05. ỤKA NKE ISE N’OGE MBILITE N’NW KRISTI, AF NKE ABỤỌ

 UKWE MBATA

Kweerenu Onyenweanyị ukwe ọhụrụ n’ihi na Dinwenu arụọla ọtụtụ ọrụ ebube. O gosịla mba niile nzọpụta ya, aleluya. 

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike niile dị ebebe, biko na-emejụpụtawanye iheomimi nke Paska n’ime anyị oge niile, ka ndị ọmasịrị Gị ime ka ha dị ọhụrụ na Baptizim dị asọ, site na nchekwaba Gị mịta ọtụtụ mkpụrụ, ma bata n’aṅụrị nke ndụ ebebe. Site na Kristi Dịnwenu anyị

 

IHE GG NKE MB (R ND OZI 9:26-31)

Ihe gg e wetara n’Akwkw r Nd Ozi.

Banabas kọọr otu Dinwenu siri gosi Sl onwe ya n’z.

26Mgbe Sọl bịaruru Jersalem ọ gbalịrị isonye ndị na-eso ụzọ Jesu, mana ha niile tụrụ egwu oge ha hụrụ ya, n’ihina ha ekwetaghị na ọ bụrụgo onye na-eso ụzọ Jesu n’ezie.

27Ma Banabas kpọọrọ ya dugara ya ụmụazụ kọọrọ ha otu o si hụ Onyenweanyị n’ụzọ na otu o si zisaa oziọma n’aha Jesu na Damakọs n’asọghị onye ọbụla anya.

28N’ihi nke a, ha nabatara Sọl o soro ha na-agagharị ebe dị icheiche na Jersualem

29na-agbasa oziọma n’aha Onyenweanyị n’atụghị egwu ọbụla. Ọ gwara ndị Juu na-asụ Grik okwuchukwu. Ha na ya rụrịtakwara ụka ma ha gbara mbọ chọsie ike igbu ya.

30Mgbe ụmụnna n’ime Kristi chọpụtara nke a, ha duuru ya ruo Sizeria, wee si ebe ahụ zilaa ya Tasụs.

31N’ihi ya nzukọ Kristi niile dị n’ala Judia, Grik na Sameria nwere udo. Ọ kwụdosiriike na-abawanye site n’ịtụegwu nke Onyenweanyị na agbamume nke Mmụọ Nsọ.    

V.  Okwu nke Osebruwa
R.  Ekene diri Chukwu

Read More

 01. ỤKA NKE MBỤ N’OGE MBILITE N’ỌNWỤ KRISTI, AFỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA: (PS. 138:18, 5-6)

Ebiliela m n'ọnwụ, mụ na gị ka nọkwa, I bikwasala m aka Gị. Amamihe Gị dị itụnanya, alleluia.

Ma o bu Lk. 24:35,cf Rev 1:6

N'ezie, Dịnwenụ ebilitego n'ọnwụ, alleluia. Otito na ike ọchịchị bụ nke Ya ebeebe

 

EKPERE MMGHE

O Chukwu, I sigo n'aka otu Nwa Gị, na sitena mmeri O meriri ọnwụ, megheere anyị ọnụ ụzọ eligwe n'ụbọchị taa. Anyị na-arịọ ka anyị bụ ndị na-eri oriri mbilite n'ọnwụ nke Dinwenu site na mgbanwo nke Mụọ Nsọ wee bilite n'uju ndụ. Sitena Kristi Dinwenu anyị

 

IHE   ỌGỤGỤ NKE MBỤ

Ihe ọgụgụ nke ewetara n'Ọrụ Ndị Ozi (10:34.37-43)

Anyị na Ya rịkọrọ ma ñụkọọ mgbe O siri n'ọnwụ kulite

Pita gwara Conelus na ezinulo ya okwu si: Unu maara nke ọma maka okwu ahụ e kwusara na Judia niile, bido na Galili mgbe Jọn kwuchara maka mmirichukwu. Unu makwa maka Jesu onye Nazaret otu Chineke si nye ya Mụọ Nsọ na ike, ọ gagharịrị na-eme iheọma, na-agwọ ndị ọrịa na ndị ekwensu kere agbụ, n'ihina Chineke nọnyeere ya. Anyị bụ ndị akaebe nke ihe niile omere n'obodo ndị Juu na n'ime Jerusalem. Ha gburu ya site n'ịkpọgbu ya n'obe. Chineke mere ka O si n'ọnwụ bilie n'ụbọchị nke atọ, mee ka ndị mmadụ hụ ya. Ọ bụghị mmadụ niile ka o gosiri onwe ya kama ọ bụ naanị anyị, ndị Chineke họputara ka ha bụrụ ndị akaebe ndị soro Ya rie ma ñụọ ka o bilitechara n'ọnwụ. O nyekwara anyị iwu ka anyị kwusaara mmadụ niile oziọma, ka anyị gbaakwa akaebe na ya bu onye Chineke họputara ịbụ onye ịkpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Ndi amụma niile gbara akaebe maka ya, na onye ọbụla kwere na ya na-anata mgbaghara njọ site na-aha ya.

V.  Okwu nke Osebruwa
R.  Ekene diri Chukwu

Read More

02. ỤKA NKE ABỤỌ N’OGE MBILITE N’ỌNWỤ KRISTI, AFỌ NKE ABỤỌ (DIVINE MERCY SUNDAY) 

UKWE MBATA

Dịka umu a mụrụ ọhụrụ, na-enwenu agụụ sọsọ maka mmiri ara nke mmuọ nke unu ga eji na-etowanye n’ike wee nweta nzọpụta. Aleluya

EKPERE MMEGHE

Chineke onye obi ebere, onye na-esite n’emume nke Pascha anyi na-eme na-afunwu ọkụ nke okwukwu nke ndị nke ya, biko, anyị na-arịọ Gị, ka ị bawanye grasia Gị n’ime anyị, ka anyị wee nwe ike ịghọta ụdị ụgwọ a kwụrụ maka mgbapụta anyị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (ỌRỤ NDỊ OZI:4:32-35)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi.

Ha jikọrọ ọnụ n’otu mmụọ na n’otu obi.

Ọha ndị kwere na Kristi jikọrọ ọnụ n’otu mmụọ na n’otu obi, nwekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị, onye ọbụla n’ime ha na-asị na ihe ọbụla ya nwere bụ nke naanị ya. Ha ji ike ha niile na-agba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu, ma bụrụkwa ndị ana-asọpụrụ n’ụzọ pụrụ iche. Ọ dịghị onye ọbụla n’etiti ha a hapụrụ ka ọ nọdụ n’ụkọ. Ndị nwere ala ubi, mọbụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, dobe ha n’ụkwụ ndị ụmụazụ. Ha na-ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọbụla n’otu n’otu dịka mkpa ya si dị.       

V.  Okwu nke Osebruwa
R.  Ekene diri Chukwu

Read More

03. ỤKA NKE ATỌ N’OGE MBILITE N’ỌNWỤ KRISTI, AFỌ NKE ABỤỌ

UKWE MBATA   

Ụwa niile, tierenụ Chineke mkpu ọńụ, bụọrọnụ aha Ya abụ otito; nyenu Ya ukwe otito dị ebube, aleluya. 

EKPERE MMEGHE

Mee ka ndị nke Gị, O Chukwu, na-egori mgbe niile n’ime mmụọ nke ndị amunworo amụnwo, ka anyị jiri obi aṅụrị nke ndị agụnyegoro n’ụmụ Gị, were nchekwube siri ike na-atụ anya nnukwu aṅụrị nke ụbọchị mbilite n’ọnwụ. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

 

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ (ỌRỤ NDỊ OZI 3:13-15.17-19)

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi.

Unu egbugo onye na-enye ndụ, mana Chukwu mere ka o si n’ọnwụ bilie. 

Pita wee si ndị mmadụ: 13“Chukwu nke Abraham, na nke Aịzik, na nke Jekọb, Chukwu nke nnanna anyị ha, enyela nwodibo ya bụ Jesu otito na ebube kacha elu. Onye nke unu nyefere n’aka ndịisi, gọnahụkwa ya n’ihu Paịlet, Ọ bụladị mgbe Paịlet kpebiri ịhapụ ya.

14Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume ahụ, ma rịọ ka a hapụrụ unu onye ogbu mmadụ.

15N’ime nke a, unu egbuo onye na-enye ndụ, onye Chukwu mere ka o si n’ọnwụ bilie. Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe nke mbilite n’ọnwụ ya.

17“Ma ugbu a, ụmụnna m, amatala m na ihe unu na ndịisi unu mere Jesu, unu mere ya n’amaghị ama.”

18Maka na Chineke mere ka ihe niile o buru ụzọ kwusaa site n'ọnụ ndịamụma ya niile, na Kristi ga-ata ahụhụ mezuo.

19Ya bụ, chegharịanụ laghachikwutekwanu Chineke ka ọ sachapụ mmehie unu niile.         

V.  Okwu nke Osebruwa
R.  Ekene diri Chukwu

Read More