SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Chukwu nọ n’ebe obibi ya di aso.

 O na-eme ka ndị n’ebi n’ulo   ya jiko onụ, ya onwe n’enye ndi nke ya ebube na ike.

EKPERE MMEGHE

 O Chukwu, I bu Onye nchedo ndị niile tukwasiri gi obi.  O nweghi ihe obuna ga akwudosike ma-obu di asọ ma ewepu gị, mee k’anyị nweta ebere gi n’uju.Bikọ, buru onye nche na onye ndu anyị,  k’anyị wee jiri ezigbo ihe ndi  a n’gafe agafe n’eme ihe n’uzọ di mma, wee si etua jidesie ike ugbua, ihe ndi ahu na-adigide ebeebe. Site na Dinwenu anyị Jesu Kristi nwa gị Onye gị na ya di ndu n’achi, n’idiko............

EKPERE NHUNYE

O Chukwu biko nara onyinye ndia anyị si n’ọtụtụ onyinye i nyere anyị wee na-enye gi, biko, mee anyị na-arịọ gi ka ike nke amara gi , site n’ọrụ ya, mee ka ihe omimi ndịa di asọ, doo omume anyị asọ na ndua, ma dubata anyị n’aṅụrị ebeebe n’ụwa ọzọ. Site na Kristi...

UKWE ORIRI NSO

Mkpụrụobi m gozie Osebruwa, echezokwana  ihe nile O meere gi.

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu, anyị anatago nri nkea si n’eluigwe nke na-echetara anyị oge niile ahụhụ nke nwa gi, anyị na-arịọ gi, biko mee ka onye nkea, Nwa gi Jesu Kristi ji ihụnanya n’enweghi atụ wee nye anyị, wetara anyị nzọpụta

 

 

 

MONDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (13:1-11)

Ha ga-adị ka akwa ahụ a na-awa n'ukwu n'enweghị uru ọ bara.

Osebụrụwa gwara m sị, “Gaa ka ḷ zụta akwa a na-awa n'ukwu, kee ya n'ukwu gị, emesakwala ya mmiri. Azụrụ m ihe a dịka Dinwenụ siri kwuo ma warakwa ya n'ukwu. Okwu nke Dinwenụ bịakwutere m nke ugboro abụọ. “Were akwa a na-awa n'ukwu nke ḷ zụrụ, nke ahụ ḷ wakwa n'ukwu gị, bilie, gaa na Yufretes dịka Dinwenu siri kwuo.” Mgbe mkpụrụ ụbọchị olemaole gachara, Dinwneu gwara m sị, “Bilie gaa na Yufretes ma werekwa akwa ahụ a na awa n'ukwu nke m gwara gị ka ḷ zoo ebe ahụ.” M were gaghachi Yufretes werekwa akwa ahụ ebe m zoro ya, ma lee, akwa ahụ emebiela ọ dịghịzị mma ọbụla. Okwu nke Chineke bịakwutere m sị, “Otu a ka m ga-esi mebie ngala Juda ya na nke Jerusalem. Ndị ọjọọ a, ndị nke jụrụ ịnụ olu m, ndị kpọchịrị obi ha na-efe chi ndịọzọ, ha ga-adị ka akwa ahụ a na-awa n'ukwu enweghị uru ọ bara. Dịka akwa ahụ a na-awa n'ukwu sị atapara n'ahụ, otu a ka m si eme ezinụụlọ nke Izrel na nke Juda ka ha bịakwute m, bụrụ ndị nke m, otito m, ugwu m na ndị m ji anya isi, ma ha egeghị ntị.” ọ bụ Dinwenụ na-ekwu.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 02. MONDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

Read more: : 03. TUESDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (15:10.16-21)

Gịnị mere na ihe ụfụ m ekweghị nkwụsị? Ọ bụrụ na ḷ lọghachi, aga m anabata Gị, ḷ ga-akwụkwa m n'ihu.

Azị agbala m nne m, n'ihina ḷ mụrụ m ka m bụrụ ihe esemokwu na ihe ịrụụka n'etiti mmadụ niile. Ebinyeghị m mmadụ ego nke m na-ebiri ebiri ma ha niile na-ata m ụta. Mgbe okwu Gị bịara, e jiri m obi ịnụ ọkụ nabata ya, okwu Gị bụ mmasị m na aṅụrị nke obi m, maka na a kpọrọ m n'aha Gị, O Dinwenụ na Chineke. Anaghị m anọ n'oriri na ọṅụṅụ ndị ajọ mmadụ, ana m anọ naanị m maka na aka Gị ji m, ejupụtakwara m n'iwe. Gịnị mere na ihe ụfụ m ekweghị nkwụsị, ọnya m enweghịkwa ọgwụgwọ, o kweghịkwa ala? Ị chọrọ ịghọgbụ m dịka iyi nke na-ata n'oge ọkọchị. Dinwenu kwuru sị: 'Ọ bụrụ na ḷ lọghachi, aga m anabata Gị, ḷ ga-akwụkwa m n'ihu. Ọ bụrụ na I kwuo ihe dị mma na-abụghị nke abaghị uru, ḷ ga-adịkwa ka ọnụ m. Ha ga-abịakwute Gị, ma ḷ gaghị agakwu ha. Aga m eme ka I sie ike dịka mgbidi ọlaọkụ n'ebe ndị a nọ, ha ga-alụso gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n'ihina anọnyeere m gị iji zọpụta gị; ọ bụ Dinwenụ na-ekwu. Aga m azọpụta gị n'aka ndị ajọ mmadụ na n'aka ndị ogbu ọchụ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (18:1-6)

Dịka ụrọ dị n'aka onye na-akpụ ite, otu ahụ ka ḷ dị n'aka m.

Nke a bụ okwu siri n'aka Dinwenu bịakwute Jeremaya, “Bilie ka ḷ gakwuru onye nke ahụ na-akpụ ite, n'ebe ahụ aga m eme ka ḷ nụrụ okwu m.” M wee gaa n'ụlọ onye ahụ na-akpụ ite, ebe ọ nọ arụ ọrụ ya. Ma ihe nke ọ na-akpụ mebiri n'aka ya, ma ọ kpụgharịrị ya n'ụdị ihe ọzọ dịka o si masị ya. Okwu nke Dinwenụ bịakwutere m: “Ụlọ nke Izrel, ọ bụ na enweghị m ike ime gị dịka onye a na-akpụ ite siri mee?” Dinwenu na-ekwu. N'ezie dịka ụrọ dị n'aka onye na-akpụ ite, otu ahụ ka ḷ dị n'aka m o ụlọ Izrel.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (26:1-9)

Ndị mmadụ niile wee gbakọọ gburugburu n'ebe ahụ Jeremaya nọ n'ime ụlọ nke Dinwenu.

Na mbido ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya eze nke Juda, okwu nke a si n'aka Dinwenu bịa sị: “Ọ bụ Dinwenu na-ekwu Guzoro n'ihu ụlọ Chineke ma gwa obodo niile nọ na Juda ndị bịara ife ofufe n'ụlọ nke Dinwenu, okwu niile nke m nyere gị n'iwu ka ị gwa ha; ezokwala okwu ọbụla. O nwere ike bụrụ na ha ga-ege ntị, ma chegharịa na mmehie ha; nke ga-emekwa ka m chegharịa ma wepụkwa ihe ọjọọ nke m chọrọ ime n'ebe ha nọ n'ihi agwa ọjọọ ha. Ị ga-agwa ha sị, 'Lee ọ bụ Dinwenu na-ekwu ọ bụrụ na unu egeghị m ntị, bịa soro ụzọ iwu m nke m chere n'ihu unu, ma geekwa ntị n'okwu nke ụmụodibo m ndịamụma ndị m na-ezitere unu ọsọọsọ, ndị unu na-egebeeghị ntị mbụ, mgbe ahụ, aga m eme ụlọ unu dịka Shịlọ, agakwa m eme obodo a ka ọ bụrụ ihe ịbụ ọnụ n'ebe mba niile dị n'elu ụwa nọ.” Ndị ụkọchukwu na ndịamụma na ndị mmadụ niile hụrụ Jeremaya ka ọ na-ekwu ihe ndị a n'ime ụlọ nke Chineke. Mgbe Jeremaya kwuchara ihe niile Dinwenu nyere ya n'iwu ka o kwuo, ndị ụkọchukwu na ndịamụma na ndị mmadụ niile abịa jide ya gwa ya sị, “Ị ga-anwụrịrị. Olee ihe kpatara I jiri na-ebu amụma n'aha nke Dinwenu na-ekwu na-asị, Ụlọ nke a ga-adị ka Shịlọ, obodo nke a ga-abụkwa ihe e mebichara emebicha o nweghị onye ga-ebi n'ime ya?” Ndị mmadụ niile wee gbakọọ gburugburu n'ebe ahụ Jeremaya nọ n'ime ụlọ nke Dinwenu.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 06. FRIDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah (26:11-16.24)

Dinwenu zipụtara m ka m gwa unu okwu ndị a ka ọ banye unu na ntị.

N' ụbochị ndị ahụ:  Ndị ụkọchukwu na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ndị mmadụ niile sị, “Nwoke a kwesịrị amamikpe ọnwụ, maka na ọ buola amụma megide obodo nke a, dịka ụnụ jirila ntị ụnụ nụ.” Jeremaya wee gwa ndịisi ọchịchị niile na ndị mmadụ niile sị, Dinwenu ziri m ka m buo amụma megide ụlọ nke a, ya na obodo nke a dịka ụnụ siri nụ n'okwu m. Ya mere, ugbu a, mezienụ ndụ ụnụ na ụzọ ụnụ ma geekwanụ ntị n'okwu nke Dinwenu bụ Chineke ụnụ, ka Dinwenu wee tụgharịa uche banyere ihe ọjọọ nke o kwupụtara ga-eme unu. Mana banyere mụ onwe m, anọ m n'aka ụnụ, jirinụ m mee ihe dị ụnụ mma na ihe masịrị ụnụ. Naanị ihe ụnụ ga-amata bụ na ọ bụrụ na ụnụ egbuo m, ọbara onye enweghị ihe ọ mere ga-adị n'isi ụnụ nakwa obodo ụnụ na ndị niile bi na ya, n'ihina n'eziokwu, ọ bụ Dinwenu zipụtara m ka m gwa ụnụ okwu ndị a ka ọ banye ụnụ na ntị.” Mgbe ahụ ndịisi ochịchị na ndị mmadụ niile gwara ndị ụkọchukwu na ndịamụma sị, “Nwoke a ekwesịghị amamikpe ọnwụ ọbụla n'ihina ọ gwara anyị okwu site n'aha nke Dinwenu Chineke anyị.” Ahịkam nwa Shafan chedoro Jeremaya nke mere na ahanyeghị ya n'aka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 07. SATURDAY OF THE SEVENTEENTH WEEK OF EASTER, YEAR B (IGBO)