu anya. Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asọpụrụ m, ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ. A/”

MBEKU: (Ps 94:8) Alleluia, alleluia! Unu akpọchila obi unu, kama, nụrụnụ ihe Dinwenu na-ekwu. Alleluia!

OZIỌMA

Ihe ọgụgụ nke a si n'oziọma dị asọ nke Matiu dere: (12:38-42)

Ezenwaanyị nke Sheba ga-ebili maa ọgbọ a ikpe.

 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii gwara Jesu sị, “Onyenkuzi, anyị chọrọ ka I gosi anyị ihe  ịrịbaama”. Ma ọ zara ha sị, “Ọgbọ jupụtara n'ihe ọjọọ na ịkwaiko na-achọ ihe ịribaama, ma o nweghị ihe ịrịbaama a ga-egosi ha karịa nke onye amụma Jona. N'ihina otu Jona siri nọọ n'afọ azụ ụbọchị atọ, ehihie na abali, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n'ime ala ụbochị atọ, ehihie na abali. N'ụbọchị ikpe, ndị obodo Ninive ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n'ihina ha chegharịrị mgbe ha nụrụ okwuchukwu Jona; ma lee, onye karịrị Jona nọ n'ebe a. n'ụbọchị ikpe, ezenwaanyị nke Sheba ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n'ihina o si ebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomon. Ma lee, onye kaa Solomon nọ ebe a.

Oziọma nke Osebụrụwa.

Otito dịri Gị, Kristi.

TUESDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ogụgụ ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Micah (7:14-15.18-20)

O ga tụnye njọ anyị niile n'ala ala osimiri.

Jiri mkpara onye ncheatụrụ chịga ndị nke gị n'ebe ahịhịa ha ga-eri dị, duokwa igwe atụrụ a bụ ihe nketa gị, bụ ndị bi n'ime oke ohịa a, ala anaghị amịta mkpụrụ. Mee ka ha taa nrị n'obodo Bashan na Giled dịka na mgbe ochie. Dịka n'ụbọchị ahụ unu siri n'Ijipt pụta, aga m egosi ha ihe ịtụnaanya. Kedụ chi a ga-eji tụnyere Gị n'ịgbaghara njọ na ileghara mmehie ndị nke ya anya? Ọ naghị anọgide n'iwe ebighịebi, kama ọ na-enwe mmasị n'igosi Ihụnaanya dị ọkpụ. Ọ ga-egosi anyị ebere ya ọzọkwa, kpochapụ mmehie anyị niile, tụnye njọ anyị niile n'ala ala osimiri. Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasịobi, gosikwa Abraham ịhụnaanya Gị dị ọkpụ dịka I si ṅụọrọ nna anyị ha n'iyi site na mgbe ochie.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE SIXTEENTH IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (1:1,4-10)

Ahọpụtakwala m gị ka onye amụma nke mba niile.”

Okwu nke Jeremaya nwa Hilkaya onye nchụaja n'usoro nke ndị Anatọt dị n'ala ndị Benjamin; Okwu nke Chineke bịakwutere m na-asị: “Tupu a tụrụ ime gị, amarala m gị, tupu a mụọ gị edoola m gị nsọ; ahọpụtakwala m gị ka onye amụma nke mba niile.” Azara m ya sị, “Ah! Osebụrụwa Chineke! Lee amaghị m ka e si ekwu okeu n'ihina m bụ nwata.” Mana Osebụrụwa gwara m sị, “Ekwukwala na  ị bụ nwata; ị ga-agakwuru ndị niile m ga-ezigara gị, ị ga-ekwukwa ịhe ọbụla m gwara gị. Atụkwala ha egwu n'ihina m nọnyeere gị ịzọpụta gị, Osebụrụwa na-ekwu.” Ma Osebụrụwa setịrị aka ya metụ n'ọnụ m, wee gwa m sị, “Lee etinyela m okwu m n'ọnụ gị. Lee ezipụla m gị taata n'ime mba niile nakwa ọchịchị niile, ka I tọpụta ma kụtuo, ka I mebie ma weghara ọchịchị niile, ka ị rụzie ma kụọkwa.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. WEDNESDY OF THE SIXTEENTH IN ORDINARY TIME YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (2:1-3.7-8.12-13)

“Ndị nke m emeela ụzọ arụ abụọ; ha akpọla m asị, mụ bụ isi mmiri nke ndụ, gwuoro onwe ha olulu mmiri gbawara agbawa nke apụghị ichedo mmiri ọbụla”.

Okwu nke Osebụrụwa bịakwutere m sị, “Gaa kwupụta n'ala Jerusalem na Osebụrụwa kwuru sị, 'Echetara m nkwụdosiike gị n'oge ịna etolite, ịhụnaanya gị dịka nke nwaanyị a lụtara ọhụrụ, otu I siri guzosie ike n'ebe m nọ n'ọzara, n'ime ịkpa. Izrel; ḷ bụ nke naanị m, ḷ bụkwa onye nke m dị nsọ. Ezigaara  m ndịiro gị ahụhụ na ọgbaaghara,' Osebụrụwa na-ekwu. Akpọbatara m ụnụ n'ala ihe oriri jupụtara ka unu jiri iheọma niile dị na ya bie ndụ n'uju ya. Ma mgbe unu batara n'ime ya, unu merụrụ ala m, ma meekwa ihe nketa m ka ọ bụrụ arụ. Ndị bụ ndị ọkaịkpe amaghị m; ndị ọchịchị mehiekwara megide m; ọbụladị ndịamụma malitere mawa amụma n'aha nke Baal, ma tụkwasịkwa obi n'ebe ihe abaghị uru di. Ka akpataoyi wụọ ụnụ, maka nke a, ụnụ eluigwe; ka ahụ ọmajijiji jidekwa unu, tọgbọrọkwanụ n'efu,' Osebụrụwa na-ekwu. N'ihina ndị nke m emeela ụzọ arụ abụọ; ha akpọla m asị, mụ bụ isi mmiri nke ndụ, gwuoro onwe ha olulu mmiri gbawara agbawa nke apụghị ichedo mmiri ọbụla.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE SIXTEENTH IN ORDINARY TIME YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (3:14-17)

Aga m enye unu onye ndụ nke m hụrụ na-anya, mba niile ga-ezuko na Jerusalem.

“Laghachịkwutenụ m biko ụnụ ụmụ ntakịrị enweghị okwukwe,” Osebụrụwa na-ekwu. “N'ihina m bụ nna ụnụ ukwu, aga m akpọrọ ụnụ otu onye site n'otu obodo nakwa abụọ site n'otu ezinụụlọ. Agam akpọga ụnụ na Zayọn. Aga m enyekwa ụnụ ndị nche atụrụ na-eme uche m, ndị ga-eji amamihe na nghọta na-azụ ụnụ nri. N'oge ahụ, mgbe ụnụ mụbawanyechara ma baakwa ụba n'ala ahụ,” Dinwenu na-ekwu, “Ha agakwaghị ekwu ọzọ sị, 'Ebee ka ụgbọ nke ọgbụgbandụ nke Dinwenu dị. Agaghị echetakwa ya n'echiche; ọ gaghị abatakwa n'obi ndị mmadụ, nke a na-enwekwa mwute maka ya; a gaghị arụghaịkwa ya ọzọ. N'oge ahụ a ga-akpọ Jerusalem ocheeze nke Dinwenụ, mba niile ga-ezukọta na ya n'ihu nke Chineke, ha agaghị esokwa ụzọ ọjọọ ha na mkpọchị obi ha.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 06. FRIDAY OF THE SIXTEENTH IN ORDINARY TIME YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE SIXTEENTH WEEK OF ORDINARY, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

 IHE ỌGỤGỤ NKE MbỤ

Ihe ogụgụ ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremịah (7:1-11)

Unu ji ụlọ nsọ m, mere ebe ana-ezu ohi?

Okwu nke Osebụrụwa bịakwutere Jeremaya sị: “Guzo n'ọnụụzọ mbata ukwu nke ụlọ nke Chineke, kwuo okwu a ebe ahụ sị, 'nụrụnụ okwu nke Dinwenụ ụnụ bụ ndị Juda niile na-abata n'ọnụụzọ ukwu a ihe Osebụrụwa, Dinwenu nke ji ike niile, Chineke nke Izrel kwuru sị, Mezienụ ụzọ ụnụ na omume ụnụ niile, ka m kwere ka unu biri ebe a. Unụ enwela ntụkwasịobi n'okwu ndụhie ụzọ niile ndị a: Nke a bụ ụlọ nke Dinwenụ ụlọnsọ nke Dinwenụ, ụlọ nke Dinwenụ. N'ihina unu mezie ụzọ unu niile na omume unu niile, ọ bụrụkwa na unu jiri ikpe nkwụmọtọ na-eso ibe unu, ma gharakwa imegbu ndị ọbịa, ndị enwe nne enwe nna mọbụ ndị ajadụ ma gharakwa ịkwatụ ndị aka ha dị ọcha n'ala a, ma ọ bụrụkwa na unu akwụsị ife chị ndịọzọ dị icheiche ofufe nke na-ebutere unu nsogbu, aga m ekweta ka ụnụ biri ebe a; n'ime ala nke m nyerela nnanna ụnụ n'oge ochie ruo mgbe ebighịebi. Lee, ụnụ na-atụkwasa obi n'okwu ndụhie nke abaghị uru. Ọ bụ ụnụ zuchaa ohi, gbuo ọchụ, kwaa iko, nụọkwa iyi ụgha, fee arụsị Baal n'ọtụtụ chị ndịọzọ dị icheiche, unu abịakwa guzo n'ihu m n'ime ụlọnsọ a, nke akpọrọ ahụ m, ma na-emekwa ihe ọjọọ niile ndị a?”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE SIXTEENTH IN ORDINARY TIME YEAR B (IGBO)