08. ỤKA NKE ASATỌ N’OGE NADỊGHỊ N’EMUME, ARỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA

Osebrụwa bu onye nchedo m; Ọ zọpụtara m, kpọpụta m n’ụzọ di obosara,  Ọ zọpụtara m n’ihina Ọ hụrụ m n’anya. (Abụ 17:19-20)

EKPERE MMEGHE

Mee anyị na arịọ O Chukwu, ka ihe gbasara uwa nkea bụrụ ihe ga enweta ezi mgbasiri site n’odudu oma gi n’enweghi atu, ka uka gi n’enwe ọnụ, ghara inwe nsogbu obula n’ikpere gi. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

 

09. ỤKA NKE ITEOLU N’OGE NADỊGHỊ N’EMUME, ARỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA (Ps. 95:1.6)

Tụgharịa mere m ebere O Chukwu, n’ihi na a bụ m ogbenye, e nwekwaghị m onye enyemaka. Leenu ahụhụ na ihe mgbu m, O Chukwu gbaghara njọ m niile. (Abụ 24:16.18)

EKPERE MMEHE

O Chukwu onwekwaghị ihe gbara gi gharịị n’ụzọ i si echekwaba ihe nile ikere eke, anyị ji umeala arịọ ka i wepụrụ anyị ajọ ihe niile, ma nyekwa anyị ihe ga abara anyị uru. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ na-achi, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọnsọ, otu Chukwu site n’ụwatụ nile. Amen.

EKPERE MMEGHE

O Chukwu anyị ji ntukwasị obi anyị nwere n’ebere gi, wee na-ebute onyinye anyị n’ebe nchụaja gi di asọ. Biko site n’amara gi, mee ka ihe omimi ndi a anyị na-asọpụrụ wụchaa anyị ma wetara anyị ndụ ebeebe. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

Read More

07. ỤKA NKE ASAA N’OGE NADỊGHỊ N’EMUME, ARỌ NKE ABỤỌ  (4)

UKWE MBATA (Ps. 95:1.6)

Onyenwanyị atụkwasara m obi n’ebere nke ihunanya gi. A gam ekwere Dinwenu onye na-emere m ihe oma ukwe

EKPERE MMEHE

Chukwu pụrụ ime ihe niile, meek a site na itule uche n’ihe nke mmụọ mgbe ọbụla, k’anyị na-emepụta n’omume na okwu ọnụ ihe ndi na-asọ gi.

IHE GG NKE MB (AIZAYA 43:18-19 21-22.24-25.)

Ihe gg e wetara nAkwkw onye Amuma Aizaya

M onwe m bu onye ga na-asachap mmehie niile.

Ọ baghi uru icheta ihe ndi a gara aga maọbu tụghariba uche n’ ihe ndi mere na mbụ Lee, ana m eme ihe ọhụrụ; ugbu a ọ chawapụtala; ọ bụ na unu ahụghi ya? Aga m akwa ụzọ n’ ime ikpa, mee ka mmriri diri n’ime ọzara. Ndi m họọrọ ka ha bụrụ ndi nke m, ga-ekwupụta otito m. Ma Jacob akpọkughi m, ike m agwụkwala gi Izrel. Kama unu ejirila njọ unu megide m, were arụrụ ala ụnụ mee ka ike gwụ m. M onwe m bu onye ahu na-ekpochapụ mmehie, agaghi m echeta njọ unu.

Okwu nke Oseburụwa.

Read More

05. UKA NKE ISE N’OGE NADIGHI N’EMUME, ARO NKE ABUO

Ukwe Mbata

Bianụ k’anyị sekpuoro Chukwu.  Ngwanu k’anyị kpọọ isi ala n’ihu Osebụrụwa Onye kere anyị, n’ihi na O bụ Osebrụwa Chukwu anyị.

EKPERE MMEGHE

Were obioma gi na-enweghi atụ chekwaba ezi-na-ụlọ gi, O Osebruwa,  ebe o bụ na nchekwube ya niile di n’amara gi si n’enuigwe, biko, mee ka o na-enwe nchedo gi oge niile.  Site na Dinwenu anyị Jesu Kristi Nwa gi, onye gi na ya di ndụ, na-achi .....

IHE GG NKE MB (Job 7:1-4,6-7)

Ihe gg e wetara nAkwkw Job

Ana m atghar onwe m ruo na chi bb.

Job bidoro okwu ya sị: Ọ bụ na mmadụ enweghị ọrụ siri ike n’elu ụwa, ka ọ bụ na ụbọchị ya adịghị ka nke onye e goro ọrụ? Dịka onye ohu si atụ anya uhuruchi, ma onye e goro ọrụ na-atụkwa anya ụgwọ ọrụ ya, Otu a ka e sị kenye m ọtụtụ ọnwa abaghị uru, na ọtụtụ abalị bụ sọ iru uju. Ọ bụrụ na m dina ala, ana m ajụ sị, “Olee mgbe m ga ekuli, abalị ka tere aka?” Ana m atụgharị onwe m ruo na chi ọbụbọ. Ụbọchị m na-agba nwangwa karịa ihe ọkwa akwa ji agbanye owu ma na-abịa n’isi njedebe n’enweghị olileanya. Cheta na ndụ m bụ ụfụrụ; anya m agaghịkwa ahụ iheọma ọzọ   

Okwu nke Oseburụwa.

Read More