EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

O Chukwu, were obi ọma gi zọpụta m! Gbata ọsọ ka  I nyere m aka, O Osebruwa. I bụ enyemaka m na onye nzọputa m. O Osebruwa gbata ọsọ-ọsọ

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, nodebe ụmụodibo gi nso. Ma were obi ọma gi nụrụ ekpere ha, ebe anyị na-egori n’ime Gi  dịka onye okike  na Onye nchekwube anyị, biko, anyị na-arịọ, ka inyeghachị ihe ikere-eke ndụ, ma were obi ọma gi na-echekwaba ndụ nkea inyeghachiri anyị.

EKPERE NHUNYE

O Chukwu, were obioma doo onyinye ndia asọ, biko mekwa k’anyị bụrụ onyinye nke ga-adị ebebe n’ebe ịnọ.

UKWE ORIRI NSO

A bụ m, achịcha nke ndụ; ọ bụ Dinwenu m na-ekwu. Onye na-abiakwute m agu agaghị agụ ya;Onye kwere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nku

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chuwkum mee ka nchkwaba gi n’ebe anyị nọ di oge nile, nonyere ndi iji onyinye nkea si n’eluigwe wee zụọ; biko, mekwa k’anyị si na nchwkwaba nkea i na-enye anyị oge nile, tosi inweta nzọpụta di ebebe.

 

 

MONDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE GG NKE MB

Ihe gg ewetara n'Akwkw Onye Amuma Jeremiah (28:1-17)

“Hananaya, bgh Chineke zitere g, ma I meela ka nd mmad kwenye n'ozias.”

N'otu afọ ahụ, na mbido ọchịchị nke Zedekaya eze nke Juda n'ime ọnwa nke ise n'ime afọ nke anọ, Hananaya nwa Azọ, onye amụma nke Gibon gwara m okwu n'ime ụlọ nke Dinwenu n'ihu ndị ụkọchukwu na ndị mmadụ niile sị, “Lee ọ bụ Dinwenu nke igwe ndịagha na-ekwu, Chineke nke Izrel; emebiela m ọchịchị nchịgbu nke eze Babịlọn. N'ime afọ abụọ ugbu a, aga m eweghachite azụ n'ebe a, ngwongwo niile nke dị n'ụlọ nke Chineke nke Nebukadneza eze Babịlọn sị n'ebe a buru buga na Babịlọn. Aga m akpọghachịkwa azụ n'ebe a Jekonaya nwa Jehoyakim eze nke Juda, ya na ndị soro ya gbaa ọsọ agha site na Juda, ọ bụ Dinwenu na-ekwu, maka na aga m emebi ọchịchị nchịgbu nke eze Babilọn.” Mgbe ahụ onye amụma Jeremaya wee gwa onye amụma Hananaya okwu n'ihu ndị ụkọchukwu na ndị mmadụ niile ndị nọ n'ime ụlọnsọ nke Dinwenu. Onye amụma Jeremaya ekwuo sị, “Amen! Ka Dinwenu mee nke a, ka o mejupụta ihe ndị a I buru n'amụma ma weghachi azụ n'ebe a, site na Babịlọn, ngwongwo niile nke ụlọ nke Chineke ya na ndị niile a kpụụrụ n'agha. Ma ugbu a nụrụ okwu a nke m na-agwa gị, nke m na-agwakwa mmadụ niile. Ọtụtụ ndịamụma bụ anyị ụzọ site na mgbe ochie buru amụma maka agha, ọnwụ na ọrịa ọgwụrụmba megide ọtụtụ mba ya na ọtụtụ alaeze. Gbasara onye amụma nke na-ebu amụma udo, a ga-amata na ọ bụ Dinwenu zitere ya n'eziokwu mgbe e mejupụtara ihe o buru n'amụma.” Otuihu ahụ, onye amụma Hananaya were iyagba ahụ Jeremaya nya n'olu, dobie ya. Hananaya ekwuo okwu n'ihu ndị mmadụ sị, “Lee, ọ bụ Dinwenu na-ekwu, otu a ka m ga-esi mebie ọchịchị nchịgbu Nebukadneza n'ebe mba niile dị n'ụwa nọ n'ime afọ abụọ na-abịanụ, ma Jeremaya onye amụma jewaara onwe ya. Ka obere oge gachara mgbe onye amụma Hananaya jiri dọbichaa ịyagba onye amụma Jeremaya nya n'olu, okwu nke Dinwenu bịakwutere Jeremaya sị, “Gaa, ma gwa Hananaya sị, 'Lee, ọ bụ Dinwenu na-ekwu, ị kụjiela mgbaolu nke osisi, mana mụ onwe m ga-eji mkpọ nke igwe dochie n'ọnọdụ ya.' Otu a ka Dinwenu nke igwe ndịagha, Chineke nke Izrel siri kwuo; Etinyela m n'olu mba ndị a niile, mgbaolu igwe nke ọchịchị nchịgbu ga-esite n'aka Nebukadneza eze nke Babịlọn, ha ga-efe ya, n'ihina enyela m ya ọbụladị ụmụ anụọhịa.” Onye amụma Jeremaya gwara Hananaya onye amụma sị, “Gee ntị gị bụ Hananaya, ọ bụghị Chineke zitere gị, ma I meela ka ndị mmadụ kwenye n'oziasị, Ya mere, ọ bụ Dinwenu na ekwu, 'Ugbu a aga m ewepụ gị n'elu ụwa, N'ime afọ a, ị ga-anwụ, n'ihina ị kwuola okwu megidere Dinwenu.” N'ime afọ ahụ, n'ọnwa nke asaa, onye amụma Hananaya anwụọ.”

Okwu nke Osebrwa.

Read more: : 02. MONDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amuma Jeremaya (30:1-2.12-15.18-22)

Njọ unu buru ibu, ya mere m ji mee unu otua. A ga-eweghachite iheọma niile nke ụlọ Jekọb.

Okwu nke a bịakwutere Jeremaya site n'aka Dinwenu. “Lee Ọ bụ Dinwenu na-ekwu, Chineke nke Izrel: deba n'akwụkwọ, okwu niile nke m gwara gị. Dinwenu na-ekwu nke a, mmeru ahụ unu agaghị enwe ngwọta, ọnya ụnụ bukwara ibu. O nweghịkwa onye nwere ike ịrịọtara ụnụ, o nweghị ọgwụ ọbụla dị maka ọnya ụnụ, o nweghịkwa ngwọta ọbụla dịịrị ụnụ. N'ihina ndị enyị gị niile echefuola gị, ha anaghịkwa elebara gị anya ọzọ, n'ihina emeela m ka onyeiro gị meruo gị ahụ, ahụhụ nke si n'aka onyeiro obi tachiri, n'ihina njọ gị karịrị akarị, mmehie gị na-achake achake. Gịnị mere I ji ebe akwa maka mmerụ ahụ gị? Ihe mgbu gị enweghị ngwọta n'ihina ihe ọjọọ gị buru ibu njọ gị na-achakekwa achake. Ọ bụ m mere gị ihe ndị a.” Dinwenu kwuru nke a: N'eziokwu a ga-eweghachite iheọma niile nke ụlọ Jekọb, ma nweekwa obi ebere n'ebe ndị bi n'ime ya nọ; a ga-arụzi obodo a n'elu aja ọgba ya, obi eze abịa kwụrụkwa ebe ọ nọọrọ na mbụ. Ukwe ekele ga-esi n'ọnụ ha apụta, ya na olu ndị na-enwe aṅụrị. Aga m eme ka ha dị ụbara, ha agaghịkwa adị nta ọzọ; aga m eme ha ka ha nwee ugwu, ha agaghị adị olemaole. Ụmụ ha ga-adị otu ha na-adị na mgbe ochie, agakwa arụlite ọgbakọ ha n'ihu m, ma aga m ata ndị niile na-emegbu ha ahụhụ. Nwa eze ha ga-abụkwa otu onye n'ime ha, onye ọchịchị ha ga-esikwa n'etiti ha: aga m eme ya ka ọ bịaruo m nso, ma ọ ga-abịakwutekwa m, ma olee onye ga-anwa n'onwe ya ịbịakwute m? Dinwenu na-ekwu. Mgbe ahụ ụnụ ga-abụ ndị nke m, mụ abụrụ Chineke ụnụ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amuma Jeremaya (31:1-7)

Ewerela m ịhụnaanya dị ebeebe hụ gị n'anya.

N'oge ahụ ọ bụ Dinwenụ na-ekwu, “aga m abụ Chineke ezinụụlọ niile nke Izrel, ha ga-abụkwa ndị nke m.” Dinwenụ kwuru sị, “Ndị nwụfọrọ n'agha n'ime ọzara nwere isiọma. Mgbe Izrel chọrọ ka o zuo ike ma nweekwa ọnọdụ Dinwenu siri n'ebe dị anya bịakwute ya. Ewerela m ịhụnaanya dị ebeebe hụ gị n'anya n'ihi nke a, aga m na-akwụdosiike n'ebe ḷ nọ. Aga m arụ gị, aga m arụgharịkwa gị, Izrel nwaagbọghọ amaghị nwoke. Ị ga-ejikwa ihe egwu gị chọọ onwe gị mma, ḷ ga-esokwa ndị ọṅụ juru obi ete egwu. Ọzọ ḷ ga-akọkwa vaịn n'elu ugwu niile nke Sameria, ndị na-akụ mkpụrụ ga-akụ ma nwee ọǹụ n'ihe mkpụrụ ha kụrụ mịpụtara. N'ihina otu ụbọchị ndị nche ga-akpọ oku n'ugwu obodo nke Ifrem sị, 'Kulienu k'anyị gaa na Zayọn, gakwuru Osebụrụwa Chineke anyị.' N'ihina Dinwenu kwuru sị, “Werenụ ọṅụ na oke olu bụọ abụ maka Jekọb, tiekwanụ mkpu maka eze mba niile, kwupụtanụ, nyenụ ekele na-asị, Dinwenu azọpụtala ndị nke ya bụ ndị fọdụrụ n'Izrel.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 04. WEDNESDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya (31:31-34)

Agam emeeọgbụgbandụ ọhụrụ. Agaghị m echetakwa mmehie ha ọzọ.

Lee oge na-abịa, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu, mgbe mụ na ezinụụlọ Izrel na Juda ga-agba ndụ ọhụrụ. Ọ gaghị adịkwa ka ọgbụgbandụ nke mụ na nnanna ha n'ala Ijipt, nke ha mebikwara n'agbanyeghị na m bụ nna ha ukwu, ọ bụ Dinwenu na-ekwu. Mana nke a bụ ọgbụgbandụ ga-adị n'etiti mụ na ụlọ Izrel mgbe ụbọchị ndị ahụ gafechara, ọ bụ Dinwenu na-ekwu. M ga-etinye iwu m n'ime ha, dekwaa ya n'ime obi ha: aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ndị nke m. O nwekwaghị ka agbataobi mmadụ mọbụ nwanne mmadụ n'ụlọ Izrel kuziere onwe ha sị, 'Maranụ Dinwenu,' n'ihina ha niile ga-amata m bido n'onye kacha nta n'etiti ha ruo n'onye kachasị elu, Dinwenu kwuru nke a; n'ihina aga m agbaghara ha mmehie ha niile, agaghị m echetakwa mmehie ha ọzọ.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrint: (9:6-10)

Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ enye onyinye n'anya.

Mkpụrụ onye kụrụ ka ọ ga-aghọta. Onye kụrụ nwantịntị ga-aghọta nwantịntị. Onye kụrụ n'uju ga-aghọtakwa n'uju. Onye ọbụla ga-enye dịka o kpebiri n'obi ya. Unu enyela na nwute na n'inwe obi abụọ, mọbụ dịka a manyere unu amanye, n'ihina Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ enye onyinye n'anya. Chineke n'onwe ya, pụrụ ibutere unu ngọzị n'uju, karịa ka unu tụrụ anya. Ọ pụrụ ime ka unu nwezuo ihe; obiọma ya na adịgịde ruo mgbe ebighị ebi. “Chineke, onye na-enye onye ọrụ ụbi mkpụrụ akụkụ na ihe oriri ga-enyekwa unu mkpụrụ mọbụ ihe unu ji arụ ọrụ obiọma. Ọ ga-eme ka ha mụbaa bụ ihe ọma nke unu na-akụ dịka mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka ngọzi nke sitere n'ezi ọrụ unu bawanye.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 06. FRIDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amuma Habakkuk (1:12-2:4)

Ọ bụ site na-okwukwe ya ka onye eziomume ga-eji dị ndụ.

Ọ bụ na ḷ dịghị ebeebe Osebụrụwa na Chukwu m, onye nsọ nke m? Anyị agaghị anwụ. Dinwenu I mere ka ihe ndị a bụrụ ihe a ga-eji dọọ anyị aka na ntị. Gị bụ okwute, I meela ka ha bụrụ ihe ḷ ga-eji taa anyị ahụhụ. Anya Gị dị nsọ, ọ naghị achọ ịhụ njọ, ọ naghị achọkwa ịhụ ndị na-eme ajọ ihe. Ma gịnị mere ị ji hapụ ndị na-aghọ aghụghọ, gịnị mere I ji gba nkịtị ebe onye ajọ mmadụ na-emegbu onye eziomume? Gịnị mere I ji meso ndị mmadụ omume dịka azụ bi na mmiri, dika anụmaanụ na-awagharị n'enweghị onyendu. Ha na-eji nko ha na ụbụ ha na-ejide ha dika azụ, bịazie na-aṅụrị ọnụ, na-etegharịkwa egwu. N'ihi nke a, ha na-achụnyere ụbụ ha aja mgbaisiọma n'ihina ọ bụ site na ya ka ha si ebi ezi ndụ, na-erikwa ihe kachasị mma. Ha ga na-aga n'ihu na-awụpụ ihe ụbụ ha gbutere oge niile, na-egbupịa mba niile n'enweghị obi ebere ọbụla? Aga m akwụrụ n'ebe nche m, aga m arịgoro n'ụlọ nche m dị elu. Aga m anọrọ wee mara ihe Chineke ga-agwa m, ihe ọ ga-asa m gbasara mkpesa m kpesara ya. Mgbe ahụ Dinwenụ zara m sị, “Detuo ọhụ a, depụta ya na mbamba okwute ebe a ga-agụta ya nke ọma. N'ihina ọhụ a na-eche oge ya; ọ chọrọ ka e mejupụta ya ngwa ngwa, nrafu ọbụla adịghị na ya. Ọ bụrụ na o mezughị ya ọsọọsọ, chere ya n'ihina ọ ga-emechaa mezuo. Lee anya, onye ọbụla obi ya akwụghị ọtọ ga-anwụ. Mana ọ bụ site na-okwukwe ya ka onye eziomume ga-eji dị ndụ.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 07. SATURDAY OF EIGHTEENTH WEEK OF ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)