NKE ADVENT, I

Na Missa “oge Advent”, bido na Sunday izizi nke Advent ruo na December

_________________________

O kwesịrị ezịe, bụrụ kwa ihe ziri ezi, na-azọ ndụ,

Na anyị ga-enye Gị ekele, oge nile, n’ebe nile,

O Nna dị nsọ, Chineke ji ike nile, Onye dị ụwatụwa,

site na Kristi, Dinwenu anyị.

 

Onye jiri ume ala bịan’uwa n’ụdị mmadụ,

bịa mejuo nkwa ᴉ kwere mgbe ochie,

wee megheere anyị ụzọ nzọpụta ebebe.

N’oge dị ugbu a, anyị nọ na-eche nche,

na-atụ anya mgbe Ya bụ Kristi ga-abịa ọzọ

n’ebube Ya,

bịa wetara anyị mgbapụta nụ ᴉ kwere anyị na nkwa.

 

Nsọ, Nsọ, Nsọ,

Osebrụwa Chineke nke igwe ndịagha,

ebube Gị jupụtara eligwe na ala.

Họzana n’elu kacha elu.

Ọ dị ngọzi bụ onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Họzana n’elu kacha elu.