NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

UKWE MBATA

Lekwasi ogbubandu gi anya, O Osebruwa, echezokwana ndu umu ogbenye gi ebeebe. O Chukwu, kunie, ka ikpe ikpe gi, echezokwana ekpere ndi niile na-acho gi.

 EKPERE MMEGHE

O Chukwu puru ime ihe niile, Nna di ebeebe, o bụ site na mmuo nsọ k’anyi ji buru umu gi, biko mee ka mmuo nke ibu umu gi anyi bu zuo oke n’ime anyi, k’anyi wee di mma ibanye na-ndu ohuru ahu nke I kwere anyi na-nkwa. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndu na-achi….

EKPERE NHUNYE

O Chukwu, were obioma gi nara onyinye nke nzuko gi, n’ihina obu site na-ebere gi k’anyi si nweta onyinye ndia anyi n’ebunye gi, biko were ike gi rugharia ya ka o wee bụrụ ihe-omimi nke nzọpụta anyi. Site na Kristi Dinwenu anyi.

UKWE ORIRI NSO

Nri ahu nkem ga-enye, bu ahu m maka ndu nke uwa, Ọ bụ Dinwenu n’ekwu.

EKPERE ANATACHA ORIRI

O Chukwu, mee ka oriri nsọ anyi natara wetara anyi nzọpụta, ma debe anyi ebeebe na ihe nke eziokwu gi. Site na Kristi Dinwenu anyi.

 

MONDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amuma Ezekiel (1:2-5.24-28)

Otu ahụ ka ebube nke Dinwenu na-adị.

N'ụbọchị nke ise n'ọnwa ahụ, (ọ bụ n'afọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoyakim jee mba ọzọ) okwu nke Dinwenụ bịakwụtere Izikel onye ụkọchukwu nwa Buzi, n'ala nke ndị Kaldia, n'akụkụ mmiri Keba; ebe ahụ ka Dinwenu kpọrọ ya. Ka m na-ele anya oke ifife si na mgbago ugwu bịa, ahụkwara m igwe ojii na ihe na-egbuke egbuke nke ukwu gbara m gburugburu, ọkụ si n'ime ya na-achawapụta, n'etiti ọkụ ahụ e nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amuke. N'etiti ya ahụrụ m ihe anọ e kere eke dị ndụ. Otu a ka ha dị; ha dịka mmadụ. Mgbe ha gagharịrị anụrụ m ụda nku ha dịka nke ebili mmiri, dịkwa ka ụda egbeigwe nke onye ji ike niile, dịkwa ka mkpọtu nke igweagha, mgbe ha kwụsịrị, ha chịturu nku ha. Ma a ka nwere mkpọtụ si n'igwe na-abịa n'elu isi ha, mgbe ha kwụsịrị ma-chịtuo nku ha. N'elu mbara igwe ahụ dị n'elu isi ha; e nwere ihe dịka ocheeze, nke dịka nkume a na-akpọ Safire. N'elu ihe a dịka ocheeze, e nwere ihe dịka mmadụ. Site n'ebe dịka ukwu ya gbagowe elu, ahụrụ m ihe dika ọlaọkụ na-egbuke egbuke dịka ọkụ e kpuchiri gburugburu; site n'ebe dịka ukwu ya gbadawa, ahụrụ m ihe dịka ọkụ nke na-egbuke egbuke n'akụkụ ya niile, Ihe ahụ na-egbuke egbuke nke gbara ya gburugburu dịka egwurugwu nke pụtara n'igwe ojii n'ụbọchị mmiri na-ezo. Otu ahụ ka ebube nke Dinwenu na-adị. Mgbe m hụrụ ya, akpọrọ m isi ala, anụrụ m olu na-ekwu okwu.

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 02. MONDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

TUESDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel (2:8-3:4)

O nyere m akwụkwọ ahụ ka m rie, ọ dị ụtọ ka mmanụ aṅụ.

Dinwenụ kwuru nkea “Ma gị, nwa nke mmadụ, nụrụ ihe m na-agwa gị; adịkwala ka ndị nnupisi a, meghee ọnụ rie ihe nke m ga-enye gị.” Mgbe m lere anya, ahụrụ m aka e setịpụtaara m, nke ji akwụkwọ a pịakọtara apịakọta n'ime ya. O wee saghee ya n'ihu m e dere ya ihe n'ihu na azụ. Ihe e dere n'ime ya bụ okwu na-eweta ịkwa akwa, iru uju na ịsụ ude. O wee sị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe nke enyere gị, rie akwụkwọ nke a apịakọtara apịakọta, ma gaa gwa ụlọ Izrel okwu.” Ya mere, m meghee ọnụ m, O nye m akwụkwọ ahụ ka m rie. Ọ sị m, “Nwa nke mmadụ, rie akwụkwọ nke a m na-enye gị ka I rijuo afọ gị.” Mgbe m riri ya, o dị m ụtọ dịka mmanụ aṅụ. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gaa n'ụlọ Izrel gwa ha okwu nke m.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 03. TUESDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

WEDNESDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'Akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel (9:1-7;10:18-22)

“Gaa gburugburu obodo Jerusalem niile ma kaa akara n'ihu ndị niile na-eru ụjụ ma na-ebekwa akwa maka ihe ọjọọ nke na-eme na Jerusalem.”

Mgbe ahụ Dinwenu tiri nnukwu mkpu ka m wee nụrụ sị, “bịanụ ndị na-ebibi obodo, onye ọbụla burukwa ngwa mbibi ya n'aka.” Ozigbo, ụmụnwoke isii sitere n'ọnụụzọ nke dị n'ebe mgbago na-abịa, nke ọbụla bụ ngwaagha n'aka ya. N'ime ha bụ otu nwoke yi uwe na-achake achake ma nyarakwa ihe edemede nke ndị oke akwụkwọ n'ukwu ya. Ha wee bata n'ime ụlọnsọ ma kwụrụ n'ihu ebe nchụaja nke e jiri ọlaọkụ mee, Otito nke Chineke nke Izrel ewee site n'elu cherubim ebe ọ nọọrọ bilie nke chere ihu n'ọnụụzọ nke ụlọnsọ nke Chineke. Ọ kpọọ nwoke ahụ yi uwe ọcha ma yirikwa ihe edemede n'ukwu, sị ya, “Gaa gburugburu obodo Jerusalem niile ma kaa akara n'ihu ndị niile na-eru ụjụ ma na-ebekwa akwa maka ihe ọjọọ nke na-eme na ya.” Anụkwara m ka Ọ gwara ndịọzọ sị, “Soronụ ya gaa obodo niile ma gbuchapụnụ ha, unu egosikwala ha obi ebere ọbụla. Unu enwekwala obi ebere ọbụla n'ebe ndị okenye ndị nwoke, ụmụokorobịa, ndị agadị nwaanyị, ụmụagbọghọ na ụmụaka nọ. Gbuchapụnụ ma kpochapụkwanụ ha niile. Ma unu emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ n'ihu ya aka. Bidonụ n'ebe kacha nsọ nke m.” Nke a mere ha jiri bodo site na ndị okenye, ndị nke nọ n'ụlọnsọ nke Dinwenu. Ya asị ha, “Merụọnụ ụlọnsọ nke Dinwenu, werenụ ozu mechie ebe obibi niile, bidonụ ọrụ ozigbo.” Ha apụọ bido na-egbu ndị mmadụ, na-emebikwa ihe niile nọ n'obodo ahụ. Mgbe ahụ, ebube nke Dinwenu pụrụ n'ọnụụzọ nke ụlọnsọ ahụ, ma guzoro n'elu Cherub ndị ahụ. Ndị Cherub ahụ gbasara nku ha wee felie ka m na-ele ha anya. Ha bukwa ụkwụ igwe ndị ahụ, guzoro n'ọnụụzọ nke nọ n'ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ nke Dinwenu. Ebube nke Chineke nke Izrel nọ n'elu ha. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ n'okpuru Chineke nke Izrel n'akụkụ mmiri Keba. Ama m na ha bụ ndị Cherub. Nke ọbụla nwere ihu anọ na nku anọ, ma n'okpuru nku ha ka m hụrụ ihe dịka aka mmadụ. Banyere ihe ha yiri, ha dịka ihu ndị m hụrụ n'akụkụ mmiri Keba. Ha niile na-aga n'ihu n'ihu.

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 04. WEDNESDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

THURSDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ ewetara n'akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel (12:1-12)

Gbaa ọsọ agha n'ehilie na'ihu ha.

Okwu nke Dinwenụ bịakwutere m sị: “Nwa nke mmadụ, I bi n'etiti ndị nnupụisi, ndị nwere anya ma ha anaghị ahụ ụzọ, nweekwa ntị ma ha anaghị anụ ihe, n'ihina ha bụ ụlọ ndị nnupụisi. Ya bụ nwa nke mmadụ, kwado ibu gị dịka onye na-agba ọsọ agha ma gbapụ n'obodo a n'ehihie n'ihu ha; ị ga-aga dịka onye a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ, site n'obodo gị gaa obodo ọzọ n'ihu ha. Eleghị anya ha ga-aghọta, n'agbanyeghị na ha bụ ndị nnupụisi. Ị ga-ebupụta ibu gị n'ehihie n'ihu ha dịka ibu onye na-agba ọsọ agha. Ị gakwa azọpụ njem na mgbede n'ihu ha dịka ụmụnwoke ndị na-agba ọsọ agha na-eme. Gwupuo mgbidi aja n'ihu ha ma si ebe ahụ pịopụ. N'ihu ha, ị ga-amaburu ibu gị n'ubu ma buru ya pụọ n'ọchịchịrị. Ị ga-ekpuchi ihu gị, ka ị ghara ịhụ ala ahụ, n'ihina emeela m ka ị bụrụ ihe ịrịbaama n'ebe ụmụ Izrel nọ. Emere m dịka e siri gwa m. Ebupụtara m ibu m n'ehihie dịka ibu onye na-agba ọsọ agha, na mgbede ya. Ejiri m aka m gwuwaa mgbidi aja ma zọpụ ije n'ọchịchịrị burukwa ibu m n'ubu m n'ihu ha. N'ụtụtụ, okwu nke Dinwenu bịakwutere m sị: “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụmụ lzrel ndị nnupụisi ahụ ajụbeghị gị sị, 'Olee ihe ị na-eme?' Gwa ha sị, 'Lee, ọ bụ Dinwenu na-ekwu okwu nke a gbasara onye ochịchị nke Jerusalem nakwa ụmụ Izrel niile ndị bi n'ime ya.' Kwuo sị, 'Abụ m ihe ịrịbaama nye unu; dịka m siri mee, otu a ka a ga-eme ụnụ niile; unu ga-agba ọsọ agha, bụrụkwa ndị a dọtara n'agha.' Mgbe ahụ onye ọchịchị nke nọ n'etiti ha ga-amaburu ibu ya n'ubu n'ọchịchịrị ma zọpụ ije; ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo ma sị ebe ahụ piopụ, ọ ga-ekpuchi ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 05. THURSDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

FRIDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel (16:1-15.60.63)

Mma Gị dị egwu site n'onyinye dị iche iche mụ nyere gị, mana imere onwe Gị akwụna.

Okwu nke Dinwenu bịakwutere m sị; “Nwa nke mmadụ, mee ka Jerusalem mata arụ ya niile, ma kwuo sị: 'Nke a ka Dinwenụ gwara Jerusalem; isi mmalite gị na omume gị sitere n'ala ndị Kenaan, nna gị bụ onye Amọraịt, ebe nne gị bụ onye Hitaịt. Banyere ọmụmụ gị, n'ụbọchị a mụrụ gị e gbubighị eriri afọ gị, a sachakwaghị gị ka ị dị ọcha, mọbụ tee gị nnu mọbụ wanye gị akwa nwa. O nweghị anya ọbụla ji ọmịiko lekwasa gị, iji meere gị ihe ndị a n'obi ebere, kama a tụfuru gị na mbara ezi n'ihina a kpọrọ gị asị n'ụbọchị ahụ a mụrụ Gị. Ma mgbe m gafere n'ebe ị nọ, hụ gị ka ị na-atụgharị n'ime ọbara gị, asịrị m gị, dị ndụ, ma tokwaa dịka osisi n'ime ọhịa. I wee tolite, dị ogologo, ma tozuo agbọghọ; ara gị wee pụta, ntutu gị etojuo; mana ị ka gba ọtọ n'eyighị ihe ọbụla. Mgbe m gafere ọzọ n'ebe ị nọ ma lekwaa gị anya, m hụrụ na I toruola ogo maka ịhụnaanya, ekpugidere m gị akwa m n'ahụ iji kpuchie ịgba ọtọ gị. Aṅụọrọ m gị iyi, mụ na gị agbaa ndụ, I wee ghọọ nke m, Ọ bụ Dinwenu na-ekwu. Ejiri m mmiri saa gị ahụ, sachapụ gị ọbara ma teekwa gị mmanụ. Eyibere m gị uwe a kpara nke ọma, yibe gị akpụkpọ ukwu; ma kekwaa gị akwa isi, were uwe ụlarị kpụchie gị. Ejiri m ngwa ọla dị icheiche chọọ gị mma, gbanye gị ọla n'aka abụọ, bịa nyawakwa gị ihe olu. Agbanyere m gị ọla imi na ọla ntị, ma kpuwekwa gị okpu eze mara mma n'isi. Otu a ka m siri were ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma, uwe gị bụkwa ụlarị mara mma na uwe ọcha na akwa a kpara nke ọma. Nrị gị bụ ntụọka mara mma mmanụaṅụ na mmanụ dị oke ọnụ. Ị bịa maa mma nke ukwu ruo ogo eze nwaanyị. Aha gị gazuru mba niile n'ihi mma gị nke zuru oke site n'onyinye niile m nyere gị, Ọ bụ Dinwenụ na-ekwu. Ma ị tụkwasara obi na mma gị wee mee onwe gị onye akwụna n'ihi oke aha gị, ma werekwa onwe gị nye onye ọbụla bịakwutere gị. ma aga m echetakwa ọgbụgbandụ mụ na gị mgbe ị dị na nwata, aga m edotakwa n'etiti mụ na gị ọgbụgbandụ ga-adị ebighịebi, ka ị wee cheta ma nwee mgbagwojuanya, ma gharakwa imeghe ọnụ gị ọzọ n'ihi ihere gị, oge m ga-agbaghara gị n'ihe niile ị mere, Ọ bụ Dinwenu na-ekwu.”

Okwu nke Osebụrụwa

Read more: : 06. FRIRDAY DAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

SATURDAY OF THE NINETEENTH WEEK IN  ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe Ọgụgụ Ewetara N'akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel (18:1-10.13.30-32)

“Aga m ekpe onye ọbụla ikpe dika ụzọ ya siri dị”.

Okwu nke Dinwenụ wee bịakwue m ọzọ sị, “Gịnị kpatara I ji na-atụ ilu a ugboro ugboro n'ala Izrel sị, ndị nna ataala mkpuru osisi na-achaghị acha, mọbụ ụmụ ha ka eze na-ejiji?” Ka m na-adị ndụ, Ọ bụ Dinwenụ Chineke na-ekwu, agaghị atụkwa ilu a ọzọ n'ala Izrel. Lee mkpụrụ obi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, mkpụrụ obi ọbụla mehierenụ ga-anwụ. Onye ọbụla bụ onye eziomume, na-emekwa ihe ziri ezi na ihe dị mma. Ọ bụrụkwa na ọ anaghị eri ihe n'elu ugwu mọbụ welite anya ya n'ebe arụsị niile nke Izrel dị; ọ merughị nwunye onye agbataobi ya mọbụ gakwuru nwaanyị mgbe ọ nọ n'oge ya; ọ naghị emegbu onye ọbụla, kama ọ na-enyeghachị onye ọ ji ụgwọ ihe ya, ọ naghị apụnarị mmadụ ihe ya n'ike, ma ọ na-enye onye agụụ na-agụ nri ya, na-eyiwekwa onye gba ọtọ akwa, ọ naghị agbazinye ego n'ọmụrụ nwa, mọbụ nara ụma, ọ na-ewepụ aka ya na mpụ, ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n'etiti mmadụ na ibe ya, ọ na-aga ije n'ụkpụrụ m niile, ma kpachapụ anya n'idebe ihe niile m nyere n'iwu, onye dị otu a bụ onye eziomume, ọ ghaghị ịdị ndụ, Ọ bụ Dinwenụ Chineke na ekwu. Ma ọ bụrụ na ọ mụtara nwa nke bụ onye ohi, onye na-akwafụ ọbara, ọ na-agbazinye ego n'ọmụrụ nwa, na-anarakwa ụma; onye dị otu a ọ ga-adi ndụ? O meela ihe arụ niile ndị a; ọ ga-anwụrịrị, ọbara ya ga-adịkwa ya n'isi. Ya mere, aga m ekpe ụnụ ikpe, ụlọ Izrel, onye ọbụla dịka ụzọ ya sị dị. Ọ bụ Dinwenụ Chineke na-ekwu. Chegharịanụ ma sinụ na mmehie ụnụ pụta, ka ajọọmume ghara ịbụ ihe mbibi ụnụ. Tụfuonụ mmehie unu niile nke ụnụ mere megide m; nwetaranụ onwe ụnụ obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Gịnị kpatara ụnụ ji chọọ ịnwụ, ụlọ Izrel? N'ihina enweghị m mmasị n'ọnwụ onye ọbụla, Ọ bụ Dinwenụ Chineke na-ekwu; ya bụ tụgharịanụ ka ụnụ dị ndụ.”

Okwu nke Osebụrụwa.

Read more: : 07. SATURDAY DAY OF THE NINETEENTH WEEK IN ORDINARY TIME, YEAR B (IGBO)