UKWE  MBATA (Ps 25:1-3)

N’ebe I nọ kam welitere mkpụrụobi m, O Chukwu, n’ebe I nọ kam tinyere nchekwube. Ekwela ka ndi iro m jiri m mere ihe ọchị, n’ihi na ndi ji nchekwube atụ anya n’aka Gi ka uche Gi mee, agaghi enwe ihere. 

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ ime ihe niile, biko, bawanye n’ime anyị, mmụọ nke ịrụ ezi-ọrụ; ka anyị wee tosi etosi izuta Kristi Nwa Gi n’ọbịbịa ya, wee tosikwa ịbụ ndi ọ ga-edobe nso n’akụkụ ya n’alaeze eluigwe. Site na Dinwenụ… 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (Aịzaya 63:16-17;64:1.3-8)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye amụma Aịzaya 

O! Ọ ga-adị mma ma a sị na ị mepere eluigwe gbadata. 

Gị O Dinwenụ, bụ nna anyị, aha Gị site na mgbe ochie bụ onye Nzọpụta anyị. Dinwenụ, olee ihe ị jiri hapụ anyị ka anyị jehie, hapu ụzọ Gị, kpọchịkwa obi anyị nke mere na anyị adịghị atụkwa gị egwu. Lọghachi azụ maka ihi ụmụodibo gị; agbụrụ nke ị nwetara onwe gị. O! Ọ ga-adị mma ma asị na ị mepere eluigwe gbadata ka ugwu niile maa jijiji ma gbazie n’ihụ Gị. Site na mgbe ochie, onwebeghị onye nụrụnụ, nke ọ na-abata na ntị, mọbụ hụ chi karịrị Gị nke na-arụrụ ndị ya ka ị si arụrụ ndị tụkwasara nchekwube ha na Gị ọrụ. Ị na-ejekwuru onye ahụ ji obi aṅụrị na-arụ ọrụ ziri ezi, ndị na-echeta gị n’ụzọ gị niile. Lee, ị wesaara anyị iwe mgbe anyị mere njọ. Anyị anọọla n’ime njọ ogologo oge, a ga-azọpụtakwa anyị? Anyị niile dịka ka akwa e tere unyi. Anyị niile atụnwụọla dịka akwụkwọ kpọrọ akpọ. Omume ọjọọ anyị, dịka ikuku, ebufuola anyị. O nweghị onye ọbụla na-akpọku aha gị mọbụ gbaa mbọ iji nweta Gị, n’ihina izopụla ihu Gị n’ebe anyị nọ, hapụ anyị ka anyị nwụfuo na njọ anyị. Ma na-agbanyeghi, O Dinwenụ, Gị bụ nna anyị. Anyị bụ ụrọ, Gịnwa bụ Onye ọkpụite, anyị niile bụ ọrụ aka Gị. 

Okwu nke Oseburụwa 

ABỤỌMA NA AZIZA (Abu.80:2-3.15-16.18-19.Az.4)

Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasa anyị; ka anyị wee nweta nzọpụta. 

  1. Gee ntị, o onye nche nke Izrel, chawapụta site na oche eze Gị. O Dinwenụ, kulite ike Gị, bịa ka Ị inyere anyị aka (A)
  2. Chineke nke igwe ndịagha tụgharịa ọzọ, anyị na arịọ Gị, si n’eligwe ledata anya ka ịhụ. Bịa leeta ugbo vaịn Gị ma chekwaba ya, ugbo vaịn nke iji aka nri wee kụọ. (A)
  3. Ka aka Gị chekwaba nwoke ahụ ị họọrọ, onye ahụ ị nyere ike. Mgbe ahụ anyị agaghị agbakụta gị azụ ọzọ; nye anyị ndụ ka anyị were na-akpọku aha Gị.(A)                                                       

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ (1Ndị Kọrint 1:3-9)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ ozi mbu Paul dị asọ degara ndị Kọrint. 

Anyị nọ na-eche mgbe aga-egosipụta Onyenweanyị Jesu Kristi.

­­­­­

Ka Chukwu nna na Dinwenụ Jesu Kristi zitere unu amara na udo. Ana m ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, n’ihi amara nke O nyere unu n’ime Jesu Kristi. Ana m ekelekwa ya, n’ụzọ ọbụla unu jupụtara n’amara ya, ma n’okwu unu ma na nghọta unu. N’ihina ịgba akaebe banyere Kristi pụtara ìhè, kwụdosikwa ike na ndụ unu. Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụnụ nke unu enweghi; ka unu nọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenweanyị Jesu Kristi. Chineke n’onwe ya ga-eme ka unu kwudosie ike ghara inwe ntụpọ ọbụla ruo n’ụbọchi nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Chineke kwesịrị ntụkwasịobi, onye e si n’aka ya kpọbata unu na mmekọ nke nwa ya Jesu Kristi Dinwenụ anyị.    

Okwu nke Osebrụwa. 

MBEKU (Abụọma 85:7)

Aleluya, aleluya!

Mee ka anyị hụ ebere Gị, O Dinwenụ ma nyekwa anyị enyemaka nke nzọpụta Gị. 

Aleluya!

 OZIỌMA (Mak 13:33-37)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

 Nọdụnụ na nche n’ịhịna unu amaghị mgbe onye nwe ụlọ ga-alọghachite.

 Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya si, “Lezienu anya, na-echenu nche, n’ịhịna unu amaghị mgbe ọ gage a bụ. Ọ dịka otu nwoke na-aga njem onye nyefere ụmụodibo ya ụlọ ya n’aka mgbe ọ na-apụ; O nyere onye ọbụla ọrụ nke ya, nyekwa onye na-eche ọnụụzọ iwu ka ọ nọdụ na nche. N’ihi nke a nọdụnụ na nche n’ihina unu amaghị mgbe onye nwe ụlọ ga-alọghachite, ma ọ ga-abụ n’uhuruchi, etiti anyasị, oge okeọkpa na-akwa ma ọ bụkwanụ n’ụtụtụ. Nọdụnụ na nche ka ọ ghara ikwudo unu na mberede hụ unu ebe unu na-arahụ ụra. Ihe m gwara unu ka m na-agwa onye ọbụla: Chebenụ nche”.                    

Oziọma nke Osebrụwa.

 EKPERE NHUNYE

Nara, anyị na-arịọ gi, O Osebrụwa, onyinye ndia anyị si n’ihe ndi I nyere anyị we na-enyekwuazi gi, Biko, mee ka anyị site n’ofufe gi n’uwaa nweta ụgwọ nke nzọpụta gi di ebeebe. Site na Kristi..

UKWE ORIRI NSO (Ps 85:13)

Osebrụwa ga-eneye anyị ngọzị ya, ka ala anyị wee mịta ezi mkpụrụ.

EKPERE ANATACHAA ORIRI

Mee, anyị na-arịọ Gi, O Osebrụwa, ka ihe omimi nkea anyị na-anata ugbolo ugbolo baara anyị uru, k’anyị bụ ndi bi n’ime ihe ndi na-agafe agafe; na-ahụ ihe nke eluigwe anya wee na-atụkwasị obi anyị na akụ na ụba nke ga-adị ebeebe. Site na Kristi Dinwenụ anyị

UKWE  MBATA (Is 30:19.30)

Ndi obodo Zayọn, leenu anya, Osebrụwa Chukwu ga-abịa ka O zọpụta mba niile; Osebrụwa   ga-enye obi unu aṅụrị; ọ ga-eme ka anụ banyere ike na ebube ya.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu pụrụ m ime ihe niile, Nna nwere obi ebere, mee ka ihe nke ụwaa ghara idachịrị anyị bụ ndi na-agbata ọsọ ịzute nwa Gi n’ụzọ, kama ka mmụta na amamihe nke eluigwe mee k’anyị tosi isonye na ndi aga-agunye na ndi otu ya oge ọ ga-abịa. site na Dinwenụ .. 

IHE GG NKE MB (Azaya 40:1-5.9-11)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye amụma Aịzaya

Dozienu z Osebrwa 

Osebrụwa   kwuru si: kasie ndị nke m obi, kasienu ha obi. Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya na ụbọchi ịgba ohu ya agwụla, na a gbagharala mmehie ya niile, na Chineke ga-enye mgbaghara ga-adị mmaji abụọ karịa mmehie niile o mere. Otu olu na-eti mkpu na-asị, “Dozierenu Dinwenụ  ụzọ ya, mekwanụ ka ụzọ niile dị n’ime ọzara di larịị maka Chineke anyị. Kpojuonu ndagwurugwu niile, kposakwaanu ugwu niile, menu ka ebe niile gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ, meekwanu ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. Mgbe ahụ ebube nke Chineke ga-achawapụta, mmadụ niile ga-ahụ ya n’ihina Osebrụwa   ekwuola ya.” Rịgoro n’elu ugwu, gị bụ onye ozi nke Zayọn, welie olu gị elu tisie mkpu ike, O onye ozi nke Jerusalem, tisie mkpu ike atụla egwu, gwa obodo niile nke Juda sị: “Leenu Chineke unu!” Lee, Osebrụwa   Chineke anyị ji ike abịa, ọ ga-eji aka ya na-achị. Ọ ga-enye onye ọbụla ihe ruru ya. Dika onye ncheatụrụ, Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya nri. Ọ ga-eji aka ya na-edu ụmụatụrụ ya. Ọ ga-ebu ha n’ubu ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.”         

Okwu nke Osebrụwa

 ABỤỌMA NA AZIZA (Ps 85:9-14.Az 8)

Azza: Dinwen gosi any ebere G, nyekwa any nzpta G. 

  1. Aga m anụ ihe Dinwenụ Chineke ga-ekwu: olu na-ekwu maka udo; udo maka ndị nke Ya. Enyemaka Ya n’anọdebe ndị na-atụ Ya egwu ka ebube ya wee nọgịde n’ala anyị.   (A)
  2. Ebere na ikwudosike amakụọla, ikpe nkwumọtọ na udo ebiela ọma. Ikwudosike ga-esi n’ala epunite, ikpe nkwụmọtọ esi n’eluigwe na-eledata anya. (A) 
  1. Dinwenụ ga-enye anyị ọganihu, ala anyị ga-amịta mkpụrụ ya. Eziomume ga-aga n’ihu Ya, udo ga na-eso nzọụkwụ Ya. (A) 

IHE GG NKE ABỤỌ (2 Pita 3:8-14)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Akwụkwọ ozi nke Abụọ Pita dị asọ dere

 Any na-eche enuigwe h na wa h.

 Ndị m hụrụ n’anya, unu echefukwala ọkpụrụkpụ okwu nke a; na, n’anya Onyenweanyị, otu ụbọchi dị ka puku afọ; puku afọ dịkwa ka otu ụbọchi. Chineke adịghịkwa atụfu oge n’imezu nkwa niile o kwere, etu ndị ụfọdụ si eche. Ma o nwere ndịdị n’ebe unu nọ. Maka na ọ chọghị ka onye ọbụla laa n’iyi, kama ihe ọ chọrọ bụ ka mmadụ niile chegharịa. Mana ụbọchi nke Onyenweanyị ga-abịa na mberede, dịka onye ohi. N’ụbọchi ahụ, urukpu nke igwe ga-eme oke ụzụ, gabiga. Ihe niile dị n’igwe ga-agbaze n’ọkụ. A ga-ejikwa ọkụ rechapụ ụwa na ihe niile dị n’ime ya. Ebe unu matara na ihe ndị a niile ga-esi otu a laa n’iyi, olee ụdị ndụ unu ga na-ebi? O kwesiri ka unu na-ebi ndụ nke ịdị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke. Na-emenu otu a, ka unu nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị nke Chukwu. Chọsikwaanụ ya ike ka ọ bịa ngwangwa, bụ ụbọchi ahụ Chineke ga-amụnye eluigwe niile ọkụ ka ha repịa. Mana anyị na-atụ anya ihe Chineke kwere na nkwa, bụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe eziomume ga-adịgide. Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu nọ na-ele anya ụbọchi ahụ, gbaanu mbọ dobe onwe unu ọcha, ka unu ghara inwe ntụpọ ọbụla n’ihu Chineke, ka unu dịkwa n’udo mgbe ọ ga-abịa.        

Okwu nke Osebrụwa.

 MBEKU (Luk 3:4.6)

Aleluya, aleluya!

Dozienụ ụzọ maka Onyenweanyị, Meenụ ka ụzọ ya kwụru  ọtọ, mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta nke Chineke.                                                 

Aleluya!

 OZIMA (Mak 1: 1-8)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

 Meenu z ya ka kwr t

 Mbido oziọma Jesu Kristi, Nwa nke Chineke. Dika edere n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya, ‘Lee, ana m ezipụ onye ozi m onye ga-edozi ụzọ gị ka ọ gaa n’ihu gị; Otu olu na-eti mkpu n’ime ọzara; Mezienụ ụzọ nke Dinwenụ, Meenụ ka okporo ụzọ ya dị larịị’. Jọn onye na-eme mmirichukwu pụtara n’ọzara, na-ekwusa mmirichukwu nke nchegharị maka mgbaghara nke njọ. Ndị bi n’obodo Jerusalem na Judia pụtara ka ha nụ olu ya; o mekwara ha mmirichukwu n’osimiri Jordan mgbe ha kwupụtara mmehie ha. Jọn yi ajị ịnyịnyaibu n’ahụ, ma kekwaa akpụkpọ okike n’ukwu ya. Ihe oriri ya bụ igurube na mmanụ ańụ. O kwusara sị, ‘Onye ka m ike na-abịa n’azụ m, onye m na-etosighị ihulata ala tọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Eji m mmiri mee ụnụ mmirichukwu; ma ọ ga-eji Mụọ Nsọ mee unu mmirichukwu.

Oziọma nke Osebrụwa.

 EKPERE NHUNYE

Were ebere lekwasi anya, anyị na-arịo gi, Osebrụwa, n’onyinye na ekpere anyị ji umeala enye gi; ebe ọbụ na onweghi ihe ọbụla anyị nwere ike ime na onwe anyị, bịa ka I bụrụ onye nzọpụta anyị na enyemaka anyị. Site….

 UKWE ORIRI NSO (Ps 85:13)

Jerusalem, kunie, kwuru n’ebe di ezigbo elu; ka I hụ aṅụrị si na aka Chukwu wee na abiakwute gi.

EKPERE ANATACHAA ORIRI

Anyị bụ ndi natara oriri nke mmụọ nkea, na arịọ Gi, O Osebrụwa  , ka I mee k’anyị site na iketa oke na ihe-omimi nkea, wee na-ahụ ihe nke eluigwe n’anya. Site na……

 

 

UKWE MBATA

Ṅụriwa n’Osebrụwa oge niile. Ka m gwa unu ọzọ, ṅụrịbanụ!Osebrụwa nọzị unu nso.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu, lee ka ndi nke gi si were okwukwe na-atụ anya maka oriri ọmụmụ nke nwa gi. Nyere anyị aka ka anyị nweta aṅụrị zuru oke nke nzọpụta ọ na-ewetara anyị. Biko, mee ka anyị were aṅụrị na obi na-anụ ọkụ wee na-eme ya bụ emume oge niile. Site na---

IHE GG NKE MB (Azaya 61:1-2.10-11)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye amụma Aịzaya 

Ana m enwe nnukwu ń nime Dinwen. 

Mmụọ nke Chineke adakwasala m, n’ihina Dinwenụ eteela m ude, o zigala m ka m wetara ndị ogbenye oziọma, ka m kasie ndị obi na-agbawa obi ka m mee ka ndị e ji eji nwere onwe ha, ka m megheere ndị nọ na mkpọrọ ụzọ. Ka m kwupụta afọọma nke Chineke. Aga m enwe nnukwu ọńụ n’ime Dinwenụ, mkpụrụ obi m ga-ańụrị na Chineke m, n’ihina o yiwela m uwe nke nzọpụta, were uwe eziomume kpuchie m ahụ, dịka otu  nwaagbọghọ a na-alụ alụ siri ejiri ọla e ji achọ mma ejikwa onwe ya. Dịka otu ala siri epupụta ahịhịa, dịkwa ka otu  alaubi si eme ihe a kọrọ na ya ka o pupụta, otu  ahụ ka Dinwenụ Chineke ga-esi eme ka ikpe nkwụmọtọ na otito pụta ihe n’ihu mba niile.      

Okwu nke Osebrụwa 

ABỤỌMA NA AZIZA (Lk 1:46-50, 53-54. Az. Azaya 61.10)

Azza: Mkpr obi m na-ańr na Chineke m. 

  1. Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ, mmụọ m na-ańụrị na Chineke onye nzọpụta m. O leela anya n’adịghị ike nke odibo nwanyị ya. Site taa gawa, ndụdụgandụ niile ga-akpọ m onye dị ngọzi. (A)
  2. Onye ji ike niile emerela m nnukwu ihe ịtụnaya, aha Ya dị asọ. Ebere Ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ Ya egwu. (A)
  3. O jịla ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ, bịakwa chụpụ ndị ọgaranya n’enyeghị ha ihe ọ bụla. O chekwara Izrel nwodibo ya na ncheta ebere Ya. (A)

IHE GG NKE ABỤỌ (1Nd Tesalonka 5:16-24)

 Ihe gg e wetara n Akwkw ozi Mb Paul d as degara nd Tesalonika.

Ka o dobekwa mmụọ, ah na mkprobi unu nke ma; maka bba nke Dinwen any Jesu Kristi

 Na-ańụrịnụ ọńụ mgbe niile. Na-ekpekwanu ekpere oge niile. N’ọnọdụ ọbụla, na-enyenu Dinwenụ ekele n’ihina nke a bụ uche Chineke maka unu n’ime Jesu Kristi. Unu egbochila ọrụ nke Mmụọ Nsọ. Unu elelịkwala ibu amụma. Kama tulenu ihe ọbụla nke ọma tupu na unu emebe ya, jidesienu ezi ihe ike.  Wepụnu aka n’ihe ọjọọ n’ụdị ọbụla. Ka Chineke nke udo n’onwe ya doo unu nsọ n’ụzọ niile; ka o dobekwa mmụọ, ahụ na mkpụrụobi unu nke ọma; n’enweghị ntụpọ ọbụla ruo mgbe Dinwenụ anyị Jesu Kristi ga-abịa. Chineke bụ onye kpọrọ unu kwesịrị ntụkwasịobi, ọ ga-emezukwa ya.       

Okwu nke Osebrụwa. 

MBEKU (Is 61:1 (Luk 4:18)

Aleluya, aleluya!

E nyela m mmụọ nke Dinwenụ, O zigala m ka m bugara ndị ogbenye oziọma. Aleluya!

 OZIMA (John 1:6-8.19-28)

Ihe gg nke a si nOzima d as nke Jọn dere.

O nwere otu onye n n etiti unu, onye unu na-amagh. na-esochi m naz. 

Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgba ama, ịgbara ìhè ahụ akaebe, ka mmadụ niile site n’ ìhè ahụ kwere. Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ịgbara ìhè ahụ akaebe. Nke a bụ akaebe nke Jọn gbara: Mgbe ndị Juu siri na Jerusalem zigaara ya ndị nchụaja na ndị Levaị, ka ha jụọ ya sị, “Onye ka ị bụ?” Jọn kwuru eziokwu, Ọ gọghị agọ, kama o kwupụtara sị; “Abụghị m Kristi ahụ.” Ha jụrụ ya sị, “Onyezi ka ị bụ? Ị bụ Elaija?” Jọn zara sị, “Abụghị m ya. “Ha jụkwara ya sị; “Ị bụ onye amụma ahụ?”  Ọ zara sị, “Mba.” Ha sịrị ya, “Onye ka ị bụ? Gwa anyị ka anyị nwee ihe anyị ga-agwa ndị zitere anyị. Gịnị ka ị nwere ikwu banyere onwe gị?” Ọ sịrị, “Abụ m olu nke ahụ na-eti mkpu n’ime ọzara sị, ‘Meenu ụzọ nke Osebrụwa ka ọ kwuru ọtọ,’ dị ka onye amụma Aịzaya siri kwuo.” Mgbe ahụ, ndi ahụ bụ ndị ndị Farisii zitere, jụrụ ya sị, “Gịnị mere ị ji eme ndị mmadụ mmirichukwu ma ọ bụrụ na ị bụghị Kristi ahụ mọbụ Elaijia, ị bụghịkwa onye amụma ahụ?” Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri eme mmirichukwu ma otu onye nọ n’etiti unu, onye unu na-amaghị. Ọ na-esochi m n’azụ, onye mụ na-etoroghị itọpụ ọbụladị eriri akpụkpọ-ụkwụ ya.” Ihe a mere na Betani n’ofe osimiri Jọdan, ebe Jọn nọ na-eme mmirichukwu.               

Oziọma nke Osebrụwa. 

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, Ka aja nke ofufe anyị bụrụ ihe a ga-achụnyere gi mgbe ọbụla iji weta na mmezu ọrụ nke ihe omimi nke ebidogoro n’ime anyị; wee si otu ahụ ruzuo ọrụ nke nzọpụta anyị. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

UKWE ORIRI DI AS

Gwa ndi ume ha dara mba si: jisienu obi ike, unu atụla egwu, Chukwu anyị na-abịa, Ọ ga-azọpụta anyị.

EKEPERE ANATACHAA ORIRI

Anyị na-arịọ gi, O Osebrụwa, ka I nara ekpere anyị site na ebere Gi. Biko, mee ka nri nke anyị natara wụchapụ mmehie anyị niile, k’anyị wee bụrụ ndi kwesiri iso wee rie oriri nke na-abịanụ.

UKWE MBATA (Is 45:8)

Ka eluigwe gbasa igirigi n’ala; ka urukpu zidata onye-ikpe-nkwumọtọ; ka ala meghee wee mịpụta onye-nzọpụta.

EKPERE MMEGHE

Anyi na-arịọ gi, O Chukwu, ka irunye grasịa gi n’ime obi anyi,  anyị bụ angel butere ozi, wee mara iwere ahụ nke Kristi nwa gi,  site n’afụfụ ya na obe ya wee bata n’otito nke mbilite n’ọnw ya. Site na Kristi onye new anyị 

IHE GG NKE MB (2Sam 7:1-5.8-12.14.16)

Ihe gg e wetara nAkwkw Abụọ nke Samuel. 

Dinwen ga-echekwaba alaeze nke Devid mee ka oguzosie ike ebebe. 

Mgbe Dinwenụ nyere Devid ezumike n’ebe ndịiro gbara ya gburugburu nọ, Devid wee biri n’ụlọ ya. Devid sịrị onye amụma Natan, “Lee, ugbu a ebi m n’ụlọ osisi sida, ma Igbe Ọgbụgbandụ Chineke dọrọ n’ime ụlọikwu.” Natan zara ya sị: “Gaa mee ihe ọbụla dị gị n’uche n’ihina Osebrụwa nọnyeere gị.” Ma n’abali ụbọchi ahụ, Dinwenụ ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m, bụ Devid, na m sị ya, ‘Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga-ebi? Ya mere, jee gwa odibo m bụ Devid na mụ, bụ Chineke nke igwe ndịagha, sị ya, ‘Esiri m ebe ị na-azụ atụrụ n’ọhịa kpọpụta gị, mekwaa ka ị bụrụ onyendu ndị nke m bụ Izrel. Anọnyekwaara m gị ebe ọbụla ị jere merikwaa ndị iro gị niile, n’ihu gị. Aga m emekwa ka aha gị dị ukwu dịka ndị aha ha kacha dị ukwu. Aga m ahọpụtara ndị nke m bụ Izrel otu ebe, kụọkwa ha dịka osisi n’ebe ahụ.” Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ na-enweghị nsogbu ọzọ; ndị obi ọjọọ agaghị akpagbukwa ha dịka na mbụ, bido mgbe m họpụtaara ndị nke m Izrel ndịikpe; aga m enye ha ezumike site n’aka ndịiro ha. Aga m eme ka ị dị ukwu; aga m ewuru gị ụlọ. Mgbe ị nwụrụ, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n’ime ụmụ gị ndị nwoke bụrụ eze. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Aga m abụ nna ya; ọ ga-abụkwa nwa m. Mgbe ọbụla o mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna si adụ nwa ya ọdụ site n’inye ya ahụhụ. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe.”                 

Okwu nke Osebrụwa 

ABỤỌMA NA AZIZA (Abu.88:2-5.27.29.Az 2)

Azịza: Aga m ekwe ukwe ebebe maka ịhụnaanya Gị, O Osebrụwa .

  1. Aga m ekwe ukwe ebebe maka ịhụnaanya Gị, o Osebrụwa : na ndụdụgandụ niile, aga m ekwuwapụta ezikokwu Gị. Eji m n’aka n’ịhụnaanya Gị ga-adị ebebe. Eziokwu Gị ga-akwudosi ike dịka eligwe. .(A)
  2. Mụ na onye M rọọlụ enwego ọgbụgbandụ. Ańụgo m iyi n’ebe nwa-odibo M Devid nọ. Aga M eme ka ụlọ nke gị n’achị ebebe, wee mee ka ụkpụ Eze gị n’ aga n’iru na ndụdụgandụ niile.(A)
  3. Ọ ga-agwa m: “Ngịnwa bụ Nna m, Chukwu m n’okwute nke nzọpụta m” ịhụnaanya m ga-anọnyere ya oge niile; maka ihi Ya, ọgbụgba ndụ m ga-atọ atọ (A)                                                         

IHE GG NKE ABỤỌ (Rom 16:25-27)

Ihe gg e wetara n Akwkw ozi Paul d as degara nd Rom 

Ihe omimi ahụ, nke e zoro site n’ogologo mgbe ochie gara aga ka, ekpughere ụgbụ a. 

Ka otito dịrị Chineke, onye pụrụ ime ka okwukwe unu kwudosie ike dịka oziọma Jesu nke m na-ekwusa si dị, na dịka ihe omimi ahụ e kpugheere anyị si dị, bụ nke e zoro site n’ogologo mgbe ochie gara aga. Ugbu a, Chineke ekpugheela ya. O sitekwara n’ihe ndịamụma dere n’akwụkwọnsọ mee ka mba niile mara ya. Chineke nke dị ebeebe kpughere nke a dịka iwu ya si dị, ka ụmụ mmadụ mụta irubere Chineke isi site n’okwukwe ha nwere na Kristi. Ka otito niile dịrị Chineke ahụ onye naanị ya mazuru ihe niile, site na Jesu Kristi, ebeebe ebeebe. Amen.      

Okwu nke Oseburụwa. 

MBEKU (Lk 1:38)

Aleluya, aleluya!

Abụ m odibo nwaanyị nke Osebrụwa , ka o reere m ka ị siri kwu. Aleluya! 

OZIMA (Luke 1:26-38)

Ihe gg nke a si nOzima d as nke Luke dere 

Lee, ga-ad ime, mta nwa nwoke.

 N’ọnwa nke isii, Chineke zịgara Mmụọma Gabrel ka ọ gaa n’obodo Galili ana-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid, ga-alụ. Aha nwaagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele,” ị jupụtara na grasịa, Osebrụwa  nọnyeere gị” Obị lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtule n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara. Mmụọma ahụ sịrị ya, atụla egwu, Marịa, n’ihina ị natala ngọzị n’aka Chineke. Lee, ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa nke onye kacha elu. Dinwnenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na amaghị m nwoke.” Ma Mmụọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ ị ga-amụ; onye nsọ, nwa Chineke. Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadị ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.” Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebrụwa , ka o reere m ka ị siri kwu.” Mmụọma ahụ wee si n’ebe ọnọ pụọ.                                  

Oziọma nke Osebrụwa. 

EKPERE NHUNYE

Anyị na-arịọ gi, O Osebruwa, ka I meek a otu Mmụọ Nsọ ahụ biakwasịrị Marịa di ngozi n’ike ya niile, gozie onyinye ndịa n’ebe nchụaja gi. Site na Kristi Dinwenụ anyị

 UKWE ORIRI NS

Lee, otu nwagbọghọ na amaghị nwoke ga-atụrụ ime mụta nwa nwoke; aha aga-akpọ ya bụ Immanuel

 EKPERE ANATACHAA ORIRI

Anyị na-arịọ gi O Chukwu pụrụ ime ihe niile, ka anyị bụ ndi natara oriri nkea bụ ihe ngosi nzọpụta anyị; na-abawanye na idi asọ, etu ọ bụ n’oriri nke nzọpụta anyị na-akpudebe nso, biko, mee k’anyị tosi na ndị ga-eso rie ya bụ oriri nke omụmụ Nwa gi. Site na Kristi Dinwenụ anyị. 


Arranged and edited by ichristus.org