NKE CHRISTMAS, III

Mwekorita onodu n’etiti chukwu na mmadu n’iwere ahu nke okwu Chukwu

___________________________________________________________

O kwesiri ezie bụrụkwa ihe ziri ezi, na-azọ ndụ,

Na anyi ga-enye Gi ekene, oge nile,

n’ebe nile, O Nna di nsọ,

Chineke ji ike nile, Onye di ụwatụwa,

site na Kristi, Diwenụ anyị.

 

N’ihi na ihe ọhụruụ achakwasala ụwa taa,

mgbe Okwu Gị were ụdị nke anyị na-adịhị ike,

ọ bụghị naanị na mmadụ enwetala ebube dị ebeebe,

mana mmadụ na chukwu abụrụkwala otu ọzọ n’ime kiristi.

 

Anyi ji aṅụrị

na-eso igwe ndi mmụọọma niile nke Eligwe,

na-eto ebube gị oge niile na ukwe, na-asi.

 

Nsọ, Nsọ, Nsọ,

Osebrụwa Chineke nke igwe ndịagha,

ebube Gị jupụtara eligwe na ala.

Họzana n’elu kacha elu.

Ọ dị ngọzi bụ onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Họzana n’elu kacha elu.